Nsogbu Ndị Pụrụ Iche nke Ezinụlọ Nkuchi
EZINỤLỌ NKUCHI NDỊ NA-ENWE OBI ỤTỌ GA-EKWE OMUME! N’ỤZỌ DỊ AṄAA?
Ezinụlọ nkuchi aghọwo ụdị ezinụlọ a na-ahụkarị n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Ma, ezinụlọ nkuchi nwere nsogbu ndị pụrụ iche. Obi abụọ adịghị ya na nke kasị bụrụ ihe ịma aka bụ ịzụ ụmụ. Otú ọ dị, dị ka isiokwu abụọ na-esonụ ga-agbalị igosi, ọ ga-ekwe omume ịzụ ụmụ n’ụzọ gara nke ọma n’ime ezinụlọ nkuchi.
KEMGBE ỤWA, E KWUWO OKWU ỌJỌỌ BANYERE NDỊ NNE NA NNA NKUCHI. MGBE ANYỊ BỤ ỤMỤNTA-kịrị, ọtụtụ n’ime anyị nụrụ ụdị akụkọ ifo ụfọdụ banyere Cinderella, bụ́ onye hụsiri anya n’aka nne nkuchi ya nwere obi ọjọọ. Ụmụntakịrị nọ na Europe na-amụtakwa akụkọ ifo bụ́ Snow White and the Seven Dwarfs (Snow White na Ndị Akakpọ Asaa Ahụ). Nne nkuchi Snow White mesịrị ghọọ amoosu dị obi ọjọọ!
Akụkọ ifo ndị dị otú ahụ hà na-enye echiche ziri ezi banyere ezinụlọ nkuchi? Ndị nne ma ọ bụ nna nkuchi nile hà dịcha njọ otú ahụ n’ezie? Ee e. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-achọ nanị ihe kasị mma maka ụmụntakịrị ndị ha nwetara site n’alụmdi na nwunye. Ma ha aghaghị iche ụfọdụ nsogbu ndị tara akpụ ihu bụ́ ndị na-adị ná ndụ ezinụlọ nkuchi.
Nsogbu nke Ịzụ Ụmụ
Mgbe alụmdi na nwunye nke mbụ dakpọrọ, ihe na-akpatakarị ya bụ etozughị okè nke di na nwunye ahụ. N’alụmdi na nwunye nke abụọ, iso ụmụntakịrị mekọọ ihe pụrụ ime ka mmekọrịta ahụ taa akpụ. Ihe ndekọ ụfọdụ na-egosi na ihe karịrị 4 n’ime ezinụlọ nkuchi 10 na-ejedebe n’ịgba alụkwaghịm n’ime afọ ise mbụ ha.
Ndị ahụ gbara akwụkwọ ọhụrụ nwere ike ghara ịghọta oké nsogbu mmetụta uche, amaghị onye a ga-akwado, na mmetụta nke ekworo na iwe nke ọbịbịa nke nne ma ọ bụ nna nkuchi ahụ na-akpali n’ime ụmụntakịrị ahụ. Ụmụntakịrị a nwere ike iche na nne ma ọ bụ nna mụrụ ha hụrụ nne ma ọ bụ nna nkuchi ha n’anya karịa ha. Ọzọkwa, o nwere ike isiri nne ma ọ bụ nna mụrụ ụmụ bụ́ onye onye òtù ọlụlụ ya gbahapụrụ ike ịghọta nkekọ dị adị nke ụmụaka ahụ nwere n’ebe onye òtù ọlụlụ mbụ ya nọ. Otu nwa okoro gbalịrị ịkọwa ezi mmekọrịta ya na nna mụrụ ya nwere, na-asị: “Mama, amaara m na papa m mesoro gị n’ụzọ dị njọ, ma ọ na-emeso m nke ọma!” Okwu dị otú ahụ, ọ bụ ezie na e kwuru ya n’ezi obi, pụrụ ime ka onye bụ́ nne wesa nna nwa ahụ iwe dị ọkụ.
Otu nna nkuchi kwupụtara, sị: “Adịghị m njikere n’ezie ilebara nsogbu nile metụtara ịzụlite ụmụ nkuchi m anya. Abanyere m n’ọnọdụ ahụ na-eche na ugbu a m lụrụla nne ha, abụzi m nna ha. Ọ dị m nnọọ mfe n’anya! Aghọtaghị m nkekọ ụmụntakịrị ahụ nwere n’ebe nna mụrụ ha nọ, emehiekwara m ọtụtụ ihe.”
Esemokwu pụrụ ibilite karịsịa n’ihe banyere ịdọ aka ná ntị. Ịdọ aka ná ntị ịhụnanya dị ụmụntakịrị mkpa, ma ha na-enupụkarị isi na ya ọbụna mgbe o sitere n’aka onye mụrụ ha. Lee ka o si sie ike karị ịnara ya n’aka nne ma ọ bụ nna nkuchi! Dị ka a na-ahụkarị, mgbe e nyere ya ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ, nwa nkuchi ga-ekwu ihe dị ka, “Ị bụghị nna m n’ezie!” Lee ka okwu dị otú ahụ pụrụ isi bụrụ ihe na-egbu mmụọ nye nne ma ọ bụ nna nkuchi nwere ezi ebumnobi!
À pụrụ ịzụlite ụmụntakịrị n’ụzọ gara nke ọma n’ezinụlọ nwere nne ma ọ bụ nna nkuchi? Ndị nne na nna nkuchi hà pụrụ ikere òkè dị mkpa n’iwulite ezinụlọ nkuchi gara nke ọma? Azịza nye ajụjụ abụọ ahụ bụ ee ma ọ bụrụ na ndị nile o metụtara agbasoo ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible.
[Foto dị na peeji nke 3]
“Ị bụghị nna m n’ezie!”