Oziọma Ndị Ahụ—Hà Bụ Akụkọ Mere Eme Ka Hà Bụ Ifo?
GBAA ụwa gburugburu, akụkọ banyere Jisọs onye Nazaret—nwa okorobịa nke gbanwere usoro akụkọ ihe mere eme nke mmadụ—aghọwo akụkụ dị mkpa nke ọha mmadụ. Ọ bụ akụkụ nke izi ihe nkịtị na agụmakwụkwọ bụ́ isi. Ọtụtụ ndị na-ewere Oziọma ndị ahụ dị ka ebe eziokwu na ilu ndị oge ha na-adịghị agafe agafe si malite, dị ka, “Ka okwu unu bụrụ, Ee, ee; Ee e, ee e.” (Matiu 5:37) N’ezie, ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ pụrụ ịbụwo ihe ndabere nke ihe ndị nne na nna gị kụziiri gị, ma hà bụ ndị Kraịst ma ọ bụ na ha abụghị.
Nye ọtụtụ nde ụmụazụ Kraịst obi ha ziri ezi, Oziọma ndị ahụ enyewo nkọwa banyere nwoke ahụ ha dịworo njikere ịta ahụhụ ma nwụọ n’ihi ya. Oziọma ndị ahụ enyewokwa ihe ndabere na ihe mkpali maka obi ike, ntachi obi, okwukwe, na olileanya. Mgbe ahụ, ị́ gaghị ekwere na e kwesịrị inye ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha tupu a na-ekwubi na ihe ndekọ ndị a bụ akụkọ e chepụtara echepụta? N’ịtụle mmetụta dị ukwuu nke ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ nweworo n’echiche nakwa n’akparamàgwà ụmụ mmadụ, ọ bụrụ na mmadụ achọọ ime ka i nwee obi abụọ banyere ịbụ eziokwu ha, ị́ gaghị achọ ka o nye gị ihe akaebe doro anya?
Anyị na-agba gị ume ịtụle ụfọdụ ajụjụ na-akpali echiche banyere Oziọma ndị ahụ. Hụ n’onwe gị ihe mmadụ ụfọdụ na-amụ Oziọma ndị ahụ chere banyere okwu ndị a, n’agbanyeghị na ụfọdụ n’ime ha adịghị azọrọ na ha bụ ndị Kraịst. E mesịa, ị pụrụ iru ná nkwubi okwu nke gị nke dabeere n’ihe ọmụma i nwere.
AJỤJỤ NDỊ A GA-ATỤLE
◆ Oziọma ndị ahụ hà pụrụ ịbụ ihe e ji nkà chepụta?
Robert Funk, bụ́ onye guzobere Nzukọ Ọmụmụ Ihe Banyere Jisọs, na-ekwu, sị: “Matiu, Mak, Luk, na Jọn ‘kọwara Mesaịa’ iji mee ka o kwekọọ na nkwenkwe ndị Kraịst nke malitere mgbe Jisọs nwụsịrị.” Otú ọ dị, mgbe a nọ na-ede Oziọma ndị ahụ, ọtụtụ ndị nụrụ okwu Jisọs, ndị hụrụ ihe ndị o mere, ndị hụkwara ya mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ, ka nọ ndụ. Ha eboghị ndị dere Oziọma ndị ahụ ebubo ịbụ ndị nduhie n’ụzọ ọ bụla.
Tụlee ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Kraịst. Ọ bụghị nanị na Oziọma ndị ahụ bu ihe ndekọ a pụrụ ịdabere na ha banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs kama akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint oge ochie bukwa ya. O dere, sị: “Enyere m n’aka unu na mbụ ihe m natakwara idebe, na Kraịst nwụrụ n’ihi mmehie anyị nile, dị ka ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ si dị; na e likwara Ya; na e mewokwara ka O si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ, dị ka ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ si dị; na O mekwara ka Kifas hụ Ya anya; e mesịa O mere ka ndị ozi iri na abụọ ahụ hụ Ya anya; e mesịa O mere ka ndị [karịrị narị mmadụ ise] n’etiti ụmụnna anyị hụ Ya anya n’otu mgbe, ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’etiti ndị ahụ na-anọgide ruo ugbu a, ma ụfọdụ adawo n’ụra ọnwụ; e mesịa O mere ka Jemes hụ Ya anya; e mesịa O mere ka ndị ozi nile hụ Ya anya; ma n’ikpeazụ ha nile, dị ka nwa a mụkworo amụkwo, O mere ka mụ onwe m hụkwa Ya anya.” (1 Ndị Kọrint 15:3–8) Ndị àmà dị otú ahụ bụ ndị maara akụkọ ndị mere eme n’ezie banyere ndụ Jisọs.
A dịghị ahụ nchepụta ahụ ndị nkatọ nke oge a na-ebo ebubo ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Kama nke ahụ, a na-ahụ ya n’ihe odide ndị nke narị afọ nke abụọ O.A. Ya mere, e chepụtara akụkọ ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị banyere Kraịst mgbe ndapụ n’ezi Iso Ụzọ Kraịst na-amalite n’etiti ndị e kewapụrụ pụọ n’ọgbakọ ndị ozi.—Ọrụ 20:28–30.
◆ Oziọma ndị ahụ hà pụrụ ịbụ akụkọ na-emeghị eme?
O siiri onye edemede na onye nkatọ bụ́ C. S. Lewis ike ile Oziọma ndị ahụ anya dị ka akụkọ nkịtị na-emeghị eme. “Dị ka odeakụkọ ihe mere eme, ekwenyesiri m ike n’ụzọ zuru ezu na ihe ọ sọrọ Oziọma ndị ahụ ha bụrụ, ha abụghị akụkọ na-emeghị eme,” ka o dere. “Nkà e ji dee ha erughị nke akụkọ na-emeghị eme. . . . Anyị amaghị akụkụ ka ukwuu nke ndụ Jisọs, ọ dịghịkwa ndị na-echepụta akụkọ na-emeghị eme ga-ekwe ka nke ahụ dị otú ahụ.” Ọ bụkwa ihe na-akpali mmasị na n’agbanyeghị na ọkọ akụkọ ihe mere eme a ma ama bụ́ H. G. Wells adịghị azọrọ na ya bụ onye Kraịst, o kwetara, sị: “Mmadụ anọ [ndị dere Oziọma] ahụ dum kwenyekọrọ n’inye anyị nkọwa banyere onye dịrị adị kpọmkwem; ha nwere . . . ihe na-eme ka e kwenyesie ike na ha mere eme.”
Tụlee otu ihe atụ nke oge Jisọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite mere ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya. O yiri ka onye bụ́ ọkà n’ichepụta akụkọ na-emeghị eme ọ̀ gaara akọwawo Jisọs dị ka onye mere ka nlọghachi ya wuo ewuo, kwuo okwu dị mkpa, ma ọ bụ bụrụ onye jupụtara n’ìhè na n’ebube. Kama nke ahụ, ndị dere Oziọma ndị ahụ kọwara ya nanị dị ka onye guzoro n’ihu ndị na-eso ụzọ ya. Ya ajụzie ha, sị: “Ụmụntakịrị, ùnu ji ihe oriri ọ bụla?” (Jọn 21:5) Ọkà mmụta bụ́ Gregg Easterbrook na-ekwubi, sị: “Ndị a bụ ụdị nkọwa na-egosi akụkọ mere eme, ọ bụghị ifo.”
Ebubo ahụ bụ́ na Oziọma ndị ahụ bụ akụkọ na-emeghị eme ekwekọghịkwa n’usoro izi ihe ndị rabaị nke na-adịghị agbanwe agbanwe bụ́ nke na-ewu ewu n’oge e dere Oziọma ndị ahụ. Usoro ahụ gbasoro nnọọ ịmụ ihe site n’ibu ya n’isi—usoro nke iburu ihe n’isi site n’ikwughachi ya ugboro ugboro. Nke a mere ka e nwee ike iji nlezianya detuo ihe ndị Jisọs kwuru na ọrụ ndị ọ rụrụ n’ụzọ ziri ezi, bụ́ nke dị iche n’ebe ihe odide e tinyere nnu na ose dị.
◆ Ọ bụrụ na Oziọma ndị ahụ bụ akụkọ na-emeghị eme, à pụrụ idewo ha nnọọ ngwa ngwa mgbe Jisọs nwụsịrị?
Dị ka ihe àmà e nwere na-egosi, e dere Oziọma ndị ahụ n’agbata afọ 41 na 98 O.A. Jisọs nwụrụ n’afọ 33 O.A. Nke a pụtara na e dekọrọ ihe banyere ndụ ya n’oge na-adịghị nnọọ anya mgbe ozi ya gwụsịrị. Nke a na-eme nnọọ ka arụmụka ahụ bụ́ na akụkọ ndị dị n’Oziọma ndị ahụ bụ akụkọ na-emeghị eme ghara inwe isi. A chọrọ oge iji wulite akụkọ na-emeghị eme. Were uri bụ́ Iliad na Odyssey nke onye Gris oge ochie na-ede uri bụ́ Homer dere dị ka ihe atụ. Ụfọdụ ndị kweere na o were ihe karịrị ọtụtụ narị afọ iji wulite ma mee ka ihe ndị dị n’uri abụọ ahụ na-emeghị eme bụ́ ndị kọrọ banyere ndị dike, bụrụ ịgba. Gịnị banyere Oziọma ndị ahụ?
N’akwụkwọ ya bụ́ Caesar and Christ, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant na-ede, sị: “Na ụmụ mmadụ ole na ole na-agụghị oké akwụkwọ . . . ga-echepụtaworị ụdịdị onye nke dị ike nke ukwuu ma na-adọrọ mmasị, ụkpụrụ omume dị elu nke ukwuu, na ọhụụ dị ebube banyere òtù ụmụnna nke ụmụ mmadụ, ga-abụ ọrụ ebube siri ike nkwere nke ukwuu karịa nke ọ bụla e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ. Mgbe narị afọ abụọ nke Oké Nkatọ Bible gasịrị, ihe ndekọ nke ndụ, omume, na ozizi Kraịst, ka nọgidere bụrụ ihe doro anya nke ọma, nweekwa ihe kasị atụ n’anya n’akụkọ ihe mere eme nke onye si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa.”
◆ È mesịrị degharịa Oziọma ndị ahụ iji mee ka ha kwekọọ ná mkpa nke ndị Kraịst oge mbụ?
Ụfọdụ ndị nkatọ na-arụ ụka na ndọrọ ndọrọ nke ndị Kraịst oge mbụ mere ka ndị dere Oziọma ndị ahụ degharịa akụkọ Jisọs ma ọ bụ tinye ihe na ya. Otú ọ dị, iji nlezianya mụọ Oziọma ndị ahụ na-egosi na ihe dị otú ahụ emeghị. Ọ bụrụ na a gbanwere ihe Oziọma ndị ahụ dekọrọ banyere Jisọs n’ihi aghụghọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, gịnị mere okwu ọjọọ ndị e kwuru banyere ma ndị Juu ma ndị Jentaịl ka ji dịrị n’ihe odide ahụ?
A na-achọta otu ihe atụ na Matiu 6:5–7, bụ́ ebe e kwuru na Jisọs sịrị: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpekwa ekpere, unu agaghị adị ka ndị ihu abụọ ahụ: n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iguzo n’ụlọ nzukọ unu na nkuku ámá unu ikpe ekpere, ka ha wee were onwe ha gosi mmadụ. N’ezie asị m unu, Ha na-enwezu ụgwọ ọrụ ha.” N’ụzọ doro anya, nke a bụ nkatọ a katọrọ ndị ndú okpukpe ndị Juu. Jisọs kwukwara, sị: “Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu, dị ka ndị mba ọzọ [ndị Jentaịl] na-eme: n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ọtụtụ okwu ha na-ekwu.” Site n’ihota ihe Jisọs kwuru n’ụzọ dị otú a, ndị dere Oziọma ndị ahụ adịghị anwa ịtọghata ndị mmadụ. Ha nọ nnọọ na-edekọ ihe Jisọs Kraịst kwuru n’ezie.
Tụleekwa ihe e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ banyere ndị inyom ahụ letara ili Jisọs ma hụ na ọ tọgbọ chakoo. (Mak 16:1–8) Dị ka Gregg Easterbrook si kwuo, “na nkà mmụta mmekọrịta ọha na eze nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nke oge ochie, e lere akaebe ndị inyom gbara anya dị ka ihe a na-apụtụghị ịdabere na ha: dị ka ihe atụ, àmà ndị ikom abụọ gbara zuru ezu iji maa nwanyị lụrụ di ikpe ịkwa iko, ebe ọ na-adịghị nwanyị nke akaebe ya pụrụ ime ka a maa nwoke ikpe.” N’ezie, ndị na-eso ụzọ Jisọs n’onwe ha ekwetaghị ihe ndị inyom ahụ kwuru! (Luk 24:11) N’ihi ya, o yikarịghị ka a ga-akpachapụwo anya chepụta akụkọ dị otú ahụ.
Ọdịdị ilu na-adịghị n’akwụkwọ ozi ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nakwa n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi bụ ihe akaebe siri ike na-egosi na ọ bụghị ndị Kraịst oge mbụ tinyere ilu ndị ahụ dị n’Oziọma ndị ahụ kama na ọ bụ Jisọs n’onwe ya tụrụ ha. Tụkwasị na nke ahụ, iji nlezianya jiri Oziọma ndị ahụ tụnyere akwụkwọ ozi ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik na-ekpughe na ma Pọl ma ndị ọzọ so dee Akwụkwọ Nsọ Grik, ejighị akọ degharịa okwu ha ma kwuo na ọ bụ Jisọs kwuru ha. Ọ bụrụ na ndị Kraịst oge mbụ mere ihe dị otú ahụ, anyị kwesịrị ịtụ anya ịhụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ n’ime ihe ndị e dere n’akwụkwọ ozi ndị ahụ n’ime ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ. Ebe ọ bụ na anyị ahụghị ha, anyị pụrụ ikwubi n’ezie na ihe odide nke Oziọma ndị ahụ dị otú e si kwuo ha ma bụrụ eziokwu.
◆ Gịnị banyere ihe ndị yiri ka hà na-emegiderịta onwe ha n’Oziọma ndị ahụ?
Ọ dịla anya ndị nkatọ zọrọwaara na ihe ndị na-emegiderịta onwe ha jupụtara n’Oziọma ndị ahụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Durant gbalịrị iji obi ọcha nyochaa ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ—dị ka ihe odide bu akụkọ mere eme. Ọ bụ ezie na o kwuru na e nwere ihe ndị yiri ka hà na-emegiderịta onwe ha n’ime ha, ọ na-ekwubi, sị: “Mmegiderịta ahụ e nwere bụ banyere nkọwa ndị dị nnọọ nta, ọ bụghị ihe ndị dị mkpa; a bịa n’isi ihe ndị dị na ha, oziọma ndị ahụ bụ́ ndị yirịtara onwe ha nwere nnọọ nkwekọ pụtara ìhè, nweekwa otu ụdị akụkọ banyere Kraịst.”
A na-edozikarị ihe ndị yiri ka hà na-emegiderịta onwe ha n’ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ, n’ụzọ dị mfe. Iji maa atụ: Matiu 8:5 na-asị na “ọchịagha na-achị [otu narị ndị agha] bịakwutere [Jisọs], na-arịọ Ya” ka ọ gwọọ onye na-ejere ya ozi. Na Luk 7:3, anyị na-agụ na ọchịagha ahụ “[zigaara Jisọs] ndị okenye nke ndị Juu, na-arịọ Ya ka Ọ bịa zọpụta ohu [ahụ].” Ọchịagha ahụ zigara ndị okenye ahụ dị ka ndị nnọchianya ya. Matiu sịrị na ọchịagha ahụ n’onwe ya rịọrọ Jisọs arịrịọ n’ihi na nwoke ahụ rịọrọ arịrịọ ya site n’ọnụ ndị okenye ahụ, bụ́ ndị jere ozi dị ka ọnụ na-ekwuru ya. Nke a bụ nanị otu ihe atụ na-egosi na a pụrụ ime ka ihe ndị a sịrị na ha bụ ndịrịta iche n’Oziọma ndị ahụ doo anya.
Gịnị banyere nzọrọ ndị oké nkatọ Bible na-azọrọ na Oziọma ndị ahụ erughị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke akụkọ ihe mere eme n’ezie? Durant gara n’ihu ikwu, sị: “N’inwe oké obi ụtọ banyere ihe ndị ọ chọpụtara, Oké Nkatọ Bible elewo Agba Ọhụrụ ule ndị tara akpụ iji chọpụta ịbụ eziokwu ya nke na e lee otu narị ndị ikom biri n’oge ochie bụ́ ndị a ma ama ule otú ahụ—dị ka ihe atụ, Hammurabi, Devid, Socrates—ha ga-aghọ ndị ọ na-enwetụghị mgbe ha dị adị. N’agbanyeghị omume ụfọdụ na-emebi ihe na echiche okpukpe nke ndị dere Oziọma ndị ahụ, ha dekọrọ ọtụtụ ihe nke ndị na-ede ihe ha chepụtara echepụta gaara ezochiwo—ndọrọ ndọrọ ndị ozi dọrọ maka ọkwá dị elu n’Alaeze ahụ, ọsọ ha gbara mgbe e jidesịrị Jisọs, ngọnahụ Pita gọnahụrụ ya . . . Ọ dịghị onye na-agụ ihe ndekọ ndị a nke pụrụ ịrụ ụka banyere ịdị adị nke onye e dere banyere ya.”
◆ Iso Ụzọ Kraịst nke oge a ọ̀ na-anọchite anya Jisọs ahụ e kwuru n’Oziọma ndị ahụ?
Nzukọ Ọmụmụ Ihe Banyere Jisọs ekwupụtawo na nnyocha ọ na-eme n’Oziọma ndị ahụ “anọghị n’okpuru nduzi nke kansụl chọọchị.” Ma ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Wells ghọtara na e nwere nnukwu oghere dị n’agbata ozizi Jisọs dị ka e si dekọọ ha n’Oziọma ndị ahụ na ozizi Krisendọm. O dere, sị: “Ọ dịghị ihe àmà na-egosi na ọ dị mgbe ndị ozi Jisọs nụrụ banyere Atọ n’Ime Otu—site n’ọnụ ya n’ụzọ ọ bụla. . . . [Jisọs] ekwughịkwa ihe ọ bụla banyere ife nne ya bụ́ Meri ofufe, n’ọdịdị Isis, bụ́ Eze Nwanyị nke eluigwe. O leghaara ozizi nile nke Krisendọm anya.” Ya mere, mmadụ apụghị ikwu ịba uru nke Oziọma ndị ahụ na-adabere n’ozizi Krisendọm.
GỊNỊ BỤ NKWUBI OKWU GỊ?
Mgbe ị tụlesịrị isi ihe ndị a dị n’elu, gịnị ka i chere? È nwere ihe akaebe bụ́ eziokwu ma doo anya nke na-egosi na Oziọma ndị ahụ bụ akụkọ ifo nkịtị? Ọtụtụ ndị na-ahụta ajụjụ na obi abụọ ndị a na-enwe banyere ịbụ eziokwu nke Oziọma ndị ahụ ịbụ ndị na-enweghị ebe ha gbakwasịrị ụkwụ na ndị na-edoghị anya. Iji nye echiche nke gị, ọ dị gị mkpa iji obi ọcha gụọ Oziọma ndị ahụ. (Ọrụ 17:11) Mgbe ị tụlere nkwekọ, ezoghị ọnụ, na izi ezi nke e ji kọwaa àgwà Jisọs n’Oziọma ndị ahụ, ị ga-aghọta na ihe ndekọ ndị a abụtụghị nchịkọta nke akụkọ ifo.a
Ọ bụrụ na i jiri nlezianya nyochaa Bible ma tinye ndụmọdụ ya n’ọrụ, ị ga-ahụ otú ọ pụrụ isi gbanwee ndụ gị n’ụzọ ka mma. (Jọn 6:68) Nke a bụ eziokwu karịsịa banyere okwu Jisọs ndị e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ. Ọzọkwa, n’ime ya ị pụrụ ịmụta banyere ọdịnihu dị ebube nke na-echere ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi.—Jọn 3:16; 17:3, 17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isi nke 5 ruo 7 nke akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.
[Igbe dị na peeji nke 7]
Ihe Àmà nke Akụkọ Bụ́ Eziokwu
AFỌ ụfọdụ gara aga, onye Australia na-ede akwụkwọ nke bụbukwa onye nkatọ Bible, kwupụtara, sị: “Na nke mbụ ya ná ndụ m, emere m ihe kwesịrị ịbụ ihe mbụ onye na-ede akụkọ kwesịrị ime: enyochara m eziokwu dị n’ihe m gụrụ. . . . Ọ bụkwaara m ihe ijuanya, n’ihi na ihe m na-agụta [n’ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ] abụghị akụkọ na-emeghị eme, ọ naghịkwa ada ka akụkọ e chepụtara echepụta. Ọ bụ ndekọ akụkọ. Ọ bụ akụkọ banyere ihe omume ndị pụrụ iche bụ́ ndị ndị ji anya ha hụ ihe merenụ na ndị nụrụ n’ọnụ ndị ọzọ dere . . . Ide akụkọ nwere ihe e ji ama ya, ihe ahụ e ji ama ya dịkwa n’Oziọma ndị ahụ.”
N’otu aka ahụ, E. M. Blaiklock, bụ́ prọfesọ nke ihe edemede mgbe ochie na Mahadum Auckland, rụrụ ụka, sị: “Ana m azọrọ na abụ m ọkọ akụkọ ihe mere eme. Ana m ele Ihe Ndekọ Akụkọ Mgbe Ochie anya dị ka akụkọ mere eme. Ana m agwakwa unu na ihe àmà e nwere maka ndụ, ọnwụ, na mbilite n’ọnwụ Kraịst bụ eziokwu karịa nke ihe ka ọtụtụ n’akụkọ ihe mere eme nke oge ochie.”
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 9]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
FINISIA
GALILI
Osimiri Jọdan
JUDIA
[Foto]
“Ihe àmà e nwere maka ndụ,ọnwụ, na mbilite n’ọnwụ Kraịst bụ eziokwu karịa ihe ka ọtụtụ n’akụkọ ihe mere eme nke oge ochie.”—PROFESỌ E. M. BLAIKLOCK
[Ebe E Si Nweta Foto]
Map ndị dị n’azụ: Dabere na map nke ikike mbipụtaghachi ya dị n’aka Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. na Survey of Israel.