Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 4/1 p. 23-27
  • Ịchọ Paradaịs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịchọ Paradaịs
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịlaghachi n’Ọrụ Ugbo
  • A Kpalite Nkwenye na Chineke n’Ime M
  • Azịza Nye Ekpere M
  • Inwe Ọganihu Ime Mmụọ
  • Enweta M Enyemaka Mgbe Obi Na-erughị M Ala
  • Iru Eru Maka Ihe Ka Mma
  • Betel—Paradaịs Ime Mmụọ Dị Ịrịba Ama
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Akwụsịbeghị M Ịmụta Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Òkù A Na-akpọ Mmadụ Niile!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 4/1 p. 23-27

Ịchọ Paradaịs

Dị Ka Pascal Stisi Si Kọọ

Chi ejimielarị, mmadụ anọghịkwa n’okporo ámá ndị dị n’obodo Béziers, n’ebe ndịda France. N’ịchọta ụlọ ahụ a na-ere akwụkwọ okpukpe nke a ka tere ágbá ọhụrụ, mụ na enyi m kịkara okwu nke ọkà ihe ọmụma bụ́ onye Germany bụ́ Nietzsche n’ahụ ya ná mkpụrụ akwụkwọ ndị dị okpotokpo: ‘Ndị bụ́ chi anwụwo. Nwoke Ike ị ga-adị ogologo ndụ!’ Otú ọ dị, gịnị dubara m n’ihe a nile?

A MỤRỤ m na France na 1951 n’ime ezinụlọ si Itali nke na-ekpe Katọlik. Mgbe m bụ nwata, anyị na-aga ezumike n’ebe ndịda Itali. N’ebe ahụ, obodo nta ọ bụla nwere onyinyo nke Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri. N’isoro nna m ochie na-aga ije, ana m elegide anya n’akatamkpo ihe oyiyi ndị a e yikwasịrị uwe bụ́ ndị e doro n’ahịrị toro ogologo gafee ugwu dị iche iche—ma ekwenyeghị m na ya ma ọlị. Ebe mbụ m gụrụ akwụkwọ bụ n’ụlọ akwụkwọ okpukpe nke ndị Jesuit na-elekọta. Otú ọ dị, apụghị m icheta mgbe m nụrụ ihe ọ bụla nke wulitere okwukwe m n’ebe Chineke nọ n’ezie.

Ọ bụ mgbe m debanyere aha n’otu mahadum dị na Montpellier ịmụ nkà mmụta ọgwụ ka m malitere ịtụgharị uche ná nzube nke ndụ. E merụwo nna m ahụ n’oge agha, ndị dọkịta na-anọkwa n’akụkụ ihe ndina ya mgbe dum. Ọ̀ gaghị aka mma ịkwụsị agha kama ịtụfu oge na mgbalị dị ukwuu n’ịgwọ ndị merụrụ ahụ site na ya? Ma, Agha Vietnam nọ na-akpọtụ. Dị ka ihe atụ, nye m, nanị ụzọ ezi uche dị na ya isi kwụsị ọrịa cancer akpa ume bụ iwepụ ihe bụ́ isi na-akpata ya—ụtaba. Gịnịkwanụ banyere nrịanrịa ndị erighị ihe na-edozi ahụ kpatara ná mba ndị ka na-emepe emepe nakwa ndị iribiga ihe ókè kpatara n’ala ndị bara ọgaranya? Ọ̀ gaghị aka mma iwepụ ihe ndị na-akpata ha kama ịnwa ịgwọ ihe ndị dị mwute na-esi na ha apụta? N’ihi gịnị ka e ji nwee oké nhụjuanya n’ụwa? Echere m na ọ dị ihe na-adịghị agazi nnọọ agazi n’ebe ọha mmadụ a na-egbu onwe ha nọ, atakwara m gọọmenti ụta maka ya.

Akwụkwọ na-amasịkarị m bụ nke onye na-akpasu ọgba aghara dere, ana m edekwa ahịrịokwu ndị sitere na ya n’ahụ ájá. Nke nta nke nta, aghọkwara m onye na-akpasu ọgba aghara, onye na-enweghị okwukwe ma ọ bụ iwu omume ọma, onye na-achọghị Chineke ma ọ bụ nna ukwu ọ bụla. Nye m, Chineke na okpukpe bụ ihe ndị bara ọgaranya na ndị dị ike mepụtara ka ha wee nwee ike ịchịkwa na irigbu anyị bụ́ ndị fọdụrụnụ. ‘Rụsiere anyị ọrụ ike n’elu ụwa, ụgwọ ọrụ gị ga-adịkwa ukwuu n’ime paradaịs n’eluigwe,’ ka o yiri ka ha na-ekwu. Ma oge nke ndị bụ́ chi agwụla. Ọ dị ndị mmadụ mkpa ka a gwa ha. Idekasị ihe n’ahụ ájá bụ otu ụzọ isi gwa ha.

N’ihi ya, edebere m ọmụmụ ihe m n’ọnọdụ nke abụọ. Ka ọ dị mgbe ahụ edebanyewo m aha ịmụ banyere ọdịdị mbara ala na njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha na mahadum ọzọ dị na Montpellier bụ́ ebe nnupụisi jupụtara. Ka m na-amụkwu banyere njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha, otú ahụ ka ọ na-asọ m oyi ịhụ mmetọ a na-emetọ ọmarịcha mbara ụwa anyị.

Kwa afọ n’oge ezumike nke oge okpomọkụ, ana m abanye n’ụgbọala ndị na-ebu n’efu, na-aga ọtụtụ puku kilomita gburugburu Europe. Ka m na-eme njem, na-esokwa ọtụtụ narị ndị ọkwọ ụgbọala na-ekwurịta okwu, eji m anya m hụ ihe ọjọọ na nretọ nke na-eti ọha mmadụ ihe otiti. N’otu oge, ka m nọ na-achọ paradaịs, erutere m n’ụsọ mmiri ndị magburu onwe ha dị n’ọmarịcha àgwàetiti Krit wee hụ ka mmanụ jupụtara n’elu ha. O wutere m nke ukwuu. È nwere akụkụ paradaịs ka fọdụrụ n’ebe ọ bụla n’ụwa?

Ịlaghachi n’Ọrụ Ugbo

Na France ndị na-amụ banyere njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha nọ na-akwado mmaliteghachi nke ọrụ ugbo dị ka ihe ngwọta nye ahụhụ nke ọha mmadụ. Achọrọ m iji aka m rụọ ọrụ. Ya mere azụrụ m otu ụlọ ochie e ji nkume wuo n’obodo nta dị n’ala nke Ugwu Cévennes dị n’ebe ndịda France. N’ọnụ ụzọ ya, edekwasịrị m ya “Paradaịs Ugbu A,” bụ́ okwu e ji mara ndị agboro America. Otu nwa agbọghọ Germany nke na-esi n’ógbè anyị agafe ghọrọ iko m nwanyị mụ na ya bi. Agatụdịghị m ekwe ka anyị mee ememe alụmdi na nwunye nke onyeisi obodo ga-eduzi, bụ́ onye nnọchiteanya gọọmenti. Gịnịkwanụ banyere ịlụ na chọọchị? Echetụdịla nke ahụ n’echiche!

Ọtụtụ mgbe, anyị gbaara ụkwụ ọtọ jee ije, enwekwara m agịrị isi toro ogologo na afụ ọnụ a na-elekọtaghị anya. Ịkọ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri masịrị m. N’oge okpomọkụ igwe na-acha anụnụ anụnụ, ụmụ ahụhụ cicada na-ebekwa ube. Okooko osisi ndị dị n’ala ahụ na-esi nnọọ isisi ọma, mkpụrụ osisi Mediterranean ndị ahụ anyị na-akọ—vine na fig—dịkwa nnọọ pokopoko! O yiri nnọọ ka anyị achọtala ọnọdụ anyị n’ime paradaịs.

A Kpalite Nkwenye na Chineke n’Ime M

Na mahadum, amụwo m banyere mkpụrụ ndụ, mmalite nke ndụ n’akpa nwa, na akụkụ ahụ mmadụ na anụmanụ, enwewokwa m mmasị miri emi n’ịdị mgbagwoju anya na inwe nkwekọ ndị dị n’usoro ịrụ ọrụ ndị a. Ugbu a m pụrụ ịtụle ma kirie ihe e kere eke n’onwe m kwa ụbọchị, ịma mma ha na ntolite ha tụrụ m n’anya nke ukwuu. Anọ m na-asape akwụkwọ okike kwa ụbọchị. Otu ụbọchị mgbe m na-eme ogologo njem n’ugwu, mgbe m tụgharịsịwokwara uche n’ụzọ miri emi banyere ndụ, ekwubiri m na aghaghị inwe Onye Okike. Ekpebiri m n’ime obi m ikwere na Chineke. Na mbụ, enwewo m mmetụta nke ịtọgbọ chakoo n’obi m, owu ọmụma na-enye nsogbu. Ụbọchị m malitere ikwere na Chineke, agwara onwe m, sị, ‘Pascal, owu agaghị ama gị ọzọ.’ Ọ bụ mkpali pụrụ iche.

N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, mụ na iko m nwanyị mụtara otu nwatakịrị nwanyị—Amandine. Ejighị m ya egwu egwu. Ugbu a m kwere na Chineke, amalitere m ịkwanyere iwu omume ole na ole ndị m maara ùgwù. Akwụsịrị m izu ohi na ịgha ụgha, n’oge na-adịghị anya achọpụtakwara m na nke a nyeere m aka izere ọtụtụ nsogbu n’ebe ndị nọ m nso nọ. Ee, anyị nwere nsogbu, paradaịs m adịchaghịkwa otú m tụworo anya ya. Ndị na-akọ osisi mmanya n’obodo ahụ ji ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ na ọgwụ e ji egbu ahịhịa mee ihe, ha mebikwara mkpụrụ ọkụkụ m. A zabeghị ajụjụ m banyere ihe na-akpata ihe ọjọọ. Ọzọkwa, ọ bụ ezie na agụwo m ọtụtụ ihe banyere ndụ ezinụlọ, nke a egbochighị mụ na iko m nwanyị inwe arụmụka ndị kpụ ọkụ n’ọnụ. Anyị nwere ndị enyi ole na ole, ha bụkwa ndị enyi ụgha; ụfọdụ nwara ọbụna ime ka iko m nwanyị soro onye ọzọ nwee mmekọahụ. A ghaghị inwe paradaịs ka mma.

Azịza Nye Ekpere M

N’ụzọ nke m, ekpere m ekpere mgbe mgbe ka Chineke duzie m ná ndụ. Otu ụtụtụ Sunday otu nwanyị nwere omume enyi nke aha ya bụ Irène Lopez na obere nwa nwoke ya bịara n’ọnụ ụzọ anyị. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Egere m ntị n’ihe o nwere ikwu ma kwere ka ọ bịa leta m ọzọ. Ndị ikom abụọ bịara ịhụ m. Site ná mkparịta ụka anyị, echetara m ụzọ ihe abụọ—Paradaịs na Alaeze Chineke. Eji m nlezianya tinye echiche ndị ahụ n’ime obi m, ka ọnwa ụfọdụ gafekwara, aghọtara m na n’otu ụbọchị aghaghị m ime ka ndụ m kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke ma ọ bụrụ na m chọrọ inwe akọ na uche dị ọcha ma chọta ezi obi ụtọ.

Iji mee ka ndụ anyị kwekọọ n’Okwu Chineke, enyi m nwanyị chọburu ịlụ m. E mesịa o sooro ndị na-eme Chineke na iwu ya akaje na-enwe mkpakọrịta ọjọọ. Ka m lọtara n’ebe obibi m n’otu uhuruchi n’oge opupu ihe ubi, akpata oyi wụrụ m nke ukwuu. Ọ dịghị onye nọ n’ụlọ anyị. Iko m nwanyị akpọrọla nwa anyị nwanyị dị afọ atọ gbapụ. Ruo ọtụtụ ụbọchị, anọgidere m na-eche ka ha lọta—ma o nweghị isi. Kama ịta Chineke ụta, ekpere m ekpere ka o nyere m aka.

N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, eweere m Bible, nọdụ ala n’okpuru osisi fig m, ma malite ịgụ ya. N’ezie, anabatara m okwu ndị dị n’ime ya. Ọ bụ ezie na agụwo m ụdị akwụkwọ nile nke ndị na-eme nchọpụta banyere onye ọrịa na ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ dere, ọ dịbeghị mgbe m hụtụrụla amamihe dị otú ahụ. A ghaghị idewo akwụkwọ a n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ozizi Jisọs na nghọta o nwere banyere ọdịdị mmadụ tụrụ m n’anya. Enwetara m nkasi obi site n’Abụ Ọma, amamihe dị irè nke Ilu jukwara m anya. Aghọtara m ozugbo na ọ bụ ezie na ihe ọmụmụ banyere okike bụ ihe magburu onwe ya maka ịdọta mmadụ n’ebe Chineke nọ, ọ pụrụ ikpughe “nanị nsọtụ ụzọ Ya nile.”—Job 26:14.

Ndịàmà ahụ nyekwara m akwụkwọ ndị bụ́ Ezi-Okwu Ahu nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi na Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ.a Ọgụgụ m gụrụ ha meghere anya m. Akwụkwọ Ezi-Okwu nyeere m aka ịghọta ihe mere mmadụ ji eche mmetọ zuru ebe nile, agha, ịba ụba nke ime ihe ike, na iyi egwu nke mgbuchapụ nuklia ihu. Dịkwa nnọọ ka igwe na-acha ọbara ọbara nke m nọ n’ubi m hụ gosiri na ọnọdụ ihu igwe ga-adị mma n’echi ya, ihe omume ndị a gosiri na Alaeze Chineke dị nso. Banyere akwụkwọ Ndu Ezi-na-ulo, ọ dị m nnọọ ka ya bụrụ na m ga-enwe ike igosi ya iko m nwanyị ma gwa ya na anyị pụrụ inwe obi ụtọ site n’itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ. Ma ọ gaghịzi ekwe omume.

Inwe Ọganihu Ime Mmụọ

Achọrọ m ịmụtakwu ihe, ya mere agwara m Robert, bụ́ Onyeàmà, ka ọ bịa na nke m. N’ịbụrụ ya oké ihe ijuanya, agwara m ya na achọrọ m ka e mee m baptism, ya mere a maliteere m ọmụmụ Bible. Amalitere m ozugbo ịgwa ndị ọzọ banyere ihe m na-amụ, amalitekwara m ikesa mbipụta ndị m natara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Iji kpata ego, amalitere m ịmụ ọrụ ido blọk. N’ịmara banyere ihe ọma Okwu Chineke pụrụ imere mmadụ, eji m ohere ọ bụla dapụtaranụ mee nkwusa n’ụzọ mberede nye ụmụ akwụkwọ ibe m na ndị nkụzi. N’otu uhuruchi, ezutere m Serge n’otu paseji. O ji magazin ụfọdụ n’aka. “Ahụrụ m na ịgụ ihe na-amasị gị,” ka m gwara ya. “Ee, ma nke a agwụla m ike.” “Ị̀ chọrọ ịgụ ihe dị mma n’ezie?” ka m jụrụ ya. Anyị nwere mkparịta ụka magburu onwe ya banyere Alaeze Chineke, ọ natakwara akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ Bible. N’izu na-esonụ, o sooro m bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, a malitekwaara ya ọmụmụ Bible.

Otu ụbọchị ajụrụ m Robert ma m̀ pụrụ ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọ banyere n’ebe ọ na-ekowe uwe ya ma wetara m otu kootu. Na Sunday na-esonụ, esoro m ya zọpụ ụkwụ mbụ m n’ozi. N’ikpeazụ, na March 7, 1981, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke n’ihu ọha site n’ime baptism.

Enweta M Enyemaka Mgbe Obi Na-erughị M Ala

Ka ọ dị mgbe ahụ achọpụtawo m ebe Amandine na nne ya bi ná mba ọzọ. Ewo, nne ya—n’ụzọ nile iwu kwadoro, dị ka iwu nke mba ahụ o bi si dị—gbochiri m ịhụ nwa m nwanyị. Obi gbawara m. Nne Amandine lụrụ di, obi nkoropụ m kakwuru njọ mgbe m nwetara akwụkwọ iwu kwadoro na di ya ekuchiwo nwa m nwanyị—n’enwetaghị nkwado m ma ọlị. Enweghịzi m ikike ọ bụla n’ebe nwa m nọ. N’agbanyeghị akwụkwọ m gbara, anatalighị m ikike ileta ya. Ọ dị m nnọọ ka m bu ibu dị kilogram 50 n’azụ m, otú ahụ ka ihe mgbu m dị.

Ma Okwu Jehova kwagidere m n’ọtụtụ ụzọ. Otu ụbọchị mgbe obi na-erughị m nnọọ ala, ekwughachiri m okwu ndị ahụ dị n’Ilu 24:10 ugboro ugboro: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” Amaokwu a nyeere m aka ka obi ghara ikoropụ m. N’oge ọzọ, mgbe m nwesịrị ihe ndọghachi azụ n’ịgbalị ịhụ nwa m nwanyị, ejere m ozi ma jidesie aka n’akpa m ike ruo otú ike kwere m. N’oge ndị tara akpụ dị otú ahụ, ahụrụ m ịbụ eziokwu nke Abụ Ọma 126:6, nke na-asị: “Onye na-ebu njuaka mkpụrụ ọghịgha, ọ bụ ezie na ọ na-eje ije na-akwa ákwá; ma ọ ghaghị iwere iti mkpu ọṅụ bịaghachi, na-ebu ùkwù ọka ya nile.” Otu ihe dị mkpa m mụtara bụ na mgbe i nwere ọnwụnwa ndị siri ike, ozugbo i meworo ihe nile ị pụrụ ime iji dozie ha, ị ghaghị iwezuga ha n’akụkụ ma jiri mkpebisi ike gaa n’ihu n’ozi Jehova. Nke a bụ nanị ụzọ ị ga-esi nọgide na-enwe ọṅụ.

Iru Eru Maka Ihe Ka Mma

N’ịhụ mgbanwe ndị m meworo, ezigbo nne na nna m kwuru na ha ga-enyere m aka ịga n’ihu n’ihe ọmụmụ m na mahadum. Ekelere m ha, ma ugbu a enwere m ihe mgbaru ọsọ ọzọ. Eziokwu ahụ emewo ka m nwere onwe m pụọ na nkà ihe ọmụma mmadụ, nkwenkwe nke ihe omimi, na ịgụ kpakpando. Ugbu a, enwere m ezi ndị enyi bụ́ ndị na-agaghị egbu ibe ha n’agha ma ọlị. N’ikpeazụ enwetakwara m azịza nye ajụjụ m banyere ihe mere e ji nwee oké nhụjuanya n’ụwa. N’ihi obi ekele achọrọ m iji ume m dum jeere Chineke ozi. Jisọs ararawo onwe ya nye kpam kpam n’ozi ya, achọkwara ịgbaso ihe nlereanya ya.

Na 1983, akwụsịrị m ọrụ ido blọk m iji ghọọ onye ozi oge nile. N’azịza nye ekpere m, achọtara ọrụ nwa oge n’otu ogige iji lekọta onwe m. Lee ihe ọṅụ ọ bụ isoro Serge, bụ́ nwa okorobịa ahụ m gbawooro àmà n’ụlọ akwụkwọ a na-amụ ido blọk, gaa ụlọ akwụkwọ ndị ọsụ ụzọ! Mgbe m jesịrị ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile ruo afọ atọ, enwere m ọchịchọ ime ọbụna ihe ka ukwuu n’ozi Jehova. Ya mere, na 1986, a họpụtara m ịbụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo ahụ mara mma bụ́ Provins, nke na-adịghị anya site na Paris. Ọtụtụ mgbe, mgbe m lọtara n’ebe obibi m n’uhuruchi, ana m egbu ikpere n’ala n’ekpere iji kelee Jehova maka ụbọchị dị ebube m jiworo gwa ndị ọzọ okwu banyere ya. N’ezie, ihe abụọ kasị atọ m ụtọ ná ndụ bụ ịgwa Chineke okwu na ikwu okwu banyere Chineke.

Ihe ọzọ nyere m oké ọṅụ bụ baptism e mere nne m dị afọ 68 bụ́ onye bi na Cébazan, obodo nta nke dị n’ebe ndịda France. Mgbe nne m malitere ịgụ Bible, ezigaara m ya ụtụ Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụ onye nwere ezi uche, n’oge na-adịghịkwa anya ọ bịara chọpụta na eziokwu dị n’ihe ọ na-agụ.

Betel—Paradaịs Ime Mmụọ Dị Ịrịba Ama

Mgbe Watch Tower Society kpebiri ibelata ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, etinyere m akwụkwọ maka Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, tinyekwa maka Betel, bụ́ alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na France. Achọrọ m ịhapụ ya n’aka Jehova ikpebi ụzọ kasị mma m pụrụ isi jeere ya ozi. Ọnwa ole na ole mgbe e mesịrị, na December 1989, a kpọrọ m òkù ịbịa Betel dị na Louviers, n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ France. Nke a ghọrọ ihe magburu onwe ya si na ya pụta, ebe ọ bụ na ebe ọ dị mere ka m nwee ike inyere nwanne m nwoke na nwunye ya aka ilekọta ndị mụrụ m mgbe ọrịa jisiri ha ike. Agaraghị m enwe ike ime nke a ma a sị na m nọ n’ozi ala ọzọ n’ebe dịpụrụ adịpụ ruo ọtụtụ puku kilomita.

Nne m letara m ugboro ugboro na Betel. Ọ bụrụgodị na àjà ọ chụrụ bụ mụ na ya ibi iche, ọ gwara m mgbe mgbe, sị: “Nwa m, Nọrọ na Betel. Obi dị m ụtọ na ị na-ejere Jehova ozi n’ụzọ dị otú a.” N’ụzọ dị mwute, ma nne m ma nna m anwụwo. Lee ka m si atụ anya ịhụ ha n’ime ụwa nke e mere ka ọ ghọọ paradaịs a na-ahụ anya!

Ekwenyere m n’ezie na ọ bụrụ na ọ dị ụlọ kwesịrị ka a kọwaa ya dị ka “Paradaịs Ugbu A,” ọ bụ Betel—“Ụlọ Chineke”—n’ihi na karịsịa, ezigbo paradaịs bụ nke ime mmụọ, ndị nwere ezi ọnọdụ ime mmụọ jupụtakwara na Betel. Anyị nwere ohere ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Ndị Galetia 5:22, 23) Nri ime mmụọ mara abụba anyị na-eri n’oge a na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị sitere na Bible na n’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ nke Ụlọ Nche, na-enye aka iwusi m ike maka ozi Betel. Ọzọkwa, inwe ike isoro ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe bụ́ ndị jewooro Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ iri afọ na-akpakọ, na-eme ka Betel bụrụ ebe pụrụ iche ịnọ tolite n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ ezie na e kewapụwo m n’ebe nwa m nwanyị nọ ruo afọ 17 ugbu a, ahụwo m imerime ndị ntorobịa na-anụ ọkụ n’obi na Betel, bụ́ ndị m weere dị ka ụmụ m, ndị m na-enwekwa obi ụtọ n’ọganihu ime mmụọ ha. N’ime afọ asatọ gafeworonụ, arụwo m ụzọ ọrụ asaa. Ọ bụ ezie na mgbanwe ndị a adịchaghịrị m mfe mgbe nile, ọzụzụ dị otú ahụ na-aba uru ka oge na-aga.

Ana m akọbu ụdị mkpụrụ àgwà na-amị mkpụrụ n’ụba. N’otu aka ahụ, ahụwo m na mgbe ị ghara mkpụrụ ọjọọ, ị na-enweta ihe ka njọ n’ụba dị ka ihe ubi—ọ bụghịkwa nanị otu ugboro. Ịmụta ihe site n’ahụmahụ bụ nnọọ ụlọ akwụkwọ ihe ọmụmụ ya na-efu oké ihe. Agaara m ahọrọ edebaghị aha m n’ụlọ akwụkwọ ahụ ma ọlị, kama ka a zụlite m n’ụzọ Jehova. Lee ihe ùgwù ọ bụụrụ ndị ntorobịa nne na nna ha bụ́ ndị Kraịst zụlitere! Obi abụọ adịghị ya na ọ ka mma ịgha mkpụrụ dị mma n’ozi Jehova na inweta udo na afọ ojuju hiri nne dị ka ihe ubi.—Ndị Galetia 6:7, 8.

Mgbe m bụ ọsụ ụzọ, mgbe ụfọdụ ana m agafe n’ụlọ ahụ a na-ere akwụkwọ okpukpe bụ́ nke anyị dere okwu e ji mara onye na-akpasu ọgba aghara. Ọbụna abanyewo m n’ime ya ma gwa onye nwe ya banyere Chineke dị ndụ na nzube ya. Ee, Chineke dị ndụ! Ọzọkwa, Jehova, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, bụ Nna na-ekwesị ntụkwasị obi, nke na-adịghị agbahapụ ụmụ ya ma ọlị. (Mkpughe 15:4) Ka ọtụtụ ìgwè mmadụ ka ukwuu si ná mba nile chọta paradaịs ime mmụọ ahụ ugbu a—na Paradaịs ahụ e weghachiri bụ́ nke na-abịanụ—site n’ijere Chineke ahụ dị ndụ, bụ́ Jehova ozi na inye ya otuto!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

N’ịbụ onye ịdị ebube nke ihe e kere eke kpalịrị, ekpebiri m n’ime obi m ikwere na Chineke. (N’aka nri) N’ozi Betel taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya