À Ga-enwerịrị Ikpe Na-ezighị Ezi?
“N’agbanyeghị ihe nile m ka kweere na ndị mmadụ dị mma n’obi n’ezie. Apụghị m nnọọ iwukwasị olileanya m na ntọala nke ọgba aghara, nhụsianya, na ọnwụ mejupụtara.”—Anne Frank.
ANNE FRANK, otu nwa agbọghọ onye Juu nke dị afọ 15, dere okwu ndị ahụ na-emetụ n’obi n’akwụkwọ ndetu ihe ya n’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya. Ruo ihe karịrị afọ abụọ, ezinụlọ ya bụ ndị e zoro n’ime uko ụlọ n’Amsterdam. E bibiri olileanya ya nke ụwa ka mma mgbe otu onye mgbaàmà gwara ndị Nazi ebe ha zoro. N’afọ sochirinụ, bụ́ 1945, Anne nwụrụ n’oké ịba ahụ ọkụ n’ogige ịta ahụhụ Bergen-Belsen. Nde ndị Juu isii ndị ọzọ nwụrụ ụdị ọnwụ yiri nke ahụ.
Atụmatụ ọjọọ nke Hitler igbuchapụ otu ndị pụrụ ịbụ ihe atụ kasị njọ nke ikpe na-ezighị ezi nke agbụrụ bụ́ nke narị afọ anyị hụworo, ma ọ bụghị nanị ya. Na 1994 e gbuchapụrụ ihe karịrị ọkara nde ndị Tutsi na Rwanda, nanị n’ihi na ha sitere n’ebo dị “iche.” Mgbe agha ụwa nke mbụ na-agakwa n’ihu, ihe dị ka otu nde ndị Armenia nwụrụ ná mgbukpọ nke agbụrụ.
Ụdị Ikpe Na-ezighị Ezi Ndị Na-akpata Nhụjuanya
Mgbukpọ nke agbụrụ abụghị nanị ụdị ikpe na-ezighị ezi e nwere. Ikpe na-ezighị ezi ná mmekọrịta ọha mmadụ na-etinye ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ ise nke agbụrụ mmadụ n’ịbụ ogbenye ọnụ ntụ n’ogologo ndụ ha nile. Nke ka njọ, òtù na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ bụ́ Òtù Mba Nile Na-emegide Ịgba Ohu na-agụkọ na ihe karịrị mmadụ 200,000,000 nọ n’agbụ. Ọ pụrụ ịbụ na e nwere ọtụtụ ndị ohu n’ụwa taa karịa n’oge ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme. Ọ pụrụ ịbụ na e reghị ha n’ahịa, ma ọnọdụ ịrụ ọrụ ha ka nke ọtụtụ ndị gbara ohu n’oge ndị gara aga njọ mgbe mgbe.
Ikpe na-ezighị ezi nke iwu kwadoro na-anapụ ọtụtụ nde ihe ndị bụ́ isi ruuru ha. “A na-arụ arụrụala ndị metụtara ihe ndị ruuru mmadụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị, n’otu ebe n’ime ụwa,” ka Òtù Mba Nile Maka Mgbaghara na-ekwu n’akụkọ ya nke 1996. “Ndị ọ na-emetụtakarị bụ ndị ogbenye na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, karịsịa ndị inyom, ụmụntakịrị, ndị agadi na ndị gbara ọsọ ndụ.” Akụkọ ahụ kwuru, sị: “N’ụfọdụ mba, usoro nke ọchịchị mba fọrọ nke nta ka ọ dakasịa, na-eme ka a ghara inwe ikike iwu kwadoro iji chebe ndị na-adịghị ike pụọ n’aka ndị dị ike.”
N’afọ 1996 e jichiri ọtụtụ iri puku n’ihe karịrị otu narị mba ma taakwa ha ahụhụ. N’afọ ndị na-adịbeghịkwa anya, ọtụtụ narị puku ndị mmadụ emiwo nnọọ ala, o doro anya na ndị tọọrọ ha bụ ndị ọrụ nchebe ma ọ bụ ìgwè ndị na-eyi ọha egwu. A na-ewere ya na ọtụtụ n’ime ha anwụwo.
Otú ọ dị, agha bụ ikpe na-ezighị ezi n’ụzọ a na-apụghị izere ezere, ma ha na-adịkwu otú ahụ. Agha nke oge a na-egbu ndị nkịtị, gụnyere ndị inyom na ụmụntakịrị. Nke a abụghịkwa nanị n’ihi ịtụ bọmbụ aghara aghara n’obodo ukwu dị iche iche. A na-edina ndị inyom na ụmụ agbọghọ n’ike mgbe dum dị ka akụkụ nke usoro ibu agha, ọtụtụ òtù nnupụisi na-atọrọ ụmụaka iji zụọ ha ịbụ ndị ogbu mmadụ. N’ikwu banyere omume ndị dị otú ahụ, akụkọ nke Mba Ndị Dị n’Otu bụ́ “Mmetụta nke Agha n’Ebe Ụmụaka Nọ” na-ekwu, sị: “Akụkụ na-adịwanye ukwuu nke ụwa na-emikpukwu n’enweghị omume ọma.”
Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na enweghị omume ọma nke a edugawo n’ụwa nke jupụtara n’ikpe na-ezighị ezi—nke agbụrụ, nke mmekọrịta ọha mmadụ, nke iwu, ma ọ bụ nke ndị agha. N’ezie, nke a abụghị ihe ọhụrụ. Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị ise gara aga, otu onye amụma bụ́ onye Hibru kwara arịrị, sị: “Iwu ahụ bụ ihe na-adịghị ike na nke na-abaghị uru, ọ dịghịkwa mgbe a na-eme ihe n’ikpe ziri ezi. Ndị na-emebi iwu na-emeri ndị ezi omume, n’ihi ya kwa a na-agbagọ ikpe ziri ezi.” (Habakuk 1:4, Today’s English Version) Ọ bụ ezie na ikpe na-ezighị ezi anọworị na-abụ ihe juru ebe nile, narị afọ nke 20 aghaghị ịbụ ọgbọ mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ikpe na-ezighị ezi ruru ịrị elu ọhụrụ.
Ikpe Na-ezighị Ezi Ọ̀ Dị Ihe O Mere?
Ọ dị ihe o mere mgbe ị na-ata ahụhụ n’onwe gị n’ihi ikpe na-ezighị ezi. Ọ dị ihe o mere n’ihi na ọ na-anapụ ihe ka ukwuu nke agbụrụ mmadụ obi ụtọ ruuru ha. Ọ dịkwa ihe o mere n’ihi na ikpe na-ezighị ezi na-akpalikarị ọgụ ndị a na-akwafu ọbara na ha, bụ́ nke na-emezi ka ikpe na-ezighị ezi dịgide.
Udo na obi ụtọ bụ nke e kekọtara ha na ikpe ziri ezi n’ụzọ siri nnọọ ike, ma ikpe na-ezighị ezi na-emebi olileanya, na-egwepịakwa nchekwube. Dị ka Anne Frank chọpụtara n’ụzọ dị mwute, ụmụ mmadụ apụghị iwukwasị olileanya ha na ntọala nke ọgba aghara, nhụsianya, na ọnwụ mejupụtara. Dị ka ya, ihe ka mma na-agụsi anyị nile ike.
Ọchịchọ a edugawo ndị obi ha ziri ezi ịnwa iwetara ọha mmadụ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ikpe ziri ezi. Iji mezuo nke ahụ, Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, nke Nzukọ Ezumezu nke Mba Ndị Dị n’Otu nakweere na 1948, na-ekwu, sị: “Ihe nile bụ mmadụ nweere onwe ha site n’ọmụmụ harakwa nhata n’ùgwù na ihe ndị ruuru ha. E kenyere ha echiche na akọ na uche, ha kwesịkwara imeso ibe ha ihe ná mmụọ nke ịbụ ụmụnna.”
Ndị a bụ n’ezie okwu ndị mara mma nke ukwuu, ma ihe a kpọrọ mmadụ ka nọ ebe dị anya n’inweta ihe mgbaru ọsọ ahụ a na-achọsi ike—ọha mmadụ nke na-eme ihe n’ikpe ziri ezi ebe onye ọ bụla nwere ikike hà nhata, onye ọ bụla na-emesokwa mmadụ ibe ya dị ka nwanne ya. Mmezu nke ebumnobi a, dị ka okwu mmeghe nke Nkwupụta òtù UN na-egosi, ga-arụ ọrụ dị ka “ntọala nke nnwere onwe, ikpe ziri ezi, na udo n’ime ụwa.”
Ikpe na-ezighị ezi ọ̀ bawo ọha mmadụ n’ọbara nke na ọ dịghị mgbe a ga-ekpochapụ ya? Ka ọ̀ dị ụzọ ụfọdụ a ga-esi tọọ ntọala siri ike maka nnwere onwe, ikpe ziri ezi, na udo. Ọ bụrụ otú ahụ, ònye pụrụ ịtọ ya ma jidekwa n’aka na onye ọ bụla ga-erite uru?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
UPI/Corbis-Bettmann