Ndị Kwe na Ndị Ekweghị A Na-enwe na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Ọ̀ Na-emezu Amụma Baịbụl?
Taa, ndị mmadụ adịghị n’otu n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha anaghị enwe otu olu n’ihe gbasara iwu ndị ọchịchị na-eti banyere ihe ndị mmadụ na-eme kwa ụbọchị. Ndị nke ọ bụla na-esikwa ọnwụ ma ha kwuwe ihe ha chere. Ndị omeiwu na ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị anaghị ekwekọrịta n’ọtụtụ ihe, e nweghịkwa onye na-achọ ịnabata ihe ibe ya kwuru. Ihe a niile na-eme ka e nwee ndị kwe na ndị ekweghị n’ọchịchị, meekwa ka ndị ọchịchị ghara inwe ike ime ihe ndị ha kwesịrị ime.
Ma, nke kachanụ bụ ndị kwe na ndị ekweghị dị n’ọchịchị mba Amerịka na nke Briten. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Baịbụl buru amụma na a ga na-enwe ndị kwe na ndị ekweghị n’ọchịchị mba abụọ a, kwuokwa na ka ha na-enwe ya, ọchịchị Chineke nke dị n’eluigwe ga-abịa gbanwee ụwa anyị a.
Ndị kwe na ndị ekweghị e kwuru na a ga-enwe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị “n’oge ikpeazụ”
Baịbụl buru otu amụma dị ịtụnaya n’akwụkwọ Daniel. N’amụma ahụ, Chineke gosiri Daniel “ihe ga-eme n’oge ikpeazụ.” N’oge Daniel dere amụma ahụ, oge ikpeazụ ahụ ka dị n’ihu, bụ́kwanụ mgbe ọtụtụ ihe ga-agbanwe n’ụwa a.—Daniel 2:28.
Chineke si ná nrọ gosi eze Babịlọn amụma a dị na Baịbụl. Ná nrọ ahụ, eze ahụ hụrụ otu nnukwu ihe e ji ihe dị iche iche kpụọ. Daniel onye amụma mechara kọwaara eze ahụ na ihe niile e ji kpụọ nnukwu ihe ahụ a kpụrụ akpụ, si n’isi ruo n’ụkwụ ya, nọchiri anya ọchịchị dị iche iche ndị ga-achị ụwa a, ma mechaa daa.a E mechaakwa, a ga-ebibi ihe ahụ a kpụrụ akpụ kpamkpam mgbe otu nkume, nke nọchiri anya Alaeze ma ọ bụ ọchịchị Chineke, ga-egwepịa ya.—Daniel 2:36-45.
Dị ka e buru n’amụma ahụ, Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ n’ụwa niile, agaghị enwezi ọchịchị mmadụ. Ọ bụ Alaeze a ka Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere maka ya, sị: “Ka Alaeze gị bịa.”—Matiu 6:10.
Ma oleekwanụ ebe amụma Baịbụl a kwuru na a ga-enwe ndị kwe na ndị ekweghị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa? Ị̀ chọpụtara na ihe e ji kpụọ ala ala ụkwụ ihe ahụ a kpụrụ akpụ bụ “ígwè na ụrọ.” (Daniel 2:33) Ihe abụọ ahụ a gwakọtara dị iche n’ihe e ji kpụọ ebe ndị ọzọ n’ihe ahụ a kpụrụ akpụ, bụ́ ndị a na-agwakọtaghị agwakọta. Ihe a na-egosi na a ga-enwe otu ọchịchị ga-achị ụwa nke ga-adị iche ná ndị ọzọ. Olee otú ọ ga-esi dị iche? Lee otú amụma Daniel si kọwaa ya. Ọ sịrị:
Amụma a gosiri na a ga-enwe ndị kwe na ndị ekweghị ma ọchịchị nke nọchiri anya ala ala ụkwụ ihe ahụ a kpụrụ akpụ chịwa ụwa. Ọchịchị a agaghị esi ike n’ihi ihe ndị ha na-achị ga na-eme.
Otú amụma Daniel si na-emezu taa
Ala ala ụkwụ ihe ahụ a kpụrụ akpụ nọchiri anya ọchịchị ndị na-achị ụwa taa, ya bụ, mba Amerịka na Briten ndị jikọrọ aka na-achị. Olee otú ihe ndị na-eme n’oge anyị a si gosi na ihe a bụ eziokwu?
Ihe e ji kpụọ ala ala ụkwụ ihe ahụ a kpụrụ akpụ bụ “ígwè na ụrọ.” O doro anya na ihe abụọ a ga-eme ka ụkwụ ya ghara isi ike. (Daniel 2:42) Taa, ọchịchị Amerịka na nke Briten anaghị akpacha ike n’ihi na ndị ha na-achị bụ ndị kwe na ndị ekweghị. Dị ka ihe atụ, ná mba abụọ ahụ, ụmụ amaala ha ndị nọ n’òtù dị iche iche anaghị ekwekọrịta. Ndị mmadụ na-emekwa ngagharị iwe na tigbuo zọgbuo ka ha na-azọ ihe ndị ruuru ha. Ndị ọchịchị ndị mmadụ họpụtara anaghị enwekarị otu olu n’okwu dị iche iche. Ọchịchị abụọ a anaghị enwekarị ike ime ihe ha kpebiri ime n’ihi na ndị ha na-achị bụ ndị kwe na ndị ekweghị.
Daniel isi 2 buru amụma ọchịchị ndị ga-achị ụwa
Ka anyị lebakwuo anya n’ihe ihe ụfọdụ e kwuru n’amụma Daniel pụtara na otú ha si emezu taa:
Amụma: “Alaeze ahụ ga-ekewa ekewa. Ma ọ ga-esitụ ike ka ígwè.”—Daniel 2:41.
Ihe ọ pụtara: N’agbanyeghị na e nwere ndị kwe na ndị ekweghị n’ọchịchị Amerịka na Briten n’okwu dị iche iche gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha abụọ ka nwere ndị agha siri ezigbo ike. N’ihi ya, ha na-eji ikike ha akpa ike, otú ahụ ígwè si sie ike.
Otú o si emezu
N’afọ 2023, mgbe a gbakọtara ego ole Amerịka na Briten mefuru n’ihe gbasara ndị agha ha ma gbakọta ego ole niile mba iri na abụọ ọzọ ndị mefuru nnukwu ego mefukwara, a chọpụtara na nke Amerịka na Briten mefuru karịrị nke mba iri na abụọ ndị ahụ.—Nchọpụta a si na Stockholm International Peace Research Institute.
‘E nweghị mba abụọ ọzọ na-emekọ ihe ọnụ iji na-echebe mba ha ma na-agbachitere ha otú Amerịka na Briten si agbakọ aka ọnụ. Anyị na-ejikwa ngwá ọrụ nkà na ụzụ ndị kacha ọhụrụ arụ ọrụ. Anyị na-arụkọ ọrụ ọnụ, anyị na-akwado ibe anyị, anyị na-alụkọ ọgụ onụ.’—Ihe a si na Strategic Command, U.K. Ministry of Defence, Eprel 2024.
Amụma: “Ebe ọ bụ na e ji ígwè na ụrọ kpụọ mkpịsị ụkwụ ya, alaeze ahụ ga-esitụ ike n’ebe ụfọdụ, ma ọ gaghị esi ike n’ebe ụfọdụ.”—Daniel 2:42.
Ihe ọ pụtara: N’agbanyeghị na Amerịka na Briten nwere ndị agha siri ike, ha anaghị enwe ike ime ihe niile ha chọrọ ime n’ihi otú ọchịchị onye kwuo uche ya ha nọ na ya si arụ ọrụ. Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị enweghị otu olu n’okwu ọ bụla, ọ na-esiri ndị ọchịchị ike ime ihe ha chọrọ ime.
Otú o si emezu
“Ụfọdụ ndị ọkachamara n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwuru na ndị kwe na ndị ekweghị e nwere n’ọchịchị Amerịka na-eme ka o siere ndị Amerịka ike ime ihe ha na-agwa mba ndị ọzọ dị n’ụwa na ha ga-emeli, dị ka n’okwu gbasara nchebe ma ọ bụ azụmahịa.”—Ihe a si na “The Wall Street Journal.”
“E nweela ọtụtụ nsogbu gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Briten, bụ́ ihe na-anaghị emebu. Ihe a na-emegharịkwa ndị ọchịchị anya. Ihe a emeela ka ndị ọrụ gọọmenti ghara ime mgbanwe ndị e kwesịrị ime iji nyere ụmụ amaala ha aka.”—Ihe a si na Institute for Government.
Amụma: “Ha [ya bụ, ọchịchị ahụ] na ndị nkịtị ga-agwakọta. Ma ha enweghị ike ijikọta aka dị n’otu.”—Daniel 2:43 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.
Ihe ọ pụtara: N’ọchịchị onye kwuo uche ya, ndị nkịtị nwere ike ikwu ihe ụfọdụ ndị ọchịchị ga-eme. Ma, ihe a anaghị adịcha ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị na-atụnyere ha mma n’obi.
Otú o si emezu
“Taa, ọtụtụ ndị Amerịka anaghị ele ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọchịchị anya ọma.”—Ihe a si na Pew Research Center.
“Taa, ndị Briten atụkwasịghịzi ọchịchị obodo ha na ndị ọchịchị ha obi otú ha tụkwasịrị ha obi afọ iri ise gara aga.”—Ihe a si na “National Centre for Social Research.”
Otú amụma Daniel ga-esi mezuo n’ọdịnihu
Amụma Daniel gosiri na ọ bụ ọchịchị Amerịka na Briten nke jikọrọ aka na-achị ga-abụ ọchịchị na-achị ụwa mgbe Alaeze Chineke ga-abịa kwatuo ọchịchị ụmụ mmadụ niile.—Daniel 2:44.
N’amụma ọzọ kwuru banyere otu oge ahụ, nke e dere n’akwụkwọ Mkpughe, Baịbụl kwuru na “ndị eze niile nọ n’ụwa” ga-agbakọta ka ha lụso Jehovab Chineke ọgụ n’agha Amagedọn, ya bụ, “agha a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpughe 16:14, 16; 19:19-21) N’agha ahụ, Jehova ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ niile. Ihe a ga-emezi ka ọchịchị ụwa ndị nọchịrị anya ihe ahụ a kpụrụ akpụ e kwuru okwu ya n’amụma Daniel gharazie ịdị.
Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Agha Amagedọn?” ka ị matakwuo banyere ya.
Uru ị ga-erite ma ị mata amụma Daniel buru banyere ndị kwe na ndị ekweghị a na-enwe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị
Amụma Baịbụl buru banyere ndị kwe na ndị ekweghị a na-enwe n’ọchịchị Amerịka na Briten bụ eziokwu. Ịma banyere amụma a ga-eme ka i lewe ihe ndị na-eme n’ụwa a anya otú ọzọ.
Ị ga-aghọta ihe mere Jizọs ji chọọ ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịna-etinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa a. (Jọn 17:16) Ị ga-aghọtakwukwa ihe mere Jizọs, bụ́ onye Chineke họpụtara ka ọ chịa n’Alaeze ya, ji kwuo, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.”—Jọn 18:36.
Obi ga-esi gị ike na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-agbanwe ihe niile, meekwa ka a gọzie ndị mmadụ otú Chineke kwere ná nkwa.—Mkpughe 21:3, 4.
Obi ga-esi gị ike na ọdịnihu ga-aka mma. Ị gaghịzikwa na-echegbu onwe gị na nsogbu mba ndị dị iche iche na-enwe ga-ala ụwa anyị a n’iyi.—Abụ Ọma 37:11, 29.
Amụma Daniel gosiri na ọ bụ ọchịchị Amerịka na Briten, bụ́ nke jikọrọ aka na-achị, nke nọchikwara anya ala ala ụkwụ ihe ahụ a kpụrụ akpụ, ga-abụ ọchịchị ụmụ mmadụ nke ikpeazụ ga-achị ụwa. E wepụchaa ya, Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị zuru okè, ga-esi n’eluigwe na-achị ma nọchie ya.
Lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke? ka ị matakwuo ihe Alaeze Chineke ga-emere ndị mmadụ.
a Gụọ igbe bụ́ “Olee Mba Ndị Daniel Buru Amụma Na Ha Ga-achị Ụwa?”
b Jehova bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”