Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 12/15 p. 16-21
  • Mee Nkwupụta Ihu Ọha Maka Nzọpụta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Nkwupụta Ihu Ọha Maka Nzọpụta
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na Mgbe Ikpeazụ”
  • Ekpere Maka Nzọpụta
  • Ikwupụta “Okwu Okwukwe”
  • Ịkpọku Aha Jehova
  • ‘Ụkwụ Mara Mma’ nke Ndị Nkwusa
  • Mee Ka “Olileanya Nzọpụta” Gị Na-egbukepụ Egbukepụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ònye Ka “A Ga-eme Ka O Wepụga Onwe Ya”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Nzọpụta Ihe Ọ Pụtara n’Ezie
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ònye Ga-agbanarị “Mgbe Ahụhụ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 12/15 p. 16-21

Mee Nkwupụta Ihu Ọha Maka Nzọpụta

“Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.”—NDỊ ROM 10:13.

1. N’akụkọ ihe mere eme nile, olee ịdọ aka ná ntị ndị e nyeworo?

AKỤKỌ ihe mere eme na-akọwa ọtụtụ ‘ụbọchị Jehova.’ Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, mkpochapụ nke Sọdọm na Gọmọra, na mbibi nke Jerusalem na 607 T.O.A. na 70 O.A. bụcha ụbọchị Jehova nke dị ukwuu dịkwa egwu. Ha bụcha ụbọchị imezu ikpe n’isi ndị nupụụrụ Jehova isi. (Malakaị 4:5; Luk 21:22) N’ụbọchị ndị ahụ, ọtụtụ ndị lara n’iyi n’ihi ajọ omume ha. Ma ụfọdụ lanarịrị. Jehova mere ka a dọọ aka ná ntị, na-agwa ndị ajọ omume banyere ọdachi na-abịanụ ma na-enye ndị obi ha ziri ezi ohere ịchọta nzọpụta.

2, 3. (a) Olee ịdọ aka ná ntị amụma e hotara na Pentikọst? (b) Malite na Pentikọst 33 O.A., gịnị ka a chọrọ n’ịkpọku aha Jehova?

2 Mbibi Jerusalem na 70 O.A. bụ ihe atụ pụtara ìhè banyere nke a. N’ikwu banyere ihe omume ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 900 tupu oge ya eruo, Joel onye amụma dere, sị: “M ga-enyekwa ihe ebube dị iche iche n’eluigwe na n’ụwa: ọbara, na ọkụ, na ogidi nke anwụrụ ọkụ. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-agbanwekwa ghọọ ọbara, tutu ụbọchị Jehova abịa, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu.” Olee otú onye ọ bụla pụrụ isi lanarị oge dị egwu dị otú ahụ? Joel dere n’ike mmụọ nsọ, sị: “Ọ ga-erukwa, na onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya: n’ihi na n’ugwu Zaịọn na n’ime Jerusalem ka ụfọdụ ndị gbapụrụ agbapụ ga-adị, dị ka Jehova sịworo, na n’etiti ndị fọdụrụ afọdụ ka ndị Jehova na-akpọ ga-adị.”—Joel 2:30-32.

3 Na Pentikọst 33 O.A., Pita onyeozi gwara ìgwè ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu okwu na Jerusalem wee hota amụma Joel, na-egosi na ndị na-ege ya ntị pụrụ ịtụ anya otu mmezu n’ụbọchị ha: “M ga-enyekwa ọrụ ebube n’eluigwe dị n’elu, na ihe ịrịba ama n’elu ala dị n’okpuru ya; ọbara, na ọkụ, na alụlụ anwụrụ ọkụ: anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-agbanwekwa ghọọ ọbara, tutu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ́ oké ụbọchị ahụ nke na-apụta ìhè: ọ ga-erukwa, na onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.” (Ọrụ 2:16-21) Ìgwè mmadụ ahụ na-ege Pita ntị nọcha n’okpuru Iwu Mosis, n’ihi ya kwa ha maara aha Jehova. Pita kọwara na, site ugbu a gaa n’ihu, ịkpọ aha Jehova ga-agụnye ihe ọzọ. N’ụzọ pụtara ìhè, nke a gụnyere ịbụ onye e mere baptism n’aha Jisọs, bụ́ onye e gbuworo, mesịakwa mee ka o si n’ọnwụ bilie gaa ná ndụ anwụghị anwụ nke eluigwe.—Ọrụ 2:37, 38.

4. Ozi dị aṅaa ka ndị Kraịst zisara?

4 Site na Pentikọst gaa n’ihu, ndị Kraịst gbasara okwu banyere Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie. (1 Ndị Kọrint 1:23) Ha mere ka a mara na a pụrụ ido ndị mmadụ dị ka ụmụ ime mmụọ nke Jehova Chineke, ha aghọọkwa akụkụ nke “Israel nke Chineke” ọhụrụ, mba ime mmụọ nke ‘ga-ekwusa ịdị mma nile nke Jehova.’ (Ndị Galetia 6:16; 1 Pita 2:9) Ndị ahụ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ga-eketa ndụ anwụghị anwụ nke eluigwe dị ka ndị ha na Jisọs ga-eketakọ Alaeze eluigwe ya. (Matiu 24:13; Ndị Rom 8:15, 16; 1 Ndị Kọrint 15:50-54) Ọzọkwa, ndị Kraịst a gaje ịkpọsa ọbịbịa nke ụbọchị Jehova nke dị ukwuu dịkwa egwu. Ha aghaghị ịdọ ndị Juu aka ná ntị na ọ ga-enweta mkpagbu nke karịrị ihe ọ bụla nke dakwasịtụworo Jerusalem na ndị na-asị na ha bụ ndị Chineke ruo n’oge ahụ. Otú ọ dị, a ga-enwe ndị ga-alanarị. Ole ndị? Ndị kpọkuru aha Jehova.

“Na Mgbe Ikpeazụ”

5. Mmezu dị aṅaa nke amụma werewooro ọnọdụ taa?

5 N’ọtụtụ ụzọ, ọnọdụ ndị dị laa azụ n’oge ahụ sere onyinyo ihe ndị anyị na-ahụ taa. Kemgbe 1914, ihe a kpọrọ mmadụ anọwo na-ebi n’oge pụrụ iche nke e zoworo aka n’ime Bible dị ka “mgbe ọgwụgwụ,” “ọgwụgwụ oge,” na “mgbe ikpeazụ.” (Daniel 12:1, 4; Matiu 24:3-8; 2 Timoti 3:1-5, 13) Na narị afọ anyị, agha obi ọjọọ, ime ihe ike a na-achịkwaghị achịkwa, na mbibi nke ọha mmadụ na gburugburu ebe obibi enyewo mmezu dị ịrịba ama nke amụma Bible. Ndị a bụcha akụkụ nke ihe ịrịba ama nke Jisọs buru n’amụma, na-egosi na ihe a kpọrọ mmadụ agawala ịhụ ụbọchị Jehova dị egwu nke ga-ekpebi ihe nile, bụ́ nke ikpeazụ. Nke a ga-ejedebe n’agha Amagedọn, ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ‘mkpagbu ukwu ahụ, nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.’—Matiu 24:21; Mkpughe 16:16.

6. (a) Olee otú Jehova siworo na-eme ihe iji zọpụta ndị dị umeala n’obi? (b) Olee ebe anyị na-achọta ndụmọdụ Pọl banyere otú a ga-esi alanarị?

6 Ka ụbọchị mbibi ahụ na-akpụdewe nnọọ nso, Jehova na-eme ihe maka nzọpụta nke ndị dị umeala n’obi. Na “mgbe ọgwụgwụ” a, ọ chịkọtawo ndị ikpeazụ nke Israel ime mmụọ nke Chineke ma chigharịa uche nke ndị ohu elu ala ya, site n’afọ ndị 1930 gaa n’ihu, gaa n’ịchịkọta “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” Dị ka otu ìgwè, ndị a “na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta” ná ndụ. (Mkpughe 7:9, 14) Ma olee otú onye ọ bụla pụrụ isi mee ka nlanarị ya bụrụ ihe e ji n’aka? Pọl onyeozi na-aza ajụjụ ahụ. Ná Ndị Rom isi nke 10, ọ na-enye ndụmọdụ ọma maka nlanarị—ndụmọdụ nke metụtara ụbọchị ya, nke na-emetụtakwa ụbọchị anyị.

Ekpere Maka Nzọpụta

7. (a) Olee olileanya a kọwara ná Ndị Rom 10:1, 2? (b) N’ihi gịnị ka Jehova pụrụ iji mee ka a kpọsaa “ozi ọma” ahụ n’ụzọ sakwuru mbara ugbu a?

7 Mgbe Pọl dere akwụkwọ Ndị Rom, Jehova ajụworị Israel dị ka mba. N’agbanyeghị nke ahụ, onyeozi ahụ kwusiri ike, sị: “Ihe dị obi m ezi mma na arịrịọ m na-arịọ Chineke n’ihi ha bụ, ka a zọpụta ha.” Olileanya ya bụ na onye Juu nke ọ bụla pụrụ inweta ezi ihe ọmụma nke uche Chineke, na-eduje n’ịbụ ndị a zọpụtara. (Ndị Rom 10:1, 2) Ọzọkwa, Jehova ga-achọ ka ndị nke ihe nile a kpọrọ mmadụ nwere okwukwe nweta nzọpụta, dị ka e gosiri na Jọn 3:16: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Àjà mgbapụta Jisọs meghere ụzọ maka oké nzọpụta ahụ. Dị ka ọ dị n’ụbọchị Noa na n’ụbọchị ikpe ndị ọzọ sochirinụ, Jehova mere ka a kpọsaa “ozi ọma,” na-atụga aka n’ụzọ nzọpụta.—Mak 13:10, 19, 20.

8. N’iṅomi ihe nlereanya Pọl, ole ndị ka ezi ndị Kraịst na-emere amara taa, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

8 N’igosi amara nke onwe ya n’ebe ma ndị Juu ma ndị Jentaịl nọ, Pọl mere nkwusa n’ohere ọ bụla. Ọ “na-eme ka ndị Juu na ndị Grik kwenye.” Ọ gwara ndị okenye nke Efesọs, sị: “Otú egwu na-emeghị m ka m ghara ịkọrọ unu otu ihe n’ihe nile baara unu uru, na izi unu ihe n’ihu ọha mmadụ, n’ụlọ nke aka unu kwa n’otu n’otu, na-agwasi unu ike, ma ndị Juu ma ndị Grik, okwu nchegharị n’ebe Chineke nọ, na okwukwe n’ebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.” (Ọrụ 18:4; 20:20, 21) N’ụzọ yiri nke ahụ, Ndịàmà Jehova taa na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime nkwusa, ọ bụghị nanị nye ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst kamakwa nye ndị nile, ọbụna gaa “ebe nile ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:8; 18:5.

Ikwupụta “Okwu Okwukwe”

9. (a) Ụdị okwukwe dị aṅaa ka Ndị Rom 10:8, 9 na-agba ume ya? (b) Ole mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị isi mee nkwupụta nke okwukwe anyị?

9 A chọrọ okwukwe na-adịgide adịgide maka nzọpụta. N’ihota Deuterọnọmi 30:14, Pọl kwuru, sị: “Okwu ahụ dị gị nso, n’ọnụ gị, na n’obi gị: nke ahụ bụ, okwu okwukwe, nke anyị na-ekwusa.” (Ndị Rom 10:8) Ka anyị na-ekwusa “okwu okwukwe” ahụ, ọ na-abamiwanye n’obi anyị. Otú ahụ ka o mere n’ebe Pọl nọ, okwu ndị ọ gakwara n’ihu na-ekwu pụrụ iwusi mkpebi anyị iyi ya n’isoro ndị ọzọ kerịta okwukwe ahụ ike: “Ọ bụrụ na ị ga-ewere ọnụ gị kwupụta Jisọs na Ọ bụ Onyenwe anyị, ọ bụrụkwa na ị ga-ewere obi gị kwere na Chineke mere ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, a ga-azọpụta gị.” (Ndị Rom 10:9) Ọ bụghị nanị na a na-eme nkwupụta a n’ihu ndị ọzọ n’oge baptism kama ọ ghaghị ịbụ nkwupụta na-aga n’ihu, iji ịnụ ọkụ n’obi na-agba àmà ihu ọha banyere akụkụ nile dị ebube nke eziokwu. Eziokwu dị otú ahụ na-elekwasị anya n’aha dị oké ọnụ ahịa nke Eze Onyenwe anyị Jehova; n’Eze Mesaịa na Onye Mgbapụta anyị, Onyenwe anyị Jisọs Kraịst; nakwa ná nkwa Alaeze ndị magburu onwe ha.

10. N’ikwekọ ná Ndị Rom 10:10, 11, olee otú anyị na-aghaghị isi jiri “okwu okwukwe” a mee ihe?

10 Ọ dịghị nzọpụta dịịrị onye ọ bụla nke na-anakwereghị ma tinye “okwu okwukwe” nke a n’ọrụ, dị ka onyeozi ahụ gara n’ihu na-ekwu: “A na-eji obi kwere ruo ezi omume: a na-ejikwa ọnụ kwupụta ruo nzọpụta. N’ihi na ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ na-asị, Onye ọ bụla nke kwere na Ya, a gaghị eme ka ihere mee ya.” (Ndị Rom 10:10, 11) Anyị aghaghị inweta ezi ihe ọmụma nke “okwu okwukwe” a ma nọgide na-azụ ya n’obi anyị ka e wee kpalie anyị ịgwa ya ndị ọzọ. Jisọs n’onwe ya na-echetara anyị, sị: “Onye ọ bụla ihere Mụ onwe m na okwu m nile ga-eme n’ọgbọ a nke na-akwa iko, nke na-emehiekwa, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke mmadụ, mgbe Ọ ga-abịa n’ebube nke Nna Ya, Ya na ndị mmụọ ozi Ya dị nsọ.”—Mak 8:38.

11. Ruo n’ókè hà aṅaa ka a na-aghaghị ịkpọsa ozi ọma ahụ, n’ihi gịnịkwa?

11 Dị ka Daniel onye amụma buru n’amụma, n’oge ọgwụgwụ a, a na-ahụ “ndị ahụ ndị nwere uche” ka ha na-enwu ọcha “dị ka onwunwu ọcha nke mbara ìgwè,” ka àmà Alaeze ahụ na-agbasaru nsọtụ nile nke ụwa. Ha “na-eme ọha mmadụ ka ha ghọọ ndị ezi omume,” ezi ihe ọmụma n’ezie abawokwa ụba, n’ihi na Jehova na-amụkwasịwanye ìhè na-enwusi ike n’amụma ndị metụtara oge ọgwụgwụ a. (Daniel 12:3, 4) Ọ bụ ozi nke nzọpụta nke dị mkpa maka nlanarị nke ndị nile hụrụ eziokwu na ezi omume n’anya.

12. Olee otú Ndị Rom 10:12 si kwekọọ n’ọrụ mmụọ ozi ahụ a kọwara ná Mkpughe 14:6?

12 Pọl onyeozi na-aga n’ihu: “Ọ dịghị ihe dị iche n’etiti onye Juu na onye Grik: n’ihi na otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onyenwe ọha mmadụ, bụrụkwa Onye nwere akụ̀ hie nne inye ndị nile na-akpọku Ya.” (Ndị Rom 10:12) A ghaghị ikwusa “ozi ọma” ahụ taa ọbụna n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ karị—nye ndị nile, gaa ná nsọtụ ụwa. Mmụọ ozi nke Mkpughe 14:6 nọgidere na-efe n’etiti eluigwe, na-enye anyị “ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.” Olee otú nke a ga-esi abara ndị zaghachirinụ uru?

Ịkpọku Aha Jehova

13. (a) Gịnị bụ isiokwu anyị dịịrị afọ 1998? (b) N’ihi gịnị ka isiokwu a dịịrị afọ ji kasị kwesị ekwesị taa?

13 N’ihota Joel 2:32, Pọl kwuru: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha [Jehova, NW], a ga-azọpụta ya.” (Ndị Rom 10:13) Lee ka o si kwesị ekwesị na a họrọwo okwu ndị ahụ ịbụ isiokwu dịịrị afọ nke Ndịàmà Jehova maka 1998! Ọ dịtụbeghị mgbe ọ ka mkpa ịga n’ihu na-atụkwasị Jehova obi, na-eme ka a mara aha ya na nzube ya ndị dị ebube bụ́ ndị ọ nọchiri anya ha! Dị ka na narị afọ mbụ, otú ahụ ka ọ dị na mgbe ikpeazụ nke usoro ihe rụrụ arụ nke oge a, a na-eti mkpu ahụ na-adasi ụda ike: “Zọpụtanụ onwe unu n’ọgbọ a dị mgbagọ.” (Ọrụ 2:40) Ọ bụ ọkpụkpọ òkù yiri nke opi ike maka ndị nile na-atụ egwu Chineke gbaa ụwa gburugburu ịkpọku Jehova ka o nye ha nzọpụta nakwa nye ndị ahụ na-ege ntị ná nkwusa ozi ọma nke ihu ọha ha.—1 Timoti 4:16.

14. Olee Oké Nkume anyị na-aghaghị ịkpọku maka nzọpụta?

14 Gịnị ga-eme mgbe oké ụbọchị Jehova tiwapụrụ n’ụwa a? Ihe ka ọtụtụ agaghị elegara Jehova anya maka nzọpụta. Ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha ga “na-asịkwa ugwu na oké nkume ahụ, Dakwasịnụ anyị, zopụ anyị n’ihu Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, zopụkwa anyị n’iwe nke Nwa atụrụ ahụ.” (Mkpughe 6:15, 16) Olileanya ha ga-abụ ná nzukọ na òtù ndị yiri ugwu nke usoro ihe a. Otú ọ dị, lee ka o si ka mma ma ọ bụrụ na ha atụkwasị Oké Nkume kasị ukwuu, Jehova Chineke, obi! (Deuterọnọmi 32:3, 4) Banyere ya, Eze Devid sịrị: “Jehova bụ nkume m dị elu, na ebe m e wusiri ike, na onye na-eme ka m gbapụ.” Jehova bụ “oké nkume nke nzọpụta anyị.” (Abụ Ọma 18:2; 95:1) Aha ya bụ “ụlọ elu dị ike,” nanị “ụlọ elu” nwere ike zuru ezu ichebe anyị n’oge ọgba aghara na-abịanụ. (Ilu 18:10) Ya mere, ọ dị mkpa na a kụziiri ole o kwere mee nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri mmadụ isii dị ndụ taa ịkpọku aha Jehova n’ikwesị ntụkwasị obi na n’obi eziokwu.

15. Gịnị ka Ndị Rom 10:14 na-egosi banyere okwukwe?

15 N’ụzọ dabara adaba, Pọl onyeozi gara n’ihu na-ajụ, sị: “Hà ga-esikwa aṅaa kpọkuo Onye ahụ ha aka-ekweghị na Ya?” (Ndị Rom 10:14) E nwere ìgwè mmadụ a ka pụrụ inyere aka ime “okwu okwukwe” ahụ nke ha, iji kpọkuo Jehova maka nzọpụta. Okwukwe dị oké mkpa. Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi ọzọ, sị: “A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Otú ọ dị, olee otú ọtụtụ nde ndị ọzọ ga-esi bịa nwee okwukwe na Chineke? N’akwụkwọ ozi nye ndị Rom, Pọl na-ajụ: “Ma, hà ga-esi aṅaa kwere n’Onye ahụ ha aka-anụghị okwu Ya?” (Ndị Rom 10:14) Jehova ọ̀ na-eme ụzọ ha ga-esi nụrụ? N’ezie ọ na-eme! Gee ntị n’okwu Pol gara n’ihu na-ekwu: “Ma, hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị?”

16. Ná ndokwa Chineke, n’ihi gịnị ka ndị nkwusa ji dị mkpa?

16 Site n’arụmụka Pọl o doro nnọọ anya na a chọrọ ndị nkwusa. Jisọs gosiri na nke a ga-adị otú ahụ, kpọmkwem “ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 24:14; 28:18-20) Ime nkwusa bụ akụkụ dị mkpa nke ndokwa Chineke maka inyere ndị mmadụ aka ịkpọku aha Jehova iji lanarị. Ọbụna na Krisendọm ihe ka ọtụtụ adịghị eme ihe ọ bụla iji sọpụrụ aha dị oké ọnụ ahịa nke Chineke. Ọtụtụ amaghị ọdịiche dị n’etiti Jehova na ihe ndị ọzọ dị n’ime ozizi Atọ n’Ime Otu a na-apụghị ịkọwa akọwa. Ọzọkwa, ọtụtụ na-adaba n’ụdị ndị e kwuru okwu ha n’Abụ Ọma 14:1 na 53:1: “Onye nzuzu asịwo n’obi ya, Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.” Ọ dị ha mkpa ịmara na Jehova bụ Chineke ahụ dị ndụ, ha aghaghịkwa ịghọta ihe nile aha ya nọchitere anya ha ma ọ bụrụ na ha ga-enweta nzọpụta ná mkpagbu ukwu ahụ na-abịanụ.

‘Ụkwụ Mara Mma’ nke Ndị Nkwusa

17. (a) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka Pọl hota amụma mweghachi? (b) Gịnị ka inwe ‘ụkwụ mara mma’ gụnyere?

17 Pọl onyeozi nwere otu ajụjụ ọzọ dị mkpa: “Ma hà ga-esi aṅaa kwusaa, ma ọ bụrụ na e zigaghị ha? dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu, bụ́ ụkwụ ndị na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe!” (Ndị Rom 10:15) N’ebe a Pọl na-ehota Aịsaịa 52:7, bụ́ akụkụ nke amụma mweghachi nke mezuworo kemgbe 1919. Ọzọkwa, taa Jehova na-ezipụ “onye na-ezisa ozi ọma, bụ́ onye na-eme ka a nụrụ okwu udo, onye na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe, onye na-eme ka a nụrụ okwu nzọpụta.” Ná nrubeisi, “ndị nche” Chineke e tere mmanụ na ndị enyi ha anọgidewo na-eti mkpu n’ọṅụ. (Aịsaịa 52:7, 8) Ụkwụ nke ndị na-eme ka a nụrụ okwu nzọpụta taa pụrụ inwe ike ọgwụgwụ, ọbụna dị ájá ájá, ka ha na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ma lee ka ihu ha na-egbuke n’ọṅụ! Ha maara na Jehova nyere ha ọrụ ịkpọsa ozi ọma nke udo na ịkasi ndị na-eru újú obi, na-enyere ndị a aka ịkpọku aha Jehova n’olileanya nzọpụta.

18. Gịnị ka Ndị Rom 10:16-18 na-ekwu banyere ihe ikpeazụ izisa ozi ọma ahụ na-arụpụta?

18 Ma ndị mmadụ hà ‘kwere ihe a nụworo’ ma ha na-ahọrọ inupụrụ ya isi, okwu Pọl bụ eziokwu: “Ọ̀ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ezie, n’ụwa nile ka olu ha pụrụ jezuo, ná nsọtụ nile nke elu ụwa dum mmadụ bi ka okwu ha pụwokwara jezuo.” (Ndị Rom 10:16-18) Dị nnọọ ka “eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke,” dị ka e gosipụtara n’ọrụ okike ya, otú ahụ ka Ndịàmà ya n’elu ala na-aghaghị isi kpọsaa “afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ, na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere; ịkasi ndị nile na-eru újú obi.”—Abụ Ọma 19:1-4; Aịsaịa 61:2.

19. Gịnị ga-apụtara ndị ‘na-akpọku aha Onyenwe anyị’ taa?

19 Ụbọchị Jehova nke dị ukwuu dịkwa egwu na-akpụdewe nso karị. “Ewo, ụbọchị ahụ! n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso, dị ka mbibi nke sitere n’aka Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ ga-abịa.” (Joel 1:15; 2:31) Ọ bụ ekpere anyị na ìgwè mmadụ ndị ọzọ ga-aṅa ntị ngwa ngwa n’ozi ọma ahụ, na-enubata ná nzukọ Jehova. (Aịsaịa 60:8; Habakuk 2:3) Cheta na ụbọchị ndị ọzọ nke Jehova wetara mbibi nye ndị ajọ omume—n’ụbọchị Noa, n’ụbọchị Lọt, nakwa n’ụbọchị Israel na Juda dapụrụ n’ezi ofufe. Anyị na-eguzo ugbu a n’ụsọ mkpagbu kasị mkpagbu nile ukwuu, mgbe oké ifufe Jehova ga-azachapụ ajọ omume n’elu ụwa a, na-emeghe ụzọ maka paradaịs nke udo ebighị ebi. Ị̀ ga-abụ onye ‘na-akpọku aha Onyenwe anyị’ n’ikwesị ntụkwasị obi? Ọ bụrụ otú ahụ, ṅụrịa! I nwere nkwa nke Chineke na a ga-azọpụta gị.—Ndị Rom 10:13.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Ihe ọhụrụ ndị dị aṅaa ka a kpọsara mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị?

◻ Olee otú ndị Kraịst kwesịrị isi na-aṅa ntị ‘n’okwu okwukwe’ ahụ?

◻ Gịnị ka ‘ịkpọku aha Onyenwe anyị’ pụtara?

◻ N’echiche dị aṅaa ka ndị ozi Alaeze nwere ‘ụkwụ mara mma’?

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ndị Chineke na-ezisa ịdị mma ya nile na Puerto Rico, Senegal, Peru, Papua New Guinea—ee, gburugburu ụwa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya