Ịchọ Amụma Ndị A Pụrụ Ịtụkwasị Obi
N’OGE na-adịghị anya mgbe eze Masedonia nke e mesịrị mara dị ka Alexander Onye Ukwu nọkwasịchara n’ocheeze n’afọ 336 T.O.A., o jere n’ihu agbara nke Delphi, nke dị n’etiti Gris. Atụmatụ o ji oké ọchịchọ na-eme maka ọdịnihu abụghị ihe ọzọ karịa imeri ihe ka ukwuu n’ụwa nke oge ahụ. Ma ọ chọrọ ka onye bụ́ chi mesie ya obi ike na nnukwu ihe a ọ chọrọ ime ga-aga nke ọma. Dị ka akụkọ mgbe ochie si kwuo, n’ụbọchị ọ gara Delphi, a naghị ekwe ka mmadụ kpọtụrụ dibịa afa. N’achọghị ịla n’enwetaghị azịza, Alexander siri ọnwụ, na-amanye nwanyị ahụ na-agba afa ịgbara ya afa. Nwanyị ahụ ji nkụda mmụọ tie mkpu, sị: “Ewo, nwa m, a gaghị emeri gị emeri!” Eze ahụ ka na-eto eto weere nke ahụ dị ka ihe àmà dị mma—nke na-egosi mmeri n’agha.
Otú ọ dị, Alexander gaara ama nke ọma banyere ihe ga-esi n’ibu agha ya pụta ma a sị na o nyochara amụma ndị dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel. N’izi ezi n’ụzọ dị ịrịba ama, ha buru amụma banyere mmeri ya ndị dị ngwa. Dị ka ọdịnala si kwuo, Alexander mesịrị nwee ohere ịhụ ihe Daniel dekọworo banyere ya. Dị ka onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus si kwuo, mgbe eze Masedonia ahụ banyere Jerusalem, e gosiri ya amụma Daniel—ikekwe isi nke 8 nke akwụkwọ ahụ. (Daniel 8:5-8, 20, 21) Dị ka e si kọọ, usuu ndị agha mbibi nke Alexander ebibighị obodo ahụ n’ihi nke a.
Mkpa Mmadụ Bu Pụta Ụwa
Ma ọ̀ bụ eze ma ọ bụ onye nkịtị, onye oge ochie ma ọ bụ onye oge a—mmadụ enwewo mkpa maka amụma a pụrụ ịtụkwasị obi banyere ọdịnihu. Dị ka ihe e kere eke ndị nwere ọgụgụ isi, anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-amụ banyere ihe gara aga, maara ihe na-eme ugbu a, ma nwee mmasị karịsịa n’ọdịnihu. Otu ilu ndị China na-ekwu n’ụzọ dabara nnọọ adaba, sị: “Onye pụrụ ịhụ ihe ga-eme n’ụbọchị atọ n’ihu ga-aba ọgaranya ruo ọtụtụ puku afọ.”
N’ime ọgbọ nile, ọtụtụ nde mmadụ anwawo inyoba anya n’ọdịnihu site n’ijekwuru ihe ha chere na ọ bụ chi. Were ndị Gris oge ochie dị ka ihe atụ. Ha nwere ọtụtụ ihu agbara ndị dị nsọ, dị ka ndị dị na Delphi, Delos, na Dodona, bụ́ ebe ha na-aga ajụ chi ha ase banyere ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ nke agha nakwa ihe ndị dịịrị onwe onye dị ka ime njem, alụmdi na nwunye, na ụmụ. Ọ bụghị nanị ndị eze na ndị ọchịagha si n’afa ndị a chọọ nduzi sitere n’ógbè ndị bụ́ mmụọ kama ebo na obodo n’ozuzu ha mere otú ahụ.
Dị ka otu prọfesọ si kwuo, e nwere ugbu a “mmụba dị ngwa nke òtù dị iche iche tinyere onwe ha n’ịmụ banyere ọdịnihu.” Ma, ọtụtụ na-ahọrọ ileghara nanị otu isi iyi ziri ezi nke amụma anya—Bible. Ha adịghị ekwenyetụ na ọ bụ ihe pụrụ ikwe mee na ihe ọmụma ahụ ha na-achọ dị n’amụma Bible. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-eru n’ókè nke ikwu na amụma Bible na afa ndị dibịa afa oge ochie gbara bụ otu ihe. Ndị na-enwe obi abụọ n’oge a na-enwekarị echiche na-ezighị ezi banyere amụma Bible.
Anyị na-agba gị ume inyocha ihe ndekọ ahụ n’onwe gị. Gịnị ka ntụle e ji nlezianya mee banyere amụma Bible na afa ndị mmadụ na-ekpughe? Ị̀ pụrụ ịtụkwasị amụma Bible obi karịa afa oge ochie? Ị̀ pụkwara ime ka ndụ gị daberesie ike n’amụma Bible?
[Foto dị na peeji nke 3]
Bible buru amụma banyere mmeri dị ngwa nke Alexander
[Ebe E Si Nweta Foto]
Cortesía del Museo del Prado, Madrid, Spain
[Foto dị na peeji nke 4]
Alexander Onye Ukwu
[Ebe E Si Nweta Foto]
Musei Capitolini, Roma
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]
IHU AKWỤKWỌ: Ọchịagha Titus na Alexander Onye Ukwu: Musei Capitolini, Roma