Aristakọs—Onye Ibe Na-eguzosi Ike n’Ihe
N’IME ọtụtụ ndị a tụkwasịrị obi sooro Pọl onyeozi rụkọọ ọrụ bụ Aristakọs. Gịnị na-abịa gị n’uche mgbe ị nụrụ aha ya? Ò nwere? Ì nwere ike ikwu òkè o keere ná mmezu nke akụkọ ihe mere eme nke ndị Kraịst oge mbụ? Ọ bụ ezie na Aristakọs nwere ike ọ bụghị otu n’ime ndị a kọrọ akụkọ ha n’ime Bible ndị anyị kasị mara nke ọma, otu o sina dị, o tinyere aka n’ọtụtụ ihe ndị mere eme a kọrọ akụkọ ha n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.
Ya mere, ònye bụ Aristakọs? Gịnị jikọrọ ya na Pọl? N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Aristakọs bụ onye ibe na-eguzosi ike n’ihe? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’inyocha ihe nlereanya ya?
Mbanye na-akpali akpali nke Aristakọs banyere n’ihe ndekọ nke akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi bụ mgbe e nwere iti mkpu na ọgba aghara nke ìgwè mmadụ na-enweghị nchịkwa n’obodo Efesọs. (Ọrụ 19:23-41) Owuwu nke ụlọ nsọ nta ọlaọcha nke chi ụgha bụ́ Daịana bụ azụmahịa na-eweta uru nye Dimitriọs na ndị ụzụ ọlaọcha ndị ọzọ nke Efesọs. N’ihi ya, mgbe ọrụ nkwusa Pọl n’ime obodo ahụ mere ka ọtụtụ ndị hapụ ofufe na-adịghị ọcha nke chi nwanyị a, Dimitriọs kpaliri ndị ọkà ndị ọzọ. Ọ gwara ha na nkwusa Pọl abụghị nanị na ọ na-etinye ụzọ ha si enweta ego n’ihe ize ndụ kamakwa ọ na-eme ka o yie ihe ga-eme eme na ofufe nke Daịana ga-abịa ná ngwụsị.
N’enweghị ike ịchọta Pọl, ìgwè mmadụ ahụ iwe juru obi dọkpụụrụ ndị ibe ya, Aristakọs na Gaịọs n’ike banye n’ime ebe ahụ a na-ekiri ihe. Ebe ha abụọ nọ n’ihe ize ndụ dị ukwuu, ndị enyi Pọl rịọrọ ya ka ọ “ghara inunye onwe ya n’ime ebe ahụ a na-ekiri ihe.”
Cheedị n’uche gị ịnọ n’ọnọdụ ahụ. Ruo ihe dị ka hour abụọ, ìgwè mmadụ ahụ na-enweghị nchịkwa nọgidere na-eti mkpu sị, “Daịana nke ndị Efesọs dị ukwuu”! N’ịchọta onwe ha n’aka ìgwè mmadụ ahụ na-anụbiga ọkụ n’obi ókè n’enweghịdị ike ịzara ọnụ ha aghaghị ịbụ n’ezie ahụmahụ na-atụ egwu nye Aristakọs na Gaịọs. Ha aghaghị icheworị ma ha ga-adị ndụ lanarị ya. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ha lanarịrị. N’ezie, ido anya nke ihe ndekọ Luk edugawo ụfọdụ ndị ọkà mmụta ịtụ aro na o nwetara ihe ọmụma ya site n’akụkọ nke ndị hụrụ ihe merenụ, ikekwe nke Aristakọs na Gaịọs n’onwe ha.
Odeakwụkwọ nke obodo ahụ mesịrị kwụsị ụzụ ahụ. Ọ ghaghị ịbụworị oké ahụ efe nye Aristakọs na Gaịọs ịnụ ka o kwupụtara na aka ha dị ọcha ma hụzie ka ọgba aghara ahụ gbara ha gburugburu kwụsịrị.
Olee otú ọ gaara adị gị mgbe i nwesịrị ahụmahụ yiri nke ahụ? Ị̀ gaara ekwubi na ịbụ onye ozi ala ọzọ ibe Pọl abụghị maka gị, na ọ dịbigara ize ndụ oké, nakwa na ọ ga-akara gị mma ịchọ ndụ dị jụụ karị? Ọ bụghị Aristakọs! N’ịbụ onye sitere na Tesalọnaịka, o yiri ka ọ maraworị nke ọma ihe ize ndụ dị n’ikwusa ozi ọma ahụ. Mgbe Pọl kwusara ozi ọma n’obodo ya nanị afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, ọgba aghara tiwapụkwara n’ebe ahụ. (Ọrụ 17:1-9; 20:4) Aristakọs jiri nguzosi ike n’ihe rapagide Pọl n’ahụ.
Site na Gris Gaa Jerusalem
Ọnwa ụfọdụ mgbe ọgba aghara nke ndị ụzụ ọlaọcha ahụ gasịrị, Pọl nọ na Gris na-akwadokwa iji ụgbọ site Siria gaa Jerusalem mgbe “ndị Juu gbakwara ajọ izu megide ya.” (Ọrụ 20:2, 3) Ònye ka anyị hụrụ sooro Pọl n’oge ndị a dị ize ndụ? Aristakọs!
Iyi egwu ọhụrụ a mere ka Pọl, Aristakọs na ndị ibe ha gbanwee atụmatụ, nke mbụ ime njem site na Masedonia, na-eme agatụ akwụsị n’ụzọ n’akụkụ osimiri Asia Minor tupu ha gawazie Finisia dị na Patara. (Ọrụ 24:4, 5, 13-15; 21:1-3) Ihe àmà na-egosi na nzube nke njem a bụ maka iburu onyinye ndị Kraịst nọ na Masedonia na Akaịa bugara ụmụnna ha nọ ná mkpa na Jerusalem. (Ọrụ 24:17; Ndị Rom 15:25, 26) Ọnụ ọgụgụ buru ibu mekọrọ njem ọnụ, ikekwe n’ihi na ọgbakọ dị iche iche enyewo ha ibu ọrụ a. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ìgwè buru ibu dị otú ahụ ga-eme ka e nwee nchebe ka ukwuu.
Aristakọs nwere ihe ùgwù buru ibu n’isonyere Pọl site na Gris gaa Jerusalem. Otú ọ dị, njem ha ọzọ ga-eduru ha site na Judia garuo Rom.
Ime Njem Gaa Rom
N’oge a ọnọdụ dị nnọọ iche. Pọl anọworị n’ụlọ mkpọrọ dị na Sizarịa ruo afọ abụọ, ọ kpọkuwo Siza, a ga-akpọrọkwa ya n’agbụ gaa Rom. (Ọrụ 24:27; 25:11, 12) Cheedị otú ọ dị ndị ibe Pọl n’ahụ. Njem ahụ site na Sizarịa gaa Rom ga-abụ nke toro ogologo, wetakwa nrụgide ná mmetụta uche ha, bụrụ ihe a na-amaghị ihe ga-esi na ya pụta. Ònye pụrụ isoro ya gaa iji nye ya nkwado na enyemaka? A họtara mmadụ abụọ ma ọ bụ ha nyere onwe ha n’afọ ofufo. Ha bụ Aristakọs na Luk, onye dere Ọrụ Ndị Ozi.—Ọrụ 27:1, 2.
Olee otú Luk na Aristakọs si nwee ike ịbanye n’otu ụgbọ na njem mbụ ha mere gaa Rom? Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Giuseppe Ricciotti na-atụ aro, sị: “Mmadụ abụọ a banyere n’ụgbọ dị ka ndị njem na-agara onwe ha . . . ma ọ bụ, dị ka o yikarịrị, a nabatara ha n’ihi obiọma nke onye ọchịagha ndị Rom bụ́ onye mere ka a ga-asị na o weere ha ịbụ ndị ohu Pọl, ebe iwu kwadoro ka ohu ole na ole nyere nwa amaala Rom aka.” Lee ka Pọl na-aghaghị isi bụrụ onye e mesiri obi ike site n’ọnụnọ na agbamume ha!
Luk na Aristakọs gosiri ịhụnanya ha maka Pọl ná mfu na n’itinye onwe ha n’ihe ize ndụ. N’ezie, ha zutere ọnọdụ na-eyi ndụ egwu mgbe ụgbọ ha na ndị ibe ha e ji eji kpuru n’àgwàetiti Malta.—Ọrụ 27:13–28:1.
‘Onye A Dọkọọrọ Ya Na Pọl n’Agha’
Mgbe Pọl degaara ndị Kọlọsi na Faịlimọn akwụkwọ ozi ya na 60-61 O.A., Aristakọs na Luk ka nọkwa ya n’akụkụ na Rom. E zoro aka n’ebe Aristakọs na Epafras nọ dị ka ‘ndị a dọkọọrọ ha na Pọl n’agha.’ (Ndị Kọlọsi 4:10, 14; Faịlimọn 23, 24) Ya mere, n’ụzọ doro anya Aristakọs sooro Pọl kerịta agbụ ya ruo oge ụfọdụ.
Ọ bụ ezie na Pọl bụ onye mkpọrọ na Rom ruo ma ọ dịkarịa ala afọ abụọ, e kwere ka e chee ya nche n’ụlọ nke aka ya o goro ego, bụ́ ebe ọ pụrụ ikwusara ndị nile bịara ileta ya ozi ọma. (Ọrụ 28:16, 30) Mgbe ahụ, Aristakọs, Epafras, Luk, na ndị ọzọ jeere Pọl ozi, na-enyere ya aka, na-akwagidekwa ya.
“Ndị Ngụgụ Obi”
Mgbe ị tụlesịrị ihe omume dị iche iche nke Aristakọs pụtara n’ime ha n’ihe ndekọ Bible sitere n’ike mmụọ nsọ, ụdị onyinyo dị aṅaa na-apụta? Dị ka onye edemede bụ́ W. D. Thomas si kwuo, Aristakọs “guzopụrụ iche dị ka nwoke pụrụ iche mmegide ihu ma si na ya pụta n’enweghị ihe mere okwukwe ya, bụrụkwa onye mkpebi ya ije ozi na-ebelataghị. O guzopụrụ iche dị ka nwoke hụrụ Chineke n’anya ọ bụghị nanị n’ụbọchị ihe dị mma, mgbe anyanwụ na-acha n’igwe ojii kamakwa n’oge ịta ụta na oge oké ihe isi ike.”
Pọl na-ekwu na Aristakọs na ndị ọzọ bụụrụ ya “ndị ngụgụ obi” (Grik, pa·re·go·riʹa), ya bụ, isi iyi nke nkasi obi. (Ndị Kọlọsi 4:10, 11) Ya mere, site n’ịkasi Pọl obi na ịgba ya ume, Aristakọs bụ ezi onye ibe n’oge mkpa. Inwe mmekọrịta na ọbụbụenyi onyeozi ahụ ruo ọtụtụ afọ aghaghị ịbụ ahụmahụ bara uru n’ụzọ ime mmụọ na nke na-eju nnọọ afọ.
O nwere ike bụrụ na anyị agaghị ahụ onwe anyị kpọmkwem n’ọnọdụ ndị na-akpali akpali dị ka nke Aristakọs. Otú o sina dị, iguzosi ike n’ihe yiri nke ahụ n’ebe ụmụnna ime mmụọ Kraịst na nzukọ Jehova nọ dị ndị nile nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst taa mkpa. (Tụlee Matiu 25:34-40.) O yiri ka ndị anyị na ha na-efekọ ofufe anyị maara ga-emecha nweta ahụhụ ma ọ bụ nsogbu, ikekwe n’ihi ịbụ ndị mmadụ nwụnahụrụ, ọrịa ma ọ bụ ule ndị ọzọ. Site n’ịrapagide ha n’ahụ na inyere ha aka, nkasi obi, na agbamume, anyị pụrụ inweta ọṅụ ma nwee ike igosipụta onwe anyị ịbụ ndị ibe na-eguzosi ike n’ihe.—Tụlee Ilu 17:17; Ọrụ 20:35.