Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/1 p. 19-23
  • Ime Ihe Na-atọ Jehova Ụtọ Bụ Nchegbu M Bụ́ Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Ihe Na-atọ Jehova Ụtọ Bụ Nchegbu M Bụ́ Isi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụ nke Ije Ozi A Raara Nye
  • Ule nke Okwukwe n’Ụlọ Akwụkwọ
  • E Lere Nnọpụiche M nke Ndị Kraịst Ule
  • Ọrụ Ọhụrụ Mgbe A Tọhapụsịrị M
  • Ndụ Bara Uru, Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ
  • Ije Ozi n’Okpuru Aka Ịhụnanya Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Nwa Mgbei A Gbahapụrụ Agbahapụ Achọta Nna Na-ahụ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • M Kpebisiri Ike Ịbụ Onye Agha Kraịst
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/1 p. 19-23

Ime Ihe Na-atọ Jehova Ụtọ Bụ Nchegbu M Bụ́ Isi

DỊ KA THEODOROS NEROS SI KỌỌ

Ibo ụzọ ụlọ nga m meghere, otu ọfịsa e wee jiri olu ike jụọ, sị: “Ònye bụ Neros?” Mgbe m zara na ọ bụ m, o nyere iwu, sị: “Bilie ọtọ. Anyị gaje igbu gị.” Nke ahụ mere n’ogige ndị agha dị na Kọrint, Gris, na 1952. N’ihi gịnị ka ndụ m ji nọrọ n’ihe ize ndụ otú a? Tupu mụ akọwaa nke ahụ, ka m kọtụrụ unu banyere nzụlite m.

N’IHE dị ka 1925, Ndị Mmụta Bible (dị ka a maara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ) kpọtụụrụ nna m. N’oge na-adịghị anya ọ ghọrọ otu n’ime ha ma mee ka ụmụnne ya asatọ ndị nwoke na ndị nwanyị mara nkwenkwe ya, bụ́ ndị natachara eziokwu Bible. Nne na nna ya mekwara otú ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ lụrụ nwunye, a mụkwara m na 1929 na Agrinio, Gris.

Lee afọ ndị dị egwu afọ ndị ahụ bụụrụ ndị Gris! Nke mbụ e nwere ọchịchị aka ike obi ọjọọ nke Ọchịagha Metaxas. E mesịa, na 1939, Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ, ngwa ngwa ọ malitere ndị Nazi weghaara mba ahụ. Ọrịa na agụụ juru ebe nile. E jiri obere wheelbarrow bupụ ozu koro eko nke ndị nwụrụ anwụ. Ihe ọjọọ dị n’ụwa pụtara ìhè nke ukwuu, dị ka ọ dị mkpa maka Alaeze Chineke.

Ndụ nke Ije Ozi A Raara Nye

N’August 20, 1942, ka ụfọdụ n’ime anyị gbakọtara inwe nzukọ ná mpụga Tesalọnaịka, onyeisi oche ndị nlekọta anyị tụrụ aka n’ụgbọelu agha nke ndị Britain ka ọ na-atụda bọmbụ n’obodo ahụ ma kwusie okwu ike banyere otú anyị si bụrụ ndị e chebere n’ihi irube isi n’agbamume ahụ nke ‘ịghara ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.’ (Ndị Hibru 10:25) N’oge ahụ, anyị zukọrọ n’ụsọ oké osimiri, esokwa m ná ndị wepụtara onwe ha maka baptism. Mgbe anyị pụtara ná mmiri, anyị kwụrụ n’ahịrị, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst bụkwara abụ bụ́ nke ha ji jaa anyị mma n’ihi mkpebi ahụ anyị meworo. Lee ụbọchị a na-agaghị echezọ echezọ nke ahụ bụ!

Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, ka mụ na nwata nwoke ọzọ nọ na-akpọtụrụ ndị mmadụ n’oge ije ozi ụlọ n’ụlọ anyị, ndị uwe ojii jidere anyị, kpọrọkwa anyị jee n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Iji mesie ike na e weere anyị dị ka ndị ọchịchị Kọmunist nakwa na a machibidoro nkwusa anyị iwu, a kụrụ anyị ihe, gwakwa anyị sị: “Jehova na Stalin bụ otu ihe, ndị iberibe!”

Mgbe ahụ agha obodo kpụ ọkụ n’ọnụ na Gris, mmụọ nke imegide Ọchịchị Kọmunist dịkwa ukwuu. N’echi ya a kpụụrụ anyị n’ịgà gafee ebe obibi anyị dị ka a ga-asị na anyị bụ ndị omekome. Ma ndị ahụ abụghị nanị ule ndị m zutere.

Ule nke Okwukwe n’Ụlọ Akwụkwọ

Ná mmalite afọ 1944, m ka bụ nwata akwụkwọ, ndị Nazi nọgidekwara na-ebichi Tesalọnaịka. Otu ụbọchị n’ụlọ akwụkwọ, otu onye ụkọchukwu chọọchị Ọtọdọks nke Gris, bụ́ prọfesọ anyị nke okpukpe, gwara m na a ga-ele m ule dabere n’ihe ọmụmụ nke ụbọchị ahụ. “Ọ bụghị Onye Kraịst nke chọọchị Ọtọdọks,” ka ụmụntakịrị ndị ọzọ kwuru.

“Gịnị ka ọ bụ?” ka prọfesọ ahụ jụrụ.

“Abụ m otu onye n’ime Ndịàmà Jehova,” ka m zaghachiri.

O tiri mkpu, sị: “Agụ nọ n’etiti atụrụ,” ka o jidere m ma maa m ụra.

‘Olee otú o si kwe omume,’ ka m chere n’ime onwe m, ‘na atụrụ ga-eti agụ ihe?’

Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ihe dị ka mmadụ 350 n’ime anyị nọdụrụ ala na table anyị dị njikere maka nrị ehihie. Onye nlekọta kwuru, sị: “Neros ga-edu anyị n’ekpere,” Ekpeghachiri m ekpere ahụ a na-akpọkarị ‘Nna Anyị,’ ekpere ahụ Jisọs kụziiri ndị ụmụazụ ya, dị ka e dekọrọ ya na Matiu 6:9-13. Nke a amasịghị onye nlekọta ahụ, ya mere o jiri iwe jụọ m site n’oche ya, sị: “N’ihi gịnị ka i ji kpee ekpere ahụ otú ahụ?”

“N’ihi na abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova,” ka m kwuru. Mgbe ahụ ya onwe ya kwa jidere m ma maa m ụra. Mgbe e mesịrị n’ụbọchị ahụ onye nkụzi ọzọ kpọbatara m n’ọfịs ya ma gwa m, sị: “Neros ị gbalịala, jidesie ihe i kwere ike, ahapụkwala ya.” N’abalị ahụ, nna m jiri okwu ndị a nke Pọl onyeozi gbaa m ume: “A ga-esogbukwa ndị nile ndị na-achọ ịdị ndụ n’ụzọ ịsọpụrụ Chineke n’ime Kraịst Jisọs.”—2 Timoti 3:12.

Mgbe m gụsịrị n’ụlọ akwụkwọ dị elu, aghaghị m ịhọrọ ọrụ m ga-arụ. N’ihi ọgụ obodo a na-alụ na Gris, aghaghịkwa m iche ihe metụtara nnọpụiche ndị Kraịst ihu. (Aịsaịa 2:4; Matiu 26:52) N’ikpeazụ, ná mmalite 1952, a mara m ikpe ịga mkpọrọ afọ 20 n’ihi ịjụ ibuli ngwá agha n’oge ahụ siri ike n’akụkọ ihe mere eme Gris.

E Lere Nnọpụiche M nke Ndị Kraịst Ule

N’oge a kpọchiri m n’ogige ndị agha dị na Mesolóngion nakwa na Kọrint, enwere m ohere ịkọwara ndị ọchịagha na akọ na uche m e ji Bible zụọ agaghị ekwe ka m bụrụ onye soja ná nkwado nke ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. “Abụrụlarị m onye soja nke Jisọs,” ka m kọwara, na-ezo aka n’ihe dị na 2 Timoti 2:3. Mgbe a gbara m ume ịtụleghachi ya, ekwuru m na mkpebi m abụghị nke e mere ọkụ ọkụ kama ọ bụ nke m mere mgbe m chebasiiri ya echiche ike nakwa n’ihi nrara m rara onwe m nye Chineke ime uche ya.

N’ihi ya, aghaghị m ịrụ ọrụ mmanye, nọrọ n’erighị nri n’ụbọchị m na-arụghị ọrụ ruo ụbọchị 20, na-ehikwa ụra n’ala siment nke ụlọ nga dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu mita n’ogologo na mita abụọ n’obosara. Mụ na Ndịàmà abụọ ọzọ nọ n’ụlọ nga a! Ọ bụ n’oge a, mgbe m nọ n’ogige ahụ dị na Kọrint, ka a kpọpụtara m n’ụlọ nga igbu m.

Ka anyị na-eru nso ebe a na-egbu mmadụ, ọfịsa ahụ jụrụ sị, “Ị̀ gaghị ekwu ihe ọ bụla?”

“Ee e,” ka m zara.

“Ị̀ gaghị edegara ndị ezinụlọ gị akwụkwọ ozi?”

“Ee e,” ka m zaghachiri ọzọ. “Ha amaraworị na a pụrụ igbu m n’ebe a.”

Anyị rutere n’ogige ahụ, e nyekwara m iwu ịdabere ná mgbidi. Mgbe ahụ, kama inye ndị soja iwu ịgba égbè, ọfịsa ahụ nyere iwu, sị: “Kpọba ya n’ime ụlọ.” Ọ bụ nkata a kpara akpa, ihe a haziri iji tinye mkpebi m n’ule.

Mgbe e mesịrị, e zigara m n’àgwàetiti nke Makrónisos, ebe a na-ekweghị ka m nwee akwụkwọ ọ bụla e wezuga otu Bible. E tinyere Ndịàmà 13 n’otu obere ụlọ e kewapụrụ iche site n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị mkpọrọ 500 bụ́ ndị omekome. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ụzọ ụfọdụ e zobataara anyị akwụkwọ. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị e ziteere m igbe loukóumia (otu ihe nracha na-ewu ewu). Ndị nnyocha nwere oké mmasị n’inyocha loukóumia ahụ nke na anya ha erughị na magazin Ụlọ Nche e zoro n’okpuru ya. “Ndị soja ahụ rachara loukóumia ahụ, ma anyị ‘rachara’ Ụlọ Nche!” ka otu Onyeàmà kwuru.

Otu mkpụrụ What Has Religion Done for Mankind? nke e wepụtara ọhụrụ mgbe ahụ rutere anyị, Onyeàmà a tụrụ mkpọrọ bụ́ onye maara Bekee sụgharịkwara ya. Anyị mụkọkwara Ụlọ Nche ọnụ, na-enwe nzukọ anyị ná nzuzo. Anyị lere ụlọ nga anya dị ka ụlọ akwụkwọ, dị ka ohere iji mee ka ọnọdụ ime mmụọ anyị sikwuo ike. Karịsịa, anyị nwere obi ụtọ n’ihi na anyị maara na omume anyị nke iguzosi ike n’ezi ihe tọrọ Jehova ụtọ.

Ụlọ mkpọrọ ikpeazụ a kpọchiri m na ya dị na Týrintha n’ebe ọwụwa anyanwụ Pelopónnisos. N’ebe ahụ ka m hụrụ otu onye nche bụ́ onye ji nlezianya kirie ka m na-eduziri otu onye mkpọrọ ibe m ọmụmụ Bible. Lee ihe ịtụnanya ọ bụụrụ m izute onye nche ahụ ka ọtụtụ afọ gasịrị na Tesalọnaịka! Ọ bụrụwo Onyeàmà mgbe ahụ. Mgbe e mesịrị, e zigara otu n’ime ụmụ ya ụlọ mkpọrọ, ọ bụghị dị ka onye nche kama ọ bụ dị ka onye mkpọrọ. A tụrụ ya mkpọrọ n’ihi otu ihe ahụ mere e ji tụọ m mkpọrọ.

Ọrụ Ọhụrụ Mgbe A Tọhapụsịrị M

Anọrọ m nanị afọ atọ n’ụlọ mkpọrọ n’ime afọ 20 a sịrị na m ga-anọ. Mgbe a tọhapụsịrị m ekpebiri m ibi n’Atens. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya otu ụdị nke ọrịa pleurisy rịara m, ọ manyekwara m ịlaghachi Tesalọnaịka. Edina m n’elu àkwà ruo ọnwa abụọ. Mgbe e mesịrị ezutere m ọmarịcha nwa agbọghọ aha ya bụ Koula, anyị lụkwara na December 1959. Na 1962 ọ malitere ịsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Afọ atọ mgbe nke ahụ gasịrị enwere m ike isonyere ya n’ọrụ ọsụ ụzọ.

Na January nke 1965, e kenyere anyị ịrụ ọrụ sekit, na-eleta ọgbakọ dị iche iche iji wusie ha ike n’ụzọ ime mmụọ. N’oge okpomọkụ ahụ anyị nwekwara ihe ùgwù nke ije mgbakọ distrikti ukwu nke mbụ anyị na Viennna, Austria. Ọ dịghị ka ndị ahụ anyị nwere na Gris bụ́ ebe anyị na-aghaghị izukọ ná nzuzo n’ime ọhịa n’ihi na a machibidoro ọrụ anyị iwu. Ka ọ na-eru ngwụsị afọ 1965, a kpọrọ anyị òkù ịrụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị n’Atens. Otú ọ dị, n’ihi nsogbu ahụ ike nke ụfọdụ n’ime ndị ikwu m, anyị aghaghị ịlọtaghachi Tesalọnaịka na 1967.

Ka anyị na-elekọta ibu ọrụ ezinụlọ, anyị nọgidere n’ọrụ izisa ozi ọma ahụ. N’otu oge, mgbe m na-agwa nwa nwanne papa m bụ́ Kostas okwu, akọwaara m ya ịma mma nke ọgbakọ Chineke nakwa ịhụnanya, ịdị n’otu, na nrubeisi nye Chineke dị n’ime ya. O kwuru, sị, “Ihe ndị a ga-adị nnọọ mma ma a sị nanị na Chineke dị adị.” Ọ nabatara òkù m kpọrọ ya inyocha ma Chineke ọ dị adị ma ọ bụ na ọ dịghị. Ekwuru m na anyị gaje ịga mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova na Nuremberg, Germany, n’August 1969. Ọ jụrụ ma ya pụrụ isoro anyị, enyi ya bụ́ Alekos, bụ́ onye anyị na ya na-amụkwa Bible, chọkwara iso jee.

Mgbakọ Nuremberg ahụ bụ ihe dị ịrịba àmà! E nwere mgbakọ ahụ n’ámá egwuregwu ahụ buru ibu ebe Hitler meworo ememe mmeri agha ya. Ndị bịaranụ ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ihe karịrị mmadụ 150,000, e gosipụtakwara mmụọ Jehova n’ihe nile e mere. N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị e mere ma Kostas ma Alekos baptism. Ugbu a ha abụọ na-eje ozi dị ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye, ezinụlọ ha bụkwa Ndịàmà.

Amalitere m iduziri otu nwaada nwere mmasị ihe. Di ya kwuru na ya chọrọ inyocha nkwenkwe anyị, ntakịrị oge mgbe nke a gasịkwara ọ gwara m na ya akpọwo otu Maazị Sakkos, bụ́ ọkà mmụta okpukpe Ọtọdọks nke Gris, maka nrụrịta ụka. Di ya chọrọ ịjụ anyị abụọ ajụjụ. Maazị Sakkos kpọọrọ otu ụkọchukwu bịa. Nwoke ahụ anyị nọworo na-abịa eleta malitere site n’ikwu, si, “Nke mbụ, aga m achọ ka Maazị Sakkos zaa ajụjụ atọ.”

Ka ọ na-eweli nsụgharị Bible nke anyị jiworo na-enwe mkparịta ụka elu, nwoke ahụ jụrụ, sị, “Ajụjụ nke mbụ: Ihe a ọ bụ ezigbo Bible, ka ọ bụ Bible Ndịàmà?” Maazị Sakkos zara na ọ bụ nsụgharị ziri nnọọ ezi, ọ kọwakwara Ndịàmà Jehova dị ka “ndị hụrụ Bible n’anya.”

N’ịga n’ihu, nwoke ahụ jụrụ, sị, “Ajụjụ nke abụọ: Ndịàmà Jehova hà bụ ndị nwere omume ọma?” N’eziokwu, ọ chọrọ ịma ụdị ndị ha na nwunye ya maliteworo ịkpakọ. Ọkà mmụta okpukpe ahụ zara na ha bụ ndị nwere omume ọma n’ezie.

“Ajụjụ nke atọ,” ka nwoke ahụ gara n’ihu ikwu, “A na-akwụ Ndịàmà Jehova ụgwọ?” “Ee e,” ka ọkà mmụta okpukpe ahụ zara.

“Enwetawo m azịza nye ajụjụ m nile, emewokwa m mkpebi m,” ka nwoke ahụ kwubiri. Mgbe nke ahụ gasịrị ọ gara n’ihu n’ọmụmụ Bible ya, n’oge na-adịghịkwa anya e mere ya baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Ndụ Bara Uru, Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ

Amalitere m ọzọ ije ozi dị ka onye nlekọta sekit na January 1976. Mgbe ihe dị ka afọ isii gasịrị, enwetara m ihe ùgwù nke ikere òkè n’ibute ụzọ n’ụdị ọhụrụ nke ime nkwusa na Gris—ịgba àmà okporo ámá. Mgbe ahụ, n’October 1991, mụ na nwunye m malitere ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, a ghaghị ịwa m ahụ ugboro anọ n’akwara ndị ọbara si na-aga n’obi, bụ́ nke gara nke ọma n’ụzọ nyere m obi ụtọ. Ugbu a ahụ ike m dị nnọọ mma, enwewokwa m ike ịmaliteghachi ọrụ nkwusa oge nile. Ana m ejekwa ozi dị ka okenye n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị na Tesalọnaịka, na-esokwa Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ arụ ọrụ iji nyere ndị nwere mkpa ahụ ike aka.

Mgbe m na-eleghachi anya azụ ná ndụ m, ana m aghọta otú o siworo bụrụ ihe na-enye afọ ojuju ime ihe na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ. Enwere m obi ụtọ na eri ogologo oge anarawo m ọkpụkpọ òkù ya na-adọrọ mmasị, bụ́: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) N’ezie ọ na-enye m ọṅụ ịhụ mmụba a na-enwe n’ụwa nile nke ọnụ ọgụgụ ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị na-abata n’ime nzukọ Jehova. Ọ bụ ihe ùgwù n’ezie ikere òkè n’iji eziokwu Bible tọhapụ ụmụ mmadụ n’agbụ́, sikwa otú a megheere ha olileanya nke ndụ agwụghị agwụ n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume!—Jọn 8:32; 2 Pita 3:13.

Anyị na-agbalị mgbe nile ịgba ndị na-eto eto bụ́ ndị ohu Jehova ume isetịpụ ozi oge nile dị ka ihe mgbaru ọsọ ha, inye ya oge na ume ha. N’eziokwu, ịtụkwasị Jehova obi na ịchọta obi ụtọ n’ime ka obi ya ṅụrịa bụ ndụ kasị eju afọ mmadụ pụrụ ibi!—Ilu 3:5; Eklisiastis 12:1.

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

(Site n’aka ekpe gaa n’aka nri)

Ije ozi na kichin Betel na 1965

Ikwu okwu na 1970 mgbe a machibidoro nkwusa anyị iwu

Mụ na nwunye m na 1959

[Foto dị na peeji nke 23]

Mụ na nwunye m, bụ́ Koula

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya