Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 9/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Alaeze Chineke Na-achị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Baịbụl—Akwụkwọ Na-akọ Ihe Ndị Mere Eme na Amụma Ndị Na-emezu Emezu
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Mụta Ihe n’Amụma Ndị E Dere na Baịbụl
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ịghọta Amụma Ndị Dị n’Akwụkwọ Ezikiel
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 9/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị mere e ji dee amụma ndị e dere na Baịbụl?

On the Mount of Olives, Jesus speaks with some of his apostles

Gịnị mere Baịbụl ji kwuo ihe ndị ga-eme n’oge anyị a?​—Luk 21:10, 11.

E dere ọtụtụ amụma na Baịbụl, deekwa ihe niile gbasara otú ha ga-esi mee. O nweghị mmadụ ga-ekwuli ihe ga-eme n’ọdịnihu, kwuokwa otú ọ ga-esi mee, ya emee otú ahụ o si kwuo ya. Ma, amụma ndị e buru na Baịbụl na-emezucha. Ọ na-egosi na Baịbụl bụ Okwu Chineke n’eziokwu.—Gụọ Jọshụa 23:14; 2 Pita 1:20, 21.

Amụma Baịbụl ndị mezurulanụ na-eme ka anyị nwee okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ. (Ndị Hibru 11:1) Ha na-emekwa ka obi sie anyị ike na nkwa niile Chineke kwere anyị ga-emezucha. N’eziokwu, amụma ndị e buru na Baịbụl na-eme ka anyị nwee olileanya.—Gụọ Abụ Ọma 37:29; Ndị Rom 15:4.

Olee uru amụma ndị e buru na Baịbụl na-abara anyị?

Chineke ji ụfọdụ amụma ndị e dere na Baịbụl gwa ndị ya ihe ha ga-eme. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị mbụ soro ụzọ Jizọs hụrụ ka amụma ụfọdụ e buru gbasara ibibi Jeruselem na-emezu, ha si na Jeruselem gbapụ. Mgbe e mechara bibie Jeruselem n’ihi na ọtụtụ ndị bi na ya jụrụ Jizọs, ọkọ akọghị ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Gụọ Luk 21:20-22.

Amụma ndị na-emezu taa na-egosi na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ niile. (Daniel 2:44; Luk 21:31) Ọ bụ ya mere onye ọ bụla ji kwesị ịgbasi mbọ ike ugbu a na-eme ihe dị Jizọs Kraịst mma ebe ọ bụ Eze Chineke họpụtara ka ọ na-achị n’Alaeze ya.—Gụọ Luk 21:34-36.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 2 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya