Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
‘N’ọmà Ahịa Kwa Ụbọchị’
PỌL onyeozi jiri ohere ọ bụla gbasaa ozi Alaeze ahụ. Iji chọpụta ndị kwesịrịnụ, ọ ‘gwara ndị Juu n’ụlọ nzukọ nakwa ndị ọ na-ezute n’ọmà ahịa kwa ụbọchị okwu.’—Ọrụ 17:17.
Ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ abụrụwo ihe e ji mara ndị na-efe Jehova ezi ofufe kemgbe narị afọ mbụ O.A. (Matiu 28:19, 20) Taa, Ndịàmà Jehova n’otu aka ahụ na-eji ụzọ dị iche iche eme ihe ka ha na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-enyere ndị nwere obi eziokwu aka inwe ezi ihe ọmụma nke eziokwu. (1 Timoti 2:3, 4) Ahụmahụ na-esonụ nke sitere n’Australia na-egosi nke a.
Ụbọchị ise kwa izu, Sid na Harold na-eme onye nọtụ ibe ya anọọ n’ilekọta otu ntakịrị ebe a kwasara akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’akụkụ ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị na Sydney. Ha anọwo na-ekerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụzọ dị otú a ruo ihe dị ka afọ ise ugbu a. Sid, bụ́ onye dị afọ 95 ugbu a, na-akọwa, sị: “Mgbe m gbara afọ 87, enwekwaghị m ike ịkwọ ụgbọala ọzọ. Nke ahụ wutere m n’ihi na ọrụ ịgba àmà ihu ọha tọrọ m ụtọ. Otu ụbọchị mgbe m nọ nso otu ebe ndị na-eme njem nleta na-abịakarị nke a na-akpọ Echo Point dị na Katoomba, ahụrụ m otu onye na-ese ihe ka ọ na-ere ihe osise nke ala mara mma. M leruru ihe osise ahụ anya ma chee n’obi m, ‘Enwere m foto ndị ka nke ahụ mma n’akpa m ji na-agba àmà—n’ọnụ ego kakwa nta!’ Ya mere ekpebiri m ịhazi ebe nkwasa ihe dị nta, guzobe ya ebe ndị mmadụ ga na-abịakarị, ma na-eche n’ihu ndị na-agafenụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible nwere ihe osise ndị mara mma bụ́ nke ndị Ndịàmà Jehova na-ekesa.
“Afọ anọ gara aga, akwagara m ebe nkwasa ihe ahụ na Sydney, Harold sonyekwaara m. Anyị na-eme onye nọtụ ibe ya anọọ n’ilekọta ebe nkwasa ihe ahụ na isoro ọgbakọ anyị na-arụ ọrụ.” Harold, bụ́ onye dị afọ 83 ugbu a, na-asị: “Site na Monday ruo Friday nanị mmadụ ole na ole na-anọ n’ụlọ. Ya mere ikerịta ozi Alaeze ahụ n’ụzọ dị otú a na-akpọga anyị n’ebe ndị mmadụ nọ. Dị ka o kwesịrị, anyị na-arụpụta ihe ndị ka mma. Akwụkwọ ndị anyị na-etinye pụtara nnọọ ìhè maka mba a.”
“Ọ bụ ezie na anyị eguzobewo onwe anyị n’ebe anọ ma ọ bụ ise dị iche iche n’afọ ndị a,” ka Sid na-ekwu, “o teghị anya a mara anyị. Ndị ụfọdụ na-abịakwute anyị maka akwụkwọ. Ndị ọzọ na-enwe ajụjụ ndị ha chọrọ ka a zaa. Ụfọdụ na-achọkwa nanị ikwu okwu minit ole na ole. Ọ bụ nanị n’oge a ka ndị nletaghachi m na-abịakwute m,” ka o ji ọchị kwuo.
“Ọtụtụ ndị mmadụ nwere mmasị na Bible n’ezie,” ka Harold na-agbakwụnye. “N’otu ọnwa mmadụ anọ malitere isoro Ndịàmà na-amụ Bible n’ihi akwụkwọ ndị ha natara anyị nakwa n’ihi ajụjụ ndị anyị nwere ike ịza site na Bible. Ahụmahụ ndị yiri nke ahụ na-agba anyị ume nke ukwuu.”
Dị ka Sid na Harold—dịkwa ka Pọl onyeozi—Ndịàmà Jehova n’ebe nile na-eji ụzọ ọ bụla kwere omume agbasa ozi ha dị mkpa. N’ụzọ dị otú a, a na-anọgide na-ekwusa ‘ozi ọma ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi.’—Matiu 24:14.