Ihe Mere Ị Pụrụ Iji Tụkwasị Obi N’amụma Bible
EZE PYRRHUS nke Epirus dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Gris lụsoro Alaeze Ukwu Rom ọgụ ruo ogologo oge. N’ịchọsi ike ịmata ihe ga-esi na ya pụta, ọ gara ịjụ ase n’ihu agbara nke Delphi. Ma a pụrụ ịghọta afa a gbaara ya n’ụzọ abụọ na-esonụ: (1) “M na-asị na gị bụ́ nwa Æacus pụrụ imeri ndị Rom. Ị ga-aga, ị ga-alọta, ị gaghị anwụ n’agha ma ọlị.” (2) “M na-asị na ndị Rom pụrụ imeri gị, gị nwa Æacus. Ị ga-aga, ị gaghị alọta ma ọlị, ị ga-anwụ n’agha.” Ọ họọrọ ịghọta afa ahụ n’ụzọ nke mbụ ahụ, n’ihi ya kwa, o busoro Rom agha. E meriri Pyrrhus oké mmeri.
Ọnọdụ ndị dị otú ahụ mere ka a mara afa ndị a gbara n’oge ochie dị ka ndị na-adịghị edo anya, bụrụkwa ndị pụrụ ịpụta ọtụtụ ihe. Ma gịnị banyere amụma Bible? Ụfọdụ ndị nkatọ na-ekwu na amụma ndị dị na Bible adịghị mma karịa afa. Ndị nkatọ a na-akọ nkọ na amụma Bible bụ nanị nkọwa nke mmadụ ndị maara ihe ma na-aghọta ihe nke ọma, bụ́ ndị sitekarịrị n’òtù ndị nchụàjà, ji akọ kọwaa ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Dị ka e chere, nanị site n’ahụmahụ ha ma ọ bụ site ná mmekọrịta pụrụ iche ha so ndị ọzọ nwee, ndị ikom a bu ụzọ hụ otú ihe ụfọdụ ga-esi eme. Site n’iji ihe ndị e ji mara amụma Bible tụnyere ihe e ji mara afa, a ga-akwadebe anyị nke ọma iru ná nkwubi okwu kwesịrị ekwesị.
Ọdịiche Ndị E Nwere
Ihe e ji mara afa bụ ịdị mgbagwoju anya ya. Dị ka ihe atụ, na Delphi, e nyere azịza ndị ahụ site n’ụda ndị a na-agaghị aghọta aghọta. Nke a mere o ji dị mkpa na ndị dibịa afa ga-akọwa ha ma kwuo ihe ndị pụrụ inwe nkọwa ndị na-emegide onwe ha. Ezigbo ihe atụ e nwere banyere nke a bụ ihe a zara Croesus, bụ́ eze Lidia. Mgbe ọ gara n’ihu agbara ịjụ ase, a gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na Croesus agafee Halys, ọ ga-ebibi alaeze ukwu dị ike.” N’ezie, “alaeze ukwu dị ike” e bibiri bụ nke ya! Mgbe Croesus gafere osimiri Halys iji wakpoo Kapadosia, Saịrọs onye Peasia meriri ya.
N’ụzọ dị nnọọ iche n’afa ndị ọgọ mmụọ, a maara amụma Bible maka izi ezi na ido anya ha. Otu ihe atụ bụ amụma banyere ọdịda Babilọn, nke e dekọrọ n’akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa. Ihe dị ka afọ 200 tupu ihe a emee, Aịsaịa onye amụma kwuru n’ụzọ zuru ezu ma zie ezie banyere nkwatu Medo-Peasia ga-akwatu Babilọn. Amụma ahụ kpughere na aha onye mmeri ya ga-abụ Saịrọs, o kpughekwara kpọmkwem atụmatụ nke ime ka osimiri nchebe yiri ékpè takọọ na isite n’ọnụ ụzọ ámá ndị gheere oghe banye n’obodo e wusiri ike. Ihe a nile mezuru kpọmkwem. (Aịsaịa 44:27–45:2) E bukwara amụma n’ụzọ ziri ezi na Babilọn ga-emesịa bụrụ nke mmadụ na-agaghị ebikwa.—Aịsaịa 13:17-22.
Tụleekwa ọdịdị doro anya nke ịdọ aka ná ntị a Jona onye amụma kwupụtara: “Ọ fọdụrụ [ụbọchị iri anọ], e wee kwatuo Nineve.” (Jona 3:4) E nweghị ihe ọ bụla dị mgbagwoju anya n’ebe a! Ozi ahụ dị nnọọ ịrịba ama ma doo anya nke na ozugbo ahụ, ndị Nineve “wee kwere na Chineke; ha wee kpọsaa obubu ọnụ, yiri ákwà mkpe.” N’ihi nchegharị ha, Jehova ebibighị ndị Nineve n’oge ahụ.—Jona 3:5-10.
E ji afa mee ihe dị ka ihe e ji akpa ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ndị ọchịchị na ndị ọchịagha kpọtụkarịrị uche ná nkọwa nke masịrị ha iji kwalite ọdịmma nke onwe ha na ihe ha na-eme, si otú ahụ na-eme ka nke ahụ yie “ihe si n’aka ndị bụ́ chi.” Otú ọ dị, e ziri ozi amụma Chineke n’eleghị mmadụ anya n’ihu.
Iji maa atụ: Onye amụma Jehova bụ́ Netan alaghị azụ n’ịgbazi Eze Devid na-adahie adahie. (2 Samuel 12:1-12) Mgbe Jeroboam nke Abụọ na-achị alaeze ebo iri nke Israel, ndị amụma bụ́ Hosea na Emọs gwara eze nnupụisi ahụ na ndị na-akwado ya okwu nkatọ dị ike n’ihi ndapụ n’ezi ofufe na àgwà ha nke asọpụrụghị Chineke. (Hosea 5:1-7; Emọs 2:6-8) Nke na-agba agba karịsịa bụ ịdọ aka ná ntị Jehova nyere eze ahụ site n’ọnụ Emọs onye amụma: “M ga-ejikwa mma agha bilie imegide ụlọ Jeroboam.” (Emọs 7:9) E gbuchapụrụ ezinụlọ Jeroboam.—1 Ndị Eze 15:25-30; 2 Ihe E Mere 13:20.
A na-anakarị ego iji gbaara mmadụ afa. Onye kwụrụ ụgwọ kanụ ka a ga-agbara afa masịrị ya. Ndị gara ịjụ ase n’ihu agbara Delphi kwụrụ ụgwọ dị ukwuu maka ihe ọmụma na-abaghị uru, si otú ahụ na-eme ka akụ̀ dị ukwuu jupụta n’ụlọ nsọ Apollo na nnukwu ụlọ ndị ọzọ. N’ụzọ dị iche, e buru amụma Bible ma nye ịdọ aka ná ntị ya n’anaghị ego nakwa n’eleghị mmadụ anya n’ihu ma ọlị. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị n’agbanyeghị ọkwá ma ọ bụ akụ̀ na ụba nke onye o metụtara, n’ihi na a pụghị inye ezi onye amụma aka azụ. Onye amụma na onyeikpe bụ́ Samuel pụrụ iji ezi obi jụọ, sị: “N’aka ònye ka m narawooro ihe mgbapụta iji zopụ anya m n’ahụ ya?”—1 Samuel 12:3.
Ebe ọ bụ na a na-agba afa nanị n’ebe ụfọdụ kpọmkwem, mmadụ aghaghị itinye mgbalị dị ukwuu iji garuo ebe ahụ ka e wee gbaara ya afa. Nye onye nkịtị, ọ rara ahụ ịgaru n’ihe ka ọtụtụ n’ebe ndị ahụ n’ihi na ha dị n’ebe ndị dị ka Dodona nke dị n’Ugwu Tomarus dị n’Epirus nakwa na Delphi nke dị n’etiti Gris nke ugwu jupụtara. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụ nanị ndị ọgaranya na ndị dị ike na-enwe ike ịjụta chi ndị dị n’ihu agbara ndị ahụ ase. Ọzọkwa, a na-ekpughe “uche nke ndị chi” nanị n’ime ụbọchị ole na ole n’afọ. N’ụzọ dị nnọọ iche, Jehova Chineke zigara ndị ozi ya na-ebu amụma kpọmkwem n’ebe ndị mmadụ nọ iji kpọsaa amụma ndị dị ha mkpa ịnụ. Dị ka ihe atụ, n’oge a chụgara ndị Juu na Babilọn, Chineke nwere ma ọ dịkarịa ala ndị amụma atọ na-eburu ndị ya amụma—Jeremaịa nọ na Jerusalem, Ezikiel so ndị ahụ a chụpụrụ n’ala ha, Daniel nọkwa n’isi obodo Alaeze Ukwu Babilọn.—Jeremaịa 1:1, 2; Ezikiel 1:1; Daniel 2:48.
A na-agbakarị afa na nzuzo ka onye a na-agbara ya nwee ike ịkọwa ya otú ọ ga-abara ya uru. N’ụzọ dị iche, a na-ebukarị amụma Bible n’ihu ọha ka mmadụ nile wee nwee ike ịnụ ozi ahụ ma ghọta ihe ndị ọ pụtara. Ọtụtụ mgbe, Jeremaịa onye amụma kwuru okwu n’ihu ọha na Jerusalem, ọ bụ ezie na ọ maara na ozi ya adịghị ndị ndú na ndị bi n’obodo ahụ mma.—Jeremaịa 7:1, 2.
Taa, a na-ele afa anya dị ka otu akụkụ nke akụkọ ihe mere eme oge ochie. Ha abaghịrị ndị bi n’oge anyị a dị oké egwu uru ọ bụla. Ọ dịghị afa dị otú ahụ nke na-ekwu banyere oge anyị ma ọ bụ ọdịnihu anyị. N’ụzọ dị nnọọ iche, amụma Bible bụ akụkụ nke “okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Amụma Bible ndị mezuworonụ na-egosi ụzọ Jehova si emeso ndị mmadụ ihe ma na-ekpughe akụkụ ndị dị mkpa nke nzube na àgwà ya. Tụkwasị na nke ahụ, amụma Bible ndị dị mkpa na-echere mmezu ha n’ọdịnihu dị nso. N’ịkọwa ihe dị n’ihu, Pita onyeozi dere, sị: “Dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ [Alaeze Mesaịa nke eluigwe] na ụwa ọhụrụ [òtù ụmụ mmadụ bụ́ ndị ezi omume], nke ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.
Ntụnyere a dị mkpirikpi e ji amụma Bible tụnyere afa nke okpukpe ụgha pụrụ iduga gị ná nkwubi okwu yiri nke e kwupụtara n’akwụkwọ nke isiokwu ya bụ́ The Great Ideas: “A bịahaala n’ihe banyere ndị mmadụ ịmara ihe ga-eme n’ọdịnihu, ndị amụma Hibru yiri ka ha pụrụ iche. N’adịghị ka ndị ọgọ mmụọ na-ajụ ndị mmụọ ase ma ọ bụ ndị na-akọ ọdịnihu, . . . ha adịghị eji ihe osise ma ọ bụ ngwá ọrụ dị iche iche eme ihe iji chọpụta ihe nzuzo nke ndị bụ́ chi. . . . N’akụkụ kasị ukwuu, n’adịghị ka nke ndị dibịa afa, okwu amụma ha yiri nke doro anya. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ nzube ya yiri ka ọ bụ ikpughe, ọ bụghị izochi, atụmatụ Chineke n’okwu ndị Ya Onwe Ya chọrọ ka ndị mmadụ hụ ihe Ọ ga-eme tupu o mee ha.”
Ị̀ Ga-atụkwasị Obi n’Amụma Bible?
Ị pụrụ ịtụkwasị amụma Bible obi. N’ezie, ị pụrụ ime ka Jehova na mmezu nke okwu amụma ya bụrụ ihe bụ́ isi ná ndụ gị. Amụma Bible abụghị ihe ndekọ na-abaghịzi uru nke amụma ndị mezuworonụ. Ọtụtụ amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ na-emezu ugbu a ma ọ bụ na-echere mmezu n’ọdịnihu dị nso. Ọ bụrụ na a tụlee ihe ndị gara aga, anyị pụrụ inwe nnọọ obi ike na ha ga-emezukwa. Ebe ọ bụ na amụma ndị dị otú ahụ lekwasịrị anya n’oge anyị, na-emetụtakwa ọdịnihu anyị kpọmkwem, anyị ga-eme nke ọma iji ha kpọrọ ihe.
N’ezie, ị pụrụ ịtụkwasị obi n’amụma Bible dị n’Aịsaịa 2:2, 3: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile . . . Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Jehova, . . . Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.” Taa, ọtụtụ nde mmadụ n’ezie na-anakwere ofufe dị elu nke Jehova ma na-amụta ije ije n’okporo ụzọ ya nile. Ị̀ ga-anakwere ohere nke ịmụtakwu banyere ụzọ Chineke ma nara ezi ihe ọmụma banyere ya na nzube ya iji jee ije n’okporo ụzọ ya nile?—Jọn 17:3.
Mmezu nke amụma Bible ọzọ chọrọ ka anyị mee ihe ngwa ngwa. Banyere ọdịnihu dị nso, ọbụ abụ ahụ bụrụ abụ n’ụzọ amụma, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa.” (Abụ Ọma 37:9, 10) Gịnị ka i chere na ọ dị mkpa iji zere mbibi na-abịanụ nke ndị ajọ omume, tinyere ndị ahụ na-akwa amụma Bible emo? Otu abụ ọma ahụ na-aza, sị: “Ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:9) Ile anya Jehova pụtara ịtụkwasị obi kpam kpam ná nkwa ya na ime ka ndụ anyị kwekọọ n’ụkpụrụ ya.—Ilu 2:21, 22.
Gịnị ka ndụ ga-adị ka ya mgbe ndị na-ele anya Jehova nwetara ala? Ọzọkwa, amụma Bible na-ekpughe na ọdịnihu dị ebube na-echere ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Aịsaịa onye amụma dere, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ: n’ihi na n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị.” (Aịsaịa 35:5, 6) Jọn onyeozi dere okwu ndị a na-emesi obi ike: ‘Ọ [Jehova] ga-ehichapụ anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo. Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, . . . Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.’—Mkpughe 21:4, 5.
Ndịàmà Jehova maara na Bible bụ akwụkwọ amụma a pụrụ ịdabere na ya. Ha kwenyekwara n’agbamume Pita onyeozi n’ụzọ zụrụ ezu: “E mekwara ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị; nke unu na-eme nke ọma n’ịṅa ntị ya, dị ka oriọna mgbe ọ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, ruo mgbe chi ga-abọ, kpakpando chi ọbụbọ wee tibe n’obi unu.” (2 Pita 1:19) Olileanya anyị sitere n’ezi obi bụ na atụmanya magburu onwe ha nke amụma Bible na-enye maka ọdịnihu ga-agba gị ume!
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6]
IHU AGBARA DELPHI bụ nke a kasị mara amara na Gris oge ochie.
Anwụrụ ọkụ na-egbu ka mmanya na-eme ka nwanyị ahụ na-agba afa mewe ka onye mmanya na-egbu
[Foto]
Nwanyị ahụ na-agba afa na-anọdụ n’elu ihe a nwere ụkwụ atọ agba afa ya
E kwere na ihe ndị ọ na-ekwu bụ mkpughe sitere n’aka chi bụ́ Apollo
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Ihe nwere ụkwụ atọ: Site n’akwụkwọ bụ́ Dictionary of Greek and Roman Antiquities; Apollo: The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck
[Foto dị na peeji nke 7]
Afa ndị a gbara n’ihu agbara Delphi abụtụghị ndị a pụrụ ịdabere na ha
[Ebe E Si Nweta Foto]
Delphi, Gris
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
Ị pụrụ ịtụkwasị amụma Bible banyere ụwa ọhụrụ ahụ obi n’ụzọ zuru ezu