Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 6/1 p. 20-23
  • Imezu Nkwa M Kwere Ijere Chineke Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Imezu Nkwa M Kwere Ijere Chineke Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Itolite na Lithuania
  • Imezu Nkwa M
  • Ụle Ndị Mbụ nke Okwukwe
  • Mmachibido Iwu na Njideghachi
  • Ịnọgide Na-enwe Okwukwe n’Ụlọ Mkpọrọ
  • Ịlaghachi n’Ozi Oge Nile
  • Mkpa Ndị Chọrọ Ka E Mee Mgbanwe
  • Iji Ndidi Na-echere Jehova Site Na Nwata M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Mgbalị Siri Ike Anyị Mere Iji Kwụsie Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Chineke Bụ Ebe Mgbaba na Ike M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • ‘Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Nile Na-echere Jehova’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 6/1 p. 20-23

Imezu Nkwa M Kwere Ijere Chineke Ozi

Dị Ka Franz Gudlikies Si kọọ

Nanị mmadụ anọ fọdụrụ ndụ n’ime usuu ndị agha m so na ya bụ́ nke dị ihe karịrị otu narị ndị soja. N’ịbụ onye ọnwụ chere ihu, egbudoro m ikpere n’ala ma kwe Chineke nkwa, ‘Ọ bụrụ na m anwụghị n’agha a, aga m ejere gị ozi mgbe nile.’

EKWERE m nkwa ahụ afọ 54 gara aga, n’April 1945, mgbe m bụ onye soja n’usuu ndị agha Germany. Ọ bụ obere oge tupu Agha Ụwa nke Abụọ ebie, usuu ndị agha Soviet na-emekwa mgbalị siri ike ịbanye Berlin. E dewere ndị agha anyị na nso obodo Seelow n’Osimiri Oder, ihe na-erughị kilomita 65 site na Berlin. N’ebe ahụ ka a kwara anyị mgbọ dị ukwuu ehihie na abalị, a nọkwa na-egbukpọ usuu ndị agha m so na ya.

Ọ bụ mgbe ahụ, ná nke mbụ ya ná ndụ m, ka m ji anya mmiri kpekuo Chineke ekpere. Echetara m akụkụ Bible nke nne m na-atụ egwu Chineke na-ehotakarị: “Kpọkuokwa m n’ụbọchị mkpagbu; M ga-adọpụta gị, ị ga-asọpụkwara m.” (Abụ Ọma 50:15) Ka m nọ n’ime okokoro ahụ ma na-atụ egwu maka ndụ m, ekwere m Chineke nkwa ahụ m hotara n’elu. Olee otú m si nwee ike imezu ya? Oleekwa otú o si bụrụ na mụ aghọwo otu n’ime ndị agha Germany?

Itolite na Lithuania

Na 1918, n’oge Agha Ụwa Mbụ, Lithuania kwupụtara nnwere onwe ya ma guzobe usoro ọchịchị onye kwuo uche ya. A mụrụ m na 1925 n’ógbè Memel (Klaipėda) nke dị Oké Osimiri Baltic nso. A ka jikọtasịrị nnọọ ógbè ahụ ịbụ akụkụ nke Lithuania otu afọ tupu a mụọ m.

Mụ na ụmụnne m nwanyị ise nwere obi ụtọ n’oge anyị bụ ụmụaka. Nna anyị dị ka ezi enyi, na-eso anyị bụ́ ụmụaka na-emekọ ihe mgbe nile. Nne na nna anyị na-ekpe Chọọchị Evangelical, ma ha adịghị aga ụka n’ihi na omume ihu abụọ nke onye ụkọchukwu chọọchị ahụ kpasuru nne m iwe. Ma, ọ hụrụ Chineke na Okwu ya, bụ́ Bible, n’anya, bụ́ nke o ji ịdị uchu gụọ.

Na 1939, Germany weghaara akụkụ ebe anyị bi na Lithuania. E mesịa, ná mmalite 1943, a kpọrọ m òkù ije ozi agha n’usuu ndị agha Germany. Emerụrụ m ahụ n’otu n’ime ọgụ ndị ahụ, ma mgbe ọnyá ndị ahụ lasịrị, agaghachiri m n’Ihu Ọgụ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, ọnọdụ agha agbanwewo, ndị Germany na-agbakwa ọsọ n’ihu ndị Soviet. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ fọrọ nke nta ka e gbuo m, dị ka m kọrọ n’okwu mmalite.

Imezu Nkwa M

N’oge agha ahụ, nne na nna m kwagara Oschatz, Germany, nke dị nnọọ n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Leipzig. Ozugbo agha ahụ biri, o siiri m ike ịchọta ha. Ma lee obi ụtọ anyị nwere n’ikpeazụ ijikọtaghachi ọnụ! N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, n’April 1947, esonyeere m nne m jee gee okwu ihu ọha nke Max Schubert, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova kwuru. Nne m kweere na ya achọtawo ezi okpukpe ahụ, mgbe m jesịkwara nzukọ ole na ole, eso m ya kwere.

Obere oge mgbe e mesịrị, nne m si n’elu ubube daa, merụọ ahụ bụ́ nke gburu ya mgbe ọnwa ole na ole gasịrị. Mgbe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ tupu ọnwụ ya, ọ gbara m ume n’ụzọ na-emetụ n’ahụ, sị: “Ekpewo m ekpere mgbe mgbe na ọ dịkarịa ala ka otu n’ime ụmụ m nwee ike ịchọta ụzọ na-eduga n’ebe Chineke nọ. Ugbu a ahụwo m na a zawo ekpere m, apụziri m ịnwụ n’udo.” Lee ka m si elepụ anya n’ihu n’oge ọ ga-esi n’ụra ọnwụ teta, o wee hụ na e mezuru ekpere ya!—Jọn 5:28.

N’August 8, 1947, nanị ọnwa anọ mgbe m gesịrị okwu Nwanna Schubert, e mere m baptism n’otu mgbakọ e nwere na Leipzig ná ngosipụta nke nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke. N’ikpeazụ ana m eme ihe ndị ga-eduga m n’imezu nkwa m kwere Chineke. N’oge na-adịghị anya aghọrọ m ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. N’oge ahụ e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ọsụ ụzọ 400 bi n’ebe mesịrị ghọọ German Democratic Republic, ma ọ bụ East Germany.

Ụle Ndị Mbụ nke Okwukwe

Otu onye agbata obi m nọ n’Oschatz nwara ịraba m n’òtù Marx, na-ekwu na ya ga-ezije m agụmakwụkwọ mahadum nke ndị Ọchịchị ga na-ahụ maka ya ma ọ bụrụ na m ga-esonye Socialist Unity Party of Germany (SED). Ajụrụ m onyinye ahụ, ọbụna dị ka Jisọs jụrụ onyinye Setan.—Matiu 4:8-10.

Otu ụbọchị n’April 1949, ndị uwe ojii abụọ bịara n’ebe m na-arụ ọrụ ma kwuo ka m soro ha. A kpọgara m n’ọfịs nke ndị ọrụ nnyocha nzuzo nke Soviet bụ́ ebe e boro m ebubo ịrụrụ ndị aka ji akụ̀ nọ n’ebe Ọdịda Anyanwụ ọrụ. Ha kwuru na m pụrụ igosipụta na aka m dị ọcha site n’ịnọgide na-arụ ọrụ ụlọ n’ụlọ m ma na-akọrọ ha onye ọ bụla kwuru okwu na-adịghị mma banyere Soviet Union ma ọ bụ òtù SED ma ọ bụ onye ọ bụla gara nzukọ Ndịàmà Jehova. Mgbe m jụrụ ikwenyere ha, a tụrụ m nga. Mgbe e mesịrị, a kpọgara m n’ihu ihe yiri ka ọ bụ ụlọikpe ndị agha. Ikpe a mara m: nga ọrụ ahụhụ afọ 15 na Siberia!

Anọrọ m jụụ, nke ahụ metụkwara ndị ọfịsa ahụ n’ahụ. Mgbe e mesịrị ha gwara m na ikpe a mara m ka ga-adị irè, ma na ọ ga-ezu ma ọ bụrụ na mụ ana-abịa otu ugbo n’izu ruo mgbe m dị njikere ikwenyere ha. N’ịbụ onye chọrọ ndụmọdụ nke Ndịàmà tozuru okè karị, emere m njem gaa Magdeburg, bụ́ ebe alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’oge ahụ. Njem ahụ adịghị mfe, ebe ọ bụ na a na-eledo m anya. Ernst Wauer, bụ́ onye nọ na-eje ozi ná Ngalaba Okwu Ikpe dị na Magdeburg, gwara m, sị: “Lụọ ọgụ, ị ga-emerikwa. Mebie okwukwe gị, a ga-emerikwa gị. Ọ bụ ihe anyị mụtara n’ogige ịta ahụhụ.”a Ndụmọdụ ahụ nyeere m aka imezu nkwa m kwere ijere Chineke ozi.

Mmachibido Iwu na Njideghachi

Na July 1950, a họpụtara m ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Otú ọ dị, n’August 30, ndị uwe ojii wakporo ebe obibi anyị dị na Magdeburg, a machibidokwara ọrụ nkwusa anyị iwu. N’ihi ya a gbanwere ọrụ m. Mụ na Paul Hirschberger na-eso ihe dị ka ọgbakọ 50 arụ ọrụ, na-anọnyere nke ọ bụla ruo ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ, na-enyere ụmụnna aka ịhazi onwe ha iji nọgide na-eje ozi ha n’okpuru mmachibido iwu. N’ọnwa ndị sochirinụ, agbanahụrụ m ndị uwe ojii chọrọ ịnwụchi m ugboro isii!

Otu onye egbebatawo n’otu n’ime ọgbakọ ndị ahụ bụ́ onye gbabọrọ anyị n’aka ndị Stasi, bụ́ Ụlọ Ọrụ Nchebe Obodo. N’ihi ya, na July 1951, ndị ikom ise bucha egbe jidere mụ na Paul n’okporo ámá. N’ileghachi anya azụ, anyị pụrụ ịhụ na anyị adaberebeghị n’ebe nzukọ Jehova dị ruo ókè anyị kwesịrị. Ụmụnna ndị tọrọ anyị adọwo anyị aka ná ntị ka anyị ghara imekọ njem ọnụ. Inwebiga obi ike ókè edugawo anyị n’ịtụfu nnwere onwe anyị! Ọzọkwa, anyị ebubeghị ụzọ kwurịta ihe anyị ga-ekwu ma e jide anyị.

Ka m nọ nanị m n’ụlọ nga m, eji m anya mmiri rịọ Jehova maka enyemaka ka m ghara ịrapụta ụmụnna m ma ọ bụ mebie okwukwe m. Mgbe ụra busịịrị m, ụda olu enyi m nwoke bụ́ Paul kpọtere m na mberede. Ọ bụ nnọọ n’elu ụlọ nga m ka ọnụ ụlọ ndị Stasi nọ na-agba ya ajụjụ ọnụ dị. Ebe ọ bụ n’abalị na-ekpo ọkụ, ibo varanda ahụ ghere oghe, anụpeere m ihe nile ha kwuru. E mesịa, mgbe a gbara m ajụjụ ọnụ, azara m otu ihe ahụ, bụ́ nke juru ndị ọfịsa ahụ anya. Akụkụ Bible ahụ na-amasịkarịsị nne m, “Kpọkuokwa m n’ụbọchị mkpagbu; M ga-adọpụta gị,” nọgidere na-agbata m n’uche, ọ gbakwara m ume nke ukwuu.—Abụ Ọma 50:15.

Mgbe a gbasịrị anyị ajụjụ ọnụ, mụ na Paul nọrọ ọnwa ise n’ụlọ nga nchere ikpe dị n’ụlọ mkpọrọ ndị Stasi bụ́ nke dị na Halle, e mesịakwa na Magdeburg. Mgbe anyị nọ Magdeburg, mgbe ụfọdụ ahụpeere m alaka ụlọ ọrụ anyị e mechiri emechi mgbe ahụ. Ọ dị m ka ọ bụrụ na m nọ n’ebe ahụ na-arụ ọrụ karịa ịnọ n’ụlọ mkpọrọ! Na February 1952 e kwupụtara ikpe a mara anyị: “afọ 10 n’ụlọ mkpọrọ na afọ 20 nke enweghị ihe ndị ruuru mmadụ.”

Ịnọgide Na-enwe Okwukwe n’Ụlọ Mkpọrọ

Ndịàmà Jehova a mara ikpe mkpọrọ afọ iri ma ọ dịkarịa ala yi ihe nhụwa ama pụrụ iche ruo oge ụfọdụ n’ime oge ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. A dụnyere otu ákwà na-acha uhie uhie n’otu ụkwụ traụza anyị na n’otu aka kootu anyị. Ọzọkwa, e konyere otu obere mpempe akwụkwọ kadbọd gbara gburugburu n’ọnụ ụzọ ụlọ nga anyị iji dọọ ndị nche aka ná ntị na anyị bụ ndị omekome dị ize ndụ.

Ndị ọchịchị na-ele anyị anya n’ezie dị ka ndị omekome kasị njọ. E kweghị ka anyị nwee Bible n’ihi na dị ka otu onye nche si kọwaa: “Otu n’ime Ndịàmà Jehova nke ji Bible n’aka dị ka onye omekome ji égbè n’aka.” Iji nweta akụkụ Bible dị iche iche, anyị gụrụ akwụkwọ ndị onye edemede Russia bụ́ Leo Tolstoy dere, bụ́ onye na-ehotakarị akụkụ Bible dị iche iche n’akwụkwọ ya. Anyị buuru akụkụ Bible ndị a n’isi.

Tupu e jide m na 1951, ekwewo m Elsa Riemer nkwa ọlụlụ. O letara m n’ụlọ mkpọrọ mgbe mgbe dị ka o kwere ya mee, zitekwa otu ngwugwu nri otu ugbo n’ọnwa. Ọ na-ezobakwa nri ime mmụọ n’ime ngwugwu ya ndị ahụ. Otu ugbo, ọ fanyere isiokwu dị iche iche nke otu Ụlọ Nche n’ime anụ. Ndị nche na-eghewakarị anụ eghewa ije lee ma o nwere ihe e zobara n’ime ya, ma n’oge a ngwungwu ahụ rutere obere oge tupu ọrụ ụbọchị emechie, e nyochaghịkwa ya.

N’oge ahụ, mụ na Karl Heinz Kleber na ndị mkpọrọ atọ na-abụghị Ndịàmà nọ n’otu obere ụlọ nga. Olee otú anyị ga-esi gụọ Ụlọ Nche ahụ n’abụghị ndị e jidere? Anyị mere ka anyị na-agụ otu akwụkwọ, ma n’ime ya anyị ezobawo isiokwu dị iche iche nke Ụlọ Nche ahụ n’ime ya. Anyị nyefekwara Ndịàmà ibe anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ nri ime mmụọ a dị oké ọnụ ahịa.

Ka anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ, anyị jikwa ohere dị iche iche mee ihe iji gwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. Enwere m obi ụtọ ịhụ ndị mkpọrọ ibe m ka ha ghọrọ ndị kwere ekwe n’ihi nke ahụ.—Matiu 24:14.

Ịlaghachi n’Ozi Oge Nile

N’April 1, 1957, mgbe m nọsịrị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ isii n’ụlọ mkpọrọ, a tọhapụrụ m. N’ihe na-erughị izu abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, alụrụ m Elsa. Mgbe ndị Stasi nụrụ banyere ntọhapụ m, ha chọrọ otu ihe ngọpụ ha ga-eji kpọghachi m n’ụlọ mkpọrọ. Iji gbochie nke ahụ, mụ na Elsa hapụrụ mba ahụ ije biri na West Berlin.

Mgbe anyị rutere na West Berlin, Society chọrọ ịmara ihe bụ atụmatụ anyị. Anyị kọwara na otu n’ime anyị ga-asụ ụzọ ebe onye nke ọzọ ga na-arụ ọrụ ego.

“Olee otú ọ ga-esi masị unu ma ọ bụrụ na unu abụọ aghọọ ndị ọsụ ụzọ?” ka a jụrụ anyị.

“Ọ bụrụ na nke ahụ ga-ekwe omume,” ka anyị zaghachiri, “anyị ga-amalite ozugbo.”

Ya mere a na-enye anyị obere ego mmachi akpa kwa ọnwa iji nye aka ịkwado onwe anyị, anyị malitekwara ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na 1958. Lee ọṅụ anyị nwere site n’ikiri ndị anyị mụụrụ Bible ka ha gbanwere ndụ ha iji ghọọ ndị na-ejere Jehova ozi! Afọ iri sochirinụ nke ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche kụziiri anyị ịrụkọ ọrụ ọnụ dị ka di na nwunye. Elsa na-anọnyere m mgbe nile, ọbụna mgbe m na-emezi ụgbọala anyị. Anyị gụkọkwara ihe, mụkọọ ihe, ma kpekọọ ekpere ọnụ.

Na 1969 e kenyere anyị ọrụ njegharị, na-eleta otu ọgbakọ kwa izu iji jee ozi maka mkpa nke ndị nọ na ya. Josef Barth, bụ́ nwoke nwere ahụmahụ n’ọrụ njegharị, nyere m ndụmọdụ a: “Ọ bụrụ na ị chọrọ inwe ihe ịga nke ọma n’ọrụ gị, nanị bụrụ nwanna n’ebe ụmụnna nọ.” Agbalịrị m itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ. N’ihi ya, anyị na Ndịàmà ibe anyị nwere mmekọrịta obi ụtọ na nke nkwekọrịta, bụ́ nke mere ka ọ dị mfe inye ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa.

Na 1972, a chọpụtara na Elsa nwere ọrịa cancer, a wakwara ya ahụ. Mgbe e mesịrị, o nwekwara àgbà. Ọ bụ ezie na ọ na-enwe ihe mgbu, ọ ka sonyekwaara m kwa izu, na-ejere ọgbakọ dị iche iche ozi, soro ụmụnna nwanyị na-arụ ọrụ n’ozi ruo ókè o nwere ike.

Mkpa Ndị Chọrọ Ka E Mee Mgbanwe

Na 1984 ndị ọgọ m bịara nwee mkpa nke nlekọta chiri anya, ya mere anyị hapụrụ ọrụ njegharị iji nye aka ilekọta ha ruo mgbe ha nwụrụ afọ anọ mgbe e mesịrị. (1 Timoti 5:8) E mesịa, na 1989, Elsa dara oké ọrịa. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ gbaketụrụ, ma ọ bịara dị mkpa na m ga na-ahụ banyere ọrụ ụlọ nile. M ka na-amụ ilekọta onye na-enwe ahụ mgbu mgbe nile. Ma, n’agbanyeghị ndọlị ahụ, anyị ejigidewo ịhụnanya anyị nwere maka ihe ime mmụọ.

Taa, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, anyị ka na-asụ ụzọ. Otú ọ dị, anyị aghọtawo na ihe dị mkpa abụghị ọkwá ndị anyị nwere ma ọ bụ ókè anyị nwere ike imeru ihe, kama ọ bụ ka anyị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Anyị chọrọ ife Chineke anyị, bụ́ Jehova, ọ bụghị ruo nanị afọ ole na ole, kama ruo mgbe ebighị ebi. Ahụmahụ anyị abụwo ọzụzụ magburu onwe ya maka ọdịnihu. Jehova enyewokwa anyị ume ito ya ọbụna n’okpuru ọnọdụ ndị kasị sie ike.—Ndị Filipaị 4:13.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Akụkọ ndụ Ernst Wauer dị n’Ụlọ Nche nke August 1, 1991, peji nke 25 ruo 29.

[Foto dị na peeji nke 23]

A tụrụ m mkpọrọ na Magdeburg ebe a

[Ebe E Si Nweta Foto]

Gedenkstätte Moritzplatz Magdeburg für die Opfer politischer Gewalt; Foto: Fredi Fröschki, Magdeburg

[Foto dị na peeji nke 23]

Mgbe anyị lụrụ na 1957

[Foto dị na peeji nke 23]

Mụ na Elsa taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya