Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 10/1 p. 13-18
  • Ṅomie Ebere Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ṅomie Ebere Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iwe Nwanne
  • Echiche Na-ezighị Ezi
  • Ebere nke Nna
  • Iṅomi Ebere Chineke Taa
  • “Jehova, Chineke nke Nwere Obi Ebere, Onye Na-eme Amara”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Anyị Na-efe Chineke Onye Ebere Ya “Na-enweghị Atụ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • “Nna Unu Na-eme Ebere”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Na-eme Ebere—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 10/1 p. 13-18

Ṅomie Ebere Jehova

“Nweenụ obi ebere, dị ka Nna unu nwere obi ebere.”—LUK 6:36.

1. Olee otú ndị Farisii si gosi onwe ha dị ka ndị na-adịghị eme ebere?

Ọ BỤ ezie na e kere ha n’onyinyo Chineke, mgbe mgbe ụmụ mmadụ adịghị eṅomi ebere ya. (Jenesis 1:27) Dị ka ihe atụ, tụlee ndị Farisii. Dị ka otu ìgwè, ha aṅụrịghị ọṅụ mgbe Jisọs ji obi ebere gwọọ aka kpọnwụrụ akpọnwụ nke otu nwoke n’Ụbọchị Izu Ike. Kama nke ahụ, ha gbara izu megide Jisọs “ka ha ga-esi laa Ya n’iyi.” (Matiu 12:9-14) N’oge ọzọ, Jisọs gwọrọ otu nwoke kpuru ìsì site n’ọmụmụ. Ọzọkwa, “ụfọdụ n’etiti ndị Farisii” ahụghị ihe mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ọmịiko Jisọs. Kama nke ahụ, ha mere mkpesa, sị: “Nwoke a esiteghị n’ebe Chineke nọ, n’ihi na Ọ dịghị edebe ụbọchị izu ike.”—Jọn 9:1-7, 16.

2, 3. Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe o kwuru, sị, ‘Na-ezenụ ihe ndị Farisii na-eko achịcha’?

2 Àgwà obi ịta mmiri nke ndị Farisii bụ mpụ megide mmadụ nakwa mmehie megide Chineke. (Jọn 9:39-41) N’inwe ezi ihe kpatara ya, Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị, ‘Na-eze ihe na-eko achịcha’ nke òtù ndị oké ozu a na ndị okpukpe ndị ọzọ, dị ka ndị Sadusii. (Matiu 16:6) E ji ihe na-eko achịcha mee ihe na Bible iji nọchite anya mmehie ma ọ bụ mmerụ. N’ihi ya Jisọs nọ na-asị na nkụzi “ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii” pụrụ imerụ ofufe dị ọcha. N’ụzọ dị aṅaa? N’ụzọ nke na ọ kụziiri ndị mmadụ ile Iwu Chineke anya nanị n’ụzọ ụkpụrụ nduzi na ememe okpukpe ha na-ewepụta dị ka o si masị ha, ebe ha na-elefuru “ihe ka arọ” nke gụnyere ebere, anya. (Matiu 23:23) Ụdị okpukpe a jupụtara n’ememe mere ka ife Chineke bụrụ ibu arọ na-anyịgbu anyịgbu.

3 N’akụkụ nke abụọ nke ilu ya banyere nwa mmefu ahụ, Jisọs kpughere echiche rụrụ arụ nke ndị ndú okpukpe ndị Juu. N’ilu ahụ nna ahụ, bụ́ onye na-anọchite anya Jehova, nwere oké mmasị ịgbaghara nwa ya nwoke chegharịrịnụ. Ma nwanne nwa okorobịa ahụ nke tọrọ ya, bụ́ onye na-eme ihe atụ “ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ,” nwere mmetụta dị iche kpam kpam n’okwu ahụ.—Luk 15:2.

Iwe Nwanne

4, 5. N’echiche dị aṅaa ka nwanne nwa mmefu ahụ “furu efu”?

4 “Ma nwa ya nke okenye nọ n’ubi: mgbe ọ na-abịaru ụlọ nso, o wee nụ olu abụ na ite egwú. O wee kpọọ otu onye n’ime ndị na-eje ozi ka ọ bịakwute ya, wee jụọ ya ihe ha bụ, bụ́ ihe ndị a. O wee sị ya, Nwanne gị abịawo; nna gị egbuwokwa nwa ehi a zụrụ azụ, n’ihi na ọ naara ya n’ahụ ike. Ma o were iwe, ọ chọghịkwa ịba n’ụlọ.”—Luk 15:25-28.

5 N’ụzọ doro anya, ọ bụghị nanị nwa mmefu ahụ nwere nsogbu n’ilu Jisọs. “Ụmụ abụọ ahụ e gosiri n’ebe a fuchara efu,” ka otu akwụkwọ na-egosi, “onye nke mbụ n’ihi mmebi iwu nke wedara ya n’ala, onye nke ọzọ n’ihi ịbụ onye ezi omume n’anya onwe ya bụ́ nke na-ekpuchi ya anya.” Rịba ama na ọ bụghị nanị na nwanne nwa mmefu ahụ jụrụ ịṅụrị ọṅụ kamakwa “o were iwe.” Okwu Grik maka “iwe” na-enye echiche, ọ bụghị oké ntiwapụ nke iwe, kama ọnọdụ na-adịgide n’uche. O doro anya na nwanne nwa mmefu ahụ bu iwe gbara mkpọrọgwụ n’obi, ya mere o chere na o kwesịghị ekwesị ime ememe nlọghachi nke onye na-ekwesịdịghị ịhapụ ụlọ na mbụ.

6. Ònye ka nwanne nwa mmefu ahụ nọchiri anya ya, n’ihi gịnịkwa?

6 Nwanne nwa mmefu ahụ na-anọchi anya ndị ahụ were iwe maka ọmịiko na nlebara anya nke Jisọs gosiri ndị mmehie. Ebere Jisọs emetụghị ndị a bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha n’ahụ; ha egosighịkwa ọṅụ dị n’eluigwe nke na-ebilite mgbe a gbaghaara onye mmehie. Kama nke ahụ, ebere Jisọs kpasuru ha iwe, ha malitekwara ‘iche ajọ ihe’ n’obi ha. (Matiu 9:2-4) N’otu oge iwe ndị Farisii dị ọkụ nke ukwuu nke na ha kpọtara otu nwoke Jisọs gwọworo wee “chụpụ ya” n’ụlọ nzukọ! (Jọn 9:22, 34) Dị ka nwanne nwa mmefu ahụ, bụ́ onye ‘na-achọghị ịba n’ụlọ,’ ndị ndú okpukpe ndị Juu jụwapụrụ isi mgbe ha nwere ohere ‘isoro ndị na-aṅụrị n’ịṅụrị ọṅụ.’ (Ndị Rom 12:15) Jisọs kpughekwuru ajọ echiche ha ka ọ gara n’ihu n’ilu ya.

Echiche Na-ezighị Ezi

7, 8. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka nwanne nwa mmefu ahụ si bụrụ onye na-aghọtaghị ihe ịbụ nwa pụtara? (b) Olee otú nwa nke okenye ahụ si ghara ịdị ka nna ya?

7 “Nna ya wee pụta, rịọ ya. Ma ọ zara, sị nna ya, Lee, ọtụtụ afọ ndị a ka m bụ ohu gị, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla m hapụrụ ihe i nyere n’iwu: ma ọ dịghị mgbe ọ bụla i nyere m nwa ewu, ka obi wee tọọ mụ na ndị enyi m ụtọ: ma mgbe nwa gị nke a bịara, nke ya na ndị inyom ndị na-akwa iko ripịara ihe nile i ji biri, i gburu nwa ehi a zụrụ azụ nye ya.”—Luk 15:28-30.

8 Site n’okwu ndị a, nwanne nwa mmefu ahụ mere ka ọ pụta ìhè na ọ ghọtaghị ihe ịbụ nwa pụtara. O jeere nna ya ozi n’ụzọ yiri otú onye e were n’ọrụ si ejere onye were ya n’ọrụ ozi. Dị ka ọ gwara nna ya: “M bụ ohu gị.” N’eziokwu, nwa nke okenye a ahapụtụbeghị ụlọ ma ọ bụ mebie iwu nna ya. Ma ọ̀ bụ ịhụnanya kwaliri nrubeisi ya? Ò nwetara ezi ọṅụ n’ijere nna ya ozi, ka ò jiriwo nwayọọ nwayọọ ghọọ onye onwe ya juru afọ, na-ewere onwe ya dị ka ezi nwa nanị n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ya “n’ubi”? Ọ bụrụ na ọ bụ nwa raara onwe ya nye n’ezie, n’ihi gịnị ka o ji ghara igosipụta obi nna ya? Mgbe e nyere ya ohere igosi nwanne ya nwoke obi ebere, n’ihi gịnị ka ọ na-ejighị nwetụ ọmịiko n’obi ya?—Tụlee Abụ Ọma 50:20-22.

9. Kọwaa otú ndị ndú okpukpe ndị Juu si yie nwa nke okenye ahụ.

9 Ndị ndú okpukpe ndị Juu yiri nwa nke okenye a. Ha kwere na ha na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke n’ihi na ha raparasiiri ike n’usoro iwu dị iche iche. N’eziokwu, nrubeisi dị mkpa. (1 Samuel 15:22) Ma ha ikwubiga okwu ókè banyere ọrụ mere ka ofufe Chineke ghọọ nanị ihe e ji emezu iwu, nanị ngosipụta elu elu nke nsọpụrụ n’enweghị ezi ihe ime mmụọ. Uche ha jupụtara n’ọdịnala dị iche iche. Ịhụnanya adịghị n’obi ha. Leenụ, ha weere ndị nkịtị dị ka unyi dị n’ọbụ ụkwụ ha, ọbụna jiri ụzọ nlelị na-ezo aka n’ebe ha nọ dị ka “ndị a na-abụ ọnụ.” (Jọn 7:49) N’ezie, olee otú ọrụ ndị ndú dị otú ahụ pụrụ isi masị Chineke mgbe obi ha dị nnọọ anya n’ebe ọ nọ?—Matiu 15:7, 8.

10. (a) N’ihi gịnị ka okwu ndị bụ́, “Ana m achọ ebere, ọ bụghị àjà” ji bụrụ ndụmọdụ kwesịrị ekwesị? (b) Ruo ókè hà aṅaa ka okwu banyere enweghị ebere siruru n’ike?

10 Jisọs gwara ndị Farisii ka ha ‘gaa mụta ihe okwu a bụ, Ana m achọ ebere, ọ bughị àjà.’ (Matiu 9:13; Hosea 6:6) Ihe ndị ha butere ụzọ edoghị anya, n’ihi na ma ebere adịghị, àjà ha nile ga-abụ ihe na-abaghị n’ihe. Nke a bụ n’ezie okwu siri ike, n’ihi na Bible na-ekwu na a gụnyere “ndị na-enweghị obi ebere” n’etiti ndị Chineke na-ele anya dị ka ndị “kwesịrị ọnwụ.” (Ndị Rom 1:31, 32) Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Jisọs sịrị na dị ka otu òtù, a kawo ndị ndú okpukpe akara maka mbibi ebighị ebi. Dị ka ihe àmà na-egosi, enweghị obi ebere ha tụnyere ụtụ buru ibu na ha ịbụ ndị kwesịrị inweta ikpe ọmụma a. (Matiu 23:33) Ma ikekwe a pụrụ inyere ndị sitere n’òtù a aka n’otu n’otu. Ná mmechi nke ilu ya, Jisọs gbalịrị ịgbazi echiche nke ndị Juu dị otú ahụ site n’okwu ndị nke nna ahụ gwara nwa ya nwoke nke okenye. Ka anyị hụ ụzọ o si mee ya.

Ebere nke Nna

11, 12. Olee otú nna ahụ nọ n’ilu Jisọs si gbalịa isoro nwa ya nwoke nke okenye tụgharịa uche, gịnịkwa pụrụ ịdị ịrịba ama n’ojiji nna ahụ ji nkebi okwu bụ́ “nwanne gị” mee ihe?

11 “O wee sị ya, Nwa m, mụ na gị nọ mgbe nile, ihe m nile bụkwa nke gị. Ma anyị aghaghị ime ka obi tọọ anyị ụtọ na ịṅụrị ọṅụ: n’ihi na nwanne gị nke a nwụrụrịị anwụ, o wee dị ndụ ọzọ; o fukwara efu, e wee hụ ya.”—Luk 15:31, 32.

12 Rịba ama na nna ahụ jiri okwu bụ́ “nwanne gị,” mee ihe. N’ihi gịnị? Cheta na mgbe ọ na-agwa nna ya okwu na mbụ, nwa okorobịa nke okenye akpọworị nwa mmefu ahụ “nwa gị”—ọ bụghị “nwanne m.” O yiri ka ọ ghọtaghị njikọ ezinụlọ dị n’etiti ya na nwanne ya. Ya mere ugbu a nna ahụ na-agwa nwa ya nke okenye, n’ezie, sị: ‘Onye a abụghị nanị nwa m. Ọ bụ nwanne gị, anụ ahụ na ọbara gị. I nwere ihe nile mere ị ga-eji ṅụrịa ọṅụ ná nlọghachi ya!’ Ozi Jisọs kwesịrị idoworị ndị ndú ndị Juu anya. Ndị mmehie ahụ ha na-eleda anya bụ n’ezie “ụmụnne” ha. N’ezie, “ọ dịghị onye ezi omume n’ụwa, nke na-eme ezi ihe, na-adịghị emehiekwa.” (Eklisiastis 7:20) Ya mere, ndị Juu ahụ a ma ama nwere ihe nile mere ha ga-eji ṅụrịa ọṅụ mgbe ndị mmehie chegharịrị.

13. Otú ilu Jisọs si jedebe n’ike na-ewelite ajụjụ dị aṅaa nke na-akpali iche echiche?

13 Mgbe nna ahụ rịọsịrị arịrịọ, ilu ahụ jedebere n’ike. Ọ dị ka Jisọs ọ̀ na-akpọ ndị na-ege ya ntị òkù ka ha dechapụzie akụkọ ahụ. N’agbanyeghị ihe ọ bụla mmeghachi omume nwa nke okenye ahụ bụ, ajụjụ bụ́ ‘Ị̀ ga-ekere òkè n’ọṅụ ahụ a na-enwe n’eluigwe mgbe onye mmehie chegharịrị?’ na-eche onye ọ bụla na-ege ntị ihu. Ndị Kraịst taa nwekwara ohere igosipụta azịza ha nye ajụjụ ahụ. N’ụzọ dị aṅaa?

Iṅomi Ebere Chineke Taa

14. (a) Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Pọl nke dị ná Ndị Efesọs 5:1 n’ọrụ mgbe a bịara n’ihe banyere ebere? (b) Nghọtahie dị aṅaa banyere ebere Chineke ka ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche megide?

14 Pọl dụrụ ndị Efesọs ọdụ, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) N’ihi ya, dị ka ndị Kraịst anyị kwesịrị inwe ekele banyere ebere Chineke, kụnyesie ya ike n’ime obi anyị, ma na-egosipụtazi àgwà a ná mmeso anyị na-emeso ndị ọzọ. Otú ọ dị, e kwesịrị ịkpachara anya. E kwesịghị ịghọtahie ebere Chineke dị ka ibelata ịdị njọ nke mmehie. Dị ka ihe atụ, e nwere ụfọdụ pụrụ iji omume ọ̀ gbasara m na-eche sị, ‘Ọ bụrụ na mụ emee mmehie, apụrụ m ikpeku Chineke ekpere mgbe nile maka mgbaghara, ọ ga-emekwa ebere.’ Àgwà dị otú ahụ ga-abụ ihe onye so dee Bible bụ́ Jud kpọrọ ‘ịgha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ [ihe ngọpụ maka] agụụ ịkwa iko.’ (Jud 4) Ọ bụ ezie na Jehova nwere obi ebere, “ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị” mgbe ọ na-emeso ndị mere ihe ọjọọ bụ́ ndị na-enweghị nchegharị ihe.—Ọpụpụ 34:7; tụlee Joshua 24:19; 1 Jọn 5:16.

15. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị ndị okenye mkpa karịsịa ịnọgide na-enwe echiche guzoziri eguzozi banyere ebere? (b) Ọ bụ ezie na ha adịghị anabata ihe ọjọọ a kpachaara anya mee, gịnị ka ndị okenye kwesịrị ịgbalị ime, n’ihi gịnịkwa?

15 N’aka nke ọzọ, ọ dị anyị mkpa ịkpachara anya otú ahụ n’iche nche megide imebiga ihe ókè n’akụkụ nke ọzọ—omume nke ịkpọ ekwo nkụ na ikpe ikpe nye ndị gosipụtara ezi nchegharị na mwute n’ụzọ nsọpụrụ Chineke maka mmehie ha. (2 Ndị Kọrint 7:11) Ebe ọ bụ na e nyefere nlekọta nke atụrụ Jehova n’aka ndị okenye, ọ dị oké mkpa na ha nọgidere na-enwe echiche guzoziri eguzozi n’akụkụ a, karịsịa mgbe ha na-ahụ maka okwu ikpe. A ghaghị idebe ọgbakọ ndị Kraịst ọcha, o kwesịkwara ekwesị n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ ‘iwepụ ajọ onye’ site ná nchụpụ. (1 Ndị Kọrint 5:11-13) N’otu oge ahụ, ọ dị mma ime ebere mgbe e nwere ihe ndabere doro anya maka ya. Ya mere ọ bụ ezie na ndị okenye adịghị anabata ihe ọjọọ a kpachaara anya mee, ha na-agbalị ịgbaso ụzọ ịhụnanya na nke obi ebere, ruo n’ókè ikpe ziri ezi nyere ohere ya. Ha na-eburu n’uche mgbe nile ụkpụrụ Bible bụ́: “Ọ bụ ikpe nke ebere na-adịghị ya ka a ga-ekpe onye na-emeghị ebere: ebere na-anyara ikpe isi.”—Jemes 2:13; Ilu 19:17; Matiu 5:7.

16. (a) N’iji Bible eme ihe, gosi otú Jehova si achọ n’ezie ka ndị jehierenụ laghachikwute ya. (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị kwa nabatara nlọghachi nke ndị mmehie chegharịrịnụ?

16 Ilu banyere nwa mmefu ahụ na-eme ka o doo anya na Jehova na-achọ ka ndị jehierenụ laghachikwute ya. N’ezie, ọ na-akpọ ha òkù ahụ ruo mgbe ha na-enweghị mmekwata. (Ezikiel 33:11; Malakaị 3:7; Ndị Rom 2:4, 5; 2 Pita 3:9) Dị ka nna nwa mmefu ahụ, Jehova na-eji nkwanye ùgwù emeso ndị lọghachirinụ, na-anabataghachi ha dị ka ndị òtù ezinụlọ ahụ n’ụzọ zuru ezu. Ị̀ na-eṅomi Jehova n’akụkụ a? Mgbe a nabatara onye kwere ekwe ibe gị, bụ́ onye a chụpụrụ ruo oge ụfọdụ, olee otú i si emeghachi omume? Anyị amaraworị na ‘ọṅụ dị n’eluigwe.’ (Luk 15:7) Ma ọṅụ ọ̀ dị n’ụwa, n’ọgbakọ gị, ọbụna n’obi gị? Ka ọ̀ bụ, dị ka nwa nke okenye nọ n’ilu ahụ, è nwere iwe ụfọdụ, dị ka a ga-asị na e kwesịghị ịnabata onye na-ekwesịdịghị ịhapụ ìgwè atụrụ Chineke na mbụ?

17. (a) Ọnọdụ dị aṅaa bilitere na Kọrint nke narị afọ mbụ, oleekwa otú Pọl gwara ndị nọ n’ọgbakọ ahụ ka ha si mee ihe maka okwu ahụ? (b) N’ihi gịnị ka ndụmọdụ Pọl ji dị irè, oleekwa otú anyị pụrụ isi tinye ya n’ọrụ taa? (Leekwa igbe dị n’aka nri.)

17 Iji nyere anyị aka inyocha onwe anyị n’akụkụ a, tụlee ihe mere n’ihe dị ka afọ 55 O.A. na Kọrint. N’ebe ahụ, otu nwoke a chụworo n’ọgbakọ mesịrị mee ka ndụ ya dị ọcha. Gịnị ka ụmụnna ahụ ga-eme? Hà kwesịrị inwe obi abụọ banyere nchegharị ya ma nọgide na-eze ya eze? N’ụzọ dị iche, Pọl gbara ndị Kọrint ume, sị: “Unu were amara gbaghara ya kasiekwa ya obi, ka a ghara iji ihe mwute nke na-ewutebiga ya ókè lodaa mmadụ dị otú a n’ụzọ ọ bụla. N’ihi nke a arịọ m unu ka unu mee ka ịhụnanya unu hụrụ ya bụrụ ihe dị ịtụkwasị obi.” (2 Ndị Kọrint 2:7, 8) Mgbe mgbe, ndị mere ihe ọjọọ wee chegharịa na-enwekarị mmetụta nke ihere na obi nkoropụ. N’ihi ya, ọ dị ndị a mkpa ịbụ ndị e mesiri obi ike ọzọ na ndị kwere ekwe ibe ha na Jehova hụrụ ha n’anya. (Jeremaịa 31:3; Ndị Rom 1:12) Nke a dị mkpa. N’ihi gịnị?

18, 19. (a) Olee otú ndị Kọrint si gosi onwe ha na mbụ dị ka ndị na-emebiga ebere ókè? (b) Olee otú àgwà nke emeghị ebere siworo rụpụtara ndị Kọrint ịbụ ndị ‘Setan rigburu’?

18 N’ịgba ndị Kọrint ume ka ha na-agbaghara, Pọl kwupụtara dị ka otu n’ime ihe ndị mere ha ga-eji mee otú ahụ “ka Setan wee ghara irigbu anyị: n’ihi na anyị abụghị ndị na-amaghị ihe nile ọ na-echepụta.” (2 Ndị Kọrint 2:11) Gịnị ka o bu n’uche? Na mbụ Pọl baara ọgbakọ Kọrint mba maka ime ebere gabiga ókè. Ha ahapụwo otu nwoke a ka ọ na-eme mmehie ya n’anataghị ntaramahụhụ. N’ime otú ahụ, ọgbakọ ahụ—karịsịa ndị okenye ya—mere ihe n’ụzọ na-atọ Setan ụtọ, n’ihi na ọ ga-adịwo ya mma ime ka ọgbakọ ahụ nwee aha ọjọọ.—1 Ndị Kọrint 5:1-5.

19 Ọ bụrụ na ha emebiga ihe ókè n’akụkụ nke ọzọ ugbu a ma jụ ịgbaghara onye mmehie ahụ chegharịrịnụ, Setan ga na-erigbu ha n’akụkụ ọzọ. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na ọ pụrụ iji adịghị nro na emeghị ebere ha mee ihe. Ọ bụrụ na onye mmehie ahụ chegharịrịnụ abụrụ onye ‘ihe mwute nke na-ewutebiga ya ókè lodara’—ma ọ bụ dị ka Today’s English Version si sụgharịa ya, “nwere mwute nke ukwuu nke na ọ dara mbà”—lee ajụjụ dị ukwuu ndị okenye ahụ na-aghaghị ịza Jehova! (Tụlee Ezikiel 34:6; Jemes 3:1.) N’inwe ezi ihe kpatara ya, mgbe ọ dụsịrị ụmụazụ ya ọdụ megide ime ka “otu onye n’ime ndị nta ndị a” maa n’ọnyà, Jisọs sịrị: “Na-ezenụ onwe unu: ọ bụrụ na nwanna gị emehie, baara ya mba; ọ bụrụkwa na o chegharịa, gbaghara ya.”a (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Luk 17:1-4.

20. N’ụzọ dị aṅaa ka e si enwe ọṅụ ma n’eluigwe ma n’elu ala mgbe onye mmehie chegharịrị?

20 Ọtụtụ puku ndị na-alọghachi n’ofufe dị ọcha kwa afọ nwere ekele maka ebere Jehova meere ha. “Apụghị m icheta otu oge ná ndụ m mgbe m nwetụrụla obi ụtọ otú a banyere ihe ọ bụla,” ka otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst na-ekwu banyere nnabataghachi ya. N’ezie, ndị mmụọ ozi sokwa ya na-aṅụrị ọṅụ. Ka anyị sonyekwa ‘n’ọṅụ dị n’eluigwe’ nke na-ewere ọnọdụ mgbe onye mmehie chegharịrị. (Luk 15:7) N’ime otú ahụ, anyị ga na-eṅomi ebere Jehova.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na o yiri ka a nabataghachiri onye ahụ mere ihe ọjọọ nọ na Kọrint n’ime oge dị nnọọ mkpụmkpụ, a gaghị eji nke a mere ụkpụrụ maka nchụpụ nile. Ọnọdụ nke ọ bụla dị iche. Ụfọdụ ndị mere ihe ọjọọ na-amalite inwe ezi nchegharị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo a chụpụsịrị ha. N’ebe ndị ọzọ nọ, ọ na-ewe nnọọ oge ụfọdụ tupu àgwà dị otú ahụ apụta ìhè. Otú ọ dị, n’ọnọdụ nile, ndị a nabataghachiri aghaghị ibu ụzọ gosi ihe àmà nke inwe mwute n’ụzọ nke Chineke, n’ebe o kwekwara mee, ha aghaghị igosipụta ọrụ kwesịrị nchegharị.—Ọrụ 26:20; 2 Ndị Kọrint 7:11.

Ná Ntụleghachi

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka nwanne nwa mmefu ahụ si yie ndị ndú okpukpe ndị Juu?

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka nwanne nwa mmefu ahụ si bụrụ onye na-aghọtaghị ihe ịbụ nwa pụtara n’ezie?

◻ N’igosipụta ebere Chineke, olee akụkụ abụọ nke imebiga ihe ókè ọ dị anyị mkpa izere?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ebere Chineke taa?

[Igbe dị na peeji nke 17]

“MEE KA ỊHỤNANYA UNU HỤRỤ YA BỤRỤ IHE DỊ ỊTỤKWASỊ OBI”

Banyere onye mere ihe ọjọọ nke a chụpụrụ bụ́ onye gosipụtara nchegharị, Pọl gwara ọgbakọ Kọrint, sị: “Arịọ m unu ka unu mee ka ịhụnanya unu hụrụ ya bụrụ ihe dị ịtụkwasị obi.” (2 Ndị Kọrint 2:8) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘mee ka ihe dị ịtụkwasị obi’ bụ okwu iwu nke pụtara “mee ka ihe dị irè.” Ee, ọ dị ndị chegharịrịnụ bụ́ ndị a nabataghachiri mkpa inwe mmetụta na a hụrụ ha n’anya nakwa na a nabataghachila ha dị ka ndị òtù nke ọgbakọ.

Otú ọ dị, anyị aghaghị icheta na ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ amaghị kpọmkwem ọnọdụ nke dugara ná nchụpụ mmadụ ma ọ bụ ná nnabataghachi ya. Ọzọkwa, a pụrụ inwe ụfọdụ ndị ihe ọjọọ nke onye chegharịrịnụ pụrụ imetụtawo ma ọ bụ mejọọ—ikekwe ọbụna ruo ogologo oge. Ya mere, n’ịbụ ndị okwu ndị dị otú ahụ na-emetụtakarị, mgbe a mara ọkwa nnabataghachi, ọ bụ ihe kwere nghọta na anyị ga-ejighachi okwu nnabata ruo mgbe a pụrụ ime otú ahụ mgbe nanị anyị na ya nọ.

Lee ihe na-eme ka okwukwe sie ike ọ bụ nye ndị a nabataghachiworo ịmara na a nabataghachila ha dị ka ndị òtù nke ọgbakọ ndị Kraịst! Anyị pụrụ ịgba ndị dị otú ahụ chegharịrịnụ ume site n’iso ha kwurịta okwu ma na-anụ ụtọ mkpakọrịta ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’ozi, nakwa n’oge ndị ọzọ kwesịrị ekwesị. Site n’isi otú a na-eme ka ịhụnanya anyị hụrụ ndị a dị ịtụkwasị obi, ma ọ bụ ime ka ọ dị irè, anyị adịghị ebelata ịdị njọ nke mmehie ndị ha mere n’ụzọ ọ bụla. Kama nke ahụ, anyị na-esonyere usuu ndị nọ n’eluigwe na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na ha ajụwo ụzọ mmehie ahụ ma laghachikwute Jehova.—Luk 15:7.

[Foto dị na peeji nke 15]

Nwa nke okenye jụrụ ịṅụrị ọṅụ ná nlọghachi nke nwanne ya nwoke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya