Ihe Mere Ha Ji Ahọrọ Ime Ihe Ike
A MỤCHURU nwa ka dị izu 27 na Denver, Colorado, U.S.A. Nwatakịrị nwoke ahụ anwụghị, mgbe ọ nọsịkwara ọnwa atọ n’ụlọ ọgwụ, e kughachiiri ya ndị mụrụ ya n’ebe obibi ha. Izu atọ mgbe nke a gasịrị, e kughachitere nwatakịrị nwoke ahụ n’ụlọ ọgwụ. N’ihi gịnị? O nwewo mmerụ ahụ buru ibu n’ụbụrụ site ná nkwagharị nna ya kwagharịrị ya n’ike. Nna ahụ apụghị ịnagide ákwá nwatakịrị ahụ. Nke a mere ka nwatakịrị ahụ kpuo ìsì, nweekwa nkwarụ. Ọgwụ ọgbara ọhụrụ azọpụtawo ya ná mmekpa ahụ nke ọmụmụ ya ma ọ pụghị ịzọpụta ya n’ime ihe ike nke nna ya.
Ụmụaka a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ ndị a na-emetọ, na-eti ihe, ma ọ bụ na-egbu n’otu n’ime ebe ndị a kasị eme ihe ike n’ụwa—ebe obibi! Ụfọdụ na-eme atụmatụ na ihe ruru ụmụaka 5,000 na-anwụ kwa afọ n’aka ndị mụrụ ha na United States nanị! Ọ bụghịkwa nanị ụmụaka ka a na-emeso ihe ike. Dị ka magazin bụ́ World Health si kọọ, “iti nwunye ihe bụ isi ihe na-akpata mmerụ ahụ n’etiti ndị inyom nọ n’afọ ndụ ọmụmụ nwa” na United States. Gịnị banyere mba ndị ọzọ? “Site n’otu ụzọ n’ụzọ atọ ruo ihe karịrị ọkara nke ndị inyom e nyochara [ná mba ndị na-emepe emepe] na-akọ na di ha etiela ha ihe.” Ee, ime ihe ike na-akpa ike ọjọọ, karịsịa n’ebe obibi.
Ọtụtụ di na nwunye na-anwa iji ime ihe ike edozi nghọtahie ha. Ná mba ụfọdụ, ndị mụrụ ụmụ na ndị nkụzi na-eji ime ihe ike egosipụta iwe ha n’ebe ụmụaka nọ. Maka nanị iji mee ihe ọchị, ndị ọchọ okwu na-amaja ndị ha ka ike, na-emeso ha ihe ike. Gịnị mere ụmụ mmadụ ji eme nnọọ ihe ike?
Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Eme Ihe Ike
Ụfọdụ na-azọrọ na ndị mmadụ ketara ime ihe ike eketa. Ọ bụ ezie na mpụ ime ihe ike n’ozuzu ya adalatawo na United States, ọ mụbawo n’etiti ndị ntorobịa. Inwe mmasị n’ime ihe ike amụbawokwa. Ụlọ ọrụ telivishọn atọ ndị bụ́ isi mụbara ọnụ ọgụgụ nke akụkọ banyere mpụ okpukpu abụọ, mụbaakwa akụkọ igbu ọchụ ruo okpukpu atọ. Ee, mpụ na-eme ka ihe na-aga ahịa! “Ọ bụghị nanị na anyị na-agbachi ime ihe ike nkịtị,” ka ọkà n’ihe gbasara ọrịa uche bụ́ Karl Menninger kwuru, “anyị na-etinye ya n’ihu akwụkwọ akụkọ anyị. Otu ụzọ n’ụzọ atọ ma ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke usoro ihe omume telivishọn anyị na-eji ya akpa ụmụ anyị ọchị. Ọ bụghị nanị na anyị na-anabata mpụ! Ezi ndị enyi m, anyị nwere mmasị n’ebe ọ dị.”
Ihe ọmụmụ sayensị ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya na-ekwu na ma nkà mmụta ihe ndị dị ndụ nke ụbụrụ ma gburugburu ebe obibi nwechara ihe dị ukwuu jikọrọ ha na ime ihe ike nke mmadụ. “Ihe anyị nile na-amalite ikwubi bụ na gburugburu ebe obibi ọjọọ ndị a na-ekpughe ọtụtụ ụmụaka nye, n’ezie, na-eweta ntiwapụ nke ime ihe ike,” ka Dr. Markus J. Kruesi nke Ụlọ Ọrụ Maka Nnyocha Ndị Na-eto Eto nke Mahadum Illinois na-ekwu. “Ihe ndị na-eme na gburugburu ebe obibi na-akpata n’ezie mgbanwe nke ihe ndị dịkarịsịrị nta n’ụbụrụ bụ́ ndị na-eme ka ụmụ mmadụ na-emekwu ihe ná mkpali.” Ihe ndị dị ka “ndakpọ nke usoro ezinụlọ, ịrị elu nke otu onye ịzụ nwa, ogbenye ọnụ ntụ, na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi mgbe dum pụrụ n’ezie ịkwaga ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ nke ụbụrụ gaa n’àgwà nke ime ihe ike—bụ́ mmetụta e cheburu na ọ pụghị ikwe mee,” ka akwụkwọ bụ́ Inside the Brain na-ekwu.
A na-azọrọ na mgbanwe ndị na-eme n’ụbụrụ, na-agụnye ndalata nke ọ̀tụ̀tụ̀ serotonin, bụ́ mmiri ọgwụ ụbụrụ nke e chere na ọ na-akwụsị mkpali ime ihe ike. Ihe ọmụmụ dị iche iche na-ekpughe na mmanya na-aba n’anya pụrụ ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ serotonin n’ụbụrụ, wee si otú a na-enye ihe mgbakwasị ụkwụ ụfọdụ nke sayensị maka njikọ dị n’etiti ime ihe ike na iji mmanya na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi bụ́ nke a maara eri ogologo oge.
Ma ihe ọzọ so kpata ịrị elu nke ime ihe ike taa. “Cheta,” ka otu akwụkwọ amụma a tụkwasịrị obi, bụ́ Bible, na-eme ka e buru n’uche, na “a ga-enwe oge ndị siri ike na mgbe ikpeazụ. Ndị mmadụ ga-abụ ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, ndị anyaukwu, ndị na-etu ọnụ, na ndị onwe ha juru afọ; . . . ha ga-abụ ndị na-enweghị obiọma, ndị na-enweghị obi ebere, ndị nkwutọ, ndị na-eme ihe ike, na ndị dị ka anụ ọhịa; ha ga-akpọ ezi ihe asị; ha ga-abụ ndị aghụghọ, ndị na-adịghị akpachara anya, na ndị mpako fụliworo elu . . . Zere ndị dị otú ahụ.” (2 Timoti 3:1-5, Today’s English Version) Ee, ime ihe ike nke anyị na-ahụ taa bụ mmezu amụma Bible banyere “mgbe ikpeazụ.”
Ihe ọzọ na-eme ka nke a bụrụ oge ime ihe ike karịsịa. “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri,” ka Bible na-ekwu, “n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:12) A chụpụwo Ekwensu na ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe, ha nọkwa ugbu a na-egosipụta oké ịkpọasị ha n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka “onyeisi nke ike nke [ikuku, NW],” Ekwensu na-achịkwa “mmụọ ahụ nke na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye ugbu a,” na-eme ka ụwa bụrụ ebe ime ihe ike na-aba ụba.—Ndị Efesọs 2:2.
Oleezinụ otú anyị pụrụ isi nagide “ikuku” ime ihe ike nke ụwa taa? Oleekwa otú anyị pụrụ isi dozie nghọtahie n’emeghị ihe ike?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
Ụmụaka a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ ndị a na-emetọ, ndị a na-eti ihe, ma ọ bụ ndị a na-egbu n’otu n’ime ebe ndị a kasị eme ihe ike n’ụwa—ebe obibi!