N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Kwere na Jisọs Kraịst?
“ỌBỤNA ọtụtụ mmadụ na-abụghị ndị Kraịst kweere na Ọ bụ onye ozizi ukwu nke maara ihe. N’ezie, ọ bụ otu n’ime ndị a kasị mara amara dịworo ndụ.” (The World Book Encyclopedia) Ònye ka “Ọ” bụ? Ọ bụ Jisọs Kraịst, onye guzobere Iso Ụzọ Kraịst.
Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-ekwu, nye ọtụtụ narị nde mmadụ nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nakwa n’ebe ndị ọzọ, Jisọs Kraịst bụ onye a na-amaghị ama, ọ bụ nanị aha ha pụrụ icheta site n’akwụkwọ ọgụgụ nke ụlọ akwụkwọ dị elu. Ọbụna na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, e nwere ndị ọkà mmụta okpukpe na ndị ụkọchukwu bụ́ ndị na-ekwu na anyị amaghị Jisọs n’ezie, ndị na-enwekwa obi abụọ banyere izi ezi nke ihe ndekọ anọ ahụ pụtara ìhè banyere ndụ ya (Oziọma ndị ahụ) bụ́ ndị a na-achọta n’ime Bible.
Ọ̀ pụrụ ịbụ na ndị dere Oziọma ndị ahụ chepụtara akụkọ ndụ Jisọs echepụta? Ọ dịghị ma ọlị! Mgbe ọ tụlesịrị ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ, ọkọ akụkọ ihe mere eme a maara nke ọma bụ́ Will Durant, dere, sị: “Na ụmụ mmadụ ole na ole na-amụghị oké akwụkwọ n’ime otu ọgbọ ga-echepụtaworị ụdịdị onye nke dị ike nke ukwuu ma na-adọrọ mmasị, ụkpụrụ omume dị elu nke ukwuu na ọhụụ dị ebube banyere òtù ụmụnna nke ụmụ mmadụ, ga-abụ ọrụ ebube siri ike nkwere nke ukwuu karịa nke ọ bụla e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ. Mgbe narị afọ abụọ nke Oké Nkatọ Bible gasịworo, ihe ndekọ nke ndụ, omume, na ozizi Kraịst, ka nọgidere bụrụ ihe doro anya nke ọma, nweekwa ihe kasị atụ n’anya n’akụkọ ihe mere eme nke onye si Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa.”
Ma, e nwere ndị ga-asị na Jisọs Kraịst ekwesịghị ịbụ onye ha ga-aṅa ntị n’ihi ihe ndị sịrị na ha bụ ụmụazụ ya meworo. ‘Ha tụrụ bọmbụ atọm na Nagasaki,’ ka ụfọdụ ndị nọ na Japan ga-ekwu. ‘Ndị Kraịst nọkwa na Nagasaki karịa n’ihe ka ọtụtụ n’obodo ndị dị na Japan.’ Ma ị̀ pụrụ ịta dọkịta ụta maka ọrịa nke onye ọrịa ma ọ bụrụ na onye ọrịa ahụ agbasoghị nduzi nke dọkịta ahụ? Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst elegharawo ntụziaka Jisọs nyere maka ịgwọta nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ anya. Ma, Jisọs nyere ihe ngwọta maka nsogbu ndị anyị na-enwe site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị nakwa maka mkpagbu ndị ihe a kpọrọ mmadụ na-enwe gburugburu ụwa. Ọ bụ ya mere anyị ji agba gị ume ịgụ isiokwu na-esonụ ma hụ n’onwe gị ụdị nwoke ọ bụ.