Jiri Akwụkwọ Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe
1 Ụzọ a haziri ahazi anyị si eji akwụkwọ anyị eme ihe malitere site ná nkesa 6,000 nke mbipụta Ụlọ Nche nke July 1, 1879. Kemgbe ahụ, e bipụtawo ma kesaa ụdị akwụkwọ dị iche iche n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu.
2 Ndokwa Inye Nani Onyinye: Na December 1999, a kọwara na a ga na-enye ndị nkwusa na ndị nwere mmasị akwụkwọ na magazin nanị site n’ịnata ha onyinye, ya bụ, n’ekwughị ma ọ bụ tụọ aro ka e weta ụtụ a kapịrị ọnụ tupu ha anata akwụkwọ. Mgbe e nyefere akwụkwọ, a ga-anakwere onyinye afọ ofufo iji kwado ọrụ zuru ụwa ọnụ nke ikwusa ozi ọma. Anyị nwere okwukwe na Jehova ga-agọzi ndokwa a.—Tụlee Matiu 6:33.
3 Ime Ihe Banyere Ọnọdụ Ndị A Na-ezute n’Ubi: Anyị ga-anọgide na-eji okwu mmeghe a kwadebere nke ọma na-eme ihe iji kpalie mmasị. Ebe a na-egosighị mmasị ọ bụla, ọ dịghị mkpa inyefe akwụkwọ. Anyị achọghị imefusị akwụkwọ anyị emefusị site n’inye ha ndị na-enweghị mmasị. N’aka nke ọzọ, a pụrụ inyefe ya ebe e gosiri mmasị, onye nwe ụlọ ekwetakwa ịgụ akwụkwọ ahụ. Anyị chọrọ iji akwụkwọ anyị mee ihe n’ụzọ amamihe.
4 Ị pụrụ ikwu ihe ndị na-esonụ mgbe i gosichara mmadụ akwụkwọ: “Ọ ga-amasị m ịhapụrụ gị akwụkwọ a ma ọ bụrụ na ị ga-achọ ịgụ ya.” O yiri ka onye nwe ụlọ ọ̀ ga-ajụ gị, sị: “Ego ole ka ọ bụ?” Ị pụrụ ịza ya, sị: “Anyị adịghị arụ ọrụ azụmahịa. Anyị adịghị ere akwụkwọ a ere. A na-arụ ọrụ a anyị na-arụ n’ógbè unu taa n’afọ ofufo n’ala 234 gburugburu ụwa iji nyere ndị mmadụ aka ịmata ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inye onyinye maka ọrụ a, obi ga-adị m ụtọ ịnata ya.”
5 Mgbe ị na-enyefe magazin, ị pụrụ iwelite ajụjụ metụtara otu isiokwu kpọmkwem ma kwuo, sị: “Ọ ga-amasị m ka ị rịba ihe ndị a kọwara n’isiokwu a ama. Ọ ga-amasị m ịhapụrụ gị magazin abụọ a ma ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịgụ ha.” Ọ bụrụ na ọ natara ha, ị pụrụ ịgbakwụnye, sị: “Obi dị m ụtọ na m pụrụ ime ka i nweta ihe ọmụma a. Echere m na ị ga-ahụ na isiokwu a nwere ihe mmụta n’ezie. N’ezie, ọ ga-amasị m ịlaghachite n’izu ọzọ iji mata ihe bụ echiche gị. Ị ga-achọpụta na a na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ 132 ma na-ekesa ihe karịrị 22,000,000 n’ime ya gburugburu ụwa. E ji onyinye afọ ofufo na-akwado ọrụ a nile. Ọ bụrụ na gị onwe gị kwa ga-achọ inye ntakịrị onyinye maka ọrụ izi ihe a, obi ga-adị anyị ụtọ ịnata ya.”
6 Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isi ike ikwu okwu banyere onyinye maka ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ. Dị ka ihe atụ, onye nwe ụlọ bụ́ onye nwere mmasị pụrụ ịjụ, sị: “Ùnu na-enye ya n’efu?” Anyị pụrụ ịza, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịgụ akwụkwọ a, ọ bụrụkwa na ị ga-achọ iwere ya, were ya. Ọ ga-amasị m ịbịa n’izu ọzọ iji kwurịta ihe anyị kparịtara na ịkọkwuru gị banyere ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ.” Ná nleta ndị ọzọ ị ga-eme, ị pụrụ ime ka onye ahụ nwe ụlọ mata otú e si enweta ego e ji akwado ọrụ anyị.
7 Ma ọ bụ, onye nwe ụlọ pụrụ ịnara akwụkwọ ahụ ozugbo ma sị, “I meela.” Ị pụrụ ịza, sị: “Ndewo. Ama m na ọ ga-amasị gị. Ọtụtụ ndị na-eche otú e si enweta ego e ji akwado ọrụ a, ebe ọ bụ na anyị na-arụ ya n’ụwa nile. Ọtụtụ ndị natara akwụkwọ anyị egosiwo ekele maka ihe ha ga-amụta n’ime ya ma jiri obi ha nye ntakịrị onyinye iji mee ka o kwe omume ịdị na-ekesakwu ya. Ọ bụrụ na ndị mmadụ emee otú ahụ, ọ na-amasị anyị ịnata ya.”
8 È Nwere Ezi Mmasị? N’ụzọ doro anya ọ bụghị nzube anyị ikesa akwụkwọ anyị aghara aghara. Anyị chọrọ ka akwụkwọ anyị mezuo nzube e ji bie ya, ya bụ, inyere ndị nwere mmasị aka ịmụtakwu banyere nzube ndị dị ebube nke Jehova. Ọ pụrụ ịbụ imefusị ihe ịhapụrụ ndị na-ejighi ihe ime mmụọ kpọrọ ihe akwụkwọ anyị. (Hib. 12:16) Ikesa akwụkwọ anyị n’ụzọ na-arụpụta ihe dabeere n’ikike i nwere ịchọpụta ezi mmasị. Olee otú a pụrụ isi gosi ụdị mmasị ahụ? Ịdị njikere iji obiọma soro gị kparịta ụka bụ ezi ihe àmà. Ma ọ bụ ịṅa ntị mgbe ị na-ekwu okwu, ịza ajụjụ, na ikwupụta echiche ya pụrụ igosi na ọ na-esonye ná nkwurịta okwu ahụ. Ịgwa gị okwu n’ụzọ nkwanye ùgwù, na dị ka onye agbata obi na-egosi àgwà obiọma. Isonye ka ị na-agụ Bible na-egosi nkwanye ùgwù maka Okwu Chineke. Ọtụtụ mgbe, ọ na-enye aka ịjụ ha ma ha ga-agụ akwụkwọ ahụ a na-enye ha. Ị pụkwara ịtụ aro ịbịa nletaghachi iji gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ. Nzaghachi dị mma bụkwa ihe àmà ọzọ na-egosi mmasị ha nwere. Mgbe ị hụrụ ihe àmà ndị ahụ na-egosi ezi mmasị, o yiri ka onye ahụ ọ ga-eji akwụkwọ ọ bụla ọ natara mee ihe n’ụzọ dị mma.
9 Mgbanwe a e mere n’ụzọ a anyị sị arụ ọrụ anyị na-enyekwu ihe àmà na “anyị abụghị ndị na-ere okwu Chineke.” (2 Kọr. 2:17, NW) Ọ na-egosikwa na anyị dị iche n’ụwa.—Jọn 17:14.
10 Ka mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ na-abịaru nso, e nwere nrụgide na-arị elu megide òtù okpukpe nile. Isi ihe na-echegbu anyị bụ ka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ dị mkpa nke zuru ụwa ọnụ nọgide na-aga n’ihu n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla, na-eme ka ọtụtụ ndị ọzọ nwee ike inweta nzọpụta.—Mat. 24:14; Rom 10:13, 14.