Oziọma Ndị Ahụ—Arụmụka ahụ Ka Na-aga n’Ihu
Ihe ndị e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ banyere ọmụmụ Jisọs Kraịst hà bụ́ eziokwu?
Ò ziri Ozizi Elu Ugwu ahụ?
À kpọlitere Jisọs n’ọnwụ n’ezie?
Ò kwuru n’ezie, sị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ”?—JỌN 14:6.
IHE dị ka ndị ọkà mmụta 80 atụlewo okwu ndị dị otú a ná Nzukọ Ọmụmụ Ihe Banyere Jisọs, bụ́ nke a nọworo na-enwe ugboro abụọ n’afọ kemgbe 1985. Ìgwè ndị ọkà mmụta a azawo ajụjụ ndị dị otú ahụ n’ụzọ na-eju anya. Ndị keere òkè ná nzukọ ọmụmụ ihe ahụ ejiriwo mpempe akwụkwọ mee ntụli aka n’okwu nke ọ bụla a sị na ọ bụ Jisọs kwuru n’Oziọma ndị ahụ. Mpempe akwụkwọ na-acha uhie uhie na-egosi echiche bụ́ na ọ bụ Jisọs kwuru okwu ahụ n’ezie. Mpempe akwụkwọ na-acha pinki pinki pụtara na okwu ahụ yiri ihe Jisọs pụrụ ikwuwo. Mpempe akwụkwọ na-acha ntụ ntụ na-egosi na echiche ndị ahụ pụrụ iyitụ ndị nke Jisọs, ma ọ bụghị ya kwuru okwu ahụ. Mpempe akwụkwọ ojii na-egosi na okwu ahụ abụtụghị nnọọ nke Jisọs, na-enye echiche na e si n’ọdịnala pụtara mgbe e mesịrị, nweta okwu ahụ.
N’ịgbaso usoro a, ndị keere òkè ná Nzukọ Ọmụmụ Ihe Banyere Jisọs ewerela isi ihe anọ ahụ dum e welitere n’ụdị ajụjụ ná mmalite dị ka ndị na-abụghị eziokwu. N’ezie, ha ejiriwo mpempe akwụkwọ ojii mee ntụli aka maka pasent 82 nke okwu ndị a sị na ọ bụ Jisọs kwuru n’Oziọma ndị ahụ. Dị ka ha si kwuo, ọ bụ nanị pasent 16 nke ihe ndị a kọrọ banyere Jisọs n’Oziọma ndị ahụ nakwa n’ihe odide ndị ọzọ, yiri eziokwu.
Nkatọ dị otú ahụ a na-akatọ Oziọma ndị ahụ abụghị ihe ọhụrụ. Nkatọ nke Oziọma ndị ahụ malitere na 1774, mgbe e bipụtara otu ihe odide dị peji 1,400 nke Hermann Reimarus, bụ́ prọfesọ nke asụsụ Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nọ na Hamburg, Germany dere, bụ́ nke e bipụtara mgbe ọ nwụsịrị. N’ime ya, Reimarus gosipụtara obi abụọ dị ukwuu banyere ịbụ eziokwu nke Oziọma ndị ahụ. Nkwubi okwu ya dabeere ná ntụle nke asụsụ na n’ihe ndị yiri ka hà na-emegiderịta onwe ha bụ́ ndị a na-achọta n’ihe ndị e dekọrọ n’Oziọma anọ ahụ banyere ndụ Jisọs. Kemgbe ahụ, ndị nkatọ egosipụtawo obi abụọ mgbe mgbe banyere ịbụ eziokwu nke Oziọma ndị ahụ, na-emebi obi ike ọha mmadụ nwere n’ihe odide ndị a ruo n’ókè ụfọdụ.
Àgwà ndị ọkà mmụta dị otú ahụ nwekọrọ ọnụ bụ na ha na-ele ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ anya dị ka akụkọ ifo okpukpe ndị mmadụ dịgasị iche chepụtara. Ajụjụ ndị ọkà mmụta na-enwe obi abụọ na-ajụkarị bụ: Ọ̀ pụrụ ịbụ na ihe ndị ha kweere emewo ka ndị dere Oziọma anọ ahụ tinye nnu na ose n’ihe bụ́ eziokwu n’ezie? Ndọrọ ndọrọ nke ndị Kraịst oge mbụ ò mere ka ha gbanwee akụkọ Jisọs ma ọ bụ tinye ihe na ya? Akụkụ ndị dị aṅaa n’Oziọma ndị ahụ yiri ka hà kọrọ ihe mere eme kama ịkọ akụkọ ifo?
Mmadụ ndị a zụlitere n’etiti ọha mmadụ na-ekweghị n’ịdị adị Chineke ma ọ bụ n’etiti ọha mmadụ na-enweghị mmasị n’okpukpe, kweere na Bible—gụnyere Oziọma ndị ahụ—bụ akwụkwọ nke akụkọ mgbe ochie na akụkọ ifo jupụtara na ya. Ma akụkọ mere eme banyere mwụfu ọbara, mmegbu, adịghị n’otu, na akparamàgwà na-adịghị ewetara Chineke nsọpụrụ nke Krisendọm, na-awụ ndị ọzọ akpata oyi n’ahụ. Ndị dị otú ahụ adịghị ahụ ihe mere ha ga-eji ṅaa ntị n’ihe odide ndị e weere dị ka ndị dị nsọ na Krisendọm. Ha na-eche na ihe odide ndị meworo ka e nwee okpukpe ihu abụọ apụghị ịbụ ihe ọzọ karịa akụkọ ifo na-enweghị isi.
Gịnị ka i chere? Ì kwesịrị ikwe ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta bụ́ ndị na-enwe obi abụọ banyere ịbụ eziokwu nke Oziọma ndị ahụ mee ka i nwewa obi abụọ yiri nke ahụ n’uche gị? Mgbe ị nụrụ nkwupụta nke ebubo a na-ebo na ndị dere Oziọma ndị ahụ kọrọ akụkọ ifo, ì kwesịrị ikwe ka nke a belata obi ike i nwere n’ihe ndị ha dere? Omume na-adịghị ewetara Chineke nsọpụrụ nke Krisendọm na-eme ò kwesịrị ime ka i nwee obi abụọ ma Oziọma ndị ahụ hà bụ ndị a pụrụ ịdabere na ha? Anyị na-agba gị ume inyocha ụfọdụ n’ime ihe ndị bụ́ eziokwu.
[Foto dị na peeji nke 4]
Oziọma ndị ahụ hà bu akụkọ ifo ka hà bu akụkọ mere eme?
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe Jisọs Na-eje Ije n’Elu Oké Osimiri/The Doré Bible Illustrations/Dover Publications
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
N’azụ, peji nke 3-5 na 8: Site n’aka Freer Gallery of Art, Smithsonian Institution, Washington, D.C.