Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 1/15 p. 3-4
  • Ndị Dị N’otu N’ụzọ Ndụ Kasị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Dị N’otu N’ụzọ Ndụ Kasị Mma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezinụlọ Jehova Nwere Ịdị N’otu Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • E Ji Ịdị n’Otu Mara Ndị Na-efe Chineke Ezi Ofufe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ezi Ịdị n’Otu Ndị Kraịst—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ịdị n’Otu nke Ofufe n’Oge Anyị—Gịnị Ka Ọ Pụtara?
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 1/15 p. 3-4

Ndị Dị N’otu N’ụzọ Ndụ Kasị Mma

Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa anọgide na-arị elu, a ga-enwe ijeri mmadụ isii n’ụwa n’oge na-adịghị anya. Ọ bụ ezie na mmadụ nile sitere n’otu nna nna, ihe ka ọtụtụ eyighị ka ha na-aghọta na ha bụ ndị òtù nke ezinụlọ zuru ụwa ọnụ bụ́ ndị ga-aza ajụjụ n’ihu Onye Okike nwere amamihe ma na-ahụ n’anya. Adịghị n’otu na esemokwu ndị dị n’etiti mba, agbụrụ, na ọdịbendị dị iche iche na-agba akaebe na-adịghị mma nye ọnọdụ nke a dị mwute.

N’IHI ọnọdụ ndị dị n’ụwa ugbu a, ịdị n’otu zuru ụwa ọnụ pụrụ iyi ihe mgbaru ọsọ aka na-apụghị iru. The Columbia History of the World na-ekwu, sị: “N’ajụjụ ahụ dị oké mkpa banyere otú a ga-esi bikọta ọnụ, ụwa nke oge a enwetụghị echiche ọhụrụ ọ bụla inye, ọbụnadị otu.”

Otú ọ dị, ime ka ndị nile bi n’ụwa dịrị n’otu achọghị echiche ọhụrụ. E setịpụrụ ụzọ nke na-eduga n’ịdị n’otu n’ime Akwụkwọ Nsọ. O hiwere isi n’ofufe nke Onye ahụ kere ụwa na ndụ nile dị na ya. Ezi ịdị n’otu nke echiche, nzube, na ụzọ ndụ adịworị adị n’etiti ndị Chineke. N’ịbụ ndị ọnụ ọgụgụ ha karịrị nde ise na ọkara n’ala 233, ha dị n’otu na nkwenkwe ha nke bụ́ na ụzọ ndụ nke Chineke bụ ụzọ kasị mma. Dị ka ọbụ abụ ahụ, ha na-ekpe ekpere, sị: “Zi m ụzọ Gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu Gị: mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha Gị.”—Abụ Ọma 86:11.

Aịsaịa onye amụma buru amụma n’ogologo oge gara aga banyere njikọ a nke ndị mmadụ n’ofufe dị ọcha. O dere, sị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karịa ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.”—Aịsaịa 2:2, 3.

Ịdị n’otu nke Ndịàmà Jehova bụ ọpụrụiche. N’ihe karịrị ọgbakọ 87,000 n’ụwa nile, ha na-eri otu nri ime mmụọ ahụ ná nzukọ ha kwa izu. (Matiu 24:45-47) Otú ọ dị, site n’etiti afọ 1998 ruo mmalite afọ 1999, Ndịàmà gosipụtara ịdị n’otu ha n’ụzọ ọzọ—site n’ịgbakọta ná Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke” ha nke were ụbọchị atọ n’ụwa nile. Ná mba 13, mgbakọ ndị a gụnyere ọtụtụ ndị nnọchiteanya sitere n’ala dị iche iche, a kpọkwara ha mgbakọ mba nile. A kpọrọ ndị ọzọ mgbakọ distrikti. Ma mgbakọ a nile nwere otu usoro ihe omume nke ezi ihe ime mmụọ.

Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ndị bịaranụ bụ́ ndị nwere obi ụtọ ma jie ejiji dị mma ka ha na-enuba n’ime ụlọ mgbakọ na ámá egwuregwu dị iche iche iji bụrụ ndị Jehova ziri ihe! Ihe atụ bụ ihe otu onye bịara mgbakọ mba nile ahụ e nwere na Michigan, U.S.A. kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụ nnọọ ihe ọṅụ ịhụ ụmụnna anyị ndị sitere n’ụwa nile—Czech Republic, Barbados, Nigeria, Hungary, England, Holland, Etiopia, Kenya, na ọtụtụ ala ndị ọzọ—ka ha na-amakụ ibe ha! Ọ mara mma ịhụ ụmụnna ka ha na-ebikọ n’ịdị n’otu, na-agba anya mmiri nke ọṅụ n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ nakwa n’ebe Chineke ukwu ha, bụ́ Jehova nọ.” Isiokwu na-esonụ ga-atụle usoro ihe omume mgbakọ ahụ nke ọtụtụ nde n’ụwa nile nụrụ ụtọ ya.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 3]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya