ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 34
Mụta Ihe n’Amụma Ndị E Dere na Baịbụl
“Ndị ma ihe ga-aghọta ha.”—DAN. 12:10.
ABỤ NKE 98 Akwụkwọ Nsọ Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke
IHE ISIOKWU A NA-EKWUa
1. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ka ịmụ amụma ndị dị na Baịbụl na-atọ anyị ụtọ?
OTU nwanna bụ́ okorobịa aha ya bụ Ben sịrị: “Ịmụ amụma ndị dị na Baịbụl na-atọgbu m atọgbu.” Ì kwetara ihe a o kwuru, ka ì chere na amụma ndị dị na Baịbụl anaghị ekwe nghọta? O nwedịrị ike ịdị gị ka ịmụ amụma ndị e dere na Baịbụl ọ̀ na-agwụ ike. Ma, ọ bụrụ na i chee ihe mere Jehova ji kwe ka e denye amụma ndị ahụ na Baịbụl, o nwere ike ime ka ị gbanwee otú i si ele ha anya.
2. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
2 N’isiokwu a, ihe anyị ga-eleba anya na ya abụghị naanị ihe mere anyị kwesịrị iji na-amụ amụma ndị dị na Baịbụl. Anyị ga-amụkwa otú anyị nwere ike isi na-amụ ha. Anyị ga-elebazi anya n’amụma abụọ dị n’akwụkwọ Daniel ka anyị hụ otú ịghọta ha ga-esi enyere anyị aka ugbu a.
GỊNỊ MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI NA-AMỤ AMỤMA NDỊ DỊ NA BAỊBỤL?
3. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị chọọ ịghọta amụma ndị dị na Baịbụl?
3 Anyị kwesịrị ịchọ ka e nyere anyị aka ka anyị nwee ike ịghọta amụma ndị e dere na Baịbụl. Legodịnụ ihe atụ a. Ka e were ya na ị chọrọ ịga ebe ị na-amaghị, mana ya enwee enyi gị ma ebe ahụ nke ọma gị na ya so na-aga. Ọ ma ebe unu nọ nakwa ebe ụzọ nke ọ bụla ga-eduga unu. O doro anya na obi ga-adị gị ụtọ na enyi gị ahụ kwetara iso gị. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Jehova ma nke ọma oge anyị nọ na ya, nakwa ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmụta amụma ndị e dere na Baịbụl, anyị kwesịrị iwetu onwe anyị ala rịọ Jehova ka o nyere anyị aka.—Dan. 2:28; 2 Pita 1:19, 20.
Ịmụ amụma ndị dị na Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịkwadebe maka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)
4. Olee ihe mere Jehova ji mee ka e dee amụma n’Okwu ya bụ́ Baịbụl? (Jeremaya 29:11) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
4 Jehova na-eme ka ezigbo nne ma ọ bụ nna. Ọ chọrọ ka ihe dịrị ụmụ ya ná mma n’ọdịnihu. (Gụọ Jeremaya 29:11.) Ndị nne na nna enweghị ike ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma, Jehova nwere ike ịmata kpọmkwem otú ihe ga-adị n’ọdịnihu. E nwere amụma ndị o mere ka e dee n’Okwu ya ka anyị nwee ike ịmata ihe ndị dị mkpa ga-emenụ tupu ha emee. (Aịza. 46:10) Amụma ndị e dere na Baịbụl bụ onyinye Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya nyere anyị. Ma, olee otú obi ga-esi sie gị ike na amụma ndị Baịbụl buru ga-emezu?
5. Olee ihe onye na-eto eto nwere ike ịmụta n’ihe Nwanna Max mere?
5 Ndị ha na ụmụ anyị na-anọkarị n’ụlọ akwụkwọ bụ ndị na-enweghị ihe ha ji Baịbụl kpọrọ. Ihe ndị ha na-ekwu na otú ha si akpa àgwà nwere ike ime ka ụmụaka bụ́ Ndịàmà Jehova nwewe obi abụọ. Lee ihe mere otu nwanna aha ya bụ Max. Ọ sịrị: “Mgbe m ka na-eto eto, ọ nọ na-eme m obi abụọ ma ihe nne na nna m kụziiri m gbasara okpukpe nke bụ́ ezigbo okpukpe ọ̀ bụ eziokwu, nakwa ma Baịbụl ò si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” Olee ihe nne na nna ya mere? Ọ sịrị: “Ha eweghị iwe, ọ bụ eziokwu na m ma na o nyere ha nsogbu n’obi.” Nne na nna Max ji Baịbụl zaa ya ajụjụ ndị o nwere. Mana, e nwere ihe ọzọ Max mere. Ọ sịrị: “M mụrụ amụma Baịbụl n’onwe m, mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-eto eto nọ n’ọgbakọ na-ekwurịtakwa ihe m mụtara.” Olee uru ọ baara ya? Max sịrị: “Mgbe m mechara ihe a, obi bịara sie m ike na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ Chineke.”
6. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị na-enwe obi abụọ? Maka gịnị?
6 Ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ ka Nwanna Max ma ihe Baịbụl kwuru ọ̀ bụ eziokwu, ihere emela gị. Ma, i kwesịrị ime ihe maka ya. Inwe obi abụọ dị ka nchara. Ọ bụrụ na ị gbachi ya nkịtị, o nwere ike iji nwayọọ nwayọọ mebie ihe bara ezigbo uru. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịkwụsị inwe obi abụọ nke nwere ike imebi okwukwe gị, i kwesịrị ịjụ onwe gị, sị: ‘M̀ kwetara na ihe Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihụ bụ eziokwu?’ Ọ bụrụ na obi esighị gị ike, i nwere ike ịmụ amụma ndị e dere na Baịbụl ndị mezurulanụ. Olee otú i ga-esi eme ya?
OTÚ Ị GA-ESI NA-AMỤ AMỤMA BAỊBỤL
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịtụkwasị Jehova obi otú ahụ Daniel mere, anyị kwesịrị iwetu onwe anyị ala mụọ amụma ndị dị na Baịbụl, lezie anya na-amụ ha, burukwa ezigbo ihe n’obi na-amụ ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)
7. Olee otú Daniel si gosi otú e si amụ amụma Baịbụl? (Daniel 12:10) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
7 Daniel gosiri otú dị mma e si amụ amụma Baịbụl. O bu ezigbo ihe n’obi mụọ amụma ndị ahụ, ya bụ, ka ọ mata nke bụ́ eziokwu. Ihe ọzọkwa bụ na Daniel dị umeala n’obi. Ọ ma na Jehova ga-eme ka ndị ma ya nakwa ndị na-ebi ndụ otú ọ chọrọ ghọta amụma ya. (Dan. 2:27, 28; gụọ Daniel 12:10.) Daniel gosiri na ọ dị umeala n’obi. Otú o si mee ya bụ na ọ tụkwasịrị Jehova obi ka o nyere ya aka. (Dan. 2:18) Ihe ọzọkwa bụ na Daniel leziri ezigbo anya mụọ amụma ndị ahụ. O mere nchọnchọ n’Akwụkwọ Nsọ dị n’oge ya. (Jere. 25:11, 12; Dan. 9:2) Olee otú ị ga-esi eme ka Daniel?
8. Gịnị mere ụfọdụ ndị anaghị ekweta na amụma ndị dị na Baịbụl na-emezu? Ma olee ihe anyị kwesịrị ime?
8 Buru ezigbo ihe n’obi. Ihe mere i ji na-amụ amụma ndị dị na Baịbụl, ọ̀ bụ na ị chọsiri ike ịma nke bụ́ eziokwu? Ọ bụru otú ahụ, Jehova ga-enyere gị aka. (Jọn 4:23, 24; 14:16, 17) Olee ihe ọzọ nwere ike ime ka mmadụ mụọ amụma ndị dị na Baịbụl? Ụfọdụ ndị nwere ike ime ya ka ha chọta ihe ndị na-egosi na Baịbụl esighị n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ndị na-eme otú ahụ na-eche na ọ ga-eme ka ha nwee ike ịna-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, anyị kwesịrị ibu ezigbo ihe n’obi na-amụ amụma Baịbụl. Ihe ọzọ bụ na e nwere àgwà dị ezigbo mkpa anyị ga-enwe ka anyị nwee ike ịghọta amụma ndị dị na Baịbụl.
9. Olee àgwà anyị kwesịrị inwe ka anyị nwee ike ịghọta amụma ndị dị na Baịbụl? Kọwaa.
9 Dịrị umeala n’obi. Jehova kwere nkwa inyere ndị dị umeala n’obi aka. (Jems 4:6) N’ihi ya, anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka ịghọta amụma ndị dị na Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, anyị ga-aghọta na ọ bụ n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ka Jehova si enye anyị nri n’oge kwesịrị ekwesị. (Luk 12:42) Jehova bụ Chineke na-eme ihe n’usoro. N’ihi ya, ọ dabara adaba na e nwere otu ebe o si enyere anyị aka ịghọta eziokwu ndị dị n’Okwu ya.—1 Kọr. 14:33; Efe. 4:4-6.
10. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Nwaanyị Esther mere?
10 Na-elezi anya ma ị na-amụ amụma Baịbụl. Họrọ amụma Baịbụl masịrị gị, burukwa ụzọ mee nchọnchọ na ya. Ọ bụ ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Esther mere. Ihe masịrị ya bụ amụma ndị kwuru gbasara ọbịbịa Mezaya. Ọ sịrị: “Mgbe m dị afọ iri na ise, m malitere ịchọ ihe ndị na-egosi na e dere amụma ndị ahụ tupu a mụọ Jizọs.” Ihe ọ mụtara mgbe ọ gụrụ gbasara akwụkwọ mpịakọta ndị a chọtara n’akụkụ Oké Osimiri Nnu mere ka obi sie ya ike. Ọ sịrị: “E dere ụfọdụ n’ime ha tupu Kraịst abịa. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị n’aka Chineke ka amụma ndị ahụ si.” O kwukwara, sị: “M gụrụ ihe ndị ahụ ugboro ugboro ka m nwee ike ghọta ha.” Ma, obi dị ya ụtọ na ọ gbara mbọ a. Mgbe ọ mụchara ọtụtụ amụma Baịbụl nke ọma, ọ sịrị: “O doola m anya na Baịbụl na-ekwu eziokwu.”
11. Olee otú iji aka anyị achọpụta na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu si abara anyị uru?
11 Anyị hụ otú amụma ụfọdụ dị n’Okwu Chineke si mezuo, ọ na-eme ka anyị tụkwasị Jehova na ntụziaka ọ na-enye anyị obi anyị niile. Ihe ọzọ bụ na amụma ndị dị na Baịbụl na-enyere anyị aka inwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-enwe ugbu a. Ka anyị leba anya ná nkenke n’amụma abụọ Daniel dere nakwa otú ha si emezu ugbu a. Ịghọta ha ga-enyere anyị aka ikpebi ihe ga-adị mma.
IHE MERE I KWESỊRỊ IJI AMA GBASARA ỤKWỤ E JI ÍGWÈ NA ỤRỌ KPỤỌ
12. Gịnị ka ụkwụ ahụ e ji “ígwè na ụrọ na-esighị ike” kpụọ nọchiri anya ya? (Daniel 2:41-43)
12 Gụọ Daniel 2:41-43. Ná nrọ ahụ Daniel kọwaara Eze Nebukadneza, e ji “ígwè na ụrọ na-esighị ike” kpụọ ụkwụ ihe ahụ a kpụrụ akpụ ọ hụrụ ná nrọ. Anyị leruo amụma a na amụma ndị ọzọ dị n’akwụkwọ Daniel na akwụkwọ Mkpughe anya, anyị ga-aghọta na ụkwụ ahụ nọchiri anya ọchịchị Briten na Amerịka bụ́ ọchịchị kacha akpa ike n’ụwa taa. Daniel kwuru na “alaeze ahụ ga-esitụ ike n’ebe ụfọdụ, ma ọ gaghị esi ike n’ebe ụfọdụ.” Gịnị mere na ọ gaghị esi ike n’ebe ụfọdụ? Ọ bụ n’ihi na ndị nkịtị, bụ́ ndị ụrọ ahụ na-esighị ike nọchiri anya ha, na-eme ka ọ ghara ịna-akpa ike ka ígwè.b
13. Olee eziokwu dị mkpa anyị nwere ike ịmụta ma ọ bụrụ na anyị aghọta amụma a?
13 Anyị ga-amụta ọtụtụ eziokwu dị mkpa n’otú Daniel si kọwaa ihe ahụ a kpụrụ akpụ Nebukadneza rọrọ ná nrọ, karịchaa, ụkwụ ya. Nke mbụ, ọchịchị Briten na Amerịka esila n’ụzọ ụfọdụ gosi na ha dị ike. Dị ka ihe atụ, ha so ná mba ndị meriri n’Agha Ụwa nke Mbụ na n’Agha Ụwa nke Abụọ. Ma, ọchịchị a esighịzi ike otú o siburu. Ọ ga-adịkwa otú ahụ na-aga n’ihi na ụmụ amaala obodo ndị ahụ na-alụso ibe ha nakwa ọchịchị ahụ ọgụ. Nke abụọ, ọchịchị abụọ a gbakọrọ aka ọnụ ga-abụ ọchịchị ikpeazụ ga-achị ụwa tupu Alaeze Chineke abịa bibie ọchịchị ụmụ mmadụ niile. Ọ bụ eziokwu na mba ụfọdụ nwere ike mawa ọchịchị Briten na Amerịka aka mgbe ụfọdụ, ha agaghị anọchili ha. Ihe mere anyị ji mara bụ na “nkume” ahụ nke nọchiri anya Alaeze Chineke ga-akụri ụkwụ ihe ahụ a kpụrụ akpụ nke nọchiri anya ọchịchị Briten na Amerịka.—Dan. 2:34, 35, 44, 45.
14. Olee otú ịghọta amụma banyere ụkwụ ígwè na ụrọ ahụ ga-esi enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe dị mma?
14 Obi ò siri gị ike na amụma Daniel buru gbasara ụkwụ ígwè na ụrọ ahụ bụ eziokwu? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-eme ka ị gbanwee otú i si ebi ndụ gị. Ihe ga-akacha gị mkpa abụghị ịgbalịwa ka ị bụrụ aka ji akụ̀ n’ụwa a a ga-ebibi n’oge na-adịghị anya. (Luk 12:16-21; 1 Jọn 2:15-17) Ịghọta amụma a ga-enyekwara gị aka ịmata na ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe dị ezigbo mkpa. (Mat. 6:33; 28:18-20) Ị mụchaa amụma a, jụọ onwe gị ajụjụ a, ‘Ihe ndị m na-ekpebi ime hà na-egosi na obi siri m ike na Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ niile n’oge na-adịghị anya?’
OLEE OTÚ “EZE UGWU” NA “EZE NDỊDA” SI GBASA GỊ?
15. Olee ndị bụ́ “eze ugwu” na “eze ndịda” taa? (Daniel 11:40)
15 Gụọ Daniel 11:40. Daniel isi 11 kwuru gbasara eze abụọ ma ọ bụ ọchịchị abụọ ga na-amarịta aka ịna-achị ụwa niile. Ọ bụrụ na anyị eleruo amụma a na amụma ndị ọzọ dị na Baịbụl anya, anyị ga-achọpụta na “eze ugwu” bụ Rọshịa na mba ndị na-akwado ya, nakwa na “eze ndịda” bụ ọchịchị Briten na Amerịka, bụ́ ọchịchị na-achị ụwa.c
Ọ bụrụ na anyị aghọta na ọgụ “eze ugwu” na “eze ndịda” na-alụso ibe ha na-emezu amụma dị na Baịbụl, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 ruo na nke 18)
16. Olee nsogbu na-abịara ndị bi n’ebe “eze ugwu” na-achị?
16 “Eze ugwu” na-akpagbu ndị Chineke bi n’ebe ọ na-achị. E nweela ụfọdụ Ndịàmà Jehova a kụrụ ihe ma tụọ mkpọrọ n’ihi ihe ha kweere. Ihe a “eze ugwu” na-eme na-eme ka okwukwe ụmụnna anyị sikwuo ike, kama ime ka ha daa mbà. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ụmụnna anyị ma na mkpagbu ahụ a na-akpagbu ha na-emezu amụma e dere n’akwụkwọ Daniel.d (Dan. 11:41) Anyị ịmata ihe a nwere ike inyere anyị aka ka okwukwe anyị sikwuo ike, anyị ana-erubekwara Jehova isi.
17. Olee ọnwụnwa ndị bịaarala ndị Chineke bi n’ebe “eze ndịda” na-achị?
17 N’oge gara aga, “eze ndịda” kpagbukwara ndị ohu Jehova. Dị ka ihe atụ, n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Mbụ na Agha Ụwa nke Abụọ, a tụrụ ọtutụ ụmụnna anyị mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị aga agha, chụọkwa ụfọdụ ụmụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ha ekweghị ekele ọkọlọtọ. Ma, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, e nwekwara ọnwụnwa ndị si n’ụzọ ndị ọzọ na-abịara ụmụnna anyị bi n’ebe “eze ndịda” na-achị. Dị ka ihe atụ, n’oge a na-achụ nta vootụ, Onye Kraịst nwere ike ichewe na otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ otu onye na-azọ ọchịchị ka ndị nke ọzọ mma. O nwere ike ọ gaghị aga soro tụọ vootu. Mana, n’ime obi ya, o nwere onye nke ọ na-akwado. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụghị naanị n’ihe ndị anyị na-eme, kamakwa n’ihe anyị na-eche nakwa n’otú obi na-adị anyị.—Jọn 15:18, 19; 18:36.
18. Gịnị ka anyị kwesịrị ime maka ọgụ “eze ugwu” na “eze ndịda” na-alụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
18 Ndị na-ekwetaghị na amụma dị na Baịbụl bụ eziokwu nwere ike ịna-echegbu onwe ha nke ukwuu ma ha hụ ka “eze ugwu” na “eze ndịda” ‘na-asọrịta mpi.’ (Ihe e dere n’ala ala peeji Dan. 11:40.) Ndị eze abụọ ahụ nwere ngwá agha ọgwụrụmba nwere ike ibibi ihe niile na-eku ume nọ n’ụwa. Ma, anyị ma na Jehova agaghị ekwe ka nke ahụ mee. (Aịza. 45:18) N’ihi ya, kama ihe a ha na-eme ichegbuwe anyị, otú a “eze ugwu” na “eze ndịda” si dịrị n’iro na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ọ na-eme ka obi sie anyị ike na ọgwụgwụ ụwa ochie a dị nso.
AKWỤSỊLA IGE NTỊ N’AMỤMA
19. Olee ihe anyị kwesịrị ịghọta gbasara amụma ndị dị na Baịbụl?
19 Anyị amaghị otú amụma ụfọdụ dị na Baịbụl ga-esi emezu. Daniel onye amụma aghọtaghịdị ihe amụma niile o dere pụtara. (Dan. 12:8, 9) Ma, naanị na anyị aghọtaghị kpọmkwem otú amụma ga-esi emezu apụtaghị na amụma ahụ agaghị emezu. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ịghọta ihe anyị kwesịrị ime n’oge dabara adaba otú ahụ o mere n’oge gara aga.—Emọs 3:7.
20. Olee amụma ndị magburu onwe ha Baịbụl buru anyị ga-ahụ ka ha na-emezu n’oge na-adịghị anya? Gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịna-eme?
20 A ga-eti mkpu, sị: “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!” (1 Tesa. 5:3) Mgbe ahụ, ndị ọchịchị ụwa ga-alụso okpukpe ụgha ọgụ ma bibie ya. (Mkpu. 17:16, 17) Ha ga-abịazi ịlụso ndị Chineke ọgụ. (Ezik. 38:18, 19) Ihe ndị a ga-eme ka agha Amagedọn, bụ́ agha ikpeazụ, bido. (Mkpu. 16:14, 16) Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ndị a ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ma, tupu mgbe ahụ, ka anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya na-emere anyị. Otú anyị ga-esi egosi ya bụ ịna-ege ntị n’amụma ndị dị na Baịbụl, na-enyekwara ndị ọzọ aka ime otú ahụ.
ABỤ NKE 95 Ìhè Na-enwusikwu Ike
a N’agbanyeghị otú ihe si dị njọ n’ụwa, obi kwesịrị isi anyị ike na ọdịnihu ga-aka mma. Ịmụ amụma ndị e dere na Baịbụl ga-eme ka obi sie anyị ike otú a. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ mere anyị kwesịrị iji na-amụ amụma ndị dị na Baịbụl. Anyị ga-elebakwa anya ná nkenke n’amụma abụọ n’ime amụma ndị Daniel dere, hụkwa otú amụma ndị ahụ nwere ike isi abara anyị uru ma anyị ghọta ha.
b Gụọ isiokwu bụ́ “Jehova Na-ekpughe ‘Ihe Ndị Na-aghaghị Ime n’Oge Na-adịghị Anya.’” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Jun 15, 2012, paragraf nke 7 ruo na nke 9.
c Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ ‘Eze Ugwu’ Taa?,” n’Ụlọ Nche Mee 2020, paragraf nke 3 na nke 4.
d Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ ‘Eze Ugwu’ Taa?,” paragraf nke 7 ruo na nke 9, n’Ụlọ Nche Mee 2020.