Inyefe Akwụkwọ n’Ókèala A Na-asụ Ọtụtụ Asụsụ
1. N’ihi gịnị ka o ji dị ọtụtụ ọgbakọ mkpa inwe akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ ala ọzọ?
1 N’ọtụtụ ebe, ubi ahụ amalitewo ịgụnye mmadụ ndị si n’ala ndị ọzọ. Ọtụtụ n’ime ha na-amụta ihe ngwa ngwa ma na-aghọta ihe nke ọma mgbe e ji asụsụ ala ha na-akụziri ha ihe. Olee ndokwa ndị e mere iji na-enye ndị nwere mmasị akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’asụsụ ndị ha kasị aghọta?
2. Nkwekọrịta dị aṅaa ka a chọrọ mgbe ọgbakọ abụọ ma ọ bụ karị, bụ́ ndị ji asụsụ dịgasị iche eme ihe, na-arụ ọrụ n’otu ókèala?
2 Mgbe E Kwesịrị Inyefe Akwụkwọ: Mgbe ọgbakọ abụọ ma ọ bụ karị, bụ́ ndị ji asụsụ dịgasị iche eme ihe, na-eje ozi n’otu ókèala, òtù ndị okenye ha ga-eso ndị nlekọta ije ozi nke ọgbakọ ndị ahụ rụkọọ ọrụ n’iguzobe usoro ha nile ga-anakwere ka e wee gbaara ìgwè asụsụ nke ọ bụla àmà n’ụzọ zuru ezu. Mgbe ndị nkwusa na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha agaghị na-enyefe akwụkwọ n’asụsụ ọgbakọ ndị nke ọzọ ji eme ihe, dị ka ha na-eme. Otú ọ dị, mgbe ndị nkwusa na-agba àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi ma ọ bụ n’ebe ọha na eze na-anọ, ha pụrụ inyefe akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ ndị a na-asụ n’ógbè ahụ.
3. Olee mgbe ọgbakọ ga-edebe akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ ala ọzọ?
3 Mgbe E Kwesịrị Idebe Akwụkwọ: Gịnị ka a pụrụ ime ma ọ bụrụ na ndị na-asụ asụsụ ala ọzọ butụrụ ibu n’otu ógbè ma e nweghị ọgbakọ ji asụsụ ahụ eme ihe? N’ọnọdụ ndị ahụ, ọgbakọ pụrụ idebe akwụkwọ ole na ole ndị bụ́ isi e nwere n’asụsụ ahụ, dị ka traktị, broshuọ Na-achọ, Ụzọ Na-eduba ná Ndụ, na Enyi Chineke, nakwa akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ndị nkwusa pụrụ inyefe akwụkwọ ndị a mgbe ọ bụla ha zutere ndị pụrụ ịgụ ihe n’asụsụ ahụ.
4. Olee otú a pụrụ isi nweta akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ ndị na-abụghị ndị ọgbakọ na-enwe akwụkwọ na ha?
4 Ụzọ Isi Tụọ Ọda Akwụkwọ: Ọ bụrụ na ọgbakọ adịghị edebe akwụkwọ n’asụsụ onye nwere mmasị na-agụtali, olee otú a pụrụ isi nweta akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ ahụ? Onye nkwusa ahụ kwesịrị ịgakwuru ohu na-ahụ maka akwụkwọ iji chọpụta akwụkwọ ndị e nwere n’asụsụ ahụ ka e wee nwee ike ịtụ ọda akwụkwọ ndị ahụ a chọrọ mgbe ọzọ ọgbakọ ga-atụ ọda akwụkwọ.
5. Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ anyị n’ime ka ndị mmadụ na-enweta akwụkwọ Ndị Kraịst?
5 Ka anyị jiri akwụkwọ Ndị Kraịst na-eme ihe n’ụzọ dị mma iji nyere “ụdị mmadụ nile” aka, n’agbanyeghị asụsụ ha, ‘ịbịaru ezi ihe ọmụma nke eziokwu ma bụrụ ndị a zọpụtara.’—1 Tim. 2:3, 4.