Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 10/1 p. 28-31
  • Nọgide Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgide Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inwe Ọganihu Site n’Ọmụmụ Ihe Onwe Onye
  • Mkpa nke Ịbịaru Chineke Nso
  • Ịzụlite Mmekọrịta Chiri Anya n’Ebe Jehova Nọ
  • Ọganihu Ime Mmụọ n’Ozi Gị
  • Ndị Na-eto Eto, Na-emekwunụ Nke Ọma ma Unu Mechaa Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Mee Ka Ọ Bụrụ Nzube Gị Ijere Chineke Ozi Ruo Mgbe Ebighị Ebi
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ndịàmà Jehova Hà Kweere na Jizọs?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Baptizim na Mmekọrịta Gị na Chineke
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 10/1 p. 28-31

Nọgide Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ!

Ụbọchị Baptism Anyị Bụ Ụbọchị Kwesịrị Ịdị Oké Ọnụ Ahịa Nye Anyị Na Nke Anyị Ga-echeta Mgbe Nile. E Kwuwerị, Ọ Bụ Ụbọchị Anyị Kwupụtara N’ihu Ọha Na Anyị Emewo Nraranye Ijere Chineke Ozi.

NYE ọtụtụ ndị, ọ na-ewe mgbalị dị ukwuu iji ruo na nke a—ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị nọworo ogologo oge, ikewapụ onwe onye n’ebe ndị enyi ọjọọ nọ, ịgbanwe usoro iche echiche na akparamàgwà ndị gbamiworo mkpọrọgwụ n’ime.

Ya bụrụgodị otú ahụ, ọ bụ ezie na baptism bụ ihe omume obi ụtọ na nke dị ịrịba ama ná ndụ onye Kraịst, ọ ka bụ nanị mmalite. Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst e mere baptism nọ na Judia, sị: “Ka anyị hapụ okwu nke mmalite nke Kraịst, ka a na-eburukwa anyị ruo n’itozu òkè.” (Ndị Hibru 6:1) Ee, ọ dị ndị Kraịst nile mkpa ‘iru ịdị n’otu nke okwukwe na nke mmazu nke Ọkpara Chineke, ruo ịbụ nwoke tozuru òkè, ruo ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogologo nke ozuzu nke Kraịst.’ (Ndị Efesọs 4:13) Nanị site n’inwe ọganihu ruo n’ókè nke ntozu òkè ka anyị pụrụ n’ezie ịbụ ‘ndị a na-ewere okwukwe mee ka ha guzosie ike.’—Ndị Kọlọsi 2:7.

N’afọ ole na ole gafeworonụ, ọtụtụ narị puku ndị ọhụrụ raara onwe ha nye bụ́ ndị na-efe ofufe abatawo n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Ikekwe ị bụ otu n’ime ha. Dị ka ụmụnna gị ndị narị afọ mbụ, ị chọghị ịnọgide na-abụ nwa ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. Ị chọrọ ito eto, ịga n’ihu! Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Oleekwa ụzọ ụfọdụ ị pụrụ isi nwee ọganihu dị otú ahụ?

Inwe Ọganihu Site n’Ọmụmụ Ihe Onwe Onye

Pọl gwara ndị Kraịst nọ na Filipaị, sị: “Nke a ka m na-ekpekwa ekpere, ka ịhụnanya unu wee na-ababigakwa ókè karị nke ukwuu n’ime mmazu na nghọta nile.” (Ndị Filipaị 1:9) Ito eto ná “mmazu” dị oké mkpa nye ọganihu ime mmụọ gị. ‘Ịmara Jehova Chineke na Jisọs Kraịst’ bụ usoro na-aga n’ihu, ọ bụghị ihe na-akwụsị mgbe e mesịrị baptism.—Jọn 17:3.

Otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst, onye anyị ga-akpọ Alexandra, ghọtara nke a afọ iri mgbe e mesịrị ya baptism mgbe ọ dị afọ 16. A zụlitere ya n’eziokwu, ọ nọwokwa na-abịachi nzukọ ndị Kraịst anya mgbe dum, na-ekerekwa òkè n’ọrụ nkwusa. Ọ na-ede, sị: “N’ime ọnwa ole na ole gara aga, achọpụtara m na o nwere ihe na-adịghị agazi agazi ma ọlị. Ekpebiri m ilerusi onwe m anya ike n’eziokwu, ihe m chere banyere eziokwu ahụ, na ihe mere m ka ji nọrọ n’eziokwu ahụ.” Gịnị ka ọ chọpụtara? Ọ gara n’ihu, na-asị: “Achọpụtara m na ihe ndị mere m ji nọrọ n’eziokwu ahụ na-enye m nsogbu. Echetara m na ka m nọ na-etolite, e kwusiri okwu ike banyere nzukọ na ozi ubi. Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na àgwà nke ịmụ ihe onwe onye na ikpe ekpere ga-amalitere onwe ha. Ma ka m tụlere ọnọdụ m, achọpụtara m na nke a emeghị.”

Pọl onyeozi na-agba ume, sị: “N’ihe ahụ anyị gbaruru, ka anyị na-agazi dị ka [usoro ime ihe, NW] ahụ si dị.” (Ndị Filipaị 3:16) Usoro ime ihe pụrụ isetịpụ ụzọ maka ịga n’ihu. Tupu e mee gị baptism, obi abụọ adịghị ya na i so onye nkụzi ruru eru nke ọma nwee usoro ọmụmụ Bible kwa izu. Ka ị na-etolite ná nghọta, ị gụnyere ime nkwadebe tupu oge eruo maka ihe ọmụmụ nke izu ọ bụla n’usoro ọmụmụ ihe a, na-agụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha n’ime Bible, na ihe ndị ọzọ. Ugbu a e meworo gị baptism, ị̀ nọgidewo ‘na-aga dị ka usoro ime ihe ahụ si dị’?

Ma ọ bụghị otú ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i nyochagharịa ihe ndị ị na-ebute ụzọ, ‘na-anwa ihe ha na ibe ha dị iche.’ (Ndị Filipaị 1:10) Ná ndụ anyị nke iji ọrụ n’aka, ọ chọrọ njide onwe onye iji setịpụ oge maka ọgụgụ na ọmụmụ Bible onwe onye. Ma uru ndị dị na ya mere ka o kwesị mgbalị dị otú ahụ. Tụlee ahụmahụ Alexandra ọzọ. “Aghaghị m ikwu na anọwo m n’eziokwu ruo afọ 20 ma ọ bụ ihe yiri ya site nanị n’ịga nzukọ na ịga ozi ubi,” ka ọ na-ekweta. Otú ọ dị, ọ gara n’ihu na-ekwu, “Ekwubiwo m na ọ bụ ezie na ihe ndị a dị mkpa, nanị ha apụghị ịkwagide m mgbe ihe malitere siwe ike. Ihe a nile apụtawo ìhè n’ihi na adịghị m enwekwa usoro ọmụmụ Bible onwe onye, ekpere m bụkwa nke na-enweghị nzube na nke elu ọnụ. Aghọtara m ugbu a na aghaghị m idozigharị echiche m ma malite usoro ọmụmụ ihe bara uru ka m wee nwee ike ịmara Jehova n’ezie, hụkwa ya n’anya ma nwee ekele maka ihe Ọkpara ya nyeworo anyị.”

Ọ bụrụ na ị chọrọ enyemaka n’ịmalite usoro ọmụmụ ihe onwe onye dị mma, ndị okenye na ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru òkè n’ọgbakọ gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka. Ọzọkwa, isiokwu ndị pụtara ná mbipụta Ụlọ Nche nke May 1, 1995; August 15, 1993; na May 15, 1986 nwere ọtụtụ arọ ndị na-enye aka.

Mkpa nke Ịbịaru Chineke Nso

Akụkụ ọzọ nke i kwesịrị ịgbalịsi ike inwe ọganihu bụ ná mmekọrịta gị na Chineke. N’ọnọdụ ụfọdụ, a pụrụ ọbụna inwe mkpa siri ike n’akụkụ a. Tụlee Anthony, bụ́ onye e mere baptism mgbe ọ bụ nwata. “Abụ m nwa mbụ e mere baptism n’ezinụlọ anyị,” ka ọ na-akọ. Mgbe e mesịrị m baptism, nne m makụrụ m n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Ahụtụbeghị m ebe o nwere obi ụtọ karịa ka o nwere mgbe ahụ. E nwere oké ọṅụ, enwekwara m mmetụta ịbụ onye siri nnọọ ike.” Otú ọ dị, e nwere akụkụ ọzọ nke akụkọ a. “Ruo oge ụfọdụ, ọ dịbeghị onye na-eto eto e merela baptism n’ọgbakọ anyị,” ka Anthony na-aga n’ihu ikwu. “Ya mere eji m nnọọ onwe m nyaa isi. Ejikwa m ịza ajụjụ na ihe omume m ná nzukọ nyaa isi. Ịnata otuto na nnakwere ndị mmadụ ghọrọ ihe ka mkpa nye m karịa iwetara Jehova otuto. N’ezie, enweghị m mmekọrịta chiri anya n’ebe ọ nọ.”

Dị ka Anthony, ụfọdụ pụrụ imewo nraranye n’ihi ọchịchọ nke ime ihe ga-atọ ndị ọzọ ụtọ karịa n’ihi ọchịchọ nke ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ. Ya bụrụgodị otú ahụ, Chineke na-atụ anya n’aka ndị dị otú ahụ ka ha bie ndụ kwekọrọ ná nkwa ha kwere ijere ya ozi. (Tụlee Eklisiastis 5:4.) Otú ọ dị, ọ na-esikarịrị ha ike ime otú ahụ ma ọ bụrụ na ha enweghị mmekọrịta onwe onye chiri anya n’ebe Chineke nọ. Anthony na-echeta, sị: “Oké ọṅụ ahụ m nwere n’oge baptism m adịteghị anya. Ọ bụ n’ihe na-erughị otu afọ mgbe e mesịrị m baptism ka m dabara ná mmehie dị oké njọ ma nata ịdọ aka ná ntị site n’aka ndị okenye ọgbakọ. Itinye aka n’omume ọjọọ ugboro ugboro dugara n’ịchụpụ m n’ọgbakọ. Afọ isii mgbe m rarasịịrị onwe m nye Jehova, a nwụchiri ma kpọchie m n’ihi igbu mmadụ.”

Ịzụlite Mmekọrịta Chiri Anya n’Ebe Jehova Nọ

Ihe ọ sọrọ ọnọdụ gị ya bụrụ, ndị Kraịst nile pụrụ ịza ọkpụkpọ òkù Bible bụ́: “Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jemes 4:8) Obi abụọ adịghị ya na ị zụlitere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịnọ Chineke nso mgbe ị mụrụ Bible na mbụ. Ị mụtara na Chineke abụghị chi na-abụghị onye nke a na-efe ofufe na Krisendọm, kama onye nke nwere aha, bụ́ Jehova. Ị mụtakwara na o nwere àgwà ndị na-adọrọ adọrọ, na ọ bụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere.”—Ọpụpụ 34:6.

Otú ọ dị, ka i wee bie ndụ kwekọrọ ná nraranye gị ijere Chineke ozi, ị ghaghị ọbụna ịbịarukwu ya nso! N’ụzọ dị aṅaa? Ọbụ abụ ahụ kpere ekpere, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile.” (Abụ Ọma 25:4) Ọmụmụ ihe onwe onye nke Bible na mbipụta dị iche iche nke Society pụrụ inyere gị aka ịghọ onye maara Jehova nke ọma karị. Ikpe ekpere sitere n’obi mgbe nile dịkwa mkpa. “Wụsịanụ obi unu n’ihu Ya dị ka mmiri,” ka ọbụ abụ ahụ na-agba ume. (Abụ Ọma 62:8) Ka ị na-ahụ na a na-aza ekpere gị, ị ga-aghọta mmasị onwe onye Chineke nwere n’ebe ị nọ. Nke a ga-enyere gị aka inwe mmetụta nke ịbụ onye nọkwu ya nso.

Ọnwụnwa na nsogbu na-enyekwa ohere ọzọ iji bịaruo Chineke nso. Ị pụrụ iche ihe ịma aka na ule nke okwukwe ihu, dị ka ọrịa, nrụgide n’ụlọ akwụkwọ na n’ụlọ ọrụ, ma ọ bụ ihe isi ike akụ̀ na ụba. Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na usoro ime ihe kwesịrị ekwesị nke ọchịchị Chineke nke ikere òkè n’ozi, ịga nzukọ, ma ọ bụ isoro ụmụ gị mụọ Bible na-esiri gị ike. Echela nsogbu ndị dị otú ahụ ihu nanị gị! Rịọ Chineke maka enyemaka, na-arịọ maka nduzi na ntụzi ya. (Ilu 3:5, 6) Rịọ ya maka mmụọ nsọ ya! (Luk 11:13) Ka ị na-enweta enyemaka ịhụnanya Chineke, a ga-adọtakwu gị nso n’ebe ọ nọ ọbụna karị. Dị ka ọbụ abụ bụ́ Devid si kwuo ya, “detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma: onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ nwoke nke na-agbaba n’ime Ya.”—Abụ Ọma 34:8.

Gịnị banyere Anthony? “Amalitere m iche echiche banyere oge m nwere ọtụtụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị dabeere n’ime uche Jehova,” ka ọ na-echeta. “Nke a dị mwute. Ma n’ime ihe mgbu na mmechuihu nile ahụ, echetara m ịhụnanya Jehova. O were oge tupu m nwee ike ikpegara Jehova ekpere, ma nke a ka m mere, agwakwara m ya ihe nile dị m n’obi, na-arịọ ya mgbaghara. Amalitekwara m ịgụ Bible ma nwee ihe ijuanya banyere otú m siworo chefuo ihe dị ukwuu na otú ihe m maara banyere Jehova si dị nta.” Ọ bụ ezie na Anthony ka ga-anọzu oge mkpọrọ ya maka mpụ ya, ọ na-anata enyemaka site n’aka Ndịàmà bi n’ógbè ahụ, na-agakwa n’ihu n’ịgbake n’ụzọ ime mmụọ. N’obi ekele, Anthony na-asị: “N’ihi Jehova na nzukọ ya, enwewo m ike iyipụ mmadụ ochie ahụ, ana m agbalisikwa ike iyikwasị mmadụ ọhụrụ kwa ụbọchị. Mmekọrịta mụ na Jehova bụ ihe kasị mkpa nye m ugbu a.”

Ọganihu Ime Mmụọ n’Ozi Gị

Jisọs Kraịst nyere ụmụazụ ya iwu ịbụ ndị nkwusa nke ‘ozi ọma nke alaeze.’ (Matiu 24:14) Dị ka onye nkwusa ozi ọma ka malitetụrụ ọhụrụ, ahụmahụ gị n’ozi ahụ pụrụ ịbụ nke a kpaara ókè. Oleezi otú ị pụrụ isi nwee ọganihu ka i wee “jezuo ozi gị”?—2 Timoti 4:5.

Otu ụzọ bụ site n’ịzụlite àgwà ziri ezi. Mụta ile ọrụ nkwusa anya dị ka “àkụ̀,” ihe ùgwù. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọ bụ ohere iji gosipụta ịhụnanya, iguzosi ike n’ihe, na iguzosi ike n’ezi ihe anyị nye Jehova. Ọ na-enyekwa anyị ohere igosipụta nchegbu maka onye agbata obi anyị. Inye onwe anyị n’achọghị ọdịmma onwe anyị nanị n’akụkụ a pụrụ ịbụ isi iyi nke ezi obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.

Jisọs n’onwe ya nwere echiche ziri ezi banyere ọrụ nkwusa ahụ. Isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible dị ka “ihe oriri” nye ya. (Jọn 4:34) Ya mere, a pụrụ ịchịkọta ihe na-akpali ya inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ kasị mma n’okwu ya bụ́, “Ana m achọ.” (Matiu 8:3) Jisọs nwere ọmịiko n’ahụ ndị mmadụ, karịsịa ndị ahụ ụwa Setan ‘sogbuworo ma chụsaa.’ (Matiu 9:35, 36) Ị̀ ‘na-achọ’ n’otu aka ahụ inyere ndị ahụ nọ n’ọchịchịrị n’ụzọ ime mmụọ aka, bụ́ ndị chọkwara ìhè site n’Okwu Chineke? Mgbe ahụ ị ga-enwe mmetụta nke ịbụ onye a kpaliri ịzaghachi n’iwu Jisọs bụ́: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Matiu 28:19) N’ezie, ị ga-abụ onye a kwaliri ikere òkè zuru ezu n’ọrụ a ruo n’ókè ahụ ike na ọnọdụ gị kwere gị mee.

Isi ihe ọzọ na-eduga n’inwe ọganihu bụ ikerechi òkè anya n’ozi—kwa izu ma ọ bụrụ na o kwere mee. Ime otú ahụ pụrụ inye aka ibelata ụjọ na egwu nke pụrụ ịdọla onye na-eme nkwusa nanị mgbe ụfọdụ azụ. Ikerechi òkè anya n’ozi ubi ga-abakwara gị uru n’ụzọ ndị ọzọ. Ọ ga-etinyekwu ihe ná nghọta i nwere maka eziokwu, mee ka ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova na ndị agbata obi nọ baa ụba, ma nyere gị aka ilekwasị anya n’olileanya Alaeze ahụ.

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ọnọdụ ị nọ na ya ugbu a na-akpara òkè ị na-ekere n’ọrụ nkwusa ahụ ókè? Ọ bụrụ na o doro anya na a pụghị ime mgbanwe, mgbe ahụ nwee nkasi obi n’ịmara na ihe ọ bụla ị pụrụ ime dị Chineke ụtọ, ọ bụrụhaala na i ji obi gị dum na-eje ozi gị. (Matiu 13:23) Ikekwe ị pụrụ inwe ọganihu n’ụzọ ndị ọzọ, dị ka site n’imeziwanye nkà ime nkwusa gị. N’ọgbakọ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi na-enye ọzụzụ mara mma dị ukwuu n’akụkụ a. Dị ka ọ na-adịkarị, ka anyị nọgidere na-esikwu ike n’ozi ahụ, otú ahụ ka anyị ga-anụkwu ụtọ ya ma hụ ihe ndị na-esi na ya apụta.

O doziri anya na ọganihu ime mmụọ ekwesịghị ịkwụsị ụbọchị e mere mmadụ baptism. Pọl onyeozi dere banyere olileanya ya nke inweta ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe, sị: “Ụmụnna m, mụ onwe m agụghị onwe m na ejidewo m ruo ugbu a: ma otu ihe ka m na-eme, ebe m na-echezọ ihe nile dị n’azụ, na-esetịpụkwa aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị, ana m agbakwuru ókè ịgba ọsọ ka m wee nata ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs. Ya mere, ka anyị hà, bụ́ ndị tozuru okè, ka anyị tụkwasị uche na nke a: ọ bụrụkwa na unu tụkwasị uche n’ihe ọ bụla n’ụzọ dị iche, ọbụna nke a ka Chineke ga-ekpughere unu.”—Ndị Filipaị 3:13-15.

Ee, ndị Kraịst nile, ma olileanya ha ọ̀ bụ ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe ma ọ bụ ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala, aghaghị ‘isetịpụ aka’—na-adọlị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iji nweta ihe mgbarụ ọsọ nke ndụ! Baptism gị bụ mbido dị mma, ma ọ bụ nanị mmalite. Nọgide na-agbalịsi ike inwe ọganihu ime mmụọ. Site ná nzukọ na ọmụmụ ihe onwe onye, ‘bụrụ onye tozuru okè n’uche.’ (1 Ndị Kọrịnt 14:20) Nwee “ike ighọta . . . ihe bụ obodobo na ogologo na ịdị elu na omimi” nke eziokwu ahụ. (Ndị Efesọs 3:18) Ọganihu ị na-enwe ga-enyere gị aka, ọ bụghị nanị iji nọgide na-enwe ọṅụ na obi ụtọ ugbu a kamakwa iji nweta ebe e ji n’aka n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, ebe n’okpuru ịchịisi nke Alaeze eluigwe ya, ị ga-enwe ike inwe ọganihu ruo mgbe ebighị ebi!

[Foto dị na peeji nke 29]

Ọ chọrọ ọzụzụ iji wepụta oge maka ọmụmụ ihe onwe onye

[Foto dị na peeji nke 31]

Inwe àgwà ziri ezi pụrụ inyere anyị aka ịchọta ọṅụ n’ozi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya