Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 6/15 p. 3-5
  • À Gaje Ibibi Mbara Ụwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Gaje Ibibi Mbara Ụwa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkọwa Doro Anya nke “Ụbọchị Mbibi”
  • A Gbanwee Ejizighị Ihe nke Mmadụ
  • A Pụrụ Ime Ya
  • Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide
    Teta!—2023
  • Mbara Ụwa Anyị Na-esighị Ike—Gịnị Banyere Ọdịnihu?
    Teta!—1996
  • Ọdachi Mbara Igwe Ọ̀ Ga-ebibi Ụwa Anyị?
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 6/15 p. 3-5

À Gaje Ibibi Mbara Ụwa?

ỌGWỤGWỤ narị afọ nke 20 na-eru nso, narị afọ nke 21 na-achọkwa ịmalite. N’ọnọdụ a, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-agaraghị aṅa ntị n’amụma mbibi dị iche iche na-eche ma ihe omume ụfọdụ ndị dị ịrịba ama na-eme ka ụwa mee mkpatụ ọ̀ pụrụ ịbịa n’ọdịnihu dị nso.

Ị pụrụ ịhụwo isiokwu dị iche iche ndị dị n’akwụkwọ akụkọ na magazin banyere nke a—ọbụna akwụkwọ n’ozuzu ya na-ekwu banyere isiokwu ahụ. Banyere ihe omume ndị narị afọ nke 21 ga-eji malite, anyị aghaghị ichere iji hụ. Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na iru ọgwụgwụ nke afọ 2000 bụ nanị otu afọ ka ọ ga-ewe (ma ọ bụ otu minit, site na 2000 gaa 2001), na o yikwara ka e nweghị oké ihe ga-esi na ya pụta. Ihe na-akasị echegbu ọtụtụ ndị bụ ọdịnihu dị ogologo nke mbara ala anyị.

Otu amụma nke na-agbatakarị n’uche n’ụbọchị ndị a bụ na n’otu oge—ma ọ̀ bụ n’ọdịnihu dị nso ma ọ̀ bụ n’ọdịnihu dị anya—a gaje ibibi mbara ụwa n’onwe ya kpam kpam. Tụlee nanị amụma ole na ole dị otú ahụ olileanya na-adịghị na ha.

N’akwụkwọ ya bụ́ The End of the World—The Science and Ethics of Human Extinction, bụ́ nke e bipụtara nke mbụ ya na 1996, onye na-ede akwụkwọ na ọkà ihe ọmụma bụ́ John Leslie na-ekwu ihe atọ pụrụ ime eme n’ihe banyere otú ndụ mmadụ n’elu ụwa pụrụ isi jedebe. Na mbụ ọ jụrụ, sị: “Agha nuklia eji ike nile lụọ ọ̀ pụrụ iweta njedebe nke agbụrụ mmadụ?” Mgbe ahụ ọ na-agbakwụnye, sị: “Ihe yikarịrị ka ọ ga-eme . . . ga-abụ mkpochapụ site ná mmetụta nke ụzarị ọkụ: ọrịa cancer, ike ịgwụ usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ nke na ọrịa ndị na-efe efe ga-ejupụta ebe nile, ma ọ bụ ọtụtụ nkwarụ site n’ọmụmụ. A pụkwara inwe ọnwụ nke ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ bụ́ ndị dị mkpa maka ọdịmma nke gburugburu ebe obibi.” Ihe nke atọ pụrụ ime eme nke Maazị Leslie kwupụtara bụ na comet ma ọ bụ mbara ụwa dị nta pụrụ ịkụta ụwa: “N’ihe banyere comet na mbara ụwa dị nta bụ́ ndị ịgba gburugburu ha dị n’ụdị nke na ha pụrụ ịkụta Ụwa otu ụbọchị, o yiri ka e nwere ihe dị ka puku abụọ dị n’agbata otu kilomita ruo kilomita iri n’obosara. A ka nwekwara ọnụ ọgụgụ ka nnọọ nta (ime atụmatụ ya ga-abụ nnọọ ịkọ nkọ) nke ndị ka ibu, na ọnụ ọgụgụ ka nnọọ ukwuu nke ndị ka nta.”

Nkọwa Doro Anya nke “Ụbọchị Mbibi”

Ma ọ bụ tụlee ọkà mmụta sayensị ọzọ, bụ́ Paul Davies, bụ́ prọfesọ na Mahadum Adelaide, Australia. Washington Times kọwara ya dị ka “onye na-ede akwụkwọ sayensị kasị mma n’ụwa nile.” N’afọ 1994 o dere akwụkwọ bụ́ The Last Three Minutes, bụ́ nke a kpọworo “nne nke akwụkwọ nile na-ekwu banyere ụbọchị mbibi.” A kpọrọ isiakwụkwọ mbụ nke akwụkwọ a “Ụbọchị Mbibi,” ọ na-akọwakwa otu ihe omume e chepụtara echepụta nke ihe pụrụ ime ma ọ bụrụ na otu comet ga-akụta mbara Ụwa. Gụọ akụkụ nkọwa ya na-awụ akpata oyi:

“Mbara ụwa ejiri ikike ruru nke ala ọma jijiji puku iri maa jijiji. Ntiwapụ nke oké ifufe na-efesi ike efefere n’elu ụwa, na-akwada ihe owuwu nile, na-akụpịasị ihe nile nọchiiri ya ụzọ. Ala dị larịị gburugburu ebe ahụ ihe mere afụlie ọtụtụ kilomita n’ịdị elu ịghọ ugwu dị gburugburu nke nkume ọkụ dị na ya na-asọpụta ka mmiri, na-ekpughe ime ime ala nke Ụwa n’olulu dị kilomita 150 n’obosara. . . . Ọtụtụ ihe e bibiri ebibi dị ntụ ntụ ekuba n’ikuku, na-ekpuchi anyanwụ na mbara ụwa dum. Ugbu a ijeri meteor ọjọọ, na-achasi ike n’ụzọ na-esighị ike anọchie anya ìhè anyanwụ, na-eji okpomọkụ ha na-ere ere ekpo ala ọkụ, ka ihe dapụrụ n’igwe na-adabanye n’ikuku.”

Prọfesọ Davies gara n’ihu ijikọta ihe omume a e chepụtara echepụta n’amụma ahụ bụ́ na comet Swift-Tuttle ga-akụta ụwa. Ọ na-agbakwụnye ịdọ aka ná ntị na ọ bụ ezie na ihe omume dị otú ahụ nwere ike ọ gaghị eme n’ọdịnihu dị nso, n’echiche ya “n’oge na-adịghị anya Swift-Tuttle ma ọ bụ ihe yiri ya, ga-akụta Ụwa.” Nkwubi okwu ya dabeere n’atụmatụ na-enye echiche na ihe ndị dị 10,000 nke dị ọkara kilomita ma ọ bụ karịa n’obosara na-aga n’usoro ngagharị nke na-agba Ụwa gburugburu.

Ì kwere na atụmanya dị otú ahụ na-emenye egwu bụ eziokwu? Ọnụ ọgụgụ dị ịtụnanya nke ụmụ mmadụ kwere. Kama ha na-enuchapụ nchegbu ọ bụla n’akụkụ site n’imesi onwe ha obi ike na ọ gaghị eme n’oge ha. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka a ga-ejidị bibie mbara Ụwa—ma ọ bụ n’oge na-adịghị anya ma ọ bụ n’ọtụtụ puku afọ site ugbu a? N’ezie, ọ bụghị ụwa n’onwe ya bụ isi iyi nke nsogbu nye ndị bi na ya, mmadụ ma ọ bụ anụmanụ. Kama nke ahụ, ọ́ bụghị mmadụ n’onwe ya kpatara ihe ka ọtụtụ ná nsogbu ndị nke narị afọ nke 20 a, gụnyere ikwe omume nke ‘imebi ụwa’ kpam kpam?—Mkpughe 11:18.

A Gbanwee Ejizighị Ihe nke Mmadụ

Gịnị banyere ihe ahụ yikarịrị ka ọ ga-eme eme bụ́ na mmadụ n’onwe ya pụrụ ibibi ma ọ bụ mebie ụwa kpam kpam site n’ejizighị ihe na anyaukwu ya? O doro anya na mbibi dị ukwuu nke akụkụ ụwa dị iche iche ewereworị ọnọdụ site ná mgbukpọsị oké ọhịa nke gabigara ókè, mmetọ a na-achịkwaghị achịkwa nke ikuku, na mmebi ọwa mmiri. Ndị na-ede akwụkwọ bụ́ Barbara Ward na René Dubos chịkọtara nke a nke ọma n’ihe dị ka afọ 25 gara aga n’akwụkwọ ha bụ́ Only One Earth: “Akụkụ atọ sara mbara nke mmetọ anyị na-aghaghị inyocha—ikuku, mmiri, na ala—n’ezie na-emejupụta isi ihe atọ ndị dị mkpa maka ndụ anyị n’elu ụwa.” Ọnọdụ ahụ agbanwebeghịkwa n’ụzọ bụ́ isi ịka mma eri mgbe ahụ, ọ̀ gbanweela?

Mgbe a na-atụle ikwe omume nke mmadụ imebi ma ọ bụ ibibi ụwa site n’amaghị ihe ya, anyị pụrụ inwe obi ike site n’ịtụle ike magburu onwe ya nke mbara Ụwa nwere ịlaghachi n’ọnọdụ mbụ ya na idochi onwe ya. N’ịkọwa ike nke nlaghachị a dị ịtụnanya, René Dubos kwuru okwu ndị a na-agba ume n’akwụkwọ ọzọ, bụ́ The Resilience of Ecosystems:

“Ọtụtụ ndị na-atụ egwu na ihe ọmụma banyere mmetọ nke gburugburu ebe obibi bịara nnọọ n’azụ oge n’ihi na a pụghị imezi ihe dị ukwu ná mmebi ndị e meworo n’usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha. N’echiche m, enweghị nchekwube a enweghị isi n’ihi na usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha nwere ike dị ukwuu nke inwetaghachi onwe ha site n’oké mbibi.

“Usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha nwere ọtụtụ usoro maka ịgwọ onwe ya. . . . Ha na-eme ka usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha nwee ike imeri mmetụta nke mmekpa ahụ nanị site n’iji ụzọ na-agawanye n’ihu na-eguzobeghachi ọnọdụ mbụ nke gburugburu ebe obibi.”

A Pụrụ Ime Ya

Otu ihe atụ pụtara ìhè banyere nke a n’afọ ndị na-adịbeghị anya bụ mkpocha e mere nke nta nke nta n’osimiri London a ma ama bụ́ Thames. Akwụkwọ bụ́ The Thames Transformed, nke Jeffery Harrison na Peter Grant dere, na-edekọ ihe ndị a dị ịrịba ama a rụzuru nke na-egosi ihe ndị a pụrụ ime mgbe ụmụ mmadụ rụkọrọ ọrụ ọnụ maka ọdịmma ọha. Eze nke Edinburgh nke Britain dere n’okwu mmalite ya n’akwụkwọ ahụ, sị: “Nke a bụ n’ikpeazụ akụkọ ọma n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ọkpụrụkpụ otú a nke na o kwesịrị ka e bipụta ya n’agbanyeghị na ọ pụrụ ịkpali ụfọdụ ndị iwere ya na nsogbu ndị e nwere n’ichekwa ihe esighị ike n’ezie dị ka e mere ka ha kwere. . . . Ha nile pụrụ inwe obi ike site n’ihe a rụzuru na Thames. Akụkọ ọma ya bụ na a pụrụ ime ya, na atụmatụ ha pụkwara ịga nke ọma.”

N’ime isiakwụkwọ bụ́ “Oké Mkpocha Ahụ,” Harrison na Grant ji ịnụ ọkụ n’obi dee banyere ihe a rụzuworo n’afọ 50 gara aga, sị: “Na nke mbụ ya n’ụwa, e weghachiwo osimiri e metọworo emetọ na nke ụlọ ọrụ mmepụta ihe jiworo mee ihe n’ụzọ dị njọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke na nnụnụ mmiri na azụ̀ alọghachiwo n’ụba. Na mgbanwe dị otú ahụ emewo nnọọ ngwa ngwa, n’ọnọdụ yiri na mbụ ka ihe olileanya na-adịghị na ya, na-enye ọbụna onye kwenyere ná nchekwa anụ ọhịa nke kasị ghara inwe nchekwube agbamume.”

Mgbe ahụ ha kọwara mgbanwe ahụ: “Ọnọdụ osimiri ahụ nọgidere na-ajọwanye njọ n’ime afọ ndị gaworo aga na-enwe, ma e leghị anya, ọdachi ikpeazụ ya n’oge Agha Ụwa nke Abụọ mgbe e mebiri ma ọ bụ bibie oghere ndị bụ́ isi mmiri nsị si agbapụ. N’afọ ndị 1940 na 1950 ọdịdị nke Thames dị oké njọ. Osimiri ahụ ji nanị ihe dị nta kara olulu mmiri nsị e ghewere oghe mma; mmiri ahụ dị oji, o nweghị ikuku oxygen, n’ọnwa nke oge okpomọkụ kwa, a na-anụ ísí ọjọọ sitere na Thames n’ebe dị anya. . . . E mesịala chụpụ ụbara azụ̀ ndị nọbu n’ebe ahụ, e wezụga azụ̀ agwọ ole na ole ndị nwere ike ịdị ndụ n’ihi ikike ha ikuru ume kpọmkwem site n’elu ala. Ọnụ ọgụgụ nnụnụ ndị dị na mbara akụkụ osimiri a ụlọ jupụtara n’agbata London na Woolwich fọrọ nanị ọbọgwụ ọhịa na ụgbala bekee ole na ole, ịdị ndụ ha dabekwaara n’ihe ndị si n’ebe a na-adọsa ọka n’akụkụ mmiri kama ịbụ ihe oriri ndị sitere n’okike. . . . Ònye gaara ekweta mgbe ahụ na a ga-enwe mgbanwe dị ịrịba ama nke gaje iwere ọnọdụ? N’ime afọ iri, a gaje ịgbanwe otu mbara osimiri ndị ahụ site n’ịbụ nnọọ ebe nnụnụ na-adịghị gaa n’ịbụ ebe ọtụtụ ụdị nnụnụ mmiri dị iche iche na-agbaga, gụnyere ụbara ọ̀kwà ruru 10,000 ndị bịara maka oge oyi na nnụnụ mmiri 12,000.”

N’ezie, nke ahụ na-akọwa nanị otu mgbanwe mere n’otu akụkụ dị nta nke ụwa. Otú o sina dị, anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ihe atụ a. Ọ na-egosi na ọ dịghị mkpa iwere mbara Ụwa n’ihe a gaje ibibi n’ihi ejizighị ihe, anyaukwu, na echeghị echiche nke mmadụ. Mmụta ziri ezi na mgbalị a gbakọrọ aka mee maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ inyere ụwa aka ịgbanwe ọbụna mmebi ndị dị ukwuu ná njikọ nke ihe ndị dị ndụ na ebe obibi ha, gburugburu ebe obibi, na elu ala. Ma gịnị banyere mbibi nke pụrụ ịbịa site n’ike okike ndị ọzọ, dị ka comet na mbara ụwa dị nta hiere ụzọ?

Isiokwu na-esonụ nwere isi ihe dị n’inweta aziza na-eju afọ nye ajụjụ dị otú a na-agbagwoju anya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Mmụta na mgbalị a gbakọrọ aka mee pụrụ inyere ụwa aka ịgbanwe ọbụna mbibi dị ukwuu ndị e mere ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya