‘Eziokwu ahụ Ga-eme Ka Unu Pụọ n’Ohu’
“Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” Otú a ka Jisọs kwuru ka ọ na-ezi ìgwè mmadụ ihe n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem. (Jọn 8:32) Ndị ozi Jisọs pụrụ ịmata ozizi Jisọs ozugbo dị ka eziokwu. Ha ahụwo ihe àmà buru ibu ndị na-egosi na onye ozizi ha sitere n’ebe Chineke nọ.
OTÚ ọ dị, taa ọ pụrụ isiri ụfọdụ ndị ike ịmata eziokwu ahụ nke Jisọs kwuru banyere ya. Dị ka ọ dị n’ụbọchị onye amụma bụ́ Aịsaịa, taa e nwere “ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe, ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ; ndị na-etinye ọchịchịrị n’ọnọdụ ìhè, na ìhè n’ọnọdụ ọchịchịrị; ndị na-etinye ihe ilu n’ọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ n’ọnọdụ ihe ilu.” (Aịsaịa 5:20) Ebe ọ bụ na n’oge ugbu a, a na-akwalite ọtụtụ nchepụta echiche, nkà ihe ọmụma, na ụzọ ndụ, ọtụtụ mmadụ na-eche na ihe nile bụ otú mmadụ si hụ ya nakwa na ọ dịghị ihe dị ka eziokwu.
Mgbe Jisọs gwara ndị na-ege ya ntị na eziokwu ahụ ga-eme ka ha pụọ n’ohu, ha zaghachiri site n’ịsị: “Anyị bụ mkpụrụ Abraham, ọ ka-adịghịkwa mgbe ọ bụla anyị bụ ohu onye ọ bụla: Gị onwe gị si aṅaa kwuo, A ga-eme ka unu pụọ n’ohu?” (Jọn 8:33) Ha echeghị na ọ dị ha mkpa ịbụ ndị onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ga-eme ka ha pụọ n’ohu. Ma mgbe ahụ Jisọs kọwara, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, Onye ọ bụla nke na-emehie bụ ohu mmehie.” (Jọn 8:34) Eziokwu ahụ nke Jisọs na-ekwu banyere ya pụrụ imeghe ụzọ nnwere onwe pụọ ná mmehie. Jisọs sịrị: “Ọ bụrụ na Ọkpara ga-eme ka unu pụọ n’ohu, unu ga-abụ ndị pụworo n’ohu n’ezie.” (Jọn 8:36) Ya mere eziokwu nke na-eme ka ndị mmadụ pụọ n’ohu bụ eziokwu banyere Jisọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke. Ọ bụ nanị site n’inwe okwukwe n’àjà nke ndụ mmadụ zuru okè nke Jisọs ka a pụrụ ime ka mmadụ ọ bụla nwere onwe ya pụọ n’ohu nke mmehie na ọnwụ.
N’oge ọzọ Jisọs sịrị: “Were eziokwu doo ha nsọ: okwu Gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Okwu Chineke dị ka e kwupụtara ya n’ime Bible bụ eziokwu nke pụrụ iweta nnwere onwe pụọ na nkwenkwe ụgha na ofufe ụgha. Bible nwere eziokwu banyere Jisọs Kraịst, bụ́ nke na-eduga ndị mmadụ n’inwe okwukwe n’ebe ọ nọ ma na-emeghe ụzọ olileanya na-egbukepụ egbukepụ maka ọdịnihu. Ọ bụ ihe magburu onwe ya ịbịa mara eziokwu nke Okwu Chineke!
Olee otú ịmara eziokwu dịruru ná mkpa? Ọtụtụ okpukpe taa, ọ bụ ezie na ha na-azọrọ ịbụ ndị na-agbaso Bible, bụ ndị nkà ihe ọmụma na ọdịnala mmadụ metụtaworo n’ụzọ dị ukwuu. Ọtụtụ mgbe, ndị ndú okpukpe yiri ka ha adịghị echegbu onwe ha banyere izi ezi nke ozi ha otú ha na-echegbu onwe ha banyere ịbụ ndị ọha nakweere ozizi ha. Ụfọdụ na-eche na ụdị ofufe ọ bụla dị Chineke mma, ma ọ bụrụhaala na ọ bụ nke e ji obi eziokwu na-efe. Ma Jisọs Kraịst kọwara, sị: “Oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya.”—Jọn 4:23.
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ife Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma, anyị aghaghị ịmara eziokwu. Nke a bụ okwu dị mkpa. Obi ụtọ ebighị ebi anyị dabeere na ya. Ya mere, onye ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ụzọ m sị efe ofufe, ọ̀ bụ nke Chineke na-anara nke ọma? Ènwere m ezigbo mmasị n’ịmụta eziokwu nke Okwu Chineke? Ka m̀ na-atụ ụjọ ihe nnyocha e mere nke ọma pụrụ ikpughe?’