Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 3/15 p. 29-31
  • “N’ize Ndụ n’Ime Oké Osimiri”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “N’ize Ndụ n’Ime Oké Osimiri”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpa Rom Nwere Maka Azụmahịa Oké Osimiri
  • Hà Bụ Ndị Njem Nọ n’Ụgbọ Mmiri Ndị Na-ebu Ibu?
  • Njem n’Oké Osimiri—Olee Otú Ọ Dịruru Nchebe?
  • E Buru Ozi Ọma ahụ Bamie n’Ofesi
  • “O Nweghị Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Pọl Emerie Ihe Isi Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • A Kpọgara Pọl Rom
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 3/15 p. 29-31

“N’ize Ndụ n’Ime Oké Osimiri”

N’ỌCHỊCHỊRỊ nke abalị, otu ụgbọ mmiri bu mmadụ 276 na-abịarute n’otu àgwàetiti dị na Mediterranean. Ike agwụsịwo ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ na ndị o bu site n’ịbụ ndị a na-ebugharị gaa ihu na azụ n’oké ebili mmiri ahụ ruo ụbọchị 14. Mgbe ha hụrụ ọnụ mmiri mgbe chi bọrọ, ha gbalịrị ịkwọga ụgbọ mmiri ahụ n’ụsọ oké osimiri. Ma ihu ụgbọ mmiri ahụ kpafanyere n’ihe nke na o nweghịkwa ike ịga aga, ebili mmiri ahụ tiwasịkwara azụ ụgbọ ahụ. Ndị nile nọ n’ụgbọ mmiri ahụ agbahapụ ya ma gbalịa iru n’ikperé mmiri nke Melita site n’igwu mmiri ma ọ bụ site n’ijide aka na plankị ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. N’ịbụ ndị oyi ji na ndị merụsịrị ahụ, ha dọlịrị si n’ogbu mmiri ahụ na-ekwo ekwo pụta. N’ime ndị nọ n’ụgbọ ahụ bụ onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi. A na-ebuga ya Rom iji kpee ya ikpe.—Ọrụ 27:27-44.

Nye Pọl, ụgbọ okpukpu ahụ mere n’àgwàetiti Melita abụghị ihe mbụ na-eyi ndụ egwu merela ya n’oké osimiri. Afọ ole na ole gara aga, o dere, sị: “Ugbo atọ ka ụgbọ m nọ n’ime ya kpuru, otu ụbọchị abalị na ehihie ka m nọworo n’ime ogbu mmiri.” Ọ gbakwụnyere na ya anọwo “n’ize ndụ n’ime oké osimiri.” (2 Ndị Kọrint 11:25-27) Ime njem n’oké osimiri enyeworo Pọl aka ịrụzu ọrụ Chineke nyere ya dị ka “onyeozi nke ndị mba ọzọ.”—Ndị Rom 11:13.

Ruo ókè hà aṅaa ka ime njem n’oké osimiri saruru mbara? Òkè dị aṅaa ka o keere n’ịgbasa Iso Ụzọ Kraịst? Olee otú ọ dịruru nchebe? Ụdị ụgbọ ndị dị aṅaa ka e ji na-eme ihe? Oleekwa otú o si na-abata ndị nọ n’ime ya?

Mkpa Rom Nwere Maka Azụmahịa Oké Osimiri

Ndị Rom na-akpọ Mediterranean Mare Nostrum—Oké Osimiri Anyị. Nchịkwa nke ụzọ ndị dị n’oké osimiri dị Rom oké mkpa n’ihi nzube karịrị nke agha. Ọtụtụ obodo ukwu nke Alaeze Ukwu Rom ma ọ́ bụghị na ha bụ ọdụ ụgbọ mmiri ọ̀ bụrụ na ha ji ọdụ ụgbọ mmiri eme ihe. Dị ka ihe atụ, Rom nwere ọdụ ụgbọ mmiri ya n’Ostia dị ya nso, ebe Kọrint ji Lechaeum na Kenkrii mee ihe, Antiọk nke Siria jikwa nke dị na Seleusia mee ihe. Njikọ ụzọ osimiri ndị dị mma n’etiti ọdụ ụgbọ mmiri ndị a mere ka e soro mba ndị bụ́ isi na-enwe nkwurịta okwu n’ụzọ dị ngwa, o mekwara ka ọ dị mfe ịchị ógbè dị iche iche nke ndị Rom.

Rom dabekwaara n’ụlọ ọrụ ụgbọ mmiri maka inweta nri. N’ịbụ nke nwere ụba mmadụ dị ihe dị ka otu nde, Rom chọrọ ọka dị ukwuu—ihe dị ka agbata tọn 250,000 na 400,000 kwa afọ. Olee ebe ọka nile ahụ si abịa? Flavius Josephus na-ehota Herọd Agrịpa nke Abụọ dị ka onye kwuru na Ebe Ugwu Africa zụrụ Rom ruo ọnwa asatọ nke otu afọ, ebe Ijipt bugara ọka zuru ịkwado obodo ahụ ruo ọnwa anọ ndị ọzọ. Ọtụtụ puku ụgbọ mmiri keere òkè n’ibugara obodo ahụ ọka.

Iji lekọta ọchịchọ ndị Rom nwere maka ibi ndụ okomoko, azụmahịa oké osimiri ahụ, bụ́ nke gara nke ọma, butere ụdị ngwá ahịa nile. E ji ụgbọ mmiri bute akụ̀ ndị si n’ala, nkume, na marble site na Saịprọs, Gris, na Ijipt, e sikwa Lebanọn bute osisi. E si Smụana bute mmanya, si Damaskọs bute akị, sikwa Palestine bute mkpụrụ date. E si na Silisia bute ude na rọba, si na Militọs na Leọdisia bute ákwà wool, si na Siria na Lebanọn bute ákwà dị iche iche, si na Taịa na Saịdọn bute uwe odo odo. E si na Taịataịra bute ihe ndị e ji eteji ákwà, e sikwa na Aleksandria na Saịdọn bute ugegbe. E si China na India tụbata silk, ogho, ọdụ́, na ihe ndị e ji eme ka nri tọọ ụtọ.

Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ụgbọ ahụ kpuru na Melita nke Pọl nọ n’ime ya? Ọ bụ ụgbọ mmiri na-ebu ọka, “ụgbọ Aleksandria nke na-eje Itali.” (Ọrụ 27:6, nkọwa ala ala peji nke NW) Ìgwè ụgbọ mmiri ahụ na-ebu ọka bụ nke ndị Gris, Finisia, na Siria nwe, bụ́ ndị duziri ma na-edozi ha. Otú ọ dị, ndị Ọchịchị gbaziiri ụgbọ mmiri ndị ahụ. “Dị ka ọ dị n’ịnakọta ụtụ isi,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ William M. Ramsay na-ekwu, “gọọmenti hụrụ na ọ dị mfe karị inyepụ ọrụ ahụ ná ngo karịa ịhaziri onwe ya nnukwu ndị ọrụ na ngwá ọrụ ndị dị mkpa maka ije ozi ahụ dị ukwuu.”

Pọl ji ụgbọ mmiri a tụrụ “Ụmụnne ndị ikom abụọ a mụrụ n’otu mgbe” n’isi ya metọpụ njem ya gaa Rom. Nke a bụkwa ụgbọ mmiri si Aleksandria. Ọ kwụsịrị na Pọtiọli n’ọwara oké osimiri nke Naples, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri ebe ìgwè ụgbọ mmiri ndị ahụ na-ebu ọka na-akwụsịkarị. (Ọrụ 28:11-13) Site na Pọtiọli—Pozzuoli nke oge a—a na-atụpụta ihe ụgbọ mmiri ahụ bu n’elu ala ma ọ bụ jiri ụgbọ epeepe buru ya gaa n’ebe ugwu nke ụsọ oké osimiri ahụ ma gbagoo n’Osimiri Tiber banye n’ime Rom.

Hà Bụ Ndị Njem Nọ n’Ụgbọ Mmiri Ndị Na-ebu Ibu?

N’ihi gịnị ka Pọl na ndị agha na-eche ya nche ji jiri ụgbọ mmiri na-ebu ibu mee njem? Iji zaa ajụjụ ahụ, ọ dị anyị mkpa ịmara ihe ọ pụtara bụ́ ime njem n’oké osimiri dị ka onye njem n’ụbọchị ndị ahụ.

Na narị afọ mbụ O.A., e nweghị ihe dị ka ụgbọ mmiri na-ebu ndị njem. Ụgbọ ndị njem jiri mee ihe bụ ụgbọ mmiri ndị azụmahịa. Ụdị mmadụ nile kwa—gụnyere ndị nọ n’ọkwá Ọchịchị, ndị gụrụ oké akwụkwọ, ndị na-eme nkwusa, ndị dibịa afa, ndị nkà, ndị na-eme egwuregwu, ndị azụmahịa, ndị na-eme njem mkpagharị, na ndị njem ala nsọ—pụrụ ijiworị ha mee njem.

N’ezie, e nwere ụgbọ epeepe ndị buru ndị njem na ibu n’ime mmiri ndị dị n’ụsọ oké osimiri. Pọl pụrụ ijiworị ụgbọ epeepe dị otú ahụ mee ihe iji si na Troas “gabita na Masedonia.” Ụgbọ epeepe pụrụ ibuwo ya ihe karịrị otu ugbo n’oge ọ na-aga nakwa n’oge ọ na-alọta Atens. Pọl pụkwara ijiworị ụgbọ epeepe mee njem ụgbọ mmiri mgbe e mesịrị site Troas gaa Patara bụ́ nke o si n’àgwàetiti ndị dị nso n’ụsọ oké osimiri Asia Minor gaa. (Ọrụ 16:8-11; 17:14, 15; 20:1-6, 13-15; 21:1) Iji ụgbọ epeepe ndị dị otú ahụ mee ihe belatara igbu oge, ma ha apụghị ịnwa anwa ịga ebe dị anya. N’ihi ya ụgbọ mmiri ndị bu Pọl gaa Saịprọs ma gazie Pamfilia na ndị ahụ o ji mee njem site n’Efesọs gaa Sizarịa na site Patara gaa Taịa aghaghị ibuwo nnọọ ibu. (Ọrụ 13:4, 13; 18:21, 22; 21:1-3) Ụgbọ mmiri Pọl nọ nwee ụgbọ okpukpu na Melita pụrụ ịbụwokwa nke e lere anya dị ka nke buru ibu. Olee otú ụgbọ ndị ahụ pụrụ ịharu n’ibu?

Ihe ndị e dere ede dugara otu ọkà mmụta ikwu, sị: “[Ụgbọ mmiri] nwere ikike kasị nta nke ibu ihe bụ́ nke ndị oge gboo hụtara dị ka ihe bara uru n’ozuzu ya dị ihe dị ka tọn 70 ruo 80. Ọ̀tụ̀tụ̀ ibu ibu a na-enwekarị, ma ọ̀ dịghị ihe ọzọ n’oge ọchịchị ndị Gris, bụ tọn 130. Ndị na-adị tọn 250, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe a na-ahụkarị, karịrị nnọọ otú o kwesịrị. N’oge ndị Rom, ụgbọ mmiri ndị e ji ebu ndị eze kadịrịị ukwuu, ọ̀tụ̀tụ̀ a chọrọ bụ tọn 340. Ụgbọ mmiri kasị ukwuu setụworonụ n’elu mmiri ruru tọn 1300, ikekwe ọ dịtụ ibu karị.” Dị ka nkọwa e deturu na narị afọ nke abụọ O.A. si kwuo, ụgbọ ahụ si Aleksandria bụ́ nke na-ebu ọka bụ́ Isis karịrị mita 55 n’ịdị ogologo, ọ dị ihe dị ka mita 14 n’ịdị obosara, ma dị ihe dị ka mita 13 n’imi emi, ikekwe ọ pụkwara ibu ọka karịrị otu puku tọn, ma eleghịkwa anya buo narị ndị njem ole na ole.

Olee otú e si lekọta ndị njem ahụ n’ime ụgbọ mmiri na-ebu ọka? Ebe ọ bụ na ụgbọ mmiri ahụ bụ nnọọ maka ibu, a na-echebara ndị njem echiche nanị ma ibu gasịa. A dịghị enye ha nri ma ọ bụ jeere ha ozi ọ bụla ma e wezụga inye ha mmiri. Ha ga-arahụ n’ime ala ụgbọ mmiri, ikekwe n’okpuru ndo ndị yiri ụlọ ntú bụ́ ndị e wuru n’abalị, ndị a na-ewetukwa n’ụtụtụ ọ bụla. Ọ bụ ezie na a pụrụ ikwe ka ndị na-eme njem ụgbọ mmiri jiri kichin dị n’ụgbọ mmiri mee ihe maka isi nri, ha aghaghị ijicha ihe nile dị ha mkpa maka isi nri, iri nri, ịsa ahụ, na ịrahụ ụra—site ná ngwá isi nri ruo n’ihe ndina.

Njem n’Oké Osimiri—Olee Otú Ọ Dịruru Nchebe?

N’ịbụ ndị na-enweghị ngwá ọrụ—ọbụna otu compass—ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na narị afọ mbụ ji nanị anya na-arụ ọrụ. N’ihi ya, njem na-adịkarịsị nchebe mgbe a kasị ahụ ụzọ—ọ na-abụkarị site ná ngwụsị May ruo n’etiti September. N’ime ọnwa abụọ tupu na mgbe oge ahụ gasịrị, ndị ahịa pụrụ ịnwa ihe ize ndụ nke ime njem ụgbọ mmiri. Ma n’oge oyi, alụlụ na urukpuru na-ekpuchikarị ihe e ji amata ebe a nọ, na-ekpuchikwa anyanwụ n’ehihie nakwa kpakpando n’abalị. A na-ele ime njem ụgbọ mmiri anya dị ka nke e mechiri emechi (Latin, mare clausum) site na November 11 ruo March 10, e wezụga n’ọnọdụ dị oké mkpa ma ọ bụ nke chọrọ nnọọ ime ihe ngwa ngwa. Ndị na-eme njem ná ngwụsị nke oge ahụ tinyere onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịnọ n’oge oyi n’ọdụ ụgbọ mmiri dị n’ala ọzọ.—Ọrụ 27:12; 28:11.

N’agbanyeghị na ọ dị ize ndụ, bụrụkwa nke a na-adịghị eme n’oge nile, è nwere uru ndị ime njem ụgbọ mmiri nwere karịa njem elu ala? Eenụ! Ime njem n’oké osimiri adịghị agwụcha ike, ọ dị ọnụ ala karị, ọ dịkwa ngwa karị. Mgbe ifufe na-adịghị efesi ike, ikekwe ụgbọ mmiri pụrụ ịga ihe dị ka kilomita 150 n’ụbọchị. Ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogologo njem e ji ụkwụ mee bụ kilomita 25 ruo 30 n’ụbọchị.

Ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ ụgbọ mmiri fọrọ nke nta ka ọ dabere n’ifufe kpam kpam. Njem ahụ e mere site n’Ijipt gaa Itali bụ ọgụ na mgba gara n’ihu megide ifufe si n’ihu na-efeta, ọbụna n’oge ndị kasị mma. Ụzọ kasị nso na-abụkarị site Rodes ma ọ bụ Maira ma ọ bụ ọdụ ụgbọ mmiri ọzọ dị n’ụsọ oké osimiri Lisia nke dị n’Asia Minor. Mgbe o zutesịrị oké ifufe ma fuo ụzọ, n’otu oge ụgbọ mmiri ahụ na-ebu ọka bụ́ Isis kwụsịrị na Piraeus mgbe ụbọchị 70 ọ hapụsịrị Aleksandria gasịrị. N’ịbụ nke oké ikuku si ebe ugwu ọdịda anyanwụ na-efe n’azụ ya, ma eleghị anya a pụrụ imewo njem nlaghachi ahụ site n’Itali n’ime ụbọchị 20 ruo 25. Site n’ụzọ elu ala, otu njem ahụ ma ọgịga ma ọlịla ga-ewe ihe karịrị ụbọchị 150 mgbe ihu igwe dị mma.

E Buru Ozi Ọma ahụ Bamie n’Ofesi

Ihe àmà na-egosi na Pọl maara banyere ihe ize ndụ dị n’ime njem n’oké osimiri n’oge na-ekwesịghị ekwesị n’afọ. Ọ dọrọ aka ná ntị ọbụna megide ime njem ná ngwụsị September ma ọ bụ ná mmalite October, na-asị: “Ndị ikom, ahụwo m na mbibi na oké iyi gaje ịdị n’ije ụgbọ a, ọ bụghị nanị nke ihe ụgbọ na-ebu na ụgbọ onwe ya, ma nke ndụ anyị kwa.” (Ọrụ 27:9, 10) Otú ọ dị, onye agha okwu dị n’aka leghaara okwu ndị a anya, ihe sikwa na nke a pụta bụ ụgbọ okpukpu ahụ e nwere na Melita.

Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke ọrụ ozi ala ọzọ ya, Pọl e nwewo ụgbọ okpukpu ọ dịkarịa ala ugboro anọ. (Ọrụ 27:41-44; 2 Ndị Kọrint 11:25) Ma, nchegbu na-enweghị isi banyere ihe ndapụta ndị dị otú ahụ egbochighị ndị nkwusa ozi ọma oge mbụ ime njem n’oké osimiri. Ha ji usoro ime njem ọ bụla dịnụ mee ihe iji gbasaa ozi Alaeze ahụ. Ná nrubeisi n’iwu Jisọs kwa, a gbara àmà n’ebe nile. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8) N’ihi ịnụ ọkụ n’obi ha, okwukwe nke ndị gbasoworo ihe nlereanya ha, na nduzi nke mmụọ nsọ Jehova, ozi ọma ahụ eruwo akụkụ kasị dịpụ adịpụ nke elu ụwa dum mmadụ bi.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 31]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya