Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 5/1 p. 20-24
  • Nọrọ Na Nche Ma Dị Uchu!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọrọ Na Nche Ma Dị Uchu!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọrọ na Nche, Dị Ka Ụmụ Agbọghọ Ise ahụ Nọọrọ!
  • Nọrọ na Nche Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso
  • Ịnọ na Nche Ma Dị Uchu n’Oge Ọnụnọ Ya
  • Ị̀ Ga ‘Na-eche Nche’?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ị̀ Na-ege Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Jizọs Ejiri Ihe Atụ Ụmụ Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Kụzie Gbasara Ịmụrụ Anya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Inye Ìhè Maka “Ọgwụgwụ Oge A”
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 5/1 p. 20-24

Nọrọ Na Nche Ma Dị Uchu!

“Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge awa ahụ.”—MATIU 25:13.

1. Gịnị ka Jọn onyeozi na-elepụ anya n’ihu maka ya?

NÁ MKPARỊTA ụka ikpeazụ dị na Bible, Jisọs kwere nkwa, sị: “Ana m abịa ọsọ ọsọ.” Onyeozi ya bụ́ Jọn zaghachiri, sị: “Amen: bịa Onyenwe anyị Jisọs.” Onyeozi ahụ enweghị obi abụọ ọ bụla na Jisọs ga-abịa. Jọn so n’etiti ndị ozi ahụ jụworo Jisọs, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [Grik, pa·rou·siʹa] gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” Ee, Jọn ji obi ike lepụ anya maka ọnụnọ Jisọs n’ọdịnihu.—Mkpughe 22:20; Matiu 24:3, NW.

2. Banyere ọnụnọ Jisọs, gịnị bụ ọnọdụ dị na chọọchị dị iche iche?

2 A dịghị ahụkebe obi ike dị otú ahụ n’ụbọchị ndị a. Ọtụtụ chọọchị nwere ozizi ha nakweere banyere “ọbịbịa” Jisọs, ma ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ndị òtù ha na-atụ anya ya n’ezie. Ha na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na Jisọs agaghị abịa. Akwụkwọ bụ́ The Parousia in the New Testament na-asị: “Olileanya Parousia na-enwe mmetụta dị nta ná ndụ, echiche na ọrụ nke chọọchị. . . . Oké ịdị ngwa nke chọọchị kwesịrị iji na-arụ ọrụ nchegharị ya na nke ikpọsa ozi ọma n’ala ọzọ, ebelatawo ma ọ bụrụ na o funyụbeghị anya.” Ma ọ dịghị otú ahụ n’ebe mmadụ nile nọ!

3. (a) Olee otú ezi ndị Kraịst si ele pa·rou·siʹa anya? (b) Gịnị kpọmkwem ka anyị ga-atụle ugbu a?

3 Ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs na-echesi ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a ike. Ka anyị ji iguzosi ike n’ihe na-eme otú ahụ, ọ dị anyị mkpa inwe echiche ziri ezi n’ihe nile ọnụnọ Jisọs gụnyere ma mee ihe n’ụzọ kwekọrọ na ha. Nke ahụ ga-eme ka anyị nwee ike ‘iwere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile ma bụrụ ndị a zọpụtara.’ (Matiu 24:13) Ka ọ na-ebu amụma ahụ anyị na-achọta na Matiu isi nke 24 na 25, Jisọs nyere ndụmọdụ amamihe dị na ya nke anyị pụrụ itinye n’ọrụ, iji nweta abamuru na-adịgide adịgide. Isi nke 25 nwere ilu ndị ị maara ma eleghị anya, gụnyere nke ahụ metụtara ụmụ agbọghọ iri (ụmụ agbọghọ ndị maara ihe na ndị nzuzu) na ilu banyere talent. (Matiu 25:1-30) Olee otú anyị pụrụ isi rite uru n’ihe atụ ndị ahụ?

Nọrọ na Nche, Dị Ka Ụmụ Agbọghọ Ise ahụ Nọọrọ!

4. Gịnị bụ isi ihe dị n’ilu ụmụ agbọghọ ahụ?

4 Ị pụrụ ịchọ ịgụghachi ilu banyere ụmụ agbọghọ ahụ, nke a na-achọta na Matiu 25:1-13. Ebe ọ nọ were ọnọdụ bụ n’otu nnukwu agbamakwụkwọ ndị Juu nke onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ gara n’ụlọ nna nwunye ahụ ọ na-alụ ọhụrụ iji dulata nwanyị ahụ n’ebe obibi ya (ma ọ bụ na nke nna ya). Ndị na-eti egwú na ndị na-abụ abụ pụrụ iso n’ìgwè dị otú ahụ, a gaghịkwa ama kpọmkwem oge ọ ga-eji bịarute. N’ilu ahụ, ụmụ agbọghọ iri cheere ruo n’ime abalị maka nlọrute nke onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ise n’ime ha ezuzuruwo hapụ iweta mmanụ ọkụ ga-ezuru ha, n’ihi ya kwa, ha aghaghị ịga zụtakwuo. Ise ndị ọzọ ejiriwo amamihe gbanyekwuo mmanụ n’arịa ha ka ha wee nwee ike ịgbajughachi oriọna ha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa n’oge ahụ ha nọ na-echere. Nanị mmadụ ise a nọ ya ma dị njikere mgbe onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ lọrutere. N’ihi ya, nanị ha ka e kwere ka ha banye n’oriri ahụ. Mgbe ụmụ agbọghọ nzuzu ise ahụ lọghachiri, oge agafewo nnọọ maka ha ịbanye.

5. Olee akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-eme ka a ghọta ihe ilu ụmụ agbọghọ ahụ pụtara n’ụzọ ihe atụ?

5 A pụrụ ịghọta ọtụtụ akụkụ nke ilu a dị ka ihe atụ. Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere Jisọs dị ka onye na-alụ nwunye ọhụrụ. (Jọn 3:28-30) Jisọs ji onwe ya tụnyere nwa nwoke nke eze bụ́ onye e doziwooro oriri alụmdi na nwunye. (Matiu 22:1-14) Bible na-ejikwa Kraịst atụnyere di. (Ndị Efesọs 5:23) N’ụzọ na-akpali mmasị, ọ bụ ezie na a kọwara ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka “nwunye ọhụrụ” Kraịst n’ebe ndị ọzọ, ilu ahụ ehotaghị nwunye ọhụrụ. (Jọn 3:29; Mkpughe 19:7; 21:2, 9) Otú ọ dị, ọ na-ekwu banyere ụmụ agbọghọ iri, n’ebe ọzọ, e jikwa ndị e tere mmanụ tụnyere nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke e kwere nkwa ọlụlụ nye Kraist.—2 Ndị Kọrint 11:2.a

6. Olee agbamume Jisọs nyere mgbe ọ na-emechi ilu ụmụ agbọghọ ahụ?

6 E wezụga nkọwa zuru ezu dị otú ahụ na otú ọ bụla e si jiri ha mee ihe n’ụzọ amụma, n’ezie e nwere ụkpụrụ ndị dị mma anyị pụrụ ịmụta site n’ilu a. Dị ka ihe atụ, rịba ama na Jisọs ji okwu ndị a na-esonụ mechie ya: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge awa ahụ.” Ya mere ilu ahụ na-egosi mkpa ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị ịnọ na nche, ịmụrụ anya banyere ọgwụgwụ na-abịanụ nke ajọ usoro ihe a. Obi abụọ ọ bụla adịghị ya na ọgwụgwụ a na-abịa, ọ bụ ezie na anyị apụghị ikwu kpọmkwem ụbọchị ọ ga-abụ. Banyere nke a, rịba àgwà ndị ìgwè ụmụ agbọghọ abụọ ahụ gosipụtara ama.

7. N’echiche dị aṅaa ka ise n’ime ụmụ agbọghọ ahụ nọ n’ilu ahụ gosiri na ha dị nzuzu?

7 Jisọs sịrị: “Ise n’ime ha bụ ndị nzuzu.” Ọ̀ bụ n’ihi na ha ekwetaghị na onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa? Hà pụrụ na-achụso ihe ụtọ? Ka à ghọgburu ha? Ee e. Jisọs sịrị na mmadụ ise a ‘pụrụ izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ.’ Ha maara na ọ na-abịa, ha chọkwara isonye, ọbụna iso kere òkè “n’oriri ọlụlụ nwunye” ahụ. Ma, hà jikeere nke ọma? Ha cheere ya ruo oge ụfọdụ, ruo “n’etiti abalị,” ma ha adịghị njikere maka nrute ya mgbe ọ bụla nke ahụ ga-abụ—ma ọ̀ bụ tupu oge ha tụburu anya ya ma ọ bụ mgbe oge ahụ gasịrị.

8. Olee otú ise n’ime ụmụ agbọghọ ahụ nọ n’ilu ahụ si gosi na ha nwere uche?

8 Ise ndị ọzọ—ndị ahụ Jisọs kpọrọ ndị nwere uche—jikwa oriọna ndị a mụnyere ọkụ pụọ, na-atụ anya mbịarute nke onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ha aghaghịkwa ichere, ma ha “nwere uche.” Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “nwere uche” pụrụ inye echiche nke “ịdị akọ, inwe ezi uche, inwe amamihe.” Mmadụ ise a gosiri na ha nwere uche site n’iweta arịa ndị a gbanyekwuru mmanụ iji gbajughachi oriọna ha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. N’ezie, ha chọrọ nnọọ ịdị njikere maka onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ nke na ha agaghị enyetụ mmadụ mmanụ ha. Ịnọ na nche dị otú ahụ ehieghị ụzọ, dị ka e gosiri site na ha ịbụ ndị nọ ya nakwa ịbụ ndị dị njikere n’ụzọ zuru ezu mgbe onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị a “e doziworo wee so ya baa n’oriri ọlụlụ nwunye: e wee mechie ụzọ.”

9, 10. Gịnị bụ isi ihe dị n’ilu ụmụ agbọghọ ahụ, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

9 Jisọs anaghị enye ihe mmụta banyere àgwà kwesịrị ekwesị n’agbamakwụkwọ, ọ naghịkwa enye ndụmọdụ banyere ikerịta ihe. Isi ihe ọ na-ekwu bụ: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge awa ahụ.” Jụọ onwe gị, ‘M̀ nọ na nche n’ezie n’ihe banyere ọnụnọ Jisọs?’ Anyị kweere na Jisọs na-achị achị ugbu a n’eluigwe, ma olee otú anyị tụkwasịruru uche n’eziokwu bụ́ na ‘Nwa nke mmadụ ga-abịa n’isi nso n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube’? (Matiu 24:30) Ka ọ na-erule “n’etiti abalị,” mbịarute nke onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ dị nso n’ezie karịa otú ọ dị mgbe ụmụ agbọghọ ahụ pụtara izute ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, mbịarute Nwa nke mmadụ iji bibie ajọ usoro ihe dị ugbu a dị nso karịa otú ọ dị mgbe anyị malitere ịtụ anya ọbịbịa ya. (Ndị Rom 13:11-14) Ànyị anọgidewo na nche, ọbụna na-eche nche karị ka oge ahụ na-abịarukwu nso?

10 Ọ chọrọ ịnọ na nche mgbe nile iji rube isi n’iwu ahụ bụ́ ‘na-echenụ nche.’ Ụmụ agbọghọ ise kwere ka mmanụ ha gwụ ma gaa ịzụta ọzọ. N’otu aka ahụ, a pụrụ ịdọpụ uche onye Kraịst taa nke na ọ gaghị adịzu njikere maka ọbịbịa Jisọs nke dị ezi nso. O mere ụfọdụ ndị Kraịst narị afọ mbụ. Ọ pụrụ ime ụfọdụ ndị taa. Ya mere ka anyị jụọ onwe anyị, sị, ‘Ọ̀ na-eme m?’—1 Ndị Tesalọnaịka 5:6-8; Ndị Hibru 2:1; 3:12; 12:3; Mkpughe 16:15.

Nọrọ na Nche Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso

11. Olee ilu ọzọ Jisọs tụrụ, gịnịkwa ka o yiri?

11 N’ilu ya sochirinụ, Jisọs mere ihe karịrị ịgba ụmụazụ ya ume ịnọ na nche. Mgbe ọ kọsịrị banyere ụmụ agbọghọ ndị maara ihe na ndị nzuzu, ọ tụrụ ilu banyere talent. (Gụọ Matiu 25:14-30.) N’ọtụtụ akụkụ, nke a yiri ilu mbụ ya banyere pound, bụ́ nke Jisọs tụrụ n’ihi na ọtụtụ ndị “na-eche na alaeze Chineke gaje ịpụta ìhè ngwa ngwa.”—Luk 19:11-27.

12. Gịnị bụ isi ihe dị n’ilu talent ahụ?

12 N’ilu talent ahụ, Jisọs kọrọ banyere otu nwoke nke kpọrọ ndị ohu ya atọ, tupu ya emee njem n’ala ọzọ. Otu ka o nyere talent ise, nye onye nke ọzọ abụọ, nyekwa onye nke ikpeazụ nanị otu—“onye ọ bụla dị ka ike nke aka ya hà.” Ma eleghị anya, nke a bụ talent ọlaọcha, bụ́ ego e ji eme ihe mgbe ahụ nke ruru ihe onye ọrụ ga-akpata n’afọ 14—nnukwu ego! Mgbe nwoke ahụ lọghachiri, o mere ka ndị ohu ahụ mee ngụkọ ihe ha mere ‘n’ogologo oge’ ahụ ọ na-anọghị ya. Ndị ohu abụọ mbụ ahụ amụbaala uru nke ihe e nyere ha okpukpu abụọ. Ọ sịrị “i mere nke ọma,” kwe nke ọ bụla n’ime ha nkwa inyekwu ya ibu ọrụ, ma kwubie, sị: “Baa n’ọṅụ nke onyenwe gị.” N’ịzọrọ na onyenwe ya na-achọbiga ihe ókè, ohu ahụ e nyere otu talent ejibeghị talent ahụ mee ihe ọ bụla bara uru. O zoro ego ahụ, o tinyedịghị ya n’aka ndị na-agbanwe ego iji nweta ọmụrụ nwa. Onyenwe ya kpọrọ ya “ajọ ohu nke dị umengwụ” n’ihi na ọ rụwo ọrụ n’ụzọ megidere ọdịmma onyenwe ya. N’ihi ya, a napụrụ ya talent ahụ, a tụpụkwara ya n’èzí bụ́ ‘ebe ịkwa ákwá na ịta ikikere ezé ya’ ga-adị.

13. Olee otú Jisọs si gosi na ya bụ nna ukwu ahụ nọ n’ilu ahụ?

13 Ọzọkwa, a pụrụ ịghọta nkọwa zuru ezu banyere nke a n’ụzọ ihe atụ. Dị ka ihe atụ, Jisọs, bụ́ onye nwoke ahụ mere njem gaa ala ọzọ sere onyinyo ya, ga-ahapụ ndị na-eso ụzọ ya, gaa n’eluigwe, ma chere ruo ogologo oge tupu ya anata ike ọchịchị.b (Abụ Ọma 110:1-4; Ọrụ 2:34-36; Ndị Rom 8:34; Ndị Hibru 10:12, 13) Otú ọ dị, anyị pụkwara ịhụ ihe mmụta ma ọ bụ ụkpụrụ sakwuru mbara nke anyị nile kwesịrị itinye n’ọrụ ná ndụ anyị. Gịnị ka nke ahụ bụ?

14. Ilu talent ahụ na-emesi mkpa dị aṅaa ike?

14 Ma olileanya anyị ọ̀ bụ ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe ma ọ bụ ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs, o doro anya site n’ilu Jisọs na anyị kwesịrị ịdogbu onwe anyị n’ọrụ n’ihe omume dị iche iche nke ndị Kraịst. N’ezie, a pụrụ ịchịkọta ozi dị n’ilu a n’okwu bụ́: ịdị uchu. Ndị ozi setipụrụ ụkpụrụ a site na Pentikọst 33 O.A. gaa n’ihu. Anyị na-agụ, sị: “[Pita] jikwa ọtụtụ okwu ọzọ kwusie okwu ike, na-arịọkwa ha, sị, Zọpụtanụ onwe unu n’ọgbọ a dị mgbagọ.” (Ọrụ 2:40-42) Leekwa uru magburu onwe ya o nwetara n’ihi mgbalị ya! Ka ndị ọzọ sonyeere ndị ozi ahụ n’ọrụ nkwusa ndị Kraịst, ha onwe ha dịkwa uchu, na-eme ka ozi ọma ahụ ‘na-aba ụba n’ụwa nile.’—Ndị Kọlọsi 1:3-6, 23; 1 Ndị Kọrint 3:5-9.

15. N’ụzọ dị aṅaa pụrụ iche ka anyị kwesịrị isi na-etinye isi ihe dị n’ilu talent ahụ n’ọrụ?

15 Buru n’uche ihe a na-ekwu n’ilu a—amụma banyere ọnụnọ Jisọs. Anyị nwere ihe àmà hiri nne na pa·rou·siʹa Jisọs na-aga n’ihu, na ọ ga-eru ọgwụgwụ ya n’oge na-adịghị anya. Cheta njikọ Jisọs jikọrọ “ọgwụgwụ ihe nile” na ọrụ ahụ ọ dị mkpa ka ndị Kraịst rụọ: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) N’iburu nke a n’uche, olee ụdị ohu anyị yiri? Jụọ onwe gị: ‘À ga-enwe ihe mere a ga-eji ekwubi na m yiri ohu ahụ nke zoro ihe e nyere ya, ikekwe ebe o lebaara mkpa nke aka ya anya? Ka ò doro anya na m yiri ndị ahụ ziri ezi ma kwesị ntụkwasị obi? M̀ kpebisiri ike ịmụba ọdịmma nke Onyenwenụ ahụ n’oge nile?’

Ịnọ na Nche Ma Dị Uchu n’Oge Ọnụnọ Ya

16. Ozi dị aṅaa ka ilu abụọ ahụ anyị tụleworo na-ezi gị?

16 Ee, e wezụga ihe ha pụtara n’ụzọ ihe atụ na n’ụzọ amụma, ilu abụọ a na-enye anyị agbamume doro anya nke sitere n’ọnụ Jisọs n’onwe ya. Ozi ya bụ nke a: Nọrọ na nche; dị uchu, karịsịa mgbe a hụrụ ihe ịrịba ama nke pa·rou·siʹa Kraịst. Ya bụ ugbu a. Ya mere ànyị nọ na nche ma dị uchu n’ezie?

17, 18. Gịnị ka Jemes onye na-eso ụzọ dụrụ n’ọdụ metụta ọnụnọ Jisọs?

17 Onye otu nne ji ya na Jisọs bụ́ Jemes anọghị n’Ugwu Olive iji nụ amụma Jisọs; ma o mesịrị mara banyere ya, ọ ghọtakwara isi ihe dị na ya nke ọma. O dere, sị: “Ya mere, ụmụnna m, na-atachinụ ogologo ntachi obi ruo [ọnụnọ, NW] nke Onyenwe anyị. Lee, onye ọrụ ubi na-eche mkpụrụ dị oké ọnụ ahịa nke ala, na-atachi ogologo ntachi obi n’ebe ọ dị, ruo mgbe ọ ga-anata mmiri ozuzo mbụ na mmiri ozuzo ikpeazụ. Unu onwe unu, na-atachikwanụ ogologo ntachi obi; meenụ ka obi unu guzosie ike: n’ihi na [ọnụnọ, NW] nke Onyenwe anyị dị nso.”—Jemes 5:7, 8, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

18 Mgbe o mesịrị ka obi sie ha ike na Chineke ga-ama ndị ji akụ̀ ha na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ikpe, Jemes gbara ndị Kraịst ume ka ha ghara ịbụ ndị na-enweghị ogologo ntachi obi ka ha na-eche ka Jehova mee ihe. Onye Kraịst nke na-enweghị ogologo ntachi obi pụrụ ịghọ onye na-abọ ọ́bọ̀, dị ka a ga-asị na ya onwe ya bụ onye na-aghaghị imezi ihe ọjọọ ahụ e mere. Ma, nke ahụ ekwesịghị ịdị otú ahụ n’ihi na oge ikpe ga-abịarịrị. Ihe atụ banyere onye ọrụ ubi na-egosipụta nke ahụ, dị ka Jemes kọwara.

19. Olee ụdị ogologo ntachi obi onye Israel na-arụ ọrụ ubi pụrụ igosipụta?

19 Onye Israel bụ́ onye ọrụ ubi nke kụrụ mkpụrụ aghaghị ichere, nke mbụ maka akwụkwọ ya ịpụta, mgbe ahụ maka ihe ọkụkụ ahụ ito, n’ikpeazụ kwa maka iwe ihe ubi. (Luk 8:5-8; Jọn 4:35) N’ime ọnwa ndị ahụ, e nwere oge, ma eleghịkwa anya ihe na-akpata nchegbu ụfọdụ. Mmiri ozuzo ndị mbụ hà ga-abịa ma zoo nnukwu? Gịnị banyere mmiri ozuzo ndị ikpeazụ? Ụmụ ahụhụ ma ọ bụ oké ifufe hà pụrụ igbu ihe ọkụkụ ndị ahụ? (Tụlee Joel 1:4; 2:23-25.) Otú o sina dị, n’elu ihe nile, onye Israel bụ́ onye ọrụ ubi pụrụ ịtụkwasị Jehova na usoro ndị sitere n’okike o guzobeworo obi. (Deuterọnọmi 11:14; Jeremaịa 5:24) Ogologo ntachi obi onye ọrụ ubi pụrụ n’ezie ịrụpụta atụmanya na-esi obi ike. N’okwukwe, ọ maara na ihe ọ na-eche ga-abịa. Ọ ga-abịarịrị!

20. Olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta ogologo ntachi obi n’ụzọ kwekọrọ na ndụmọdụ Jemes?

20 Ọ bụ ezie na onye ọrụ ubi pụrụ inwe ihe ọmụma ụfọdụ banyere mgbe owuwe ihe ubi ga-abụ, ndị Kraịst narị afọ mbụ apụghị ịgụkọ mgbe ọnụnọ Jisọs ga-abụ. Otú ọ dị, e ji n’aka na ọ ga-abịa. Jemes dere, sị: “[Ọnụnọ, NW] [Grik, pa·rou·siʹa] nke Onyenwe anyị dị nso.” N’oge Jemes dere okwu ndị ahụ, ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Kraịst apụtabeghị ìhè n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu, ma ọ bụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ. Ma ọ pụtawo ugbu a! Ya mere olee mmetụta anyị kwesịrị inwe n’oge a? Ihe ịrịba ama ahụ pụtara ìhè n’ezie. Anyị na-ahụ ya. Anyị pụrụ iji obi ike kwuo, sị, ‘Ana m ahụ ihe ịrịba ama ahụ ka ọ na-emezu.’ Anyị pụrụ iji obi ike kwuo, sị, ‘Ọnụnọ nke Onyenwe anyị amalitewo, ọgwụgwụ ya dịkwa nso.’

21. Gịnị ka anyị kpebisiri ike ime?

21 Ebe ọ dị otú ahụ, anyị nwere kpọmkwem ihe siri ike mere anyị ga-eji buru ihe mmụta ndị bụ́ isi nke ilu abụọ Jisọs anyị tụleworo n’obi ma tinye ha n’ọrụ. Ọ sịrị: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amataghị ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge awa ahụ.” (Matiu 25:13) Obi abụọ ọ bụla adịghị ya na ugbu a bụ oge anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ndị Kraịst anyị. Ka anyị na-egosi ná ndụ anyị kwa ụbọchị na anyị ghọtara isi ihe Jisọs kwuru. Ka anyị nọrọ na nche! Ka anyị dị uchu!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Banyere nkọwa ihe atụ zuru ezu nke ilu ahụ, lee God’s Kingdom of a Thousand Years Has Approached, peji nke 169-211, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Lee God’s Kingdom of a Thousand Years Has Approached, peji nke 212-256.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Isi ihe dị aṅaa ka ị mụtaworo site n’ilu ụmụ agbọghọ ahụ maara ihe na ndị ahụ dị nzuzu?

◻ Site n’ilu talent ahụ, ndụmọdụ dị aṅaa bụ́ isi ka Jisọs na-enye gị?

◻ N’echiche dị aṅaa ka ogologo ntachi obi ị na-enwe banyere pa·rou·siʹa si yie nke onye Israel bụ́ onye ọrụ ubi?

◻ Gịnị mere oge a anyị na-ebi n’ime ya ji bụrụ oge kasị akpali akpali ma na-eweta ihe ịma aka?

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Gịnị ka ị mụtara site n’ilu ụmụ agbọghọ ahụ na nke talent ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya