Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 5/15 p. 29-31
  • Sọl—Ihe Ọrụ A Họpụtaara Onyenwe Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Sọl—Ihe Ọrụ A Họpụtaara Onyenwe Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezinụlọ Sọl
  • Agụmakwụkwọ Sọl
  • Ikike Ndị E Ji Mee Ihe Bara Uru
  • Jizọs Họọrọ Sọl
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • ‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Onye Mkpagbu ahụ Ahụ Oké Ìhè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • “Irube Isi Dị Mma Karịa Àjà”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 5/15 p. 29-31

Sọl—Ihe Ọrụ A Họpụtaara Onyenwe Anyị

SỌL onye Tasọs bụ ajọ onye iro nke ụmụazụ Kraịst. Ma Onyenwe anyị zubeere ya ihe dị iche ọ ga-eme n’ọdịnihu. Sọl gaje ịghọ onye nnọchiteanya pụtara ìhè nke kpọmkwem ụzọ ahụ ọ lụsoworo ọgụ nke ukwuu. Jisọs sịrị: “Onye ahụ [Sọl] bụ ihe ọrụ a họpụtara nye m, ka o buru aha m chee n’ihu mba ọzọ na ndị eze, na ụmụ Israel.”—Ọrụ 9:15.

A gbanwere ndụ Sọl dị ka “onye na-eme mmadụ ihe ihere” kpam kpam mgbe e meere ya ebere, o wee ghọọ “ihe ọrụ a họpụtara” nye Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. (1 Timoti 1:12, 13) E ji ike nile nke kwaliworo ya ikere òkè n’ịtụ Stifen nkume na ná mwakpo ndị ọzọ a wakporo ndị na-eso ụzọ Jisọs mezuo nzube dị nnọọ iche mgbe Sọl ghọrọ onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi. O doro anya na Jisọs hụrụ àgwà ọma ndị Sọl nwere. Àgwà ndị dị aṅaa? Ònye bụ Sọl? Olee otú nzụlite ya si mee ka ọ bụrụ onye kwesịrị iji ya eme ka ezi ofufe gaa n’ihu? Ànyị pụrụ ịmụta ihe ọ bụla site n’ahụmahụ ya?

Ezinụlọ Sọl

N’oge e gburu Stifen, n’oge na-adịghị anya mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị, Sọl bụ “nwa okorobịa.” Mgbe ọ na-edegara Faịlimọn akwụkwọ n’ihe dị ka afọ 60-61 O.A., ọ bụ “agadi.” (Ọrụ 7:58; Faịlimọn 9) Ndị ọkà mmụta na-atụ aro na, dị ka otú e si agụ afọ ndụ n’oge ochie si dị, “nwa okorobịa” yiri ka ọ pụtara onye dị n’agbata afọ 24 na 40, ebe “agadi” ga-abụ malite n’afọ ndụ 50 ruo 56. N’ihi ya o nwere ike ịbụ na a mụrụ Sọl nanị afọ ole na ole mgbe a mụsịrị Jisọs.

Mgbe ahụ ndị Juu bi n’ọtụtu mpaghara ụwa. Mmeri e meriri ha, ịgba ha ohu, ịgbara ha ụgbọ nwa mkpi, azụmahịa, na ha iji aka ha gaa n’ala ọzọ so n’ime ihe ndị kpatara ha ji si na Judia gasasịa. Ọ bụ ezie na ezinụlọ ya bụ ndị Juu gapụrụ agapụ, Sọl na-emesi ike nrapagide ha rapagidesiri ike n’Iwu ahụ, na-ekwu na ‘e biri ya úgwù n’ụbọchị nke asatọ, na ya sitere n’ụmụ Israel, sitekwa n’ebo Benjamin, bụrụ onye Hibru nke sitere ná ndị Hibru; n’akụkụ iwu, bụrụ onye Farisii.’ Sọl zara otu aha Hibru ahụ nke onye a ma ama si n’ebo ya—eze mbụ nke Israel—zara. Dị ka onye Rom site n’ọmụmụ, Sọl onye Tasọs nwekwara aha Latin, bụ́ Paullus.—Ndị Filipaị 3:5; Ọrụ 13:21; 22:25-29.

Sọl ịbụ onye a mụrụ dị ka nwa amaala Rom pụtara na otu n’ime ndị nna nna ya nwetara ihe ùgwù nke ịbụ nwa amaala mba ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịbụ ihe merenụ. E wezụga iketa ọnọdụ ịbụ nwa amaala, a pụrụ inye ya mmadụ ma ọ bụ òtù dị iche iche dị ka ihe nrite, maka iji ya enweta uru ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ dị ka ụgwọ ọrụ maka ezigbo ozi e jeere Ọchịchị. Ohu nke nwere ike ịzụnata onye Rom nnwere onwe ya, ma ọ bụ onye nwa amaala Rom tọhapụrụ, ga-aghọ onye Rom n’onwe ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa onye sobu n’òtù ndị agha mgbe a tọhapụrụ ya site n’usuu ndị agha nke Rom. Ndị obodo bi n’ebe ndị Rom na-achị pụrụ ịghọ ụmụ amaala mgbe oge na-aga. E kwukwara na n’oge ụfọdụ, e ji ego buru ibu zụta ọnọdụ ịbụ nwa amaala. Otú ezinụlọ Sọl si bụrụ ndị amaala ka bụ ihe a na-amaghị.

Anyị maara na Sọl si Tasọs, obodo bụ́ isi na isi obodo nke ógbè Rom bụ́ Silisia (nke dị ugbu a n’ebe ndịda Turkey). Ọ bụ ezie na ndị Juu butụrụ ibu bi n’ógbè ahụ, ndụ a na-ebi n’ebe ahụ gaara ekpughekwa Sọl nye ọdịbendị ndị Jentaịl. Tasọs bụ obodo buru ibu ma baa ọgaranya nke a maara dị ka ebe mmụta ndị Gris hiwere isi. Atụmatụ e mere na-egosi na ndị bi na ya na narị afọ mbụ dị n’agbata 300,000 na 500,000. Ọ bụ ebe bụ́ isi a na-azụ ahịa n’ụzọ awara awara dị n’agbata Asia Minor, Siria, na Mesopotemia. Tasọs bara ọgaranya n’ihi azụmahịa na ime nri nke ọma nke ala gbara ya gburugburu, bụ́ nke na-emepụtakarị ọka, mmanya, na ákwà. A na-emepụta ákwà ajị ewu bụ́ nke e ji eme ụlọikwuu, n’ụlọ ọrụ ya nke na-emepụta ákwà.

Agụmakwụkwọ Sọl

Sọl, ma ọ bụ Pọl, jiri ezi obi kpaara onwe ya nri ma kwado ọrụ ozi ala ọzọ ya site n’ịkpa ákwà ụlọikwuu. (Ọrụ 18:2, 3; 20:34) Ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu bụ ihe a na-emekarị n’obodo o si pụta, bụ́ Tasọs. O yikarịrị ka Sọl mụtara ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu n’aka nna ya mgbe ọ na-etolite.

Ọmụma Sọl maara asụsụ dị iche iche—karịsịa ọmụma ọ maara Grik nke ọma, bụ́ asụsụ onye ọ bụla na-asụ n’Alaeze Ukwu Rom—bakwara oké uru n’ozi ala ọzọ ya. (Ọrụ 21:37–22:2) Ndị na-enyocha ihe odide ya na-ekwu na otú o si asụ asụsụ Grik magburu onwe ya. Okwu ndị o ji eme ihe abụghị nke ndị oge ochie ma ọ bụ nke ndị nwere isi akwụkwọ, kama nke ahụ, o yiri nke e ji mee ihe na Septuagint, bụ́ nsụgharị Grik nke Akwụkwọ Nsọ Hibru nke o hotakarịrị ma ọ bụ kwutetụ ihe dị na ya. N’ihi ihe àmà a, ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ewere ya na ma ọ dịghị ihe ọzọ Sọl nwetara ezigbo agụmakwụkwọ bụ́ isi n’asụsụ Grik, eleghị anya n’ụlọ akwụkwọ ndị Juu. “N’oge ochie agụmakwụkwọ ka mma—karịsịa agụmakwụkwọ ndị Gris—abụghị ihe a na-enweta n’efu; iwu bụ na a na-enye ego tupu e nweta ya,” ka ọkà mmụta bụ́ Martin Hengel na-ekwu. N’ihi ya agụmakwụkwọ Sọl na-atụ arọ na a mụrụ ya n’ezinụlọ a ma ama.

O yikarịrị ka mgbe ọ na-agafebeghị afọ 13, Sọl gara n’ihu n’agụmakwụkwọ ya na Jerusalem, ihe dị ka kilomita 840 site n’ụlọ ha. A kụziiri ya ihe n’ụkwụ Gameliel, bụ́ onye nkụzi a maara nke ọma nke ọdịnala ndị Farisii, bụ́ onye a na-akwanyekwara ùgwù. (Ọrụ 22:3; 23:6) Mmụta ndị ahụ, ndị a ga-eji atụnyere agụmakwụkwọ mahadum taa, meghere ohere maka inweta ọkwá ukwu n’okpukpe ndị Juu.a

Ikike Ndị E Ji Mee Ihe Bara Uru

N’ịbụ onye a mụrụ n’ezinụlọ ndị Juu n’obodo ndị Gris na ndị Rom, Sọl sitere n’akụkụ atọ n’ụwa. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nzụlite e nyere ya n’akụkụ ụwa dị iche iche ndị na-asụ ọtụtụ asụsụ nyeere ya aka ịghọ “ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ.” (1 Ndị Kọrint 9:19-23) Ọbụbụ ọ bụ nwa amaala Rom mesịrị mee ka o nwee ike ịgọpụrụ ozi ya n’ụzọ iwu kwadoro ma were ozi ọma ahụ gaa n’ihu onye ọchịchị kasị elu n’Alaeze Ukwu Rom. (Ọrụ 16:37-40; 25:11, 12) N’ezie, ọzụzụ, agụmakwụkwọ, na àgwà Sọl bụ nke Jisọs e mere ka o si n’ọnwụ bilie maara, bụ́ onye gwara Ananaịas, sị: “Gaa: n’ihi na onye ahụ bụ ihe ọrụ a họpụtara nye m, ka o buru aha m chee n’ihu mba ọzọ na ndị eze, na ụmụ Israel: n’ihi na Mụ onwe m ga-egosi ya ka ha hà, bụ́ ahụhụ nile ọ na-aghaghị ịhụ n’ihi aha m.” (Ọrụ 9:13-16) Mgbe e jiri ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi, ịnụ ọkụ n’obi Sọl nyere aka n’ịgbasa ozi Alaeze ahụ gaa n’ókèala ndị dị anya.

Nhọrọ Jisọs họọrọ Sọl maka ọrụ pụrụ iche bụ ihe omume dị ịrịba ama n’akụkọ ihe mere eme nke ndị Kraịst. Ma, ndị Kraịst nile nọ n’oge a nwere ikike na àgwà onwe onye ndị a pụrụ iji eme ihe n’ụzọ dị irè n’ịgbasa ozi ọma ahụ. Mgbe Sọl ghọtara ihe Jisọs chọrọ ka o mee, ọ laghị azụ. O mere ike ya nile iji kwalite ọdịmma Alaeze. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu n’ebe ị nọ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Banyere ihe Sọl nwere ike ịmụtaworị n’aka Gameliel, lee Ụlọ Nche, July 15, 1996, peji nke 26-29.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 30]

Idebanye Aha Ịbụ Nwa Amaala Rom na Ikwado Ya

Ọgọstọs ji iwu abụọ e tiri n’afọ 4 na 9 O.A. guzobe ndebanye aha ụmụ nke ndị amaala Rom n’akwụkwọ. Ndebanye aha aghaghị iwere ọnọdụ n’ime ụbọchị 30 a mụsịrị mmadụ. N’ógbè ndị ahụ nile, ezinụlọ aghaghị ime nkwupụta n’ihu onye majie nọ n’ụlọ ọrụ ọha kwesịrị ekwesị a na-eme ndekọ, na-ekwu na nwa ahụ bụ nwa afọ, bụrụkwa nwa amaala Rom. A na-edebakwa aha nne na nna ya, debakwa ma nwa ahụ ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwanyị na aha ya, nakwa ụbọchị a mụrụ ya. Ọbụna tupu e tie iwu ndị a, e ji usoro ịgụ ndị mmadụ ọnụ na-emeghachi ndebanye aha ụmụ amaala n’obodo, ala a na-achị achị, na n’ụlọ ọrụ ndị isi nke Rom n’afọ ise ọ bụla.

A pụrụ isi otú a gosi ọnọdụ mmadụ site n’izo aka n’ihe àmà nke ndekọ ndị e chekwara nke ọma. A pụrụ inweta ihe ndekọ ndị ahụ a bịanyere aka na ha n’ụdị nke tebụl osisi na-ebughị oké ibu (tebụl a na-apịakọta apịakọta). N’echiche nke ụfọdụ ndị ọkà mmụta, mgbe Pọl na-azọrọ na ya bụ nwa amaala Rom, o nwere ike ịbụ na ọ pụrụ inwetaworị satifiketi iji kwado ihe ọ na-azọrọ. (Ọrụ 16:37; 22:25-29; 25:11) Ebe a na-ele ịbụ nwa amaala Rom anya dị ka inwe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ “ọdịdị dị nsọ” ma mee ka mmadụ ruo eruo inweta ọtụtụ ihe ùgwù, imepụta adịgboroja nke akwụkwọ ahụ bụ ajọ ịda iwu. Ogbugbu ka a na-egbu onye ọ bụla na-ekwu ihe ọ na-abụghị.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Historic Costume in Pictures/Dover Publications, Inc., New York

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

Aha Rom Sọl

Nwa amaala Rom ọ bụla bụ́ nwoke nwere ọ dịkarịa ala akụkụ ihe atọ mejupụtara aha ya. O nwere aha mbụ, aha ezinụlọ ya (nke e jikọrọ n’ebo, ma ọ bụ gens ya), na aha nna ya. Otu ihe atụ a ma ama bụ Gaius Julius Caesar. Bible adịghị enye anyị aha zuru ezu nke ndị Rom, ma akwụkwọ ndị na-abụghị Bible na-agwa anyị na Agripa bụ Marcus Julius Agripa. Galio bụ Lucius Junius Galio. (Ọrụ 18:12; 25:13) Ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ banyere aha abụọ ikpeazụ n’ime aha atọ mmadụ bụ Pọntiọs Pilatus (ihe e dere n’okpuru), Sajiọs Pọlọs, Klọdiọs Lisias, na Pọsiọs Festọs.—Ọrụ 4:27; 13:7; 23:26; 24:27.

E nweghị ike ikwu hoo haa ma Paullus ọ bụ aha mbụ nke Sọl ka ọ bụ aha nna ya. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịgbakwụnye aha ọzọ nke ezinụlọ ma ọ bụ ndị enyi mmadụ pụrụ ịdị na-akpọ ya. N’aka nke ọzọ, a pụrụ iji aha na-abụghị nke Rom dị ka Sọl dochie ya. “[Sọl] agaghị ekwesị ekwesị ịbụ aha Rom ma ọlị,” ka otu onye ọkà mmụta na-ekwu, “kama dị ka aha ebe a nọ mụọ mmadụ nke e nyere nwa amaala Rom dị ka signum, ọ ga-ekwesị nnọọ ekwesị.” N’ebe a na-asụ ọtụtụ asụsụ, o nwere ike ịbụ na ọnọdụ ya pụrụ ikpebiworị aha nke mmadụ pụrụ ịhọrọ ịza n’ime aha ndị o nwere.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto Israel Museum sere, ©Israel Antiquities Authority

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya