Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 2/15 p. 18-23
  • Ụzọ Ịhụnanya Adịghị Ada Mgbe Ọ Bụla

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Ịhụnanya Adịghị Ada Mgbe Ọ Bụla
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịhụnanya Na-enyere Anyị Aka Imeri Nganga
  • Ịhụnanya Na-eme Ka E Nwee Mmekọrịta Udo
  • Ịhụnanya Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi
  • Ịhụnanya—“Ụzọ nke Kachasị Mma”
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Ịhụnanya’
    Bịaruo Jehova Nso
  • Na-agbaso Ụzọ Kachasị Mma nke Ịhụnanya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ịhụnanya (Agape)—Ihe Ọ Na-abụghị na Ihe Ọ Bụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nwee Ịhụnanya nke Na-adịghị Ada Ada
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 2/15 p. 18-23

Ụzọ Ịhụnanya Adịghị Ada Mgbe Ọ Bụla

“Werenụ obi na-anụ ọkụ chọọ onyinye amara ndị a nke [karịrị] ukwuu. Tụkwasị ihe ndị a ana m egosikwa unu ụzọ nke kachasị mma.”—1 NDỊ KỌRINT 12:31.

1-3. (a) Olee otú ịmụta otú e si egosipụta ịhụnanya si yie nnọọ ịmụ asụsụ ọhụrụ? (b) Ihe ndị dị aṅaa pụrụ ime ka ịmụta otú e si egosipụta ịhụnanya bụrụ ihe ịma aka?

Ọ̀ DỊWO mgbe ị gbalịrị ịmụ asụsụ ọhụrụ? Ọ bụ ihe ịma aka, ma ọ dịghị ihe ọzọ! N’ezie, nwatakịrị pụrụ ịmụta asụsụ nanị site n’ịnọ ebe a na-asụ ya. Ụbụrụ ya na-amịkọrọ nnọọ ụda okwu na ihe ndị ha pụtara, nke mere na n’oge na-adịghị anya nwatakịrị ahụ na-ekwu okwu nke ọma, ikekwe na-ekwu ya n’akwụsịghị akwụsị. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’ebe ndị meworo okenye nọ. Anyị na-enyocha akwụkwọ ọkọwa okwu nke asụsụ ọzọ ugboro ugboro, nanị iji mụta nkebi okwu ole na ole ndị bụ́ isi n’asụsụ ọzọ. Otú ọ dị, ka oge na-aga, sitekwa n’ịnụ asụsụ ọhụrụ ahụ ọtụtụ ugboro, anyị na-amalite iche echiche n’asụsụ ọhụrụ ahụ, ịsụ ya na-aghọkwa ihe dị mfe karị.

2 Ịmụta otú e si egosipụta ịhụnanya yiri nnọọ ịmụ asụsụ ọhụrụ. N’eziokwu, ụmụ mmadụ ketara ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke àgwà a nke Chineke. (Jenesis 1:27; tụlee 1 Jọn 4:8.) Ma, ịmụta otú e si egosipụta ịhụnanya na-ewe mgbalị pụrụ iche—karịsịa taa, mgbe e nwere ụkọ ịhụnanya ebumpụta ụwa. (2 Timoti 3:1-5) Ọ na-adị otú a mgbe ụfọdụ n’ime ezinụlọ. Ee, ọtụtụ ndị na-etolite na gburugburu ebe obibi ebe a na-adịghị ekwukebe okwu ịhụnanya—ma ọ bụrụ na a na-ekwudịrị ya ekwu. (Ndị Efesọs 4:29-31; 6:4) Oleezi otú anyị pụrụ isi mụta igosi ịhụnanya—ọbụna ma ọ bụrụ na anyị enwetakebeghị ya?

3 Bible pụrụ inye aka. Ná 1 Ndị Kọrint 13:4-8, Pọl adịghị enye nkọwa elu elu banyere ihe ịhụnanya bụ, kama nkọwa doro anya banyere otú ụdị ịhụnanya a kasị elu si arụ ọrụ. Ntụle nke amaokwu ndị a ga-enyere anyị aka ịghọta ọdịdị nke àgwà a nke Chineke ma kwadebe anyị nke ọma karị, igosipụta ya. Ka anyị tụlee akụkụ ụfọdụ nke ịhụnanya dị ka Pọl si kọwaa ha. Anyị ga-ekewa ha gaa n’akụkụ atọ buru ibu: àgwà anyị n’ozuzu ya; mgbe ahụ, n’ụzọ a kapịrị ọnụ karị, mmekọrịta anyị na ndị ọzọ; na, n’ikpeazụ, ntachi obi anyị.

Ịhụnanya Na-enyere Anyị Aka Imeri Nganga

4. Nghọta dị aṅaa ka Bible na-enye banyere ekworo?

4 Mgbe o kwusịrị okwu mmalite ya banyere ịhụnanya, Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ, sị: “Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.” (1 Ndị Kọrint 13:4) Ekworo pụrụ igosipụta onwe ya n’inwe anyaụfụ maka ihe ịga nke ọma ma ọ bụ ihe ndị ọzọ nwetara. Ụdị ekworo ahụ na-emebi ihe—n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ mmetụta uche, na n’ụzọ ime mmụọ.—Ilu 14:30; Ndị Rom 13:13; Jemes 3:14-16.

5. Olee otú ịhụnanya pụrụ isi nyere anyị aka imeri ekworo mgbe o yiri ka e leghaara anyị anya maka ihe ùgwù ụfọdụ nke ọchịchị Chineke?

5 N’ihi nke a, jụọ onwe gị, ‘M̀ na-enwe anyaụfụ mgbe o yiri ka e leghaara m anya maka ihe ùgwù ụfọdụ nke ọchịchị Chineke?’ Ọ bụrụ na azịza ya bụ ee, enwela obi nkoropụ. Onye so dee Bible bụ́ Jemes na-echetara anyị na ‘ụzọ ekworo’ dị n’ime ụmụ mmadụ nile na-ezughị okè. (Jemes 4:5) Inwe ịhụnanya n’ebe ụmụnna gị nọ pụrụ inyere gị aka inwetaghachi ezi àgwà gị. Ọ pụrụ inyere gị aka isoro ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ, gharakwa ile ya anya dị ka mkparị n’ebe ị nọ mgbe onye ọzọ natara ngọzi ma ọ bụ ịja mma.—Tụlee 1 Samuel 18:7-9.

6. Ọnọdụ dị aṅaa dị oké njọ bilitere n’ọgbakọ Kọrint nke narị afọ mbụ?

6 Pọl na-agbakwụnye na ịhụnanya “adịghị anya isi, ọ dịghị afụli onwe ya elu.” (1 Ndị Kọrint 13:4) Ọ bụrụ na anyị nwere nkà ma ọ bụ ikike ụfọdụ, ọ dịghị mkpa iji ya eme ihe ngosi. Dị ka ihe àmà na-egosi, nke a bụ nsogbu ndị ikom ụfọdụ nwere oké ọchịchọ bụ́ ndị gbebatara n’ime ọgbakọ Kọrint oge ochie nwere. Ọ pụrụ ịbụ na ha nwere ikike ka elu n’ịkọwa echiche dị iche iche ma ọ bụ ụzọ dị irè karị nke isi na-eme ihe. Ha ime ka a hụ ha pụrụ isowo kpata nkewa e kewara ọgbakọ ahụ gaa n’akụkụ dị iche iche. (1 Ndị Kọrint 3:3, 4; 2 Ndị Kọrint 12:20) Ọnọdụ ahụ jọrọ njọ nke ukwuu nke na Pọl mesịrị baara ndị Kọrint mba maka ‘ịnagide ndị na-enweghị uche,’ bụ́ ndị Pọl ji nkatọ kọwaa dị ka “ndị kachasị elu n’etiti ndị ozi.”—2 Ndị Kọrint 11:5, 19, 20.

7, 8. Jiri Bible gosi otú anyị pụrụ isi jiri nkà ọ bụla anyị ketara mee ihe iji kwalite ịdị n’otu.

7 Ọnọdụ yiri nke ahụ pụrụ ibilite taa. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ pụrụ inwe àgwà nke itu ọnụ banyere ihe ndị ha rụzuru n’ozi ma ọ bụ ihe ùgwù ndị ha nwere ná nzukọ Chineke. Ọ bụrụgodị na anyị nwere otu nkà ma ọ bụ ikike nke ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-enweghị, nke ahụ ọ̀ ga-eme ka anyị fụlie onwe anyị elu? E kwuwerị, anyị kwesịrị iji ikike ọ bụla anyị ketara mee ihe iji kwalite ịdị n’otu—ọ bụghị onwe anyị.—Matiu 23:12; 1 Pita 5:6.

8 Pọl dere na ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ndị mejupụtara ọgbakọ, “Chineke tigwara ahụ n’otu.” (1 Ndị Kọrint 12:19-26) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “tigwara” na-egosi ngwakọta kwekọrọ ekwekọ, dị ka n’ịgwakọta ụcha dị iche iche. Ya mere ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nke kwesịrị ịfụli onwe ya elu banyere ikike ya ma gbalịa ịchịkwa ndị ọzọ. Nganga na oké ọchịchọ enweghị ọnọdụ ọ bụla ná nzukọ Chineke.—Ilu 16:19; 1 Ndị Kọrint 14:12; 1 Pita 5:2, 3.

9. Ihe atụ ịdọ aka ná ntị ndị dị aṅaa ka Bible na-enye banyere ụmụ mmadụ ndị na-achọ ọdịmma nke onwe ha?

9 Ịhụnanya “[adịghị] achọ ihe nke aka ya.” (1 Ndị Kọrint 13:5) Onye na-ahụ n’anya adịghị eji aghụghọ achịkwa ndị ọzọ iji nweta ihe ọ na-achọ. Bible nwere ihe atụ ịdọ aka ná ntị n’okwu a. Iji maa atụ: Anyị na-agụ banyere Delaịla, Jezebel, na Atalaịa—ndị inyom ji aghụghọ chịkwaa ndị ọzọ n’ihi ịchọ ọdịmma onwe ha nanị. (Ndị Ikpe 16:16; 1 Ndị Eze 21:25; 2 Ihe E Mere 22:10-12) Onye ọzọkwa bụ nwa Eze Devid bụ́ Absalọm. Ọ na-agakwuru ndị bịara Jerusalem maka ikpe ma jiri akọ gwa ha na ụlọikpe eze enweghị ezi mmasị ná nsogbu ha. Mgbe ahụ ọ na-ekwu hoo haa na ihe ụlọikpe ahụ chọrọ n’ezie bụ nwoke nwere obiọma dị ka ya! (2 Samuel 15:2-4) N’ezie, Absalọm enweghị mmasị n’ahụ ndị a na-emegbu emegbu, kama nanị n’onwe ya. N’ije ozi dị ka eze họpụtara onwe ya, ọ rafuru ọtụtụ ndị. Ma ka oge na-aga, e meriri Absalọm ajọ mmeri. Mgbe ọ nwụrụ, e leghịdị ya anya dị ka onye e kwesịrị ili n’ụzọ dị mma.—2 Samuel 18:6-17.

10. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-ele anya n’ọdịmma nke ndị ọzọ?

10 Nke a bụ ihe ịdọ aka ná ntị nye ndị Kraịst taa. Ma ànyị bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, anyị pụrụ inwe ike nrụgide ebumpụta ụwa. Ọ pụrụ ịdịrị anyị mfe inweta ihe anyị na-achọ, dị ka a pụrụ ikwu ya, site n’ekweghị ka ndị ọzọ tinye ọnụ ná mkparịta ụka ma ọ bụ site n’ime ka ike gwụ ndị nwere echiche dị iche. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị na-ahụ n’anya n’ezie, anyị ga na-ele anya n’ọdịmma nke ndị ọzọ. (Ndị Filipaị 2:2-4) Anyị agaghị na-erigbu ndị ọzọ ma ọ bụ na-akwalite echiche ndị a na-enyo enyo n’ihi amamihe anyị ma ọ bụ ọnọdụ anyị ná nzukọ Chineke, dị ka a ga-asị na echiche anyị agwụla ndị bụ ọkpọka. Kama nke ahụ, anyị ga-echeta ilu Bible bụ́: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.”—Ilu 16:18.

Ịhụnanya Na-eme Ka E Nwee Mmekọrịta Udo

11. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi ịhụnanya nke dị ma obiọma ma nke na-eme ihe dị mma n’anya? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị adịghị aṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume?

11 Pọl dekwara na ịhụnanya nwere “obiọma” nakwa na ọ “dịghị eme ihe na-adịghị mma n’anya.” (1 Ndị Kọrint 13:4, 5) Ee, ịhụnanya agaghị ekwe ka anyị mee ihe n’ụzọ enweghị nsọpụrụ, nke jọgburu onwe ya, ma ọ bụ n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù. Kama nke ahụ, anyị ga-echebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche. Dị ka ihe atụ, onye na-ahụ n’anya ga-ezere ime ihe ndị ga-enye akọ na uche ndị ọzọ nsogbu. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 8:13.) Ịhụnanya “[adịghị] aṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume, ma ọ na-eso eziokwu ṅụrịkọọ ọṅụ.” (1 Ndị Kọrint 13:6) Ọ bụrụ na anyị hụrụ iwu Jehova n’anya, anyị agaghị agbachi omume rụrụ arụ nkịtị ma ọ bụ na-enweta obi ụtọ n’ihe ndị Chineke kpọrọ asị. (Abụ Ọma 119:97) Ịhụnanya ga-enyere anyị aka ịchọta ọṅụ n’ihe ndị na-ewuli elu kama ịbụ n’ihe ndị na-akwada akwada.—Ndị Rom 15:2; 1 Ndị Kọrint 10:23, 24; 14:26.

12, 13. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe mmadụ mejọrọ anyị? (b) Hota ihe atụ ndị dị na Bible iji gosi na ọbụna iwe ziri ezi pụrụ ime ka anyị mee omume n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya.

12 Pọl na-ede na “oké iwe adịghị ewe” ịhụnanya (“ọ dịghị ewe iwe ngwa ngwa,” Phillips). (1 Ndị Kọrint 13:5) N’eziokwu, ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị anyị bụ́ mmadụ na-ezughị okè inwe obi ilu ma ọ bụ iwetụ iwe mgbe mmadụ mejọrọ anyị. Otú ọ dị, ọ ga-adị njọ iburu iwe n’obi ruo ogologo oge ma ọ bụ ịnọgide ná mkpasu iwe. (Abụ Ọma 4:4; Ndị Efesọs 4:26) Ọ bụrụ na a chịkwaghị ya, ọbụna iwe ziri ezi pụrụ ime ka anyị mee ihe n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya, anyị pụkwara ịza ajụjụ n’ihu Jehova maka nke a.—Jenesis 34:1-31; 49:5-7; Ọnụ Ọgụgụ 12:3; 20:10-12; Abụ Ọma 106:32, 33.

13 Ụfọdụ ekwewo ka ezughị okè ndị ọzọ metụta mkpebi ha ịga nzukọ ndị Kraịst ma ọ bụ ikere òkè n’ozi ubi. N’oge gara aga, ọtụtụ n’ime ndị a gbasiri mgba ike maka okwukwe ahụ, ikekwe na-atachi obi ná mmegide ezinụlọ, akaje sitere n’aka ndị ọrụ ibe ha, na ihe ndị yiri ha. Ha tachiri obi n’ihe mgbochi ndị dị otú ahụ n’ihi na ha lere ha anya dị ka ule nke iguzosi ike n’ezi ihe, ha zikwara ezi. Ma gịnị na-eme mgbe onye Kraịst ibe ha kwuru ma ọ bụ mee ihe n’egosighị ịhụnanya? Nke a ọ̀ bụghịkwa ule nke iguzosi ike n’ezi ihe? N’ezie ọ bụ, n’ihi na ọ bụrụ na anyị anọgide ná mkpasu iwe, anyị pụrụ ‘inye ekwensu ụzọ.’—Ndị Efesọs 4:27.

14, 15. (a) Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘ịgụ ihe ọjọọ e mere gị’? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jehova n’ịgbaghara mmehie?

14 N’inwe ezi ihe kpatara ya, Pọl na-agbakwụnye na ịhụnanya “[adịghị] agụ ihe ọjọọ e mere ya.” (1 Ndị Kọrint 13:5) N’ebe a o ji okwu e ji eme ihe n’ime ndekọ ego mee ihe, ihe àmà na-egosi na ọ bụ iji nye echiche nke àgwà idetu mmejọ ahụ n’akwụkwọ ndekọ ihe ka e wee ghara ichezọ ya. Ọ̀ bụ ihe ịhụnanya dị na ya idetu n’uche anyị n’ụzọ na-adịgide adịgide okwu ọjọọ ma ọ bụ mkpasu iwe ahụ, dị ka a ga-asị na ọ ga-adị anyị mkpa izo aka na ya n’ọdịnihu? Lee ka anyị pụrụ isi nwee obi ụtọ na Jehova adịghị enyocha anyị n’ụzọ enweghị obi ebere dị otú ahụ! (Abụ Ọma 130:3) Ee, mgbe anyị gosiri nchegharị, ọ na-ehichapụ njehie anyị.—Ọrụ 3:19.

15 Anyị pụrụ iṅomi Jehova n’akụkụ a. Anyị ekwesịghị iwe iwe ngwa ngwa gabiga ókè mgbe o yiri ka mmadụ ò mejọrọ anyị. Ọ bụrụ na anyị na-adị ngwa n’iwe iwe, anyị pụrụ ịdị na-akpasu onwe anyị iwe n’ụzọ kakwu mie emie karịa otú onye ahụ kpasuru anyị iwe pụrụ ime. (Eklisiastis 7:9, 22) Kama nke ahụ, ọ dị anyị mkpa icheta na ịhụnanya “na-ekwere ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:7) N’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ka a ghọgbuo ya, ma anyị ekwesịghịkwa ịdị na-enyo ebumnobi ụmụnna anyị enyo n’ụzọ na-adịghị mkpa. N’ebe ọ bụla o kwere mee, ka anyị were ya na ibe anyị ebughị ihe ọjọọ n’obi.—Ndị Kọlọsi 3:13.

Ịhụnanya Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

16. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka ịhụnanya pụrụ inyere anyị aka inwe ogologo ntachi obi?

16 Pọl na-agwazi anyị na “ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi.” (1 Ndị Kọrint 13:4) Ọ na-enyere anyị aka idi ọnọdụ ndị bụ́ ule, ikekwe ruo ogologo oge. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị Kraịst ebiwo n’ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe ruo ọtụtụ afọ. Ndị ọzọ bụ ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye, ọ bụghị na ọ bụ ihe ha chọrọ, kama n’ihi na ha enwebeghị ike ịchọta onye òtù ọlụlụ kwesịrị ekwesị “n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39; 2 Ndị Kọrint 6:14) Mgbe ahụ e nwere ndị ha na nsogbu ahụ ike na-alụ. (Ndị Galetia 4:13, 14; Ndị Filipaị 2:25-30) N’ezie, n’usoro ihe a na-ezughị okè, ọ dịghị onye nwere ọnọdụ na-achọghị ụdị ụfọdụ nke ntachi obi ná ndụ.—Matiu 10:22; Jemes 1:12.

17. Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ihe nile?

17 Pọl na-emesi anyị obi ike na ịhụnanya “na-anagide ihe nile, . . . na-ele anya ihe nile, na-enwe ntachi obi n’ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:7) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-eme ka anyị nwee ike ịnagide ọnọdụ ọ bụla n’ihi ezi omume. (Matiu 16:24; 1 Ndị Kọrint 10:13) Anyị adịghị achọ ka e gbuo anyị n’ihi okwukwe anyị. Kama nke ahụ, nzube anyị bụ ibi ndụ n’udo, nke dị jụụ. (Ndị Rom 12:18; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:11, 12) Otú o sina dị, mgbe ule nke okwukwe bilitere, anyị na-eji ọṅụ atachi obi na ha dị ka ihe so n’ihe iso ụzọ ndị Kraịst na-efu. (Luk 14:28-33) Ka anyị na-atachi obi, anyị na-agbalị ịnọgide na-enwe nchekwube, na-ele anya maka ihe kasị mma ga-esi n’ime ọnọdụ ndị tara akpụ pụta.

18. Olee otú ntachi obi si dị mkpa ọbụna n’oge kwesịrị ekwesị?

18 Ọ bụghị nanị mkpagbu bụ ọnọdụ na-achọ ntachi obi. Mgbe ụfọdụ, ịtachi obi pụtara nanị ịnọte aka, ịnọgide n’otu ụzọ ma ọnọdụ ndị tara akpụ hà dị ma ọ bụ na ha adịghị. Ntachi obi na-agụnye ịnọgide na-enwe usoro ihe omume ime mmụọ dị mma. Dị ka ihe atụ, ị̀ na-ekere òkè buru ibu n’ozi, dị ka ọnọdụ gị si dị? Ị̀ na-agụ ma na-atụgharị uche n’Okwu Chineke, sorokwa Nna gị nke eluigwe na-enwe nkwurịta okwu site n’ekpere? Ị̀ na-agachi nzukọ ọgbakọ anya, ị̀ na-eritekwa uru site ná mgbarịta ume nke gị na ndị kwere ekwe ibe gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ma ị̀ nọ ugbu a n’oge kwesịrị ma ọ bụ n’oge na-ekwesịghị, ị na-atachi obi. Ike agwụla gị, “n’ihi na anyị ga-enweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.”—Ndị Galetia 6:9.

Ịhụnanya—“Ụzọ nke Kachasị Mma”

19. Olee otú ịhụnanya si bụrụ “ụzọ nke kachasị mma”?

19 Pọl mesiri ịdị mkpa nke igosi ịhụnanya ike site n’ịkpọ àgwà a nke Chineke “ụzọ nke kachasị mma.” (1 Ndị Kọrint 12:31) Ọ̀ “kachasị mma” n’echiche dị aṅaa? Pọl ka depụtachara onyinye nke mmụọ nsọ, bụ́ ndị jupụtara n’etiti ndị Kraịst narị afọ mbụ. E nyere ụfọdụ ike ibu amụma, e nyere ndị ọzọ ike ịgwọ ọrịa, e nyere ọtụtụ ike ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Onyinye ndị dị ịtụnanya n’ezie! Ma, Pọl gwara ndị Kọrint, sị: “A sị na eji m asụsụ dị iche iche nke mmadụ na nke ndị mmụọ ozi na-ekwu okwu, ma enweghị m ịhụnanya, aghọwo m ọla na-ara ara, ma ọ bụ ájà ọla na-ada ụda. A sịkwa na enwere m onyinye ibu amụma, matakwa ihe omimi nile na ihe ọmụma nile; a sịkwa na enwere m okwukwe nile, nke mere m ga-enwe ike ibubiga ugwu, ma enweghị m ịhụnanya, abụghị m ihe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:1, 2) Ee, ọbụna omume ndị pụrụ ịba uru na-aghọ ‘ọrụ nile nwụrụ anwụ’ ma ọ bụrụ na ebumnobi e ji mee ha abụghị ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi.—Ndị Hibru 6:1.

20. N’ihi gịnị ka ịnọgide na-eme mgbalị ji dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-azụlite ịhụnanya?

20 Jisọs na-enye anyị ihe ọzọ mere anyị kwesịrị iji zụlite àgwà Chineke bụ́ ịhụnanya. “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m,” ka o kwuru, “ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Okwu ahụ bụ́ “ọ bụrụ” na-ahapụrụ ya onye Kraịst ọ bụla ikpebi ma ọ̀ ga-amụta igosipụta ịhụnanya. E kwuwerị, nanị ibi ná mba ọzọ agaghị amanye anyị ịmụta asụsụ ya. Nanị ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ isoro ndị Kraịst ibe anyị na-akpakọrịta agaghịkwa akụziri anyị ịnọkata gosiwa ịhụnanya. Ịmụta “asụsụ” a na-ewe mgbalị a nọgidere na-eme.

21, 22. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume ma ọ bụrụ na anyị adịghị emezu akụkụ ụfọdụ nke ịhụnanya Pọl tụlere? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ isi kwuo na “ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla”?

21 Mgbe ụfọdụ, ị gaghị emezucha akụkụ ụfọdụ nke ịhụnanya Pọl tụlere. Ma adala mbà. Jiri ndidi nọgide na-eme ya. Nọgide na-amụ Bible ma na-etinye ụkpụrụ ya n’ọrụ ná mmeso ị na-emeso ndị ọzọ. Ya adịla mgbe ị ga-echezọ ihe nlereanya ahụ Jehova n’onwe ya setịpụụrụ anyị. Pọl dụrụ ndị Efesọs ọdụ, sị: “Nwerịtanụ obiọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke weerekwara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.”—Ndị Efesọs 4:32.

22 Ọbụna dị ka ịmụta ikwu okwu n’asụsụ ọhụrụ na-emesị dị mfe karị, ka oge na-aga o yikarịrị ka ị ga-achọpụta na igosi ịhụnanya ga-adị mfe karị. Pọl na-emesi anyị obi ike na “ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:8) N’adịghị ka onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ, ọ dịghị mgbe ịhụnanya ga-akwụsị ịdị. Ya mere nọgide na-amụ igosipụta àgwà a nke Chineke. Ọ bụ, dị ka Pọl kpọrọ ya, “ụzọ nke kachasị mma.”

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Olee otú ịhụnanya pụrụ isi nyere anyị aka imeri nganga?

◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ịhụnanya pụrụ isi nyere anyị aka ịkwalite udo n’ime ọgbakọ?

◻ Olee otú ịhụnanya pụrụ isi nyere anyị aka ịtachi obi?

◻ Olee otú ịhụnanya si bụrụ “ụzọ nke kachasị mma”?

[Foto dị na peeji nke 19]

Ịhụnanya ga-enyere anyị aka ileghara mmejọ nke ndị kwere ekwe ibe anyị anya

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ntachi obi pụtara ịnọgidesi ike n’usoro ihe omume ọchịchị Chineke anyị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya