Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 6/15 p. 27-28
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Kwesịrị Ikpebi Otú Ezinụlọ Ga-aharu?
    Teta!—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 6/15 p. 27-28

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ebe ọ bụ na a sịrị na a pụziri ime ka usoro mgbochi ikike ịmụ nwa gharakwa ịdị irè ma ọ bụrụ na mmadụ arịọ ka e mee otú ahụ, onye Kraịst ọ̀ pụrụ ile ha anya dị ka nhọrọ e nwere maka nchịkwa ọmụmụ?

Mgbochi ikike ịmụ nwa aghọwo ụzọ e sikarị eme atụmatụ otú ezinụlọ ga-aharu. Nye ọtụtụ ndị, ya ịbụ nke a nabatara yiri ka ọ na-adabere n’ọha na eze na agụmakwụkwọ, tinyere echiche okpukpe. Ọ bụ akụkụ metụtara nkwenkwe okpukpe bụ isi n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, bụ́ ndị nwere ọchịchọ ahụ ọbụ abụ ahụ nwere: “Jehova, zi m ụzọ Gị; durukwa m n’okporo ụzọ dị larịị.” (Abụ Ọma 27:11) Gịnị ka usoro mgbochi ikike ịmụ nwa gụnyere?

A na-akpọ mgbochi ikike ịmụ nwa nke ndị ikom maka nchịkwa ọmụmụ, mgbubi nke usoro akwara ọbara ọcha. A na-egbubi ma mechie ntakịrị akwara ọbara ọcha abụọ dị n’akpa amụ. Ndị ọrụ ahụ ike pụrụ ime nke a n’ụzọ dịgasị iche, ma nzube ya bụ iji mee ka ọ ghara ikwe ọbara ọcha omume isi ná mkpụrụ amụ gafee. A na-akpọ mgbochi ikike ịmụ nwa nke ndị inyom nkechi nke opi àkwá. A na-emekarị ya site n’igbubi na ikechi (ma ọ bụ, ịgbachi) opi ndị ahụ àkwá nwanyị na-esi agafe, bụ́ nke na-esi n’akụkụ ahụ na-emepụta àkwá buru àkwá gaa n’akpa nwa.

E lere ụzọ ndị a anya ruo ogologo oge dị ka ndị na-adịgide adịgide—na ha bụ mgbochi ikike ịmụ nwa bụ́ ndị a na-apụghịkwa ime ka ha dị otú ha dị na mbụ. Ma ụfọdụ ndị, n’ihi ịkwa ụta maka iwere nzọụkwụ ndị ha weere ma ọ bụ n’ihi ọnọdụ ọhụrụ, achọwo enyemaka ndị ọrụ ahụ ike iji jikọtaghachi usoro akwara ọbara ọcha ha ma ọ bụ tọpee opi àkwá ha. N’ihi nchọpụta a chọpụtara ngwá ọrụ ndị pụrụ iche na ịwa ahụ ndị e ji ọkpọka ígwè kọmputa eme, mgbalị ndị e mere imeghachi ha otú ha dị na mbụ agawo nke ọma karị. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịgụ na n’ime ndị a họpụtara ahọpụta na a pụrụ inwe ihe ịga nke ọma dị pasent 50 ruo 70 n’ime ka usoro akwara ọbara ọcha dịghachikwa otú ha dịbu site n’ijikọtaghachi isi nke gịrịgịrị akwara ndị ahụ e gbubiri egbubi. A na-azọrọ na e nweela ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ịga nke ọma dị pasent 60 ruo 80 n’ịtọpeghachi opi àkwá nwanyị. Ụfọdụ ndị nụworo nke a echewo na e kwesịghịzi ile mgbochi ikike ịmụ nwa anya dị ka nke na-adịgide adịgide. Ha nwere ike ikwere na a pụrụ ile mgbubi nke usoro akwara ọbara ọcha na nkechi nke opi àkwá anya dị ka nke ya na ọgwụ ndị a na-aṅụ aṅụ bụ́ ndị e ji achịkwa ịmụ nwa, condom, na diaphragm—usoro ndị a pụrụ ịkwụsị ma ọ bụrụ na a chọọ ịtụrụ ime—bụ otu ihe ahụ. Ma, e kwesịghị ileghara akụkụ ụfọdụ na-akpali iche echiche anya.

Otu bụ na atụmanya e nwere maka ime ka ọ dị otú ọ dị na mbụ pụrụ ịbụ nke e metụtara n’ụzọ dị ukwuu site n’ihe ndị dị ka otú e mebiruru akwara ọbara ọcha ma ọ bụ opi àkwá n’oge a na-eme usoro mgbochi ikike ịmụ nwa, ọ̀tụ̀tụ̀ nke akwara ọbara ọcha ma ọ bụ opi àkwá e wepụrụ ewepụ ma ọ bụ nye àpà, afọ ole gafeworonụ kemgbe e mere ya, n’ebe mgbubi nke akwara ọbara ọcha dịkwa, ma ihe ndị na-alụso ọbara ọcha nke nwoke ọgụ ọ̀ pụtawo. Ihe a na-agaghị eleghakwara anya bụ eziokwu bụ́ na ngwá ọrụ ndị e ji awa ahụ ndị a e ji ọkpọka ígwè kọmputa eme nwere ike ghara ịdị n’ọtụtụ ebe, ma ọ bụ ha nwere ike bụrụ nke aka na-agaghị eru. N’ihi ya, ọtụtụ ndị chọsiri ike ka e weghachi ikike ịmụ nwa ha agaghị enwe ike ime otú ahụ. N’ebe ha nọ nke ha agwụla.a Ya mere, ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’elu maka iweghachi ikike ịmụ nwa bụ n’ezie nanị ihe ndị e chepụtara echepụta, ọ bụghị nkezi ndị a pụrụ ịdabere na ha.

Eziokwu ụfọdụ na-egosi ihe ndị na-eme eme. Otu isiokwu e bipụtara na United States banyere ime ka usoro akwara ọbara ọcha dịghachi otú ha dịbu kwuru na mgbe a wasịrị ahụ ahụ na-efu $12,000, “nanị pasent 63 nke ndị ahụ mere ya pụrụ ịtụwali nwunye ha ime.” Ọzọkwa, nanị “pasent isii nke ndị ikom e gbubiri usoro akwara ọbara ọcha ha na-emesị chọọ ka e jikọtaghachi ya.” N’otu ihe ọmụmụ e mere na Germany banyere etiti Europe, ihe dị ka pasent 3 nke ndị ikom họọrọ igbochi ikike ịmụ nwa ha mesịrị chọọ ka e weghachi ya. Ọ bụrụgodị na ọkara nke mgbalị ndị ahụ pụrụ ịga nke ọma, ọ ga-apụta na nye pasent 98.5, igbubi usoro akwara ọbara ọcha ha pụtara igbochi ikike ịmụ nwa ha n’ụzọ na-adịgide adịgide. Ọnụ ọgụgụ ahụ ga-adịkwa elu karị n’ala ebe ndị e nwere ndị dọkịta ole na ole na-eji ọkpọka ígwè kọmputa awa ahụ ma ọ bụ ebe ndị ha na-anọghị.

N’ihi ya, ọ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ile mgbochi ikike ịmụ nwa nke onye bụ́ nwoke ma ọ bụ nwanyị anya dị ka ihe dị nta, dị ka a ga-asị na ọ bụ nchịkwa ọmụmụ na-adịru nwa oge. Nyekwa ndị Kraịst nwere obi eziokwu, e nwere akụkụ ndị ọzọ ha ga-atụle.

Isi ihe pụtara ìhè bụ na ikike ịmụ nwa bụ onyinye sitere n’aka Onye Okike anyị. Nzube mbụ ya gụnyere ndị mmadụ zuru okè, ‘ịmụjupụta ụwa ma buda ya n’okpuru onwe ha.’ (Jenesis 1:28) Mgbe Iju Mmiri ahụ gbubilatara ọnụ ọgụgụ mmadụ nọ n’ụwa ruo asatọ, Chineke nyeghachiri ntụziaka ndị ahụ bụ́ isi. (Jenesis 9:1) Chineke enyeghachighị mba Israel iwu ahụ, ma ụmụ Israel lere ịmụta nwa anya dị ka ihe a na-achọsi ike.—1 Samuel 1:1-11; Abụ Ọma 128:3.

Iwu Chineke nyere Israel gụnyere ihe ndị gosiri otú o si jiri ọmụmụ nwa kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwoke lụrụ nwanyị anwụọ tupu ya amụta nwa, iji mee ka ámá ya ghara ichi, nwanne ya nwoke ga-amụtara ya nwa nwoke site n’ịlụrụ nwunye ya ahụ. (Deuterọnọmi 25:5) Nke ka mkpa bụ iwu banyere nwanyị nke nwara inyere di ya aka n’ọgụ. Ọ bụrụ na o jide amụ onye ya na di ya na-alụ ọgụ, a ga-egbupụ aka ya; n’ụzọ dị ịrịba ama, Chineke achọghị nhá anya laara anya n’akụkụ ahụ o ji amụ nwa ma ọ̀ bụ nke di ya. (Deuterọnọmi 25:11, 12) N’ụzọ doro anya, iwu a ga-eme ka a na-akwanyere akụkụ ahụ ndị e ji amụ nwa ùgwù; a gaghị emebi ha n’ụzọ na-enweghị isi.b

Anyị maara na ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Israel, ya mere iwu nchịkwa ahụ dị na Deuterọnọmi 25:11, 12 adịghị achịkwa ha. Jisọs enyeghị iwu ma ọ bụ gosi na ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ịlụ di na nwunye ma mụta ọtụtụ ụmụ dị ka o kwere mee, bụ́ nke ọtụtụ ndị di na nwunye tụleworo mgbe ha na-ekpebi ma hà ga-eji ụfọdụ usoro nchịkwa ọmụmụ mee ihe. (Matiu 19:10-12) Pọl onyeozi gbara ‘ụmụ agbọghọ ndị di ha nwụrụ bụ́ ndị a na-akpali n’ụzọ dị mfe ume ịlụrụ di ma mụọ ụmụ.’ (1 Timoti 5:11-14) O kwughị banyere ndị Kraịst igbochi ikike ịmụ nwa n’ụzọ na-adịgide adịgide—ha ịmara ụma jiri ohere ha nwere ịmụ ụmụ chụọ àjà.

Ndị Kraịst na-eme nke ọma ịtụle ihe ndị ahụ na-egosi na Chineke ji ikike ịmụ nwa ha kpọrọ ihe. Di na nwunye nke ọ bụla aghaghị ikpebi ma hà ga-eji usoro kwesịrị ekwesị e si eme atụmatụ otú ezinụlọ ga-aharu mee ihe nakwa mgbe ha ga-eme otú ahụ. N’eziokwu, mkpebi ha ga-ebu ibu karịsịa ma ọ bụrụ na e nwere nnwapụta e ji n’aka nke sitere n’aka ndị ọrụ ahụ ike na nne ma ọ bụ nwa ya chere oké ihe ize ndụ ahụ ike ihu, ọbụna na ma eleghị anya na ọ ga-anwụ ma ọ tụrụ ime ọzọ n’ọdịnihu. Ụfọdụ nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ ekwewo, n’ụzọ na-abụchaghị ọchịchọ ha, ka e gbochie ikike ịmụ nwa ha dị ka a kọwara na mbụ iji jide n’aka na a gaghị atụrụ ime ọ bụla ga-eyi ndụ nke nne ahụ egwu (bụ́ onye pụrụ inweworị ụmụ ndị ọzọ) ma ọ bụ nke nwa ya bụ́ onye e nwere ike mụọ ya enwee nsogbu ahụ ike na-eyi ndụ egwu.

Ma ndị Kraịst bụ́ ndị na-adịghị eche ihe ize ndụ doro anya dị otú ahụ ihu, bụ́ nke na-adịghị adapụtakarịkwa kwesịrị n’ezie iji “uche zuru okè” mee ihe na iji ụzọ Chineke si eji ohere ndị e nwere ịmụ ụmụ kpọrọ ihe kpụzie echiche na omume ha. (1 Timoti 3:2; Taịtọs 1:8; 2:2, 5-8) Nke a ga-egosipụta mmetụta dị mma n’ebe ihe ndị Akwụkwọ Nsọ na-enye echiche ha dị. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na ọha amara na onye Kraịst leghaara ihe ndị Chineke ji kpọrọ ihe anya n’echeghị echiche? Ọ̀ bụ na ndị ọzọ agaghị enwe obi abụọ ma ọ̀ bụ ezi onye nlereanya, nke a maara maka ime mkpebi ndị kwekọrọ na Bible? N’ezie, aha ọjọọ dị otú ahụ bụ́ nke na-enye nsogbu n’obi pụrụ imetụta iru eru nke onye ozi maka ihe ùgwù ije ozi ndị pụrụ iche, ọ bụ ezie na nke ahụ agaghị adị otú ahụ ma ọ bụrụ na mmadụ eburula ụzọ mee nke a n’amaghị ama.—1 Timoti 3:7.

a “Mgbalị ịwa ahụ ndị e mere iji jikọtaghachi [usoro akwara ọbara ọcha] nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ịga nke ọma nke ma ọ dịkarịa ala pasent 40, e nwekwara ihe àmà ụfọdụ na-egosi na a pụrụ inweta ihe ịga nke ọma ka ukwuu ma e jiri usoro ndị ka mma nke ịwa ahụ e ji ọkpọka ígwè kọmputa eme. Ka o sina dị, e kwesịrị ile mgbochi ikike ịmụ nwa site ná mgbubi usoro akwara ọbara ọcha anya dị ka nke na-adịgide adịgide.” (Encyclopædia Britannica) “E kwesịrị ile mgbochi ikike ịmụ nwa anya dị ka usoro na-adịgide adịgide. N’agbanyeghị ihe onye ahụ mere ya pụrụ ịnụwo banyere iweghachi ikike ịmụ nwa, isite n’ịwa ahụ jikọtaghachi usoro akwara e gbubiri egbubi dị oké ọnụ, a pụghịkwa ijide n’aka na a ga-enwe ihe ịga nke ọma. Nye ndị inyom a tọpeghachiri opi àkwá ha, e nwere ihe ize ndụ dị ukwuu nke ịtụrụ ime n’ebe na-abụghị akpa nwa.”—Contemporary OB/GYN, June 1998.

b Iwu ọzọ pụrụ iyi nke metụtara okwu a kwuru na ọ dịghị nwoke ọ bụla nke e mebiri akụkụ ahụ ya e ji amụ nwa pụrụ ịbata ná mkpọkọta Chineke. (Deuterọnọmi 23:1) Otú ọ dị, Insight on the Scriptures na-ekwu na ihe àmà na-egosi na nke a “metụtara ịma ụma wepụ akụkụ ahụ e ji amụ nwa maka nzube rụrụ arụ, dị ka ndina ụdị onwe.” N’ihi ya, iwu ahụ agụnyeghị ịpị amụ ma ọ bụ ihe yiri ya iji chịkwaa ọmụmụ. Insight kwukwara, sị: “N’ụzọ na-akasi obi, Jehova buru amụma banyere oge ọ ga-anabata ndị ọnaozi dị ka ndị na-ejere ya ozi, ọ bụrụ na ha erube isi, ha ga-enwe aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Site ná mwepụ nke Jisọs Kraịst wepụrụ Iwu ahụ, ndị nile kwesịrị ntụkwasị obi, n’agbanyeghị ọkwá ma ọ bụ ọnọdụ ha nọbụ na ya, pụrụ ịghọ ụmụ ime mmụọ nke Chineke. E wepụrụ ndịrịta iche anụ ahụ.—Aịs 56:4, 5; Jn 1:12.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya