Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 7/15 p. 9-14
  • Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịbịaru Jehova Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịbịaru Jehova Nso
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzube Anyị Ji Eme Nkwusa
  • Òkè Anyị n’Ọrụ Jehova
  • Olee Ndị Jehova Na-adọta?
  • Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ
  • Ọrụ Owuwu Ihe nke Ga-adịgide
  • Iwulite Ịhụnanya n’Ebe Chineke na Kraịst Nọ
  • Ozi Anyị Na-aghaghị Ịkpọsa
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ọrụ Gị Ọ̀ Ga-alanarị Ọkụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Nọrọ Jehova Nso
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Anyị na Chineke Ịrụkọ Ọrụ Na-eme Anyị Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 7/15 p. 9-14

Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịbịaru Jehova Nso

“Ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ́ bụghị site na Mụ.”—JỌN 14:6.

1. Olee iwu Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie nyere ndị na-eso ụzọ ya, gịnịkwa ka Ndịàmà Jehova irube isi na ya rụpụtaworo?

JISỌS KRAỊST nyere ụmụazụ ya iwu ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.’ (Matiu 28:19) N’ime afọ iri gara aga, Ndịàmà Jehova enyeworo ihe karịrị nnọọ nde mmadụ atọ aka ịmara Chineke, ka oge na-aga na-eme ha baptism ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye ya ime uche ya. Lee obi ụtọ anyị nwere inyere ha aka ịbịaru Chineke nso!—Jemes 4:8.

2. Ọ bụ ezie na a na-eme ọtụtụ ndị ọhụrụ baptism, gịnị meworo?

2 Otú ọ dị, n’ala ụfọdụ ebe e meworo ọtụtụ ndị ọhụrụ na-eso ụzọ baptism, e nwebeghị mmụba ya na ya na-agakọ n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze. N’ezie, a ghaghị icheta na e nwere ndị nwụrụ anwụ, ebe ndị na-anwụ kwa afọ dị ihe dị ka 1 pasent. Ma, n’afọ ole na ole ndị gara aga, ọnụ ọgụgụ dịtụ ukwuu adapụwo n’ihi ihe ụfọdụ. N’ihi gịnị? Isiokwu a na nke na-eso ya ga-enyocha otú e si adọta ndị mmadụ n’ebe Jehova nọ na ihe ndị nwere ike ịbụ ihe mere ụfọdụ ji adapụ.

Nzube Anyị Ji Eme Nkwusa

3. (a) Olee otú ọrụ ahụ e nyere ndị na-eso ụzọ Jisọs si dabakọọ na nke mmụọ ozi ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe 14:6? (b) Gịnị ghọworo ụzọ dị irè isi kpalie mmasị ndị mmadụ n’ozi Alaeze ahụ, ma olee nsogbu dịnụ?

3 Na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere ọrụ nke ịgbasa “[ezi, NW] ihe ọmụma” banyere “ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe.” (Daniel 12:4; Matiu 24:14) Ọrụ ha dabakọrọ na nke mmụọ ozi ahụ “na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.” (Mkpughe 14:6) N’ụwa a na-etinyekarị uche n’ihe na-abụghị ihe ime mmụọ, n’ozuzu ya, ụzọ kasị dị irè isi mee ka ndị mmadụ nwee mmasị n’Alaeze Chineke ma nyere ha aka ịbịaru Jehova nso bụ ịgwa ha banyere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Ọ bụ ezie na nke a kwere nghọta, ndị na-eso ndị Chineke na-akpakọrịta nanị maka iji banye na Paradaịs adịghị agbadosi ụkwụ ike n’ụzọ ahụ dị warara nke na-eduba ná ndụ.—Matiu 7:13, 14.

4. Dị ka Jisọs na mmụọ ozi ahụ na-efe n’etiti eluigwe si kwuo, gịnị bụ nzube anyị ji na-arụ ọrụ nkwusa anyị?

4 Jisọs kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Mmụọ ozi ahụ nke na-efe n’etiti eluigwe na-akpọsa “ozi ọma ebighị ebi” ma na-agwa ndị bi n’ụwa, sị: “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto; n’ihi na oge awa nke ikpe Ya abịawo: kpọọkwanụ isiala nye Ya, bụ́ Onye kere eluigwe na ala na oké osimiri na isi iyi nile nke mmiri nile.” (Mkpughe 14:7) Ya mere, nzube bụ́ isi anyị ji ekwusa ozi ọma bụ inyere ndị mmadụ aka ịbịaru Jehova nso site na Kraịst Jisọs.

Òkè Anyị n’Ọrụ Jehova

5. Olee okwu ndị Pọl na Jisọs kwuru na-egosi na anyị na-arụ ọrụ Jehova, ọ bụghị nke anyị?

5 Mgbe ọ na-edegara ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ akwụkwọ, Pọl onyeozi kwuru banyere “ozi nke ime ka a dị n’otu” ma kwuo na Chineke na-eme ka ya na ndị mmadụ dị n’otu ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. Pọl na-asị na ọ dị “ka a ga-asị na Chineke na-arịọ arịrịọ site n’aka anyị,” nakwa na “anyị nọ n’ọnọdụ Kraịst na-arịọ unu, meenụ ka unu na Chineke dị n’otu.” Lee echiche na-enye obi ụtọ ọ bụ! Ma ànyị bụ “ndị ụkọ n’ọnọdụ Kraịst” bụ́ ndị e tere mmanụ ma ọ bụ ndị nnọchiteanya ya nwere olileanya elu ala, anyị ekwesịghị ichezọ ma ọlị na ọrụ a bụ nke Jehova, ọ bụghị nke anyị. (2 Ndị Kọrint 5:18-20) Ọ bụ Chineke n’ezie na-adọta ndị mmadụ ma na-akụziri ndị na-abịakwute Kraịst ihe. Jisọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya: Mụ onwe m ga-emekwa ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ. E dewo ya n’akwụkwọ ndị amụma, sị, Ha nile ga-abụkwa ndị Chineke ziworo ihe. Onye ọ bụla nke nụworo site n’ọnụ Nna m, nke mụtawokwara ihe, ọ na-abịakwute m.”—Jọn 6:44, 45.

6. Olee otú Jehova si buru ụzọ na-emegodị ka mba nile mee mkpọtụ, n’otu oge ahụ kwa, olee ndị na-achọta nchebe ‘n’ụlọ’ ofufe ya?

6 Na mgbe ikpeazụ ndị a, olee otú Jehova si adọta ndị mmadụ ma na-emeghere ha “ọnụ ụzọ okwukwe”? (Ọrụ 14:27; 2 Timoti 3:1) Otu ụzọ bụ́ isi bụ site n’ime ka Ndịàmà ya na-akpọsa ozi nzọpụta na nke ikpe ya megide ajọ usoro ihe a. (Aịsaịa 43:12; 61:1, 2) Mkpọsa a zuru ụwa ọnụ na-eme ka mba nile na-ama jijiji—ihe na-egosi ikpe mbibi nke ga-abịa n’isi nso. N’otu oge ahụ, a na-adọpụta ndị “dị oké ọnụ ahịa” n’anya Chineke n’usoro ihe a, ha na-achọtakwa nchebe ‘n’ụlọ’ ya nke ezi ofufe. Jehova si otú a na-emezu okwu amụma ya nke Hagaị dekọrọ: “M ga-emekwa ka mba nile mee mkpọtụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube.”—Hagaị 2:6, 7, nkọwa ala ala peji nke NW; Mkpughe 7:9, 15.

7. Olee otú Jehova si emeghe obi ndị mmadụ ma na-adọta ndị mmadụ n’ebe ya onwe ya na Ọkpara ya nọ?

7 Jehova na-emeghe obi nke ndị a na-atụ egwu Chineke—“ihe ndị kasị mma nke mba nile”—ka ha wee ‘ṅaa ntị n’ihe nile Ndịàmà ya na-ekwu.’ (Hagaị 2:7, Jewish Publication Society; Ọrụ 16:14) Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, mgbe ụfọdụ Jehova na-eji ndị mmụọ ozi ya eduru Ndịàmà ya aga n’ebe ndị nwere obi eziokwu nọ, bụ́ ndị kpọkuworo ya maka enyemaka. (Ọrụ 8:26-31) Ka ndị mmadụ na-amụta banyere ndokwa ndị dị ebube Chineke mewooro ha site n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ịhụnanya Jehova na-adọta ha n’ebe Ọ nọ. (1 Jọn 4:9, 10) Ee, Chineke na-adọta ndị mmadụ n’ebe ya onwe ya na Ọkpara ya nọ site ‘n’ebere,’ ma ọ bụ “ịhụnanya na-eguzosi ike” Ya.—Jeremaịa 31:3, nkọwa ala ala peji nke NW.

Olee Ndị Jehova Na-adọta?

8. Ụdị ndị dị aṅaa ka Jehova na-adọta?

8 Jehova na-adọta ndị na-achọ Ya n’ebe ya onwe ya na Ọkpara ya nọ. (Ọrụ 17:27) Ndị a gụnyere ndị “na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme” na Krisendọm nakwa, n’ezie, n’ụwa nile. (Ezikiel 9:4) Ha “maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3, NW) N’ezie, ha bụ “ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa,” bụ́ ndị ga-ebi n’ụwa paradaịs ruo mgbe ebighị ebi.—Zefanaịa 2:3.

9. Olee otú Jehova pụrụ isi hụ ma ndị mmadụ hà bụ “ndị e doro ịnata ndụ ebighị ebi,” oleekwa otú o si adọta ha?

9 Jehova pụrụ ịhụ ihe dị n’obi mmadụ. Eze Devid gwara nwa ya bụ́ Solomọn, sị: “Mkpụrụ obi nile ka Jehova na-enyocha, Ọ na-aghọtakwa nchepụta nile ọ bụla nke echiche: ọ bụrụ na ị chọọ Ya, Ọ ga-eme ka ị chọta Ya.” (1 Ihe E Mere 28:9) Ná ndabere nke ọnọdụ obi na mmụọ nke mmadụ, ma ọ bụ omume ọ na-emekarị, Jehova pụrụ ịhụ ma onye ahụ ò nwere ike ịnabata ndokwa Chineke mere maka mgbaghara mmehie na olileanya nke ndụ ebighị ebi n’usoro ihe ọhụrụ ezi omume nke Chineke. (2 Pita 3:13) Site n’Okwu ya, nke Ndịàmà ya na-ekwusa ma na-akụzi, Jehova na-adọtara onwe ya na Ọkpara ya “ka ha hà, bụ́ ndị e doro ịnata ndụ ebighị ebi,” ndị a kwa “wee kwere na Jisọs.”—Ọrụ 13:48.

10. Gịnị na-egosi na Jehova ịdọta ndị ụfọdụ ma hapụ ndị ọzọ enweghị ihe jikọrọ ya na akara aka?

10 Jehova ịdọta ụfọdụ ma hapụ ndị ọzọ ọ̀ gụnyere ụdị nke akara aka? Ọ dịghị ma ọlị! Ndọta Chineke na-adọta ndị mmadụ na-adabere n’ọchịchọ ha. Ọ na-akwanyere nnwere onwe ha nwere ime nhọrọ ùgwù. Jehova na-esetịpụrụ ndị bi n’ụwa taa otu nhọrọ ahụ o setịpụụrụ ụmụ Israel n’ihe karịrị afọ 3,000 gara aga, mgbe Mosis sịrị: “Etinyewo m n’ihu gị taa ndụ na ezi ihe, na ọnwụ na ihe ọjọọ; . . . Emewo m ka eluigwe na ala gbaa àmà megide unu taa, na ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị: ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị n’olu Ya, na ịrapara n’ahụ Ya: n’ihi na Ya onwe ya bụ ndụ gị, na ogologo nke ụbọchị gị.”—Deuterọnọmi 30:15-20.

11. Olee otú ụmụ Israel ga-esi họrọ ndụ?

11 Rịba ama na ụmụ Israel ga-ahọrọ ndụ site ‘n’ịhụ Jehova, n’anya, na ige nti olu Ya, na ịrapara n’ahụ Ya.’ Mgbe e kwuru okwu ndị ahụ, ndị Israel ewegharabeghị Ala Nkwa ahụ. Ha nọ n’Ọzara Moab, na-ejikere ịgafe Osimiri Jọdan wee banye Kenean. Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị na uche ha ga-adịkwasị n’ala ahụ “dị mma nke sakwara mbara” nke “mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya” bụ́ nke ha ga-enweta n’oge na-adịghị anya, inweta ihe ha chọrọ dabeere na ha ịhụ Jehova n’anya, ha ịṅa ntị n’olu ya, na ha ịrapara n’ahụ ya. (Ọpụpụ 3:8) Mosis mere ka nke a doo anya, na-asị: “N’ihi na mụ onwe m na-enye gị iwu taa ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ije ije n’ụzọ Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n’iwu, na ụkpụrụ Ya nile, na ikpe Ya nile, ka i wee dị ndụ, baakwa ụba, ka Jehova, bụ́ Chineke gị, wee gọziekwa gị n’ala ahụ ebe gị onwe gị na-aba inweta ya.”—Deuterọnọmi 30:16.

12. Gịnị ka ihe atụ nke ụmụ Israel kwesịrị ịkụziri anyị banyere ọrụ nkwusa na izi ihe anyị?

12 Ihe ndị ahụ a tụleworo ó kwesịghị ịkụziri anyị ihe n’ihe banyere ọrụ nkwusa na izi ihe anyị na mgbe ikpeazụ a? Anyị na-eche banyere ụwa Paradaịs nke na-abịanụ ma na-ekwu banyere ya n’ozi anyị. Ma anyị ma ndị na-eso ụzọ anyị na-eme agaghị ahụ mmezu nke nkwa ahụ ma ọ bụrụ na anyị ma ọ bụ ha onwe ha ana-ejere Chineke ozi n’ihi ọdịmma onwe onye nanị. Dị ka ụmụ Israel, anyị na ndị ahụ anyị na-ezi ihe aghaghị ịmụta ‘ịhụ Jehova n’anya, ige ntị n’olu Ya, na ịrapara n’ahụ Ya.’ Ọ bụrụ na anyị echeta nke a mgbe anyị na-eje ozi anyị, anyị na Chineke ga na-arụkọ ọrụ n’ezie n’ịdọta ndị mmadụ n’ebe ọ nọ.

Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ

13, 14. (a) Dị ka 1 Ndị Kọrint 3:5-9 si kwuo, olee otú anyị si aghọ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ? (b) Ònye ka otuto maka mmụba ọ bụla na-aghaghị ịgara, n’ihi gịnịkwa?

13 Pọl mere ihe atụ nke iso Chineke arụkọ ọrụ site n’izo aka n’ịkọ ubi. O dere, sị: “Gịnịkwa bụ Apọlọs? gịnị bụkwa Pọl? Ndị na-eje ozi, ndị unu si n’aka ha kwere; dị ka Onyenwe anyị nyekwara ha abụọ n’otu n’otu. Mụ onwe m kụrụ osisi, Apọlọs kwọsara ya mmiri; ma ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba. Ya mere onye na-akụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-akwọsa mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla; kama Chineke, Onye na-eme ka ọ na-aba ụba, bụ ihe nile. Ma onye na-akụ na onye na-akwọsa mmiri bụ otu: ma ha abụọ n’otu n’otu ga-anata ụgwọ ọrụ nke aka ha, onye ọ bụla dị ka ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ si dị. N’ihi na anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ: unu bụ ubi Chineke.”—1 Ndị Kọrint 3:5-9.

14 Dị ka ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ, anyị aghaghị iji ikwesị ntụkwasị obi na-akụ “okwu alaeze” ahụ n’obi ndị mmadụ, ma kwọsazie mmasị ọ bụla e gosiri mmiri site ná nletaghachi na ọmụma Bible ndị a kwadebere nke ọma. Ọ bụrụ na ala ahụ, bụ́ obi, adị mma, Jehova ga-eme òkè nke ya site n’ime ka mkpụrụ nke eziokwu Bible ahụ topụta ghọọ osisi na-amị mkpụrụ. (Matiu 13:19, 23) Ọ ga-adọta onye ahụ n’ebe ya onwe ya na Ọkpara ya nọ. Mgbe ahụ, n’ikpeazụ, mmụba ọ bụla e nwere n’ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa Alaeze bụ n’ihi ọrụ Jehova rụrụ n’obi ndị mmadụ, na-eme ka mkpụrụ eziokwu ahụ too ma na-adọta ndị dị otú ahụ n’ebe ya onwe ya na Ọkpara ya nọ.

Ọrụ Owuwu Ihe nke Ga-adịgide

15. Olee ihe atụ Pọl ji gosi otú anyị si enyere ndị ọzọ aka iwulite okwukwe?

15 Ka anyị na-aṅụrị ná mmụba ahụ, anyị ji obi eziokwu na-achọ ịhụ ka ndị mmadụ nọgidere na-ahụ Jehova n’anya, na-ege ntị n’olu ya, ma na-arapara n’ahụ ya. Ọ na-ewute anyị mgbe anyị hụrụ ụfọdụ ka ha dara mbà ma dapụ. Ọ̀ dị ihe anyị pụrụ ime iji gbochie nke a? N’ihe atụ ọzọ, Pọl na-egosi otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka iwulite okwukwe. Ọ na-ede, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịtọ ntọala ọzọ ma ọ bụghị Nke a tọworo, Nke bụ́ Jisọs Kraịst. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ewukwasị ọlaedo, ọlaọcha, nkume dị oké ọnụ, osisi, ahịhịa, okporo ọka, n’elu ntọala ahụ; a ga-eme ka ọrụ nke mmadụ nile n’otu n’otu pụta ìhè: n’ihi na ụbọchị ahụ ga-egosi ya, n’ihi na a gaje ikpughe ya n’ọkụ; ọkụ onwe ya ga-anwakwa ọrụ mmadụ nile n’otu n’otu, aha ọrụ ọ bụ.”—1 Ndị Kọrint 3:11-13.

16. (a) Olee otú ihe atụ abụọ ahụ Pọl ji mee ihe si dịrịta iche ná nzube ha? (b) Olee otú ọrụ iwu ihe anyị pụrụ isi bụrụ nke na-adịghị enye afọ ojuju na nke na-agaghị eguzogideli ọkụ?

16 N’ihe atụ Pọl ji ubi mee, uto na-adabere n’iji nlezianya na-agha mkpụrụ, ịkwọsa ya mmiri mgbe nile, nakwa ná ngọzi Chineke. Ihe atụ ọzọ nke onyeozi ahụ na-eme ka ibu ọrụ onye Kraịst bụ́ onye ozi nwere maka ihe ọrụ owuwu ihe ya ga-aghọ pụta ìhè. Ò jiriwo ihe ndị dị mma wukwasị na ntọala siri ike? Pọl na-adọ aka ná ntị, sị: “Ka onye ọ bụla lezie anya otú ọ na-ewu ụlọ n’elu ya.” (1 Ndị Kọrint 3:10) Mgbe anyị kpalisịrị mmasị mmadụ site n’ịgwa ya banyere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs, ànyị na-eme ka ihe anyị na-akụzi hiwe isi nanị n’ihe ndị bụ́ isi nke ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ ma na-ekwusizi nnọọ okwu ike n’ihe onye ahụ na-aghaghị ime iji nweta ndụ ebighị ebi? Ozizi anyị ọ̀ pụrụ ịbụ nanị nke a: ‘Ọ bụrụ na ị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs, ị ghaghị ịmụ ihe, ịga nzukọ, na ikere òkè n’ọrụ nkwusa’? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị adịghị ewukwasị okwukwe onye ahụ na ntọala siri ike, ihe anyị na-ewukwa nwere ike ọ gaghị anagideli ọkụ nke ule ma ọ bụ dịtee anya. Ịgbalị ịdọta ndị mmadụ n’ebe Jehova nọ nanị site n’olileanya nke ndụ n’ime Paradaịs dị ka ụgwọ ọrụ maka afọ ole na ole nke e ji jeere ya ozi, yiri iji “osisi, ahịhịa, okporo ọka” na-ewu ụlọ.

Iwulite Ịhụnanya n’Ebe Chineke na Kraịst Nọ

17, 18. (a) Gịnị dị oké mkpa ma ọ bụrụ na okwukwe mmadụ ga-adịgide? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nyere mmadụ aka ime ka Kraịst biri n’obi ya?

17 Ka okwukwe wee dịgide, ọ ghaghị ịdabere ná mmekọrịta onwe onye n’ebe Jehova Chineke nọ site na Jisọs Kraịst. Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị na Chineke pụrụ inwe mmekọrịta udo dị otú ahụ nanị site n’aka Ọkpara ya. (Ndị Rom 5:10) Cheta na Jisọs sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ́ bụghị site na Mụ.” Iji nyere ndị ọzọ aka iwulite okwukwe, “ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịtọ ntọala ọzọ ma ọ bụghị Nke a tọworo, Nke bụ́ Jisọs Kraịst.” Gịnị ka nke a na-agụnye?—Jọn 14:6; 1 Ndị Kọrint 3:11.

18 Iwukwasị ụlọ n’elu Kraịst dị ka ntọala pụtara ịkụzi ihe n’ụzọ nke na onye ahụ a na-amụrụ Bible ga-azụlite ịhụnanya miri emi n’ebe Jisọs nọ site ná mmazu nke ọrụ Ya dị ka Onye Mgbapụta, Isi nke ọgbakọ, Onyeisi Nchụàjà na-ahụ n’anya, na Eze na-achị achị. (Daniel 7:13, 14; Matiu 20:28; Ndị Kọlọsi 1:18-20; Ndị Hibru 4:14-16) Ọ pụtara ime ka Jisọs dị adị n’ezie nye ha nke na ọ ga-afọ nke nta ka o biri ebiri n’ime obi ha. Ekpere anyị na-ekpe n’isi ha kwesịrị ịdị ka arịrịọ Pọl rịọrọ n’isi ndị Kraịst nọ n’Efesọs. O dere, sị: “M [na-egbudo] ikpere m abụọ n’ala nye Nna anyị, . . . ka O wee nye unu . . . ka Kraịst wee site n’okwukwe unu bigide n’ime obi unu; ka unu, ebe unu gbagideworo mkpọrọgwụ n’ime ịhụnanya bụrụkwa ndị a tọworo ntọala n’ime ya.”—Ndị Efesọs 3:14-17.

19. Gịnị ka iwulite ịhụnanya n’ebe Kraịst nọ n’obi ndị anyị na-amụrụ Bible kwesịrị ịrụpụta, ma gịnị ka a na-aghaghị ịkụzi?

19 Ọ bụrụ na anyị ewuo ihe n’ụzọ nke na ịhụnanya n’ebe Kraịst nọ na-etolite n’obi nke ndị anyị na-amụrụ ihe, ihe ezi uche dị na ya ọ ga-arụpụta bụ iwulite ịhụnanya n’ebe Jehova Chineke nọ. Ịhụnanya, mmetụta, na ọmịiko Jisọs bụ ezigbo ngosipụta nke àgwà Jehova. (Matiu 11:28-30; Mak 6:30-34; Jọn 15:13, 14; Ndị Kọlọsi 1:15; Ndị Hibru 1:3) Ya mere ka ndị mmadụ na-amara ma na-ahụ Jisọs n’anya, ha ga-abịa mara ma hụ Jehova n’anya.a (1 Jọn 4:14, 16, 19) Ọ dị anyị mkpa ịkụziri ndị anyị na-amụrụ Bible na ọ bụ Jehova mere ka Kraịst mee ihe nile o meere ihe a kpọrọ mmadụ, n’ihi ya kwa na anyị ji Ya ụgwọ ekele, otuto, na ofufe dị ka “Chineke Nke bụ́ nzọpụta anyị.”—Abụ Ọma 68:19, 20; Aịsaịa 12:2-5; Jọn 3:16; 5:19.

20. (a) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị mmadụ aka ịbịaru Chineke na Ọkpara ya nso? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Dị ka ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ, ka anyị nyere ndị mmadụ aka ịbịaru ya na Ọkpara ya nso, na-enyere ha aka ịzụlite ịhụnanya na okwukwe n’obi ha. Jehova ga-esi otú ahụ ghọọ onye dị adị n’ezie nye ha. (Jọn 7:28) Site na Kraịst, ha ga-enwe ike isoro Chineke nwee mmekọrịta chiri anya, ha ga-ahụkwa ya n’anya ma rapara n’ahụ ya. Ha agaghị esetịpụ oge ha ga-akwụsị ozi ịhụnanya ha, na-enwe okwukwe na nkwa ndị dị ebube nke Jehova ga-emezu n’oge ya. (Abụ Ákwá 3:24-26; Ndị Hibru 11:6) Otú ọ dị, ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka iwulite okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, anyị aghaghị iwulite okwukwe nke anyị ka o wee yie ụgbọ mmiri siri ike nke pụrụ iguzogide oké ifufe kpụ ọkụ n’ọnụ nke mmegide. A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ihe magburu onwe ya na-enye aka ịmara Jisọs nke ọma karị, sitekwa n’ebe ọ nọ mara Nna ya, bụ́ Jehova, bụ akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Ná Ntụleghachi

◻ Olee otú anyị na-esikarị akpali mmasị ndị mmadụ n’ozi Alaeze ahụ, ma olee ihe ize ndụ dịnụ?

◻ Ụdị ndị dị aṅaa ka Jehova na-adọtara onwe ya na Ọkpara ya?

◻ Na gịnị ka ndị Israel ịbanye n’Ala Nkwa ahụ dabeere, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?

◻ Olee òkè anyị na-ekere n’inyere ndị mmadụ aka ịbịaru Jehova na Ọkpara ya nso?

[Foto dị na peeji nke 10]

Ọ bụ ezie na anyị na-eme ka olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs ruoro ndị mmadụ, nzube anyị bụ́ isi bụ ịdọta ha n’ebe Jehova nọ

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Nletaghachi anyị pụrụ ịdị nnọọ irè ma ọ bụrụ na anyị akwadebe nke ọma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya