Akụ̀ Anyị n’Ite Ájá
“Anyị nwere akụ̀ a n’ite ájá, ka ọkịka nke ike ahụ wee bụrụ nke Chineke, gharakwa isite n’anyị onwe anyị.”—2 NDỊ KỌRINT 4:7.
1. Olee otú ihe nlereanya Jisọs kwesịrị isi gbaa anyị ume?
KA JEHOVA na-akpụzi ya n’elu ala ebe a, Jisọs ji anya ya hụ adịghị ike nke ihe a kpọrọ mmadụ. Lee otú ihe nlereanya ya nke iguzosi ike n’ezi ihe kwesịrị isi gbaa anyị ume! Onyeozi ahụ na-agwa anyị, sị: “N’ihi na a kpọrọ unu ime nke a: n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ Ya nile.” (1 Pita 2:21) Site n’ikwenye ná mkpụzi dị otú ahụ, Jisọs meriri ụwa. O mekwara ka ndị ozi ya nwee anyaike ịghọ ndị mmeri. (Ọrụ 4:13, 31; 9:27, 28; 14:3; 19:8) Leekwa agbamume magburu onwe ya o nyere ná mmechi nke okwu ikpeazụ ọ gwara ha! O kwupụtara, sị: “Okwu ndị a ka M gwaworo unu, ka unu wee nwee udo n’ime m. N’ụwa unu na-enwe mkpagbu: ma nweenụ obi ike; Mụ onwe m emeriwo ụwa.”—Jọn 16:33.
2. N’ụzọ dị iche n’ebe ikpu ìsì nke ụwa dị, ìhè dị aṅaa ka anyị nwere?
2 N’otu aka ahụ, mgbe o gosichara ọdịiche dị n’etiti ikpu ìsì nke “chi nke oge a” wetara na “ìhè nke ozi ọma nke ebube,” Pọl onyeozi kwuru banyere ozi anyị dị oké ọnụ ahịa, sị: “Anyị nwere akụ̀ a n’ite ájá, ka ọkịka nke ike ahụ wee bụrụ nke Chineke, gharakwa isite n’anyị onwe anyị; a na-akpagbu anyị n’akụkụ nile, ma a dịghị akpagbubiga anyị ókè; anyị nwere obi abụọ, ma anyị adịghị enwebiga obi abụọ ókè; a na-esogbu anyị, ma a dịghị ahapụ nanị anyị; a na-atụda anyị n’ala, ma a dịghị ala anyị n’iyi.” (2 Ndị Kọrint 4:4, 7-9) Ọ bụ ezie na anyị bụ ‘ite ájá’ na-esighị ike, Chineke akpụziwo anyị nnọọ site ná mmụọ ya nke na anyị pụrụ imeri ụwa Setan kpam kpam.—Ndị Rom 8:35-39; 1 Ndị Kọrint 15:57.
Mkpụzi n’Israel Oge Ochie
3. Olee otú Aịsaịa si kọwaa mkpụzi nke mba ndị Juu?
3 Ọ bụghị nanị ndị mmadụ n’otu n’otu ka Jehova na-akpụzi, kama mba dị iche iche n’ozuzu ha. Dị ka ihe atụ, mgbe Israel oge ochie kwenyere ná mkpụzi Jehova, o nwere ihe ịga nke ọma. Ma n’ikpeazụ ọ kpọrọ ekwo nkụ gaa n’ụzọ nke nnupụisi. N’ihi ya, Onye Kpụrụ Israel wetaara ya “ahụhụ.” (Aịsaịa 45:9) Na narị afọ nke asatọ T.O.A., Aịsaịa gwara Jehova okwu banyere ajọ mmehie nke ndị Israel, na-asị: “Jehova, Nna anyị ka Ị bụ: anyị onwe anyị bụ ụrọ, Gị onwe gị bụ onye na-akpụ anyị; ọrụ aka Gị ka anyị nile bụ. . . . Ihe nile anyị a na-achọsi ike aghọwokwa mkpọmkpọ ihe.” (Aịsaịa 64:8-11) A kpụziwo Israel ịbụ arịa kwesịrị nanị mbibi.
4. Ihe atụ dị aṅaa ka Jeremaịa mere ihe ngosi ya?
4 Otu narị afọ mgbe e mesịrị, ka ụbọchị ime mpịazi kpụdewere nso, Jehova gwara Jeremaịa ka o were karama ájá ma soro ụfọdụ n’ime ndị okenye Jerusalem gaa na Ndagwurugwu Hinọm, nye ya ntụziaka, sị: “Ị ga-etiwakwa karama ahụ n’anya ndị ikom ahụ, bụ́ ndị na-eso gị jee, ị ga-asịkwa ha, Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ọbụna otú a ka M ga-etiwa ndị nke a na obodo a, dị ka mmadụ si etiwa ite ọkpụite, nke a na-apụghị imezikwa ya ọzọ.”—Jeremaịa 19:10, 11.
5. Ruo ókè hà aṅaa ka ikpe Jehova n’ebe Israel nọ ruru?
5 Na 607 T.O.A., Nebukadneza bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya ma dọrọ ndị Juu lanarịrịnụ n’agha laa Babilọn. Ma mgbe afọ 70 nke nchụpụ gaa n’ala ọzọ gasịrị, ndị Juu chegharịrịnụ laghachiri iji wughachi Jerusalem na ụlọ nsọ ya. (Jeremaịa 25:11) Otú ọ dị, ka ọ na-erule narị afọ mbụ O.A., mba ahụ agbahapụwo Ọkpụite Ukwu ahụ ọzọ, n’ikpeazụkwa o weturu onwe ya ala gaa na mpụ kasịnụ nke igbu Ọkpara Chineke. Na 70 O.A., Chineke ji Ike Ọchịchị Ụwa bụ́ Rom mee ihe dị ka ihe mere ihe o kpere n’ikpe n’ikpochapụ usoro ihe ndị Juu, na-akụpịa Jerusalem na ụlọ nsọ ya. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ aka Jehova ga-akpụzi mba Israel dị ka ihe “dị nsọ nke makwara mma.”a
Ịkpụzi Mba Ime Mmụọ
6, 7. (a) Olee otú Pọl si akọwa mkpụzi nke Israel ime mmụọ? (b) Gịnị bụ ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke “ihe dịịrị ebere,” oleekwa ndị mejupụtara ya?
6 A kpụziri ndị Juu nabataworo Jisọs dị ka ndị òtù bụ́ isi nke otu mba ọhụrụ, ‘Israel ime mmụọ nke Chineke.’ (Ndị Galetia 6:16) Mgbe ahụ, okwu Pọl ziri ezi: “Ma ọ bụ ọkpụite, ò nweghị ike n’ebe ụrọ dị, isite n’otu ọkpụkpụ ụrọ ahụ o doziri mee nke a ka ọ bụrụ ihe ga-anara nsọpụrụ, meekwa nke ọzọ ka ọ bụrụ ihe a ga-eme ihe ihere? . . . Chineke, ọ bụ ezie na Ọ na-achọ igosi iwe Ya, na ime ka a mara ike Ya, ma O weere ogologo ntachi obi hie nne nagide ihe iwe e doziworo ka ha baa n’ịla n’iyi: ka O wee meekwa ka a mara akụ̀ nke ebube Ya n’ahụ ihe dịịrị ebere, nke O buru ụzọ dozie ka ha baa n’ebube.”—Ndị Rom 9:21-23.
7 Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie mesịrị mee ka a mata na “ihe dịịrị ebere” ndị a ga-adị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ. (Mkpughe 7:4; 14:1) Ebe ọ bụ na Israel anụ ahụ emezughị ọnụ ọgụgụ ahụ, Jehova meere ndị mba ọzọ ebere. (Ndị Rom 11:25, 26) Ọgbakọ ọhụrụ ahụ nke ndị Kraịst gbasapụrụ ngwa ngwa. N’ime afọ 30, a nọ ‘na-ekwusa ozi ọma ahụ n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.’ (Ndị Kọlọsi 1:23) Nke a chọrọ ka e webata ọtụtụ ọgbakọ ndị dịsasịrị adịsasị n’ógbè ahụ n’okpuru nlekọta kwesịrị ekwesị.
8. Olee ndị mejupụtara òtù na-achị isi mbụ ahụ, oleekwa otú òtù a si mụbaa?
8 Jisọs akwadebewo ndị ozi 12 ịghọ òtù na-achị isi mbụ, na-azụ ha na ndị ọzọ maka ozi ahụ. (Luk 8:1; 9:1, 2; 10:1, 2) Na Pentikọst 33 O.A., e guzobere ọgbakọ ndị Kraịst, ka oge na-agakwa a mụbara òtù na-achị isi ya ịgụnye ‘ndị ozi na ndị okenye nọ na Jerusalem.’ O yiri ka onye otu nne ji ya na Jisọs, bụ́ Jemes, ò jere ozi dị ka onyeisi oche ruo ogologo oge, ọ bụ ezie na ọ bụghị onyeozi. (Ọrụ 12:17; 15:2, 6, 13; 21:18) Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Eusebius si kwuo, ndị ozi ahụ ghọrọ ndị a kasị kpagbuo, e mekwara ka ha gbasasịa n’ókèala ndị ọzọ. A gbanwere ndị mejupụtara òtù na-achị isi ahụ otú o kwesịrị.
9. Ihe omume dị aṅaa dị mwute ka Jisọs buru n’amụma na ọ ga-ewere ọnọdụ?
9 Ná ngwụsị nke narị afọ mbụ, ‘onye iro, bụ́ Ekwensu,’ malitere ‘ịgha ata’ n’etiti ndị nketa nke “alaeze eluigwe” bụ́ ndị yiri ọka. Jisọs ebuwo amụma na a ga-ekwe ka ihe omume a dị mwute dịrị ruo oge owuwe ihe ubi “n’ọgwụgwụ oge a.” Ọzọkwa, “ndị ezi omume ga-enwupụ dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha.” (Matiu 13:24, 25, 37-43) Olee mgbe nke ahụ ga-abụ?
Ịkpụzi Israel nke Chineke Taa
10, 11. (a) Olee otú mkpụzi nke oge a nke Israel nke Chineke si malite? (b) Ozizi ndị dị aṅaa dị iche ka a ga-ahụ n’ime Krisendọm nakwa n’etiti Ndị Mmụta Bible na-anụ ọkụ n’obi?
10 Na 1870, Charles Taze Russell guzobere ìgwè ọmụmụ Bible na Pittsburgh, Pennsylvania, U.S.A. Na 1879 ọ malitere ibipụta magazin a maara taa dị ka Ụlọ Nche, kwa ọnwa. Ndị Mmụta Bible a, dị ka a na-akpọ ha, matara n’oge na-adịghị anya na Krisendọm anakwerewo ozizi ndị na-ekpere arụsị bụ́ ndị na-adịghị n’Akwụkwọ Nsọ, dị ka anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ọkụ ala mmụọ, pọgatrị, chi Atọ n’Ime Otu, na ime ụmụ ọhụrụ baptism.
11 Otú ọ dị, nke ka mkpa, ndị a hụrụ eziokwu Bible n’anya weghachiri ozizi Bible ndị bụ́ isi, dị ka mgbapụta site n’àjà mgbapụta Jisọs na mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs udo n’elu ala n’okpuru Alaeze Chineke. Karịsịa, e kwusiri okwu ike banyere mwepụ a gaje iwepụ Jehova Chineke n’ụta dị ka Eze Onyenwe eluigwe na ala. Ndị Mmụta Bible kwenyere na a na-aga ịza Ekpere Onyenwe anyị ahụ, bụ́: “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10) Mmụọ nsọ Chineke na-akpụzi ha ịghọ òtù zuru ụwa ọnụ nke ndị Kraịst hụrụ udo n’anya.
12. Olee otú ndị Mmụta Bible si ghọta banyere otu ụbọchị dị mkpa?
12 Ịmụ Daniel isi nke 4 na amụma ndị ọzọ n’ụzọ miri emi mere ka Ndị Mmụta Bible kwenyesie ike na ọnụnọ Jisọs dị ka Eze Mesaịa aghaghị ịbụ ihe dị nso. Ha ghọtara na 1914 ga-abụ oge maka ngwụsị nke “oge nke mba ọzọ.” (Luk 21:24; Ezikiel 21:26, 27) Ndị Mmụta Bible gbasawanyere ọrụ ha n’ụzọ dị ngwa, na-eguzobe klas ọmụmụ Bible dị iche iche (ndị e mesịrị kpọọ ọgbakọ) gburugburu United States. Ka ọ na-erule ná mmalite afọ ndị 1900, ọrụ ịkụzi Bible ha nọ na-agbasa baa Europe na Australasia. Nhazi dị mma ghọrọ ihe dị mkpa.
13. Ọnọdụ dị aṅaa iwu kwadoro ka Ndị Mmụta Bible nwetara, ozi dịkwa aṅaa pụtara ìhè ka onyeisi oche mbụ nke Society jere?
13 Iji nye Ndị Mmụta Bible ọnọdụ iwu kwadoro, e tinyere aha Zion’s Watch Tower Tract Society n’akwụkwọ na 1884 na United States, na-enwe isi ụlọ ọrụ ya na Pittsburgh, Pennsylvania. Ndị nduzi ya jere ozi dị ka Òtù Na-achị Isi na-ahazi ya, na-elekọta ime nkwusa zuru ụwa ọnụ nke Alaeze Chineke. Onyeisi oche mbụ nke Society, bụ́ Charles T. Russell, dere mpịakọta isii nke Studies in the Scriptures, meekwa njem nkwusa ndị sara mbara. O nyekwara nnukwu ego ọ kpakọbara tupu ọ malite ọmụmụ Bible ya n’onyinye maka ọrụ Alaeze zuru ụwa ọnụ. Na 1916, ka Agha Ukwu ahụ nọ na-akpọtụ na Europe, Nwanna Russell ike gwụrụla nwụrụ mgbe ọ nọ na-eme njem nkwusa. O nyewo ihe nile o nwere iji gbaa àmà sara mbara banyere Alaeze Chineke.
14. Olee otú J. F. Rutherford si ‘gbaa mgba ọma ahụ’? (2 Timoti 4:7)
14 Joseph F. Rutherford, onye bụworo ọkàikpe ruo nwa oge na Missouri, ghọrọ onyeisi oche ọzọ. N’ihi nkwado ọ na-akwado eziokwu Bible n’atụghị egwu, ndị ụkọchukwu Krisendọm na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị gbakọtara aka ‘n’iji ụkpụrụ kpụzie mmegbu.’ Na June 21, 1918, a tụrụ Nwanna Rutherford na Ndị Mmụta Bible ndị ọzọ na-edu ndú mkpọrọ, nke nwere ọtụtụ ịma ikpe ịga mkpọrọ a ga-anọ afọ 10 ma ọ bụ 20 ndị ga-esokọ ọnụ. Ndị Mmụta Bible mere ihe. (Abụ Ọma 94:20; Ndị Filipaị 1:7) Mgbe ha tinyere akwụkwọ mkpegharị ikpe, a tọhapụrụ ha na March 26, 1919, e mesịakwa kwuo na aka ha dị ọcha kpam kpam n’ebubo ụgha ahụ nke ịgba ọchịchị mgba okpuru.b Ahụmahụ a nyere aka kpụzie ha ịbụ ndị nkwado siri ike nke eziokwu. Site n’enyemaka Jehova, ha mere ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji merie n’ọgụ ime mmụọ ahụ iji na-akpọsa ozi ọma ahụ n’agbanyeghị mmegide nke Babilọn Ukwu ahụ. Ọgụ ahụ na-aga n’ihu rute n’afọ 1999 nke a.—Tụlee Matiu isi nke 23; Jọn 8:38-47.
15. N’ihi gịnị ka afọ 1931 ji dị mkpa n’akụkọ ihe mere eme?
15 N’afọ ndị 1920 na 1930, a nọgidere na-akpụzi Israel nke Chineke ahụ e tere mmanụ n’okpuru nduzi nke Ọkpụite Ukwu ahụ. Ìhè amụma ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ chapụtara, na-enye Jehova nsọpụrụ, na-elekwasịkwa anya n’Alaeze Mesaịa nke Jisọs. Na 1931, Ndị Mmụta Bible ṅụrịrị ọṅụ ịnakwere aha ọhụrụ ahụ, bụ́ Ndịàmà Jehova.—Aịsaịa 43:10-12; Matiu 6:9, 10; 24:14.
16 tinyere igbe dị na peji nke 19. Olee mgbe ọnụ ọgụgụ nke 144,000 ahụ zuru, ihe àmà dịkwa aṅaa ka e nwere banyere nke a?
16 N’afọ ndị 1930 ọnụ ọgụgụ nke ndị “a kpọworo, ndị a họpụtawokwara, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi,” bụ́ 144,000, yiri ka o zuwo. (Mkpughe 17:14; lee igbe dị na peji nke 19.) Anyị amaghị ole a chịkọtara n’ime ndị e tere mmanụ ahụ na narị afọ mbụ nakwa site n’ime ndị bụ́ “ata” n’ọtụtụ narị afọ nke ịnọ n’ọchịchịrị nke oké ndapụ n’ezi ofufe nke Krisendọm. Ma na 1935 e nwere ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa 52,465 gburugburu ụwa, bụ́ ndị gosipụtara olileanya eluigwe ha site n’ikere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta, n’ime ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 56,153. Gịnị ga-abụ ọdịnihu nke ọtụtụ ndị a ka ga-achịkọta?
“Lee, Oké Ìgwè Mmadụ”
17. Ihe omume dị aṅaa nke mere ihe akụkọ weere ọnọdụ na 1935?
17 N’otu mgbakọ e nwere site na May 30 ruo June 3, 1935, na Washington, D.C., U.S.A., Nwanna Rutherford kwuru okwu dị ịrịba ama nke isiokwu ya bụ “Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ.” Ìgwè a, “nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ,” ga-apụta ka ịka 144,000 nke Israel ime mmụọ akara na-abịa ná njedebe. Ndị a kwa ga-egosi okwukwe n’ike mgbapụta nke “ọbara Nwa atụrụ ahụ,” bụ́ Jisọs, ma jee ozi dị nsọ ná ndokwa ụlọ nsọ Jehova maka ofufe. Dị ka otu ìgwè, ha ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta’ ná ndụ, iji keta Paradaịs elu ala bụ́ ebe ‘ọnwụ na-agaghị adịkwa ọzọ.’ Ruo ọtụtụ afọ tupu mgbakọ ahụ, e kwuwo banyere ìgwè a dị ka ndị òtù Jonadab.—Mkpughe 7:9-17; 21:4; Jeremaịa 35:10.
18. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka afọ 1938 si dị oké mkpa?
18 Afọ 1938 dị mkpa n’ịmata òtù abụọ ahụ n’ụzọ doro anya. Mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke March 15 na April 1, 1938 nyere ihe ọmụmụ dị akụkụ abụọ bụ́ “Ìgwè Atụrụ Ya” ma mee ka ọnọdụ nke ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na ndị enyi ha, bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ, doo anya. E mesịa, mbipụta nke June 1 na June 15 (Bekee) bu isiokwu ndị dịịrị ọmụmụ banyere “Nhazi,” bụ́ ndị dabeere n’Aịsaịa 60:17. A kpọkuziri ọgbakọ nile ka ha rịọ Òtù Na-achị Isi ka ha họpụta ndị ohu ọgbakọ, si otú ahụ na-ewebata ndokwa ọchịchị Chineke, nke ka mma, bụ́ nke Chineke mere ka ọ dịrị. Ọgbakọ ndị ahụ mere nnọọ otú ahụ.
19 tinyere ntụaka ala ala peji. Eziokwu ndị dị aṅaa na-anwapụta na ọkpụkpọ òkù a na-akpọ “atụrụ ọzọ” ahụ n’ozuzu ha anọwo na-aga n’ihu ruo ihe karịrị afọ 60 ugbu a?
19 Akụkọ dị na 1939 Yearbook of Jehovah’s Witnesses kwuru, sị: “Ụmụazụ Kraịst Jisọs e tere mmanụ nọ n’elu ala ugbu a dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ, ọ dịghịkwa mgbe ọnụ ọgụgụ ha ga-aka ukwuu. N’ime Akwụkwọ Nsọ a kpọrọ ndị a ‘ihe fọdụrụ’ n’ime ụmụ Zion, bụ́ nzukọ Chineke. (Mkpu. 12:17) Onyenwe anyị na-achịkọtara onwe ya ‘atụrụ ọzọ’ ya ugbu a, bụ́ ndị ga-emejupụta ‘oké ìgwè mmadụ’ ahụ. (Jọn 10:16) Ndị a na-achịkọta ugbu a bụ ndị enyi nke ihe ahụ fọdụrụ, na-eso ihe ahụ fọdụrụ arụkọ ọrụ. Site n’oge a gaa n’ihu, ndị ahụ na-emejupụta ‘atụrụ ọzọ’ ahụ ga-amụba n’ọnụ ọgụgụ ruo mgbe a chịkọtara ‘oké ìgwè mmadụ’ ahụ.” A kpụziwo ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ ilekọta nchịkọbata nke oké ìgwè mmadụ ahụ. A ghaghịkwa ịkpụzi ndị a ugbu a.c
20. Mgbanwe ndị dị aṅaa nke nhazi werewooro ọnọdụ kemgbe 1942?
20 Na January 1942, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu, Joseph Rutherford nwụrụ, Nathan Knorr nọchikwara ya dị ka onyeisi oche. A na-eji mmasị echeta onyeisi oche nke atọ nke Society maka iguzobe ụlọ akwụkwọ ọchịchị Chineke dị iche iche n’ime ọgbakọ nakwa Ụlọ Akwụkwọ Gilead maka ịzụ ndị ozi ala ọzọ. Na 1944, ná nzukọ Society na-eme kwa afọ, o kwuru na a na-agbanwe akwụkwọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ Society ka iso na ya wee ghara ịdabere n’onyinye ihe onwunwe, kama n’ọnọdụ ime mmụọ. N’ime afọ 30 sochirinụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-arụ ọrụ n’ubi rịrị elu site na 156,299 ruo 2,179,256 gburugburu ụwa. Na 1971-1975, imekwu mgbanwe nke nhazi dị mkpa. Otu onye na-eje ozi dị ka onyeisi oche apụghịzi ilekọta ọrụ Alaeze ahụ n’ụzọ dị mma gburugburu ụwa. A mụbara Òtù Na-achị Isi, nke na-enwe onyeisi oche na-agbanwe agbanwe, gaa n’inwe ndị òtù 18 e tere mmanụ, bụ́ ndị ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na otu ọkara n’ime ha ejesịwo ozi ha n’elu ala ugbu a.
21. Gịnị meworo ka ndị so n’ìgwè atụrụ nta ahụ ruo eru maka Alaeze ahụ?
21 A kpụziwo ihe fọdụrụ n’ime ìgwè atụrụ nta ahụ site n’ọtụtụ afọ iri nke ọnwụnwa. Ha nwere ezi obi ike, ebe ha nwetaworo ‘ịgba àmà nke mmụọ nsọ’ n’ụzọ doro anya. Jisọs agwawo ha, sị: “Unu onwe unu bụ ndị soworo m n’ọnwụnwa m nile; Mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m, ka unu wee rie ṅụọkwa na tebụl nke m n’alaeze m; unu ga-anọkwasịkwa n’ocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.”—Ndị Rom 8:16, 17; Luk 12:32; 22:28-30.
22, 23. Olee otú e si akpụzi ìgwè atụrụ nta na atụrụ ọzọ ahụ?
22 Ebe ọnụ ọgụgụ nke ihe ahụ fọdụrụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ n’ụwa belataworo, e nyewo ụmụnna tozuru okè so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ọrụ inye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọgbakọ nile gburugburu ụwa nlekọta ime mmụọ. Ka ndị ikpeazụ nke Ndịàmà e tere mmanụ bụ́ ndị kaworo nká na-ejesịkwa ozi elu ala ha, ndị isi sa·rimʹ so n’atụrụ ọzọ ahụ ga-abụworị ndị a zụrụ nke ọma ịrụ ọrụ nlekọta dị ka òtù ndị isi n’elu ala.—Ezikiel 44:3; Aịsaịa 32:1.
23 Ma ìgwè atụrụ nta ma atụrụ ọzọ ahụ na-anọgide na-abụ ndị a kpụziri ịbụ ihe ga-anara nsọpụrụ. (Jọn 10:14-16) Ma olileanya anyị ọ̀ dị ‘n’eluigwe ọhụrụ’ ma ọ bụ ‘n’ụwa ọhụrụ,’ ka anyị jiri obi dum zaghachi n’ọkpụkpọ òkù Jehova, bụ́: “Ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke: n’ihi na, lee, M na-eke Jerusalem [eluigwe] ịbụ ihe ntegharị egwú ọṅụ, ndị ya kwa, ịbụ ihe obi ụtọ.” (Aịsaịa 65:17, 18) Ka anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-adịghị ike jiri obi umeala na-eje ozi mgbe nile, na-abụ ndị a kpụziri site ‘n’ọkịka nke ike ahụ’—ike mmụọ nsọ nke Chineke!—2 Ndị Kọrint 4:7; Jọn 16:13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ka Krisendọm nupụrụ isi, nke Israel oge ochie na-ese onyinyo ya, mara maka amamikpe yiri nke ahụ site n’aka Jehova.—1 Pita 4:17, 18.
b Ọkàikpe Manton, bụ́ onye Roman Katọlik nke jụrụ ịtọhapụ Ndị Mmụta Bible ahụ n’akaebe, bụ onye e mesịrị tụọ mkpọrọ n’onwe ya, n’ịbụ onye a mara ikpe maka iri ngo.
c Na 1938 ndị bịara Ememe Ncheta gburugburu ụwa dị 73,420, mmadụ 39,225—pasent 53 nke ndị bịaranụ—keere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ. Ka ọ na-erule 1998 ọnụ ọgụgụ ahụ amụbaala ruo 13,896,312, na-enwe nanị 8,756, ndị keere òkè na ya, nkezi nke ihe na-erughị otu onye keere òkè na ya n’ọgbakọ 10 ọ bụla.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Site n’ikwenye ná mkpụzi nke Nna ya, olee otú Jisọs si bụrụ Onye Nlereanya anyị?
◻ Mkpụzi dị aṅaa weere ọnọdụ n’Israel oge ochie?
◻ Olee otú e siworo kpụzie “Israel nke Chineke” ruo ugbu a?
◻ N’ihi nzube dị aṅaa ka a kpụziworo “atụrụ ọzọ” ahụ?
[Igbe dị na peeji nke 18]
Imekwu Mkpụzi n’Ime Krisendọm
Otu ozi ụlọ ọrụ Associated Press si Atens, Gris, zipụ kọrọ ihe ndị na-esonụ banyere onyeisi Chọọchị Ọtọdọks nke Gris a họpụtara na nso nso a: “O kwesịrị ịbụ onyeozi nke udo. Ma onye ndú Chọọchị Ọtọdọks nke Gris na-eme nnọọ ka ọchịagha na-ejikere ọgụ.
“‘Anyị dị njikere, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ịwụfu ọbara ma chụọ àjà. Anyị, dị ka chọọchị, na-ekpe ekpere maka udo . . . Ma anyị na-agọzi ngwá agha dị nsọ mgbe ọ dị mkpa,’ ka Achịbishọp Christodoulos kwuru na nso nso a n’ememe ụbọchị dị nsọ nke Nrịgo nke Nwa Agbọghọ ahụ Na-amaghị Nwoke n’Eluigwe, bụ́ nke a na-emekwa dị ka ụbọchị ndị agha nke Gris.”
[Igbe dị na peeji nke 19]
“A Gaghị Etinyekwu Ihe!”
N’otu ngụsị akwụkwọ Gilead na 1970, Frederick Franz, bụ́ osote onyeisi oche nke Watch Tower Society mgbe ahụ, gwara ụmụ akwụkwọ ahụ banyere ohere e nwere na ha, bụ́ ndị socha n’atụrụ ọzọ ahụ nwere olileanya elu ala, pụrụ ime onye pụrụ ịzọrọ na ya so n’ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ, baptism. Nke a ọ̀ pụrụ ime? Ọ kọwara na Jọn Baptist so n’atụrụ ọzọ ahụ, ma o mere Jisọs na ụfọdụ ndị ozi baptism. Mgbe ahụ ọ gara n’ihu ịjụ ma à ka na-akpọ òkù maka ịchịkọtakwu ihe ahụ fọdụrụ. “Ee e, a gaghị etinyekwu ihe!” ka ọ sịrị. “Òkù ahụ jedebere laa azụ na 1931-1935! Ọ dịghị ihe a ga-etinyekwu. Olee ndị bụzi ndị ọhụrụ ole na ole ahụ bụ́ ndị na-ekere òkè n’iri ihe nnọchianya Ememe Ncheta? Ọ bụrụ na ha so n’ihe ahụ fọdụrụ, ha bụ ndị e ji dochie anya! Ha abụghị ndị a tụkwasịrị ná ndị e tere mmanụ, kama ndị e ji dochie anya ndị pụrụ ịdapụwo.”
[Foto dị na peeji nke 15]
Lee otú anyị si were ije ozi anyị dị oké ọnụ ahịa kpọrọ ihe!
[Foto dị na peeji nke 16]
Israel oge ochie ghọrọ arịa kwesịrị nanị mbibi