Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/1 p. 21
  • “Ndị Gị Bụ Onyinye Afọ Ofufo”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ndị Gị Bụ Onyinye Afọ Ofufo”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwatakịrị Nwaanyị Nyeere Otu Dike Aka
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ọ Masịrị Ya Inyere Onye Ọzọ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • O Nupụrụ Isi ma Mechaa Mee Ihe A Gwara Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Otu Nwa Agbọghọ Nta Enyere Otu Dike Aka
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/1 p. 21

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

“Ndị Gị Bụ Onyinye Afọ Ofufo”

ONYE isi usuu ndị agha Siria dị ike bụ́ Neaman na-arịa ekpenta. Ọ bụrụ na a hapụ ya n’agwọghị ya, ọrịa a na-asọ oyi pụrụ ịkpata nkwarụ na ọnwụ. Gịnị ka Neaman ga-eme? N’ime ndị nọ n’ezinụlọ Neaman bụ otu nwa agbọghọ nta, ‘e si n’ala Israel dọta n’agha.’ O ji anya ike kwuo okwu ma kọwaa Elaịsha onye amụma dị ka onye pụrụ ịgwọ Neaman.—2 Ndị Eze 5:1-3.

N’ihi nguzo obi ike nke nwa agbọghọ nta a, Neaman chọtara Elaịsha, e wee gwọọ ya. Ọzọkwa, Neaman ghọrọ onye na-efe Jehova! Ahụmahụ a, nke e dekọrọ na Bible, weere ọnọdụ na narị afọ nke iri T.O.A. (2 Ndị Eze 5:4-15) Taa, ọtụtụ ndị ntorobịa na-egosi obi ike dị otú ahụ n’ikwuwa okwu maka ọdịmma Alaeze. Ahụmahụ na-esonụ nke si Mozambique na-akwado nke a.

Nuno dị afọ isii bụ onye nkwusa ozi ọma a na-emebeghị baptism. Ọbụna tupu ọ ghọọ onye nkwusa a na-emebeghị baptism, Nuno ga-akpọkọta ụmụaka nọ n’agbata obi ha, kpee ekpere, ma kụziere ha Bible, na-eji mbipụta bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible.

Ọtụtụ mgbe, Nuno na-eteta n’isi ụtụtụ Saturday ma chetara ezinụlọ ya, sị: “Taa anyị ga-eje ozi ubi.” Ịnụ ọkụ n’obi ya maka ozi ahụ na-apụta ìhè n’ụzọ ndị ọzọ. Ka ọ na-esonyere ndị mụrụ ya n’ozi okporo ámá na Maputo, Nuno na-ejekwurukarị ndị mmadụ nanị ya. N’otu oge dị otú ahụ, otu onye ọchụ ntá ego bịakwutere ya ma jụọ: “N’ihi gịnị ka i ji na-ere magazin ndị a ere?” Nuno sịrị: “M naghị ere magazin ndị a ere, kama m na-anabata ụtụ iji nye aka ịkwado ọrụ nkwusa ahụ.” Onye ọchụ ntá ego ahụ zaghachiri: “Ọ bụ ezie na enweghị m mmasị, àgwà gị na ikike gị masịrị m. M ga-achọ ịtụnye ụtụ n’ọrụ a.”

N’oge ọzọ, Nuno jekwuuru otu nwoke n’okporo ámá ma nyefee ya akwụkwọ bụ́ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya? Nwoke ahụ jụrụ, sị: “Ị́ dịghị eje ụlọ akwụkwọ ahụ dị ebe ahụ?” “Ee,” ka Nuno zaghachiri, “m na-eje ụlọ akwụkwọ ahụ, ma taa m na-ezi ozi dị mkpa si n’akwụkwọ a. Ọ na-egosi gị na ị pụrụ ịdị ndụ n’ụwa ọhụrụ nke Chineke ga-eweta, dị ka e gosiri n’ihe osise dị n’akwụkwọ a.” Nuno amaghị na nwoke ahụ ọ gwara okwu bụ onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ ya. Ọ bụghị nanị na onye nkụzi ahụ naara akwụkwọ ahụ kama ugbu a ọ na-anatakwa magazin Ụlọ Nche na Teta! mgbe nile site n’aka Nuno.

Mgbe a jụrụ Nuno ihe mere o ji enwe mmasị ịrụ ọrụ nkwusa ahụ, ọ sịrị: “Achọrọ m ịgwa ndị mmadụ okwu ma kụziere ha banyere Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst.” Ọ gbakwụnyere: “Ọ bụrụkwa na ndị mmadụ achọghị ige ntị, o nweghị ihe mere m ga-eji ewe iwe.”

Gburugburu ụwa, ọtụtụ puku ndị ntorobịa dị ka Nuno ‘na-enye onwe ha n’afọ ofufo’ ịkụzi na ikwusa banyere Alaeze Chineke. (Abụ Ọma 110:3) Ma nke a adịghị eme na mberede. A ga-akwụghachi ndị nne na nna ndị na-akụziri ụmụ ha banyere Jehova site n’oge ha bụ nwa ọhụrụ, na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ozi ahụ, na-achụsokwa ọdịmma Alaeze ụgwọ ọrụ n’ụba.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya