Jiri Akwụkwọ Anyị Ndị Dabeere na Bible Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya
1, 2. Olee otú ọtụtụ mmadụ si were akwụkwọ anyị, oleekwa ajụjụ nke a na-eme ka a jụọ?
1 “Anọwo m na-agụ akwụkwọ unu kemgbe afọ 1965. Bible m na-anọ nso mgbe m na-agụ ya, ihe nile dị n’akwụkwọ unu na-ekwekọkwa n’ihe dị na Bible. Ọ dịla anya m nọ na-achọ ịmata ihe bụ́ nnọọ eziokwu banyere Chineke na Jizọs, apụkwara m ikwu n’ezie na m na-achọta azịza bụ́ eziokwu n’akwụkwọ unu nakwa na Bible.” Nke a bụ ihe otu nwoke degaara isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova. N’otu akwụkwọ ozi ahụ, ọ rịọrọ ka e duziere ya ọmụmụ Bible.
2 Dị ka nwoke ahụ nwere obi ekele, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile na-enwe ekele maka akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta. (Mat. 24:45) Kwa afọ, a na-ebipụta imirikiti akwụkwọ iji nyere ndị nwere obi eziokwu aka ‘ịbịaru ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’ (1 Tim. 2:4) Olee otú anyị pụrụ isi jiri akwụkwọ anyị ndị a dabeere na Bible na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya?
3. Olee otú anyị pụrụ isi zere ịla akwụkwọ anyị n’iyi?
3 Zere Ịla Ha n’Iyi: N’ime ọtụtụ afọ anyị nọworo na-enweta akwụkwọ anyị, anyị pụrụ inwe ya ole karịrị ihe anyị ga-eji eme ihe. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji zere ịla akwụkwọ anyị ndị a bara uru n’iyi? Ọ dị mkpa iji nghọta eme ihe mgbe anyị na-anata akwụkwọ ndị anyị ga-eji jee ozi. Kama ikpokọta ọtụtụ akwụkwọ ndị anyị ga-eji jee ozi, anyị pụrụ iwere nanị otu ma ọ bụ abụọ ma lọghachi were ọzọ mgbe anyị nyefesịrị ndị nke ahụ. Nke a ga-egbochi akwụkwọ anyị ijupụta n’ụlọ anyị. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị nwere ọtụtụ magazin ndị anyị na-enyefebeghị, ọ ga-adị mma ka anyị belata ọnụ ọgụgụ magazin ndị anyị na-anata.
4. Gịnị ka a pụrụ ime ma ọ bụrụ na ọgbakọ nwejuru akwụkwọ enweju?
4 Akwụkwọ Ndị Ọgbakọ Nwejuru Enweju: Ọ bụrụ na ọgbakọ nwejuru akwụkwọ ụfọdụ enweju, onye nlekọta akwụkwọ pụrụ ịchọpụta ma ọgbakọ ndị nọ ha gburugburu hà pụrụ iji akwụkwọ ndị ahụ mee ihe. Ndị nkwusa pụrụ inyefe akwụkwọ anyị ndị merela ochie n’aka ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndịàmà, ndị ha na-eduziri ọmụmụ Bible, nakwa ndị ọzọ. Ọ pụrụ ịmasị ndị ka batara ọhụrụ n’ọgbakọ inweta akwụkwọ ndị a metụrụla ochie iji debe ha n’ebe ha na-edebe akwụkwọ ha ndị dabeere na Bible.
5. Olee otú anyị pụrụ isi gosi ekele maka akwụkwọ anyị?
5 Anyị chọrọ ka akwụkwọ anyị na-emezu nzube e ji bipụta ya, nke bụ́ inyere ndị nwere obi eziokwu aka ịmụtakwu banyere nzube ndị dị ebube nke Jehova. Dị nnọọ ka Jizọs na-alaghị nri fọdụrụnụ n’iyi mgbe o nyesịrị ìgwè mmadụ nri, ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị ịbụ iji akwụkwọ anyị ndị dabeere na Bible na-eme ihe n’ụzọ kasị mma. (Jọn 6:11-13) Ozi na-azọpụta ndụ nke dị n’ime akwụkwọ anyị apụghị imetụ ndị na-achọ ime ihe ziri ezi n’obi ma ọ bụrụ na akwụkwọ ndị ahụ anọgide n’ebe anyị na-edebe akwụkwọ ma ọ bụ n’akpa ozi ọma anyị. N’ihi ya, anyị aghaghị iji ezi uche eme ihe mgbe anyị na-anara akwụkwọ anyị ji eje ozi ma jiri ha na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya ka o wee baara ndị ọzọ uru.—Fil. 4:5.