Iwukwasị Ihe n’Elu Ntọala nke Ndị Na-ekpere Arụsị
PANTHEON so n’ime ọtụtụ ihe owuwu ndị buru ibu nke ndị na-eme njem nleta na Rom, Itali, na-eleta. Ihe owuwu Rom a magburu onwe ya bụ otu n’ime ụlọ ole na ole ndị dị ebe ahụ bụ́ ndị ka dị nnọọ otú ha dị n’oge ochie. N’ịbụ nke Agrịpa malitere n’ihe dị ka 27 T.O.A., Hadrian wughachiri ya n’ihe dị ka 120 O.A. Otu ihe dị ịrịba ama banyere ihe owuwu a bụ akatamkpo elu ụlọ ya nke dị mita 43 n’obosara, bụ́ nke ọ bụ nanị n’oge a ka e nwere nke ka ya n’ịdị obosara. Na mbụ Pantheon bụ ụlọ nsọ nke ndị na-ekpere arụsị, “ebe dịịrị chi nile,” nke bụ́ ihe okwu Grik mbụ ahụ pụtara. Taa, a ka na-ewere ya na ọ bụ chọọchị Roman Katọlik. Olee otú mgbanwe na-eju anya dị otú ahụ si kwe omume?
Na 609 O.A., Popu Boniface nke Anọ raraghachiiri ụlọ nsọ a a na-ejighị mee ihe eri ogologo oge nye dị ka chọọchị “ndị Kraịst.” N’oge ahụ, e nyere ya aha bụ́ Chọọchị Okirikiri nke Santa Maria. Dị ka otu isiokwu e bipụtara na 1900 na magazin ndị Jesuit Itali bụ́ La Civiltà Cattolica si kwuo, ihe Boniface bu n’uche iji ya eme kpọmkwem bụ “itokọ ndị Kraịst nile nwụrụ n’ihi okwukwe ha, ma ọ bụkwanụ, ndị senti nile, ma onye kasị mkpa bụ Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Nne nke Chukwu.” Aha ndị Chọọchị Roman Katọlik nyere Pantheon taa—Santa Maria ad Martyres ma ọ bụ, Ụlọ Okirikiri nke Santa Maria—na-egosipụta ebumnobi ahụ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị.—Tụlee Ọrụ 14:8-15.
Iji mee ka Pantheon ahụ kwekọọ n’ihe ọhụrụ a chọrọ iji ya eme, “ọ bụ nnọọ ntakịrị ihe ka ọ dị mkpa ka e mee,” ka otu isiokwu ahụ gara n’ihu ikwu. “Boniface gbasoro ụkpụrụ nduzi ndị ahụ dị mfe, bụkwa nke afọ ọma ndị St. Gregory Onye Ukwu [Popu Gregory Mbụ], bụ́ onye bu ya ụzọ guzobeworo, onye bụ́ maestro na onye bụ́ ihe nlereanya n’imegharị ụlọ nsọ nke ndị na-ekpere arụsị maka iji ya eme ihe n’ofufe ndị Kraịst.” Gịnị bụ ụkpụrụ nduzi ndị ahụ?
N’akwụkwọ ozi o nyere otu onye ozi ala ọzọ na-aga Britain na-ekpere arụsị na 601 O.A., Gregory nyere ntụziaka a, sị: “E kwesịghị ibibi ụlọ nsọ nke arụsị ndị dị ná mba ahụ; kama nanị arụsị ndị dị na ha . . . Ọ bụrụ na e wuru ụlọ nsọ ndị ahụ nke ọma, ọ dị mkpa ka a gbanwee ha site n’ife ekwensu gaa n’ijere ezi Chineke ahụ ozi.” Echiche Gregory bụ na ọ bụrụ na ndị na-ekpere arụsị hụrụ na e bibighị ihe bụbu ụlọ nsọ ha, ha pụrụ inwe mmasị karị ịnọgide na-aga ebe ahụ mgbe mgbe. Ebe ọ bụ na ndị na-ekpere arụsị “na-adị egbu ọtụtụ oké ehi n’ịchụrụ ekwensu àjà,” ka popu ahụ dere, e nwere olileanya ugbu a na “ha agaghịzi achụ anụmanụ n’àjà nye ekwensu kama ha ga-egbu ha maka ntụrụndụ nke onwe ha iji nye Chineke otuto.”
Okpukpe Roman Katọlik ‘mekwara ihe n’ụzọ megidere’ ofufe ndị na-ekpere arụsị site n’iguzobe chọọchị ndị a raara nye ndị nna nke “ndị Kraịst,” n’ebe dị nnọọ nso n’ụlọ nsọ ndị mbụ. A nakweere ememe oge ochie ma mee ka ha bụrụ nke “ndị Kraịst.” N’ikwu ya dị ka La Civiltà Cattolica si kwuo ya: “Na ụfọdụ omenala na ememe okpukpe ndị Kraịst mbụ bụ nke ha na omume na ụzọ ụfọdụ nke ndị na-ekpere arụsị nwere njikọ n’ụzọ chiri anya, bụ ihe ndị ọkà mmụta nile maara n’ụbọchị ndị a. Ha bụ omume ndị ọha mmadụ nwere mmasị na ya, omenala ndị gbanyere mkpọrọgwụ ma gwakọta ná ndụ ọha na nke onwe onye nke ụwa oge ochie n’ụzọ miri emi. Chọọchị Roman Katọlik, n’ịbụ nke dị obiọma, marakwa ihe, ekwetaghị na ya kwesịrị ikpochapụ omume na omenala ndị a; kama nke ahụ, site n’ịgbanwe ha n’echiche nke ndị Kraịst, na-ebuli ha gaa n’ọnọdụ ọhụrụ na ndụ ọhụrụ, o meriri ha site n’ụzọ ndị dị ike ma dị nro, iji wee nweta mkpụrụ obi nke ma ọha mmadụ ma ndị gụrụ akwụkwọ, n’akpataghị ọgba agbara.”
N’ezie, otu ihe atụ a maara nke ọma banyere ịnakwere ememe ndị na-ekpere arụsị bụ Krismas. December 25 bụ, n’ezie, ụbọchị ndị Rom oge ochie ji eme ememe dies natalis Solis Invicti, ya bụ, “ụbọchị ọmụmụ nke anyanwụ a na-apụghị imeri emeri.”
N’ọchịchọ ya inweta obi ndị na-ekpere arụsị, chọọchị ahụ arapagidesidịghị ike n’eziokwu. O mere ka ngwakọta nkwenkwe, ịnakwere nkwenkwe na omume ndị ọgọ mmụọ bụ́ ndị “ọha mmadụ nwere mmasị na ya,” yie ihe ziri ezi. Ihe si na ya pụta bụ chọọchị gwara ọgwa, nke si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ nke dịwagara nnọọ iche n’ozizi nke ezi Iso Ụzọ Kraịst. N’ịtụle ihe ndị dị n’elu, ikekwe ọ bụghị oké ihe ijuanya na ụlọ nsọ Rom nke bụbu nke “chi nile”—Pantheon—ga-abụ chọọchị Roman Katọlik nke a raara nye Meri na “ndị senti” nile.
Otú ọ dị, o kwesịrị ido anya na ịgbanwe nraranye nke ụlọ nsọ ma ọ bụ aha ememe ezughị iji gbanwee ‘ofufe ekwensu gaa n’ijere ezi Chineke ahụ ozi.’ “Olee nkwekọ ụlọ nsọ nke Chineke na arụsị na-ekwekọ?” ka Pọl onyeozi jụrụ. “Sinụ n’etiti ha pụta, guzokwanụ iche, ka Onyenwe anyị kwuru, unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka; Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu, [bụkwaara] unu Nna, unu onwe unu ga-abụkwara m ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, ka Onyenwe anyị kwuru, Nke pụrụ ime ihe nile.”—2 Ndị Kọrint 6:16-18.