Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 12/15 p. 22-27
  • Akụ̀ Zoro Ezo Apụta Ìhè

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akụ̀ Zoro Ezo Apụta Ìhè
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpa E Nwere Maka Bible Russian
  • Mgbalị Ime Nsụgharị Amalite
  • Ọ̀ Bụ Ịkpa Nsụgharị Bible Ajọ Aka?
  • Akwụkwọ Pavsky
  • Inye Aha Chineke Otuto
  • Makarios Bụ́ Osote Bishọp
  • Nguzo Anyaike nke Makarios
  • E Mesịa Bipụta Ya!
  • Bible Makarios Taa
  • Okwu Chineke Na-adịru Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Otu Ihe Dị Ịrịba Ama Nye Ndị Hụrụ Okwu Chineke n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ị̀ Na-echeta?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • New World Translation Ihe Ọtụtụ Nde Mmadụ Ji Kpọrọ Ihe n’Ụwa Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 12/15 p. 22-27

Akụ̀ Zoro Ezo Apụta Ìhè

Akụkọ Banyere Bible Makarios

NA 1993 otu onye nchọpụta hụrụ ùkwù magazin Orthodox Review ochie chagharịrị achagharị n’Ọ́bá Akwụkwọ Obodo nke Russia dị na St. Petersburg. N’ime magazin ndị nke 1860 ruo 1867 e nwere akụ̀ e zopụrụ n’anya ọha mmadụ ndị Russia eri ihe karịrị otu narị afọ. Ọ bụ nsụgharị nke Akwụkwọ Nsọ Hibru dum, ma ọ bụ “Agba Ochie,” nke Bible n’asụsụ Russian!

Ndị sụgharịrị Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ Mikhail Iakovlevich Glukharev, a maara dị ka Archimandrite Makarios, na Gerasim Petrovich Pavsky. Ha abụọ bụ ndị òtù a ma ama nke Chọọchị Ọtọdọks Russia, bụrụkwa ndị ọkà mmụta asụsụ. Mgbe ndị ikom a malitere ọrụ ha ná mmalite nke narị afọ gara aga, a sụgharịbeghị Bible dum gaa na Russian.

N’ezie, e nwere Bible na Slavonic, bụ́ asụsụ bụ obu ụzọ nke Russian oge a. Otú ọ dị, ka ọ na-erule etiti narị afọ nke 19, ọ dịla anya a kwụsịrị iji asụsụ Slavonic eme ihe ma e wezụga n’ihe omume okpukpe, bụ́ ebe ndị ụkọchukwu ji ya eme ihe. E nwebuwo ọnọdụ dị otú ahụ n’Ọdịda Anyanwụ Ụwa, bụ́ ebe ndị Chọọchị Roman Katọlik gbalịrị ịhapụ Bible na nanị Latin ogologo oge mgbe a kwụsịworo iji Latin eme ihe.

Makarios na Pavsky gbalịrị ime ka ndị nkịtị nwee ike inweta Bible. N’ihi ya, nchọpụta a chọpụtara akwụkwọ ha e chezọworo eri oge emewo ka o kwe omume iweghachi akụkụ dị mkpa nke ihe nketa Russia n’ụzọ akwụkwọ na n’ụzọ okpukpe.

Ma, olee ndị kpọmkwem bụ Makarios na Pavsky? N’ihi gịnịkwa ka mgbalị ha ịsụgharị Bible n’asụsụ ọha mmadụ na-asụ ji zute mmegide dị ukwuu? Akụkọ ha na-adọrọ mmasị ma na-ewusi okwukwe nke ndị nile hụrụ Bible n’anya ike.

Mkpa E Nwere Maka Bible Russian

Makarios na Pavsky abụghị ndị mbụ hụrụ mkpa ọ dị inwe Bible n’asụsụ ọha mmadụ. Otu narị afọ tupu mgbe ahụ, eze ukwu Russia, bụ́ Peter nke Mbụ, ma ọ bụ Peter Onye Ukwu, hụkwara mkpa dị otú ahụ. N’ụzọ dị ịrịba ama, ọ kwanyeere Akwụkwọ Nsọ ùgwù, e hotakwara na o kwuru, sị: “Bible bụ akwụkwọ kasị akwụkwọ nile, ihe nile banyere ọrụ mmadụ nwere n’ebe Chineke na onye agbata obi ya nọ dịkwa n’ime ya.”

Ya mere, na 1716, Peter nyere ndị ọrụ ọchịchị ya iwu ịhụ na e biri Bible n’Amsterdam, bụ́ nke ọ ga-akwụ ụgwọ ya. Peji nke ọ bụla gaje inwe otu kọlụm nke ihe odide Russian na otu kọlụm nke ihe odide Dutch. Nanị otu afọ n’ihu, na 1717, e nwewo akụkụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ.”

Ka ọ na-erule 1721, e biwokwa nkebi nke Dutch n’ime nsụgharị dị mpịakọta anọ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. E deghị ihe ọ bụla n’otu kọlụm, bụ́ ebe a ga-emesịa dejupụta n’ihe odide Russian. Peter nyefere Bible ndị ahụ n’aka “Nzukọ Ndị Isi Chọọchị Dị Nsọ” nke Chọọchị Ọtọdọks Russia—ikike kasị elu nke chọọchị ahụ—ime ihe fọrọ banyere obibi ya na ịhụ maka nkesa ha. Ma, nzukọ ndị isi chọọchị ahụ emeghị ya.

N’ihe na-erughị afọ anọ ka e mesịrị, Peter nwụrụ. Gịnị mere Bible ya? E dejupụtaghị ma ọlị kọlụm ndị ahụ a hapụrụ maka ihe odide Russian. A chịkọtara Bible ndị ahụ n’ùkwù n’ùkwù n’otu okpukpu nke ime ala, bụ́ ebe ha retọrọ—e nweghị otu mkpụrụ nke na-emebighị emebi e mesịrị chọta! Mkpebi nzukọ ndị isi chọọchị ahụ bụ “iresị ndị ahịa ndị nile fọdụrụ.”

Mgbalị Ime Nsụgharị Amalite

Na 1812, John Paterson, onye so n’Òtù Bible nke Britain na Ofesi, bịara Russia. Paterson kpaliri mmasị nke ìgwè ndị ọkà mmụta nke St. Petersburg n’iguzobe òtù Bible. Na December 6, 1812—otu afọ ahụ usuu ndị agha Russia chụghachiri ìgwè ndị agha Napoléon nke Mbụ—Eze Ukwu Alexander nke Mbụ kwadoro akwụkwọ usoro ịrụ ọrụ maka òtù Bible Russia. Na 1815 eze ukwu ahụ nyere onye isi oche nke òtù ahụ, bụ́ Prince Aleksandr Golitsyn iwu, ka ọ tụọrọ òtù na-achị nzukọ ndị isi chọọchị ahụ aro na “ndị Russia kwesịkwara inwe ohere nke ịgụ Okwu Chineke n’asụsụ ala nna ha bụ́ Russian.”

Ọ bụ ihe ịja mma na e nyere nkwado ka a sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Russian site kpọmkwem na Hibru mbụ. Septuagint Grik oge ochie abụrụwo ebe ndabere maka nsụgharị nke Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Slavonic. A gwara ndị gaje ịsụgharị Bible gaa na Russian na ụkpụrụ ndị bụ isi nke nsụgharị ahụ ga-abụ izi ezi, ido anya, na enweghị mmerụ. Gịnị mere mgbalị ndị mbụ a iji nwee Bible n’asụsụ Russian?

Ọ̀ Bụ Ịkpa Nsụgharị Bible Ajọ Aka?

Ndị na-adịghị anabata echiche ọhụrụ ma na chọọchị ma n’ọchịchị malitere n’oge na-adịghị anya ịnọ na nche megide mmetụta okpukpe na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ofesi. Ụfọdụ ndị ndú chọọchị kwukwara na Slavonic—asụsụ ememe okpukpe—kwupụtara ozi Bible nke ọma karịa ka Russian mere.

E si otú ahụ kposaa Òtù Bible Russian na 1826. E suru ọtụtụ puku nsụgharị nke òtù Bible ahụ bipụtara ọkụ. N’ihi ya, ememe okpukpe na ọdịnala butere Bible ụzọ. N’ịgbaso ụkpụrụ Chọọchị Roman Katọlik tụrụ, nzukọ ndị isi chọọchị ahụ kpebiri na 1836, sị: “Onye nkịtị ọ bụla ji okpukpe kpọrọ ihe nwere ikike ịnụrụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ dịghị onye nwere ikike ịgụ akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ, karịsịa Agba Ochie, n’enweghị nduzi.” Nsụgharị Bible eyiwo ihe a kpara ajọ aka.

Akwụkwọ Pavsky

Ka ọ dịgodị, Gerasim Pavsky, onye prọfesọ Hibru, malitere ọrụ nke ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Russian. Na 1821 ọ sụgharịsịrị Abụ Ọma. Onye eze ukwu nyere nnwapụta ya ngwa ngwa, ka ọ na-erulekwa January 1822 e wupụtaworo ọha na eze akwụkwọ Abụ Ọma. A nakweere ya ozugbo, a ghaghịkwa ibighachi ya ugboro 12—na-eru ngụkọta nke 100,000!

Mgbalị Pavsky mere n’ụzọ nkà mmụta mere ka ọtụtụ ndị ọkà mmụta asụsụ na ndị ọkà mmụta okpukpe na-akwanyere ya ùgwù. A na-akọwa ya dị ka nwoke na-ekwu eziokwu nke na-akwụwa aka ọtọ, onye guzogidere atụmatụ nzuzo ndị gbara ya gburugburu. N’agbanyeghị mmegide chọọchị megidere Òtù Bible Russia na eziokwu ahụ bụ na ụfọdụ chere na ọ nọchitere anya ọdịmma ndị ofesi, Prọfesọ Pavsky nọgidere na-asụgharị amaokwu dị iche iche nke Bible gaa na Russian ná nkụzi ya. Ụmụ akwụkwọ ya ihe ya na-amasị ji aka depụtaghachi nsụgharị ya, mgbe oge na-agakwa, nwee ike ịchịkọta akwụkwọ ya. Na 1839 ha mesiri onwe ha obi ike ibipụta 150 n’ígwè obibi akwụkwọ ụlọ akwụkwọ—n’enwetaghị ikike ndị nnyocha.

Nsụgharị Pavsky nwere mmetụta dị ịrịba ama n’ahụ ndị na-agụ ya, mkpa e nwere maka ya nọgidekwara na-arị elu. Ma na 1841 otu onye na-ekwughị aha ya kpesaara nzukọ ndị isi chọọchị banyere “ihe ize ndụ” nke nsụgharị a, na-azọrọ na o kwekọghị na nkwenkwe Ọtọdọks. Afọ abụọ n’ihu nzukọ ndị isi chọọchị ahụ nyere iwu, sị: “Jichienụ nsụgharị nile e ji aka na nke e ji usoro lithography mee nke nsụgharị Agba Ochie nke G. Pavsky ma bibie ha.”

Inye Aha Chineke Otuto

Ka o sina dị, Pavsky atụteghachiwo mmasị ná nsụgharị Bible. O setịpụwokwa ụkpụrụ dị mkpa maka ndị nsụgharị n’ọdịnihu n’ihe banyere ihe iseokwu ọzọ dị mkpa—aha Chineke.

Onye Russia na-eme nchọpụta bụ́ Korsunsky kọwara, sị: ‘Ihe mejupụtara aha Chineke kpọmkwem, aha kasị aha nile nsọ, bụ mkpụrụ ihe odide anọ bụ́ יהוה, mkpọpụta ya ugbu a bụkwa Jehova.’ N’ime Bible oge gboo, aha ahụ pụrụ iche nke Chineke na-apụta ọtụtụ puku ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nanị. Otú ọ dị, ndị Juu ji ihie ụzọ kwere na aha Chineke dị nsọ nke ukwuu karịa ihe a ga-ede ede ma ọ bụ kpọpụta akpọpụta. Banyere nke a, Korsunsky sịrị: ‘N’okwu ma ọ bụ n’odide, a na-ejikarị Adonai edochi ya, bụ́ okwu a na-asụgharịkarị “Onyenwe anyị.”’

N’ụzọ doro anya, ihe kpatara ejighị aha Chineke mee ihe bụ egwu nkwenkwe ụgha—ọ bụghị ịtụ egwu Chineke. Ọ dịghị ebe Bible n’onwe ya gbara ume ịghara iji aha Chineke eme ihe. Chineke n’onwe ya gwara Mosis, sị: “Otú a ka ị ga-asị ụmụ Israel, Jehova, bụ́ Chineke nke nna unu ha . . . O zitewo m n’ebe unu nọ: nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile.” (Ọpụpụ 3:15) Ugboro ugboro, Akwụkwọ Nsọ na-agba ndị na-efe ofufe ume, sị: “Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha Ya.” (Aịsaịa 12:4) N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị nsụgharị Bible họọrọ ịgbaso ọdịnala ndị Juu ma zere iji aha Chineke mee ihe.

Otú ọ dị, Pavsky agbasoghị ọdịnala ndị a. Ná nsụgharị Abụ Ọma ya nanị, aha ahụ bụ́ Jehova pụtara ihe karịrị ugboro 35. Anyaike ya gaje inwe mmetụta dị ịrịba ama n’ahụ otu n’ime ndị ha na ya biri ndụ n’otu oge.

Makarios Bụ́ Osote Bishọp

Onye a ya na ya biri ndụ n’otu oge bụ Makarios bụ́ osote bishọp, bụ́ onye ozi ala ọzọ nke Ọtọdọks Russia nke nwere nkà dị egwu n’asụsụ. Mgbe ọ dị nanị afọ asaa, o nwere ike ịsụgharị ihe odide Russian ndị dị nkenke gaa na Latin. Ka ọ na-erule mgbe ọ dị afọ 20, ọ maara Hibru, German, na French. Otú ọ dị, àgwà obi umeala na nghọta dị nkọ o nwere banyere ibu ọrụ ya n’ihu Chineke nyeere ya aka izere ọnyà nke inwe obi ike gabiga ókè. Ugboro ugboro, ọ chọrọ ndụmọdụ nke ndị ọkà mmụta asụsụ na ndị ọkà mmụta ndị ọzọ.

Makarios chọrọ ịgbanwe ozi ala ọzọ na Russia. O chere na tupu e nwee ike iwegara ndị Alakụba na ndị Juu bi na Russia Iso Ụzọ Kraịst, chọọchị aghaghị “ịkụziri ọha mmadụ ihe site n’ihiwe ụlọ akwụkwọ na ikesa Bible n’asụsụ Russian.” Na March 1839, Makarios rutere St. Petersburg, na-enwe olileanya ịnata ikike iji sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Russian.

Makarios asụgharịworị akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa na Job. Ma, nzukọ ndị isi chọọchị jụrụ inye ya ikike ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Russian. N’ezie, a gwara Makarios ka o chefuo banyere ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa n’asụsụ Russian. Nzukọ ndị isi chọọchị ahụ wepụtara mkpebi, nke akara ụbọchị ya bụ April 11, 1841, na-enye Makarios iwu “ịnara ọpịpịa ga-ewe izu atọ ruo izu isii n’ụlọ otu bishọp dị na Tomsk ka o wee mee ka akọ na uche ya dị ọcha site n’ekpere na igbu ikpere n’ala.”

Nguzo Anyaike nke Makarios

Malite na December 1841 ruo January 1842, Makarios natazuru ọpịpịa ya. Ma ngwa ngwa o mezuchara nke ahụ, o bidoro ozugbo ịsụgharị ihe fọdụrụnụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ zụrụwo otu n’ime nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru nke Pavsky ma jiri ya tụnyere nsụgharị nke ya. Dị ka Pavsky, ọ jụrụ ikpuchi aha Chineke. N’ezie, aha ahụ bụ́ Jehova pụtara ihe karịrị ugboro 3,500 ná nsụgharị Makarios!

Makarios zigaara ndị enyi na-akwado ya ụfọdụ n’ime akwụkwọ ya. Ọ bụ ezie na e kesara ole na ole n’ime ndị e ji aka dee, chọọchị nọgidere na-egbochi mbipụta nke akwụkwọ ya. Makarios mere atụmatụ ịkwalite Bible ya n’ofesi. Kpọmkwem tupu ọ pụọ, ọ dara ọrịa ma nwụọ n’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, n’afọ 1847. Ọ dịghị mgbe e bipụtara Bible ya n’oge ndụ ya.

E Mesịa Bipụta Ya!

N’ikpeazụ, ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke okpukpe gbanwere. Echiche sara mbara nke dị ọhụrụ gbasazuru ala ahụ, na 1856 kwa nzukọ ndị isi chọọchị nyere nkwado ọzọ ka a sụgharịa Bible gaa na Russian. N’ọnọdụ a ka mma, e bipụtara Bible Makarios ná nkebi ná nkebi n’Orthodox Review n’agbata 1860 na 1867, n’okpuru isiokwu bụ́ An Experiment of Translation Into the Russian Language.

Achịbishọp Filaret nke Chernigov, ọkà mmụta akwụkwọ okpukpe na Russia, kwuru nke a banyere Bible Makarios: “Nsụgharị ya kwekọrọ n’ihe odide Hibru, asụsụ nke nsụgharị ahụ enweghị mmerụ, kwesịkwa isiokwu ya.”

Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe e wepụtaara ọha mmadụ Bible Makarios. N’ezie, ọ fọrọ nke nta ka e chefuchaa ya. E mesịrị sụgharịa Bible ahụ dum na 1876, gụnyere ma Akwụkwọ Nsọ Hibru ma nke Grik gaa na Russian site ná nkwado nke nzukọ ndị isi chọọchị. A na-akpọkarị Bible a zuru ezu nsụgharị nke nzukọ ndị isi chọọchị. N’ụzọ na-emegide onwe ya, nsụgharị Makarios, gụnyere nke Pavsky, bụ ebe bụ isi e si mee nsụgharị a “a nakweere” nke Chọọchị Ọtọdọks Russia. Ma e ji aha Chineke mee ihe na nanị ebe ole na ole ọ dị n’asụsụ Hibru.

Bible Makarios Taa

Bible Makarios zoro ezo ruo 1993. Dị ka a rịbara ama ná mmalite, n’oge ahụ a chọtara otu na magazin ochie bụ́ Orthodox Review ná nkebi nke akwụkwọ ndị a na-adịghị ahụkebe nke Ọ́bá Akwụkwọ Obodo nke Russia. Ndịàmà Jehova maara abamuru nke ime ka ọha na eze nweta Bible nke a. Ọ́bá akwụkwọ ahụ nyere Òtù Okpukpe nke Ndịàmà Jehova na Russia ikike idepụta otu n’ime Bible Makarios ka e wee nwee ike ịkwadebe ya maka mbipụta.

Mgbe ahụ Ndịàmà Jehova mere ndokwa ka e bie ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 300,000 nke Bible a n’Itali maka nkesa na gburugburu Russia na n’ọtụtụ mba ndị ọzọ ebe a na-asụ Russian. Tụkwasị ná nsụgharị Makarios nke ihe ka ukwuu n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, mbipụta Bible nke a nwere Abụ Ọma nke Pavsky sụgharịrị nakwa nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik nke nzukọ ndị isi Chọọchị Ọtọdọks kwadoro.

Na January afọ a, e wepụtara ya n’otu nnọkọ ndị nta akụkọ e nwere na St. Petersburg, Russia. (Lee peji nke 26.) N’ezie Bible ọhụrụ a ga-enye ndị na-agụ Russian ihe ọmụma ma zie ha ihe.

Otú a mbipụta nke Bible a bụ mmeri n’ụzọ okpukpe na n’ụzọ nkà edemede! Ọ bụkwa ihe ncheta na-ewusi okwukwe ike nke eziokwu nke okwu Aịsaịa 40:8: “Ahịhịa akpọnwụwo, okooko ọhịa ajanwụwo: ma okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”

[Igbe/Foto dị na Page 26]

Bible Enweta Ịja Mma nke Ndị Nnyocha

“E WEPỤTAWO akwụkwọ ọgụgụ ọzọ kwesịrị ncheta: Bible Makarios.” Site n’okwu mmalite ahụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ Komsomolskaya Pravda mara ọkwa mwepụta nke Bible Makarios.

Mgbe ọ rịbasịrị ama na Bible apụtaghị na nke mbụ ya n’asụsụ Russian ruo ihe dị ka “afọ 120 gara aga,” akwụkwọ akụkọ a kwara arịrị, sị: “Ruo ọtụtụ afọ chọọchị megidere ịsụgharị akwụkwọ ndị dị nsọ gaa n’asụsụ dị mfe ọgụgụ. N’ịbụ nke jụworo ọtụtụ nsụgharị, chọọchị mesịrị nakwere otu n’ime ha na 1876, a bịakwara mara ya dị ka nsụgharị nzukọ ndị isi chọọchị. Otú ọ dị, e kweghị ka e webata ya n’ime chọọchị. Ruo taa, nanị Bible a nakweere n’ebe ahụ dị na Slavonic.”

Akwụkwọ akụkọ bụ́ Echo rụtụkwara aka n’abamuru nke ibipụta Bible Makarios, na-ekwu, sị: “Ndị ọkà mmụta ọnụ na-eru n’okwu sitere Mahadum St. Petersburg State, Mahadum Nkụzi nke Herzen, na Ebe Ndebe Ihe Ochie Steti Banyere Akụkọ Okpukpe jara mbipụta Bible ọhụrụ a mma nke ukwuu.” N’izo aka ná nsụgharị Makarios na Pavsky sụgharịrị Bible gaa na Russian n’ọkara mbụ nke narị afọ gara aga, akwụkwọ akụkọ ahụ rịbara ama, sị: “Ruo mgbe ahụ, na Russia a pụrụ ịgụ Bible nanị na Slavonic, bụ́ nke nanị ndị ụkọchukwu pụrụ ịghọta.”

A kọrọ banyere mwepụta Ndịàmà Jehova wepụtara Bible Makarios n’oge nzukọ ndị nta akụkọ e nwere na St. Petersburg ná mbido afọ a. Akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị dị n’ógbè ahụ bụ́ Nevskoye Vremya kọrọ, sị: “Ndị ọkà mmụta ọnụ na-eru n’okwu . . . mesiri ya ike na e kwesịrị ịtụle mbipụta ahụ dị ka eziokwu dị oké ịrịba ama ná ndụ ọdịbendị nke Russia na St. Petersburg. N’agbanyeghị ihe onye ọ bụla na-eche banyere ọrụ nke òtù okpukpe a, obi abụọ adịghị ya na mbipụta nke nsụgharị Bible a a na-amabughị bara oké uru.”

N’eziokwu, ndị nile hụrụ Chineke n’anya na-enwe obi ụtọ mgbe e nwere Okwu ya e dere ede n’asụsụ ndị nkịtị pụrụ ịgụ ma ghọta. Ndị hụrụ Bible n’anya n’ebe nile nwere obi ụtọ na e mewo ka ọtụtụ nde na-asụ Russian gburugburu ụwa nwee ike inweta nsụgharị Bible ọzọ.

[Foto]

A mara ọkwa mwepụta nke Bible Makarios ná nzukọ ndị nta akụkọ a

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọ́bá Akwụkwọ Obodo Russia ebe a chọtara akụ̀ ahụ zoro ezo

[Foto dị na peeji nke 23]

Peter Onye Ukwu gbalịrị ime ka e bipụta Bible na Russian

[Ebe E Si Nweta Foto]

Corbis-Bettmann

[Foto dị na peeji nke 24]

Gerasim Pavsky, onye tụnyere ụtụ ná nsụgharị nke Bible gaa na Russian

[Foto dị na peeji nke 25]

Makarios bụ́ osote bishọp, onye a kpọkwasịrị aha Bible Russian ọhụrụ ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya