Igbe Ajụjụ
◼ Gịnị ga-enyere anyị aka ịma ma ànyị ga-enye mmadụ akwụkwọ anyị?
Ihe ga-akacha enyere anyị aka bụ ịchọpụta ma onye ahụ ò nwere mmasị n’ozi anyị. Ọ bụrụ na o nwere ezigbo mmasị, anyị nwere ike nye ya magazin abụọ. Anyị nwekwara ike nye ya otu broshuọ ma ọ bụ otu akwụkwọ ma ọ bụkwanụ akwụkwọ anyị na-enye ndị mmadụ n’ọnwa ahụ. Anyị ga-enye ya ya a sịgodị na o nweghị ego ọ ga-eji enye onyinye iji kwadoo ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile. (Job 34:19; Mkpu. 22:17) Ma, anyị ekwesịghị iwere akwụkwọ anyị nye onye na-ejighị ya kpọrọ ihe n’ihi na ha bara ezigbo uru.—Mat. 7:6.
Olee otú anyị ga-esi ama ma mmadụ ò nwere mmasị n’ozi anyị? Otu ụzọ bụ ma onye ahụ kwere ka anyị zie ya ozi ọma. Ihe ọzọ bụ ma o gewe ntị n’ihe anyị na-ekwu, na-aza ajụjụ ndị anyị na-ajụ ya, ma na-ekwu otú ọ dị ya n’obi. Ọ bụrụkwa na ọ na-ege ntị mgbe anyị na-agụrụ ya Baịbụl, o gosiri na o ji Okwu Chineke kpọrọ ihe. Ọ na-adịkwa mma ịjụ onye ahụ ma ọ̀ ga-agụ akwụkwọ ahụ anyị chọrọ inye ya. Ndị nkwusa kwesịrị ịsa anya ná mmiri chọpụta ma mmadụ ò nwere mmasị n’ozi ọma anyị tupu ha enyewe ya akwụkwọ anyị. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-agba àmà n’okporo ámá, ọ gaghị adị mma inye onye ọ bụla na-agafe magazin, broshuọ, ma ọ bụ akwụkwọ anyị. Ọ bụrụ na o doghị anyị anya ma onye ahụ ò nwere mmasị, ọ ga-aka mma inye ya akwụkwọ anyị ji akpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa ọmụmụ ihe anyị ma ọ bụkwanụ anyị enye ya traktị.
Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụ akwụkwọ ole onye nkwusa chọrọ iji gaa ozi ọma ga-ekpebi ole ọ ga-ewere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ bụghị ego ole o nyere n’onyinye. Anyị anaghị enye onyinye iji kwụọ ụgwọ akwụkwọ anyị weere, kama, ọ bụ iji kwadoo ihe niile gbasara ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa dum. N’agbanyeghị otú akpa anyị hà, obi ụtọ anyị nwere maka ọrụ ikwusa ozi ọma nzukọ a na-arụ n’ụwa niile ga-eme ka anyị na-enye onyinye otú ike anyị hà iji kwadoo ya. (Mak 12:41-44; 2 Kọr. 9:7) Obi ụtọ a anyị nwere ga-emekwa ka anyị na-ewere naanị akwụkwọ ndị dị anyị mkpa, ghara ịna-emefusị ego ndị mmadụ nyere n’onyinye bụ́ nke e si na ya bipụta akwụkwọ ndị ahụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 2]
Ndị nkwusa kwesịrị ịsa anya ná mmiri chọpụta ma mmadụ ò nwere mmasị n’ozi ọma anyị tupu ha enyewe ya akwụkwọ anyị