Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 3/1 p. 4-7
  • Ezinụlọ Nkuchi Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezinụlọ Nkuchi Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Àgwà Bụ́ Isi
  • Onye nke Mụrụ Nwa
  • Ịdọ Aka ná Ntị —Okwu Chọrọ Mkpachapụ Anya
  • Ọ Dị Ndị Nne na Nna Mkpa Ikwurịta Okwu
  • Ime Ka Ịdị n’Otu Ezinụlọ Sikwuo Ike
  • Nsogbu Ndị Pụrụ Iche nke Ezinụlọ Nkuchi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Papa M Lụgharịa Nwunye ma Ọ Bụ Mama M Lụgharịa Di, Gịnị Ka M Ga-eme?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Gị
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Otú I Kwesịrị Isi Na-emeso Ụmụ Di Gị Ma Ọ Bụ Ụmụ Nwunye Gị Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 3/1 p. 4-7

Ezinụlọ Nkuchi Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma

À PỤRỤ INWE EZINỤLỌ NKUCHI NDỊ NA-ENWE IHE ỊGA NKE ỌMA? EE, KARỊSỊA MA Ọ BỤRỤ NA NDỊ nile o metụtara echeta na “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) Mgbe mmadụ nile na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ihe ịga nke ọma na-afọ nke nta ka ọ bụrụ ihe e ji n’aka.

Àgwà Bụ́ Isi

Bible depụtara nanị iwu ole na ole n’ezie ịchịkwa mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ihe ka ukwuu n’ime ha na-agba ume ịzụlite àgwà na omume ọma ndị na-eduzi anyị ime ihe n’ụzọ amamihe. Omume na àgwà ọma ndị dị otú ahụ bụ ihe ndabere nke ndụ ezinụlọ obi ụtọ.

Ọ pụrụ iyi ihe pụtara ìhè, ma otú o sina dị, o kwesịrị ekwesị ikwu na àgwà bụ́ isi a chọrọ ka ezinụlọ ọ bụla wee nwee ihe ịga nke ọma bụ ịhụnanya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka ịhụnanya [unu] bụrụ ihe nke ihu abụọ na-adịghị n’ime ya. . . . N’akụkụ ịhụnanya unu n’ebe ụmụnna unu nọ, ka ihe mmadụ ibe unu na-atọrịta unu ụtọ nke ukwuu.” (Ndị Rom 12:9, 10) A na-ejikarị okwu ahụ bụ́ “ịhụnanya” eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ma àgwà Pọl na-ezo aka na ya n’ebe a pụrụ iche. Ọ bụ ịhụnanya Chineke, ọ ‘dịghịkwa ada mgbe ọ bụla.’ (1 Ndị Kọrint 13:8) Bible na-akọwa ya dị ka nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị na nke dị njikere ije ozi. Ọ na-arụsi ọrụ ike maka ọdịmma ndị ọzọ. Ọ na-enwe ndidi na obiọma, ọ dịghị ekwo ekworo, etu ọnụ, ma ọ bụ dị mpako mgbe ọ bụla. Ọ dịghị achọ ọdịmma nke aka ya. Ọ na-adị njikere mgbe nile idi mmejọ nke ndị ọzọ, ịtụkwasị obi, inwe olileanya, na ịtachi obi n’ihe ọ bụla dapụtaranụ.—1 Ndị Kọrint 13:4-7.

Ezi ịhụnanya na-enye aka idozi esemokwu, na-emekwa ka ndị nwere nzụlite na àgwà ndị dị nnọọ iche dị n’otu. Ọ na-enyekwa aka igbochi mmetụta na-ebibi ihe nke ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ ọnwụ nke onye mụrụ mmadụ. Otu nwoke nke ghọrọ nna nkuchi na-akọwa ihe ndị bụ́ nsogbu ya n’ezie, sị: “Ana m enwekarị oké nchegbu banyere mmetụta m, si otú a leghara mmetụta uche nke ụmụ nkuchi m ma ọ bụ ọbụna nke nwunye m anya. Amụtara m ibelata ịbụ onye a na-akpasu iwe ngwa ngwa. Nke kasị mkpa, amụtara m ịdị obi umeala.” Ịhụnanya nyeere ya aka ime mgbanwe ndị dị mkpa.

Onye nke Mụrụ Nwa

Ịhụnanya pụrụ inye aka n’ileba anya ná mmekọrịta nke ụmụntakịrị na onye mụrụ ha nke na-anọghịzi ya. Otu nna nkuchi na-ekwu obi ya, sị: “Achọrọ m ka ụmụ nkuchi m hụ m n’anya karị. Mgbe ha letara nna mụrụ ha, ọ na-esiri m ike iguzogide ọnwụnwa nke ịkatọ ya. Ụbọchị ha na ya nọrịsịrị nke ọma wee lọta, ọ na-ewute m nke ukwuu. Ụbọchị ha na-anọrịghị nke ọma, ana m aṅụrị ọṅụ. N’ezie, ana m atụ egwu ịbụ onye ha na-ahụkwaghị n’anya. Otu n’ime ihe ndị kasị siere m ike bụ ịghọta ịdị mkpa nke òkè nna mụrụ ha na-ekere ná ndụ ụmụ nkuchi m.”

Ezi ịhụnanya nyeere nna nkuchi a aka iche eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya ịhụnanya bịara “ozugbo” ihu. O kwesịghị inwewo mmetụta nke ịbụ onye a jụrụ ajụ mgbe ụmụntakịrị ahụ na-anabataghị ya ozugbo. Ọ bịara ghọta na ya nwere ike ghara ịnọchi anya nna mụrụ ụmụntakịrị ahụ kpam kpam n’obi ha. Ụmụntakịrị ahụ amatawo nwoke a site na mgbe a mụrụ ha, ebe nna nkuchi ahụ bụ onye bịara ọhụrụ nke na-aghaghị ịrụ ọrụ iji nweta ịhụnanya ụmụntakịrị ahụ. Onye nchọpụta bụ́ Elizabeth Einstein gosipụtara ahụmahụ nke ọtụtụ ndị mgbe ọ na-ekwu, sị: “A pụghị idochi anya nna ma ọ bụ nne nke mụrụ mmadụ—a pụghị mgbe ọ bụla. Ọbụna nne ma ọ bụ nna nke nwụworonụ ma ọ bụ nke gbahapụworo ụmụ ya ka nwere ọnọdụ dị mkpa n’ime ndụ ụmụntakịrị ahụ.”

Ịdọ Aka ná Ntị —Okwu Chọrọ Mkpachapụ Anya

Bible na-egosi na ịdọ aka ná ntị ịhụnanya dị ndị na-eto eto oké mkpa, nke ahụ na-agụnyekwa ụmụ nkuchi. (Ilu 8:33) Ọtụtụ ndị ọkachamara amalitela ikwenye n’ihe Bible na-ekwu banyere nke a. Prọfesọ Ceres Alves de Araújo kwuru, sị: “Site n’okike ọ dịghị onye na-achọ ka a kpaara ya ókè, ma ọ dị mkpa. ‘Ee e’ bụ okwu nchebe.”

Otú ọ dị, n’ezinụlọ nkuchi, echiche ndị e nwere banyere ịdọ aka ná ntị pụrụ ịkpata oké nkewa. Ụmụaka e kuchiri ekuchi abụrụwo ndị onye meworo okenye nke na-anọghịzi ya kpụziri ruo n’ókè ụfọdụ. Ma eleghị anya, ha nwere àgwà ma ọ bụ omume e ji mara ha nke pụrụ ịkpasu nne ma ọ bụ nna nkuchi ahụ iwe. Ikekwe ha adịghịkwa aghọta ihe mere nne ma ọ bụ nna nkuchi ahụ ji ekwesi olu ike n’okwu ụfọdụ. Olee otú a pụrụ isi mee ihe banyere ọnọdụ ahụ n’ụzọ gara nke ọma? Pọl na-agba ndị Kraịst ume, sị: “Na-agbaso . . . ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ.” (1 Timoti 6:11) Ịhụnanya ndị Kraịst na-enyere ma nne ma ọ bụ nna nkuchi ma ụmụntakịrị aka ịdị nwayọọ na inwe ndidi ka ha na-amụ ịghọta ibe ha. Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna nkuchi adịghị enwe ndidi, ‘ọnụma, iwe, na nkwulu’ pụrụ ibibi mmekọrịta ọ bụla e nwetaworo ngwa ngwa.—Ndị Efesọs 4:31.

Maịka onye amụma nyere nghọta nke ihe ga-enye aka na nke a. O kwuru, sị: “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” (Maịka 6:8) Ikpe ziri ezi dị oké mkpa mgbe a na-enye ịdọ aka ná ntị. Ma gịnị banyere obiọma? Otu onye Kraịst bụ́ okenye na-akọ na ọ na-esikarịrị ya ike ịkpọte ụmụ nkuchi ya n’ụra n’ụtụtụ Sunday iji kere òkè n’ofufe ọgbakọ. Kama ịbara ha mbá, o ji obiọma soro ha. Ọ na-ebili n’oge, kwadebe nri ụtụtụ, mgbe ahụ wegara nke ọ bụla n’ime ha ihe ọṅụṅụ dịtụ ọkụ. N’ihi ya, ha nwere mmasị ka ukwuu ige ntị n’arịrịọ ya maka ibili n’ụra.

Prọfesọ Ana Luisa Vieira de Mattos kwuru okwu na-esonụ nke na-akpali mmasị, sị: “Ihe dị mkpa abụghị ụdị ezinụlọ ọ bụ kama ọ bụ otú mmekọrịta ahụ dị. N’ihe ọmụmụ m, achọpụtawo m na ndị na-eto eto bụ́ ndị nwere nsogbu akparamàgwà fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha na-esikarị n’ezinụlọ ndị a na-enwekebeghị nlekọta nke ndị nne na nna, ebe ndị a na-enweghị ụkpụrụ nduzi na nkwurịta okwu.” O kwukwara, sị: “E kwesịrị nnọọ imesi ya ike na ịzụ ụmụntakịrị na-agụnye mkpa ọ dị ịsị ee e.” Tụkwasị na nke a, Dr. Emily Visher na Dr. John Visher kwuru, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, ịdọ aka ná ntị na-adị irè nanị mgbe onye a na-adọ aka ná ntị na-eche banyere mmeghachi omume nke onye ahụ na-enye ịdọ aka ná ntị na mmekọrịta nke ya na ya.

Okwu ndị a bụ banyere onye kwesịrị inye ịdọ aka ná ntị n’ezinụlọ nkuchi. Ònye kwesịrị ịsị ee e? Mgbe ha kwurịtasịrị ya, ụfọdụ ndị nne na nna ekpebiwo na, iji malitegodị, onye nke mụrụ ụmụntakịrị ahụ kwesịrị ịbụ onye bụ́ isi na-enye ịdọ aka ná ntị iji nye nne ma ọ bụ nna nkuchi ahụ ohere iso ụmụntakịrị ahụ nwee mmekọrịta kakwu chie anya. Mee ka ụmụntakịrị ahụ mụta inwe obi ike na nne ma ọ bụ nna nkuchi ha hụrụ ha n’anya tupu ọ na-enye ha ịdọ aka ná ntị.

Gịnị ma ọ bụrụ na onye nkuchi ahụ bụ nna? Bible ó kwughị na nna bụ onyeisi ezinụlọ? Ee. (Ndị Efesọs 5:22, 23; 6:1, 2) Otú ọ dị, nna nkuchi nwere ike ịchọ ikenye nwunye ya ọrụ ịdọ aka ná ntị ruo oge ụfọdụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ gụnyere inye ntaramahụhụ. Ọ pụrụ ikwe ka ụmụntakịrị ahụ rube isi ‘n’iwu nne ha’ ka ya onwe ya na-atọ ntọala maka ha ‘ịnụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna [ọhụrụ] ha.’ (Ilu 1:8; 6:20; 31:1) Ihe àmà na-egosi na, n’ikpeazụ, nke a adịghị emegide ụkpụrụ ịbụisi. Tụkwasị na nke a, otu nna nkuchi na-ekwu, sị: “Echetara m na ịdọ aka ná ntị na-agụnye ndụmọdụ, mgbazi, na ịba mbá. Mgbe e ji ụzọ ikpe ziri ezi, ịhụnanya, na ọmịiko nye ya ma jiri ihe nlereanya nne na nna kwadoo ya, ọ na-adịkarị irè.”

Ọ Dị Ndị Nne na Nna Mkpa Ikwurịta Okwu

Ilu 15:22 na-asị: “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị.” N’ezinụlọ nkuchi, okwu nzuzo nne na nna na-ekwurịta n’ụzọ dị jụụ, n’ezoghịkwa ọnụ, dị oké mkpa. Otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ bụ́ O Estado de S. Paulo kwuru, sị: “Ụmụntakịrị na-eyikarị ka hà na-anwale ókè ndị nne na nna na-akpara ha.” Nke ahụ nwere ike ịbụ eziokwu okpukpu abụọ n’ezinụlọ nkuchi. N’ihi ya, ọ dị ndị nne na nna mkpa ikwekọrịta n’okwu dị iche iche ka ụmụntakịrị ahụ wee hụ na ha dị n’otu. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna nkuchi emee ihe n’ụzọ onye nke mụrụ ụmụntakịrị ahụ na-eche na o zighị ezi? Mgbe ahụ mmadụ abụọ ahụ kwesịrị idozi okwu ahụ nanị ha, ọ bụghị n’ihu ụmụntakịrị ahụ.

Otu nne nke lụgharịrị di na-akọ, sị: “Ihe kasị esiri onye bụ́ nne ike bụ ịhụ ka nna nkuchi na-adọ ụmụ ya aka ná ntị, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ na-eche na nna nkuchi ahụ na-eme ihe ọkụ ọkụ ma ọ bụ na ọ dịghị eme ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi n’ezie. Ọ na-agbari ya obi, ọ na-achọkwa ịgbachitere ụmụ ya. N’oge ndị dị otú ahụ, ọ na-esi ike mmadụ ịnọgide na-edo onwe ya n’okpuru di ya ma na-akwado ya.

“N’otu oge, ụmụ m ndị nwoke abụọ bụ́ ndị dị afọ 12 na 14, rịọrọ ka nna nkuchi ha nye ha ikike ime otu ihe. Ọ jụrụ ozugbo ma si n’ime ụlọ ahụ pụọ n’enyeghị ụmụaka ahụ ohere ọ bụla ịkọwa ihe mere arịrịọ ahụ ji dị ha mkpa. Ụmụaka ahụ chọrọ ibe ákwá, o nyeghịkwa m ọnụ okwu. Nke okenye lere m anya ma kwuo, sị: ‘Mama, ị̀ hụrụ ihe o mere?’ Azara m, sị: ‘Ee, ahụrụ m ya. Ma ọ ka bụ onyeisi ezinụlọ a, Bible gwakwara anyị ka anyị kwanyere ịbụisi ùgwù.’ Ha bụ ezigbo ụmụaka, ha kwekwaara nke a, iwe ha dajụkwara nke nta. N’otu abalị ahụ, akọwaara m di m ihe ụfọdụ, ọ ghọtakwara na ya emewo ihe n’aka ike. Ọ banyere ozugbo n’ime ụlọ ụmụaka ahụ ma rịọ ha mgbaghara.

“Anyị mụtara ọtụtụ ihe site n’ihe ahụ merenụ. Di m mụtara ige ntị tupu ọ na-eme mkpebi. Amụtara m irube isi n’ụkpụrụ ịbụisi, ọbụna mgbe ọ na-ewute m. Ụmụaka ahụ mụtara ịdị mkpa nke ido onwe ha n’okpuru. (Ndị Kọlọsi 3:18, 19) Mgbaghara si n’obi di m rịọrọ kụzikwaara anyị nile ihe mmụta dị mkpa n’ịdị umeala n’obi. (Ilu 29:23) Taa, ụmụaka abụọ ahụ bụ ndị Kraịst bụ́ ndị okenye.”

A ga-emehie ihe. Ụmụntakịrị ga-ekwu ma ọ bụ mee ihe ndị na-akpasu iwe. Nrụgide ndị e nwere n’oge ahụ ga-eduga ndị nne ma ọ bụ nna nkuchi ime ihe n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya. Otú ọ dị, okwu ndị dị mfe bụ́, “O wutere m, biko gbaghara m,” pụrụ ime ihe dị ukwuu n’idozi nsogbu.

Ime Ka Ịdị n’Otu Ezinụlọ Sikwuo Ike

Ọ na-ewe oge iji wulite mmekọrịta ịhụnanya n’ime ezinụlọ nkuchi. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nkuchi, ọ dị gị mkpa igosi mmetụta ọmịiko. Na-egosi nghọta, dị njikere iwepụta oge isoro ụmụntakịrị ahụ nọkọọ. Soro ndị nke ka bụ ụmụaka gwurie egwu. Dị njikere isoro ndị nke toworo eto kwurịta okwu. Chọọ ohere iji nọkọọ ọnụ—dị ka ihe atụ, kpọọ ụmụntakịrị ahụ òkù inye aka n’ọrụ ụlọ, dị ka isi nri ma ọ bụ ịsa ụgbọala. Kpọọ ha òkù isonyere gị ma nyere gị aka mgbe ị na-aga ahịa. Tụkwasị na nke a, ụmụ obere omume ịhụnanya pụrụ igosi ịhụnanya i nwere. (N’ezie, ndị nna nkuchi kwesịrị ịkpachara anya imeru ihe n’ókè n’ebe ụmụaka ndị nwanyị ha kuchiri ekuchi nọ, gharakwa ime ka ahụ ghara iru ha ala. Ndị nne nkuchi kwesịkwara icheta na ụmụ nwoke nwekwara ebe a ga-ejedebe.)

Ezinụlọ nkuchi pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. Ọtụtụ na-enwe. Ndị kasị enwe ihe ịga nke ọma bụ ndị ndị nile o metụtara, karịsịa ndị nne na nna, na-azụlite àgwà ndị ziri ezi na atụmanya ndị ezi uche dị na ha. Jọn onyeozi dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị hụrịta onwe anyị n’anya: n’ihi na ịhụnanya bụ ihe si na Chineke pụta.” (1 Jọn 4:7) Ee, ịhụnanya si n’obi bụ n’ezie isi ihe na-akpata obi ụtọ n’ezinụlọ nkuchi.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

EZINỤLỌ NKUCHI NDỊ NA-ENWE OBI ỤTỌ

na-amụkọ Okwu Chineke ọnụ . . .

na-ewepụta oge ịnọkọ ọnụ . . .

na-enwe nkwurịta okwu . . .

na-arụkọ ọrụ ọnụ . . .

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya