Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/1 p. 8-13
  • Ọrụ Gị Ọ̀ Ga-alanarị Ọkụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ Gị Ọ̀ Ga-alanarị Ọkụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịtọ Ezi Ntọala
  • Iji Ezi Ngwá Ọrụ Na-ewu Ụlọ
  • Ọrụ Gị Ọ̀ Ga-alanarị Ọkụ?
  • Ònye Ka Ụta Dịrị?
  • Iwulite Ọdịdị Ndị Kraịst n’Ime Ụmụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịbịaru Jehova Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Nọgidenụ Na-arụpụta Nzọpụta nke Onwe Unu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/1 p. 8-13

Ọrụ Gị Ọ̀ Ga-alanarị Ọkụ?

“Ka onye ọ bụla lezie anya otú ọ na-ewu ụlọ n’elu [ntọala ahụ].”—1 NDỊ KỌRINT 3:10.

1. Olileanya dị aṅaa ka ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na-enwe banyere ndị gaje ịbụ ndị na-eso ụzọ?

DI NA nwunye bụ́ ndị Kraịst elee nwa ọhụrụ ha anya. Onye nkwusa Alaeze ahụ ngosipụta nke inwe oké mmasị n’ihu onye ọ na-amụrụ Bible. Onye Kraịst bụ́ onye okenye nọ n’elu ikpo okwu na-akụzi ihe ahụ otu onye ọhụrụ nwere mmasị ka o ji ịdị uchu na-asapeta akụkụ akwụkwọ nsọ n’ime Bible ya. Ndị ohu Jehova a kwesịrị ntụkwasị obi nwere obi ndị jupụtara n’olileanya. Ha aghaghị iche, sị, ‘Onye a ọ̀ ga-ahụ Jehova n’anya ma jeere ya ozi—ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi?’ N’ezie, ihe dị otú ahụ adịghị adapụta n’onwe ha. Ọ chọrọ ọrụ.

2. Olee otú Pọl onyeozi si chetara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst banyere ịdị mkpa nke ọrụ ịkụzi ihe ahụ, nnyocha onwe onye dịkwa aṅaa ka nke a pụrụ ịkpali anyị ime?

2 Onye ozizi bụ́ ọkpọka n’onwe ya, bụ́ Pọl onyeozi mesiri ịdị mkpa nke ọrụ nkụzi na ime ndị na-eso ụzọ ike mgbe o dere, sị: “Unu kwesịrị ịbụ ndị ozizi n’ihi oge.” (Ndị Hibru 5:12) Ndị Kraịst ahụ ọ gwara okwu enwewo ọganihu dị nta, n’iburu n’uche ogologo oge ha bụworo ndị kwere ekwe. Ọ bụghị nanị na ha adịghị njikere izi ndị ọzọ ihe, ọ dị mkpa ka e chetaara ha akụkụ ndị gbara ọkpụrụkpụ nke eziokwu ahụ. Taa, anyị nile ga-eme nke ọma site n’oge ruo n’oge inyocha ikike anyị dị ka ndị ozizi ma hụ ụzọ anyị pụrụ isi mee ka ha ka mma. O metụtara ndụ. Gịnị ka anyị pụrụ ime?

3. (a) Gịnị ka Pọl onyeozi ji tụnyere usoro nke ime onye na-eso ụzọ ndị Kraịst? (b) Dị ka ndị Kraịst na-ewu ụlọ, olee oké ihe ùgwù anyị nwere?

3 N’ihe atụ gbasapụrụ agbasapụ, Pọl ji ime ndị na-eso ụzọ tụnyere usoro iwu ụlọ. Ọ malitere site n’ikwu, sị: “Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ. Unu bụ ubi Chineke, bụrụkwa ụlọ Chineke na-ewu.” (1 Ndị Kọrint 3:9) Ya mere anyị na-ekere òkè n’ọrụ iwu ụlọ nke metụtara ndị mmadụ; anyị na-enye aka iwu ha ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Anyị na-eme otú ahụ dị ka ndị ha na Onye ahụ “rụrụ ihe nile,” na-arụkọ ọrụ. (Ndị Hibru 3:4) Lee ihe ùgwù ọ bụ! Ka anyị hụ otú ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke Pọl nyere ndị Kọrint pụrụ isi nyere anyị aka ịghọ ndị nwekwuru nkà n’ọrụ anyị. Anyị ga-elekwasị anya karịsịa ná “nkà izi ihe” anyị.—2 Timoti 4:2, NW.

Ịtọ Ezi Ntọala

4. (a) Gịnị bụ ọrụ Pọl n’ọrụ ndị Kraịst nke iwu ụlọ? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ma Jisọs ma ndị na-ege ya ntị maara ịdị mkpa nke ezi ntọala?

4 Ọ bụrụ na ụlọ ga-abụ nke ga-akwụrụ chịm ma dịtee anya, ọ chọrọ ezi ntọala. N’ihi ya, Pọl dere, sị: “Dị ka amara Chineke nke e nyere m si dị, dị ka onyeisi ọkà nke maara ihe, atọrọ m ntọala.” (1 Ndị Kọrint 3:10) N’iji ihe atụ yiri nke ahụ mee ihe, Jisọs Kraịst kọrọ banyere ụlọ nke lanarịrị oké ifufe n’ihi na onye wuru ya ahọrọwo ntọala siri ike. (Luk 6:47-49) Jisọs maara ihe nile banyere ịdị mkpa nke ntọala. Ọ nọ ya mgbe Jehova tọrọ ntọala ụwa.a (Ilu 8:29-31) Ndị na-ege Jisọs ntị jikwa ezi ntọala kpọrọ ihe. Nanị ụlọ ndị a tọrọ ntọala ha nke ọma pụrụ iguzogide idei mmiri na ala ọma jijiji ndị na-eme mgbe ụfọdụ na Palestine. Otú ọ dị, gịnị bụ ntọala Pọl bu n’uche?

5. Ònye bụ ntọala nke ọgbakọ ndị Kraịst, oleekwa otú e si buo nke a n’amụma?

5 Pọl dere, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịtọ ntọala ọzọ ma ọ bụghị Nke a tọworo, Nke bụ́ Jisọs Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 3:11) Nke a abụghị nke mbụ e jiworo Jisọs tụnyere ntọala. N’ezie, Aịsaịa 28:16 buru amụma, sị: “Otú a ka Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, sịrị, Lee, abụ m onye tọworo ntọala na Zaịọn, bụ́ otu nkume, nkume nke ọnwụnwa, nkume nkuku dị oké ọnụ ahịa nke bụ́ ntọala siri ike.” Jehova ezubewo eri oge na Ọkpara ya ga-aghọ ntọala nke ọgbakọ ndị Kraịst.—Abụ Ọma 118:22; Ndị Efesọs 2:19-22; 1 Pita 2:4-6.

6. Olee otú Pọl si tọọ ntọala kwesịrị ekwesị n’ime ndị Kọrint bụ́ ndị Kraịst?

6 Gịnị bụ ntọala ndị Kraịst n’otu n’otu? Dị ka Pọl si kwuo, ezi onye Kraịst enweghị ntọala ma ọ bụghị nke ahụ a tọrọ n’Okwu Chineke—Jisọs Kraịst. Pọl tọrọ ntọala dị otú ahụ n’ezie. Na Kọrint, ebe e jiri nkà ihe ọmụma kpọrọ oké ihe, ọ nwaghị iji amamihe nke ụwa dọrọ mmasị ndị mmadụ. Kama, Pọl kwusara “Kraịst, na a [kpọgburu, NW] ya,” bụ́ nke ndị mba ọzọ weere dị ka “ihe nzuzu.” (1 Ndị Kọrint 1:23) Pọl kụziri na Jisọs bụ isi sekpụ ntị ná nzube Jehova.—2 Ndị Kọrint 1:20; Ndị Kọlọsi 2:2, 3.

7. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’aka Pọl zoro onwe ya dị ka “onyeisi ọkà nke maara ihe”?

7 Pọl kwuru na ya ziri ozizi dị otú ahụ “dị ka onyeisi ọkà nke maara ihe.” Okwu a abụghị ito onwe onye. Ọ bụ nanị nnakwere nke onyinye dị ebube Jehova nyeworo ya—nke ịhazi na ịtụzi ọrụ. (1 Ndị Kọrint 12:28) N’eziokwu, anyị onwe anyị taa enweghị onyinye ọrụ ebube ahụ e nyere ndị Kraịst narị afọ mbụ. Anyị nwekwara ike ghara iche banyere onwe anyị dị ka ndị nwere onyinye izi ihe. Ma n’echiche dị mkpa, anyị bụ. Tụlee: Jehova na-enye anyị mmụọ nsọ ya inyere anyị aka. (Tụlee Luk 12:11, 12.) Anyị nwekwara ịhụnanya Jehova na ihe ọmụma banyere ozizi ndị gbara ọkpụrụkpụ nke Okwu ya. Ndị a bụ n’ezie onyinye ndị dị ebube a ga-eji akụziri ndị ọzọ ihe. Ka anyị kpebisie ike iji ha tọọ ntọala kwesịrị ekwesị.

8. Olee otú anyị si atọ Kraịst dị ka ntọala n’ime ndị gaje ịbụ ndị na-eso ụzọ?

8 Mgbe anyị tọrọ Kraịst dị ka ntọala, anyị adịghị ele ya anya dị ka nwa ọhụrụ na-anọghị na nchebe nke dina n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ, ma ọ bụ dị ka onye ya na Jehova hà nhata n’Atọ n’Ime Otu. Ee e, echiche ndị dị otú ahụ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị bụ ntọala nke ndị Kraịst adịgboroja. Kama nke ahụ, anyị na-ezi na ọ bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ, na ọ tọgbọrọ ndụ ya zuru okè n’ihi anyị, nakwa na ọ bụ Eze Jehova họpụtara na-achị achị n’eluigwe taa. (Ndị Rom 5:8; Mkpughe 11:15) Anyị na-agbalịkwa ịkwali ndị anyị na-amụrụ ihe ije ije ná nzọụkwụ Jisọs na iṅomi àgwà ya. (1 Pita 2:21) Anyị chọrọ ka ha bụrụ ndị ịnụ ọkụ n’obi Jisọs maka ozi ahụ, ọmịiko ya n’ebe ndị e wedara n’ala na ndị a na-emegbu emegbu nọ, ebere ya n’ebe ndị mmehie bụ́ ndị obi amamikpe ha gwepịara nọ, obi ike ya na-adịghị ada ada n’agbanyeghị ọnwụnwa, ga-akpali. N’eziokwu, Jisọs bụ ntọala dị ebube. Ma gịnị na-esochi?

Iji Ezi Ngwá Ọrụ Na-ewu Ụlọ

9. Ọ bụ ezie na Pọl bụ onye na-atọ ntọala n’ụzọ bụ́ isi, nchegbu dị aṅaa ka o nwere banyere ndị ahụ nakweere eziokwu nke ihe ọ kụziri?

9 Pọl dere, sị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ewukwasị ọlaedo, ọlaọcha, nkume dị oké ọnụ, osisi, ahịhịa, okporo ọka, n’elu ntọala ahụ; a ga-eme ka ọrụ nke mmadụ nile n’otu n’otu pụta ìhè: n’ihi na ụbọchị ahụ ga-egosi ya, n’ihi na a gaje ikpughe ya n’ọkụ; ọkụ onwe ya ga-anwakwa ọrụ mmadụ nile n’otu n’otu, aha ọrụ ọ bụ.” (1 Ndị Kọrint 3:12, 13) Gịnị ka Pọl bu n’uche? Tụlee ọnọdụ ahụ. Pọl bụ n’ụzọ bụ́ isi onye na-atọ ntọala. Ná njem ozi ala ọzọ ya, o mere njem site n’obodo gaa n’obodo, na-eme nkwusa nye ọtụtụ ndị na-anụtụbeghị banyere Kraịst. (Ndị Rom 15:20) Ka ndị mmadụ nakweere eziokwu nke ọ kụziri, e guzobere ọgbakọ dị iche iche. Pọl chegburu onwe ya nke ukwuu banyere ndị a kwesịrị ntụkwasị obi. (2 Ndị Kọrint 11:28, 29) Otú ọ dị, ọrụ ya chọrọ ya ka ọ nọgide na-eme njem. Ya mere mgbe o jisịrị ọnwa 18 tọọ ntọala na Kọrint, ọ gara ije mee nkwusa n’obodo ndị ọzọ. Ma, o nwere mmasị dị ukwuu n’otú ndị ọzọ si wulite ọrụ ọ rụworo n’ebe ahụ.—Ọrụ 18:8-11; 1 Ndị Kọrint 3:6.

10, 11. (a) Olee otú Pọl si gosi ọdịiche dị n’etiti ngwá ọrụ dị iche iche e ji ewu ụlọ? (b) Ụlọ nkịtị ndị dịgasị aṅaa pụrụ ịdịworị na Kọrint oge ochie? (ch) Ụlọ ndị dịgasị aṅaa yikarịrị ka ha ga-alanarị ọkụ, ihe mmụta bara uru dịkwa aṅaa ka nke ahụ na-enye ndị Kraịst na-eme ndị na-eso ụzọ?

10 O yiri ka ụfọdụ ndị nọ na-ewu ihe ná ntọala nke Pọl tọrọ na Kọrint na-arụ ọrụ na-erijughị afọ. Iji gbaa nsogbu ahụ n’anwụ, Pọl gosiri ọdịiche dị n’etiti ụdị ngwá ọrụ abụọ e ji ewu ụlọ: ọlaedo, ọlaọcha, na nkume dị oké ọnụ ahịa n’otu akụkụ; osisi, ahịhịa, na okporo ọka n’akụkụ nke ọzọ. A pụrụ iji ngwá ọrụ ndị mara mma, na-adịte anya, ọkụ na-apụghị ịgba, wulite ụlọ; ma ọ bụ a pụrụ iji ọkụ ọkụ wuo ụlọ na-eji ngwá ọrụ ndị na-emebi emebi, na-adịghị adịte anya, ma na-ere ọkụ. Obi abụọ adịghị ya na obodo ukwu dị ka Kọrint nwere ụdị ụlọ abụọ ahụ n’ụba. E nwere ụlọ nsọ ndị buru ibu e ji nnukwute nkume ndị dị oké ọnụ wuo, ikekwe bụrụ ndị e ji ọlaedo na ọlaọcha tee ma ọ bụ chọọ mma n’akụkụ ha ụfọdụ.b Ma eleghị anya nnukwu ụlọ ndị a na-adịte anya togopụtara nnọọ karịa ụlọ nta, mkpọmkpọ ebe obibi, na ụlọ ahịa ndị dị ha nso, bụ́ ndị e ji osisi ndị a na-akpụchaghị akpụcha mee ma were okporo ọka tụọ akịrịka ha.

11 Gịnị ga-eme ụlọ ndị a ma ọ bụrụ na ọkụ agbaa ha? Azịza ya doro nnọọ anya n’ụbọchị Pọl dị ka ọ dị n’ụbọchị anyị. N’ezie, Ọchịagha ndị Rom bụ́ Mummius emeriwo obodo Kọrint, suokwa ya ọkụ laarị azụ na 146 T.O.A. N’ezie e bibiwo ọtụtụ ihe e ji osisi, ahịhịa, ma ọ bụ okporo ọka wuo kpam kpam. Gịnị banyere ụlọ ndị siri ike e ji nkume wuo, ndị e ji ọlaọcha na ọlaedo chọọ mma? Obi abụọ adịghị ya na ndị a agbaghị ọkụ. Ndị Pọl na-amụrụ ihe nọ na Kọrint pụrụ ịgafewo ụlọ ndị dị otú ahụ kwa ụbọchị—ọmarịcha ụlọ nkume ndị lanarịrị ọdachi ndị kwatuworo ụlọ ndị na-adịghị adịte anya dị ha n’akụkụ. Leenụ ụzọ Pọl si mee ka ihe ọ na-ekwu pụta ìhè! Mgbe anyị na-akụzi ihe, ọ dị anyị mkpa iwere onwe anyị dị ka ndị na-ewu ụlọ. Anyị kwesịrị iji ngwá ọrụ ndị kasị mma, kasị adịte anya dị ka o kwere mee, na-arụ ọrụ. N’ụzọ dị otú ahụ o yikarịrị ka ọrụ anyị ọ ga-adịte anya. Gịnị bụ́ ngwá ọrụ ndị ahụ na-adịte anya, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa iji ha rụọ ọrụ?

Ọrụ Gị Ọ̀ Ga-alanarị Ọkụ?

12. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ụfọdụ ndị Kọrịnt bụ́ ndị Kraịst si na-arụ ọrụ iwu ụlọ na-erijughị afọ?

12 N’ụzọ doro anya, Pọl chere na ụfọdụ ndị Kraịst nọ na Kọrint na-ewu ụlọ n’ụzọ na-erijughị afọ. Gịnị bụ nsogbu? Dị ka ihe gbara ya gburugburu na-egosi, nkewa tiri ọgbakọ ahụ ihe otiti, iwere mmadụ ụfọdụ dị ka ndị ukwu n’agbanyeghị ihe ize ndụ ọ bụ nye ịdị n’otu nke ọgbakọ. Ụfọdụ na-asị, “Mụ onwe m bụ nke Pọl,” ebe ndị ọzọ nọgidere na-ekwu, sị, “Mụ onwe m [bụ] nke Apọlọs.” O yiri ka ụfọdụ hà na-eche echiche gabiga ókè banyere amamihe nke onwe ha. N’abụghị ihe ijuanya, ihe si na ya pụta bụ ọnọdụ ebe a na-eche echiche n’ụzọ anụ ahụ, etozughị okè n’ụzọ ime mmụọ, na “ekworo na esemokwu” juru ebe nile. (1 Ndị Kọrint 1:12; 3:1-4, 18) E gosipụtara àgwà a n’ezie n’ozizi e ziri n’ọgbakọ nakwa n’ozi. Ihe si na ya pụta bụ na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ha bụ nke a na-arụghị nke ọma, dị ka ọrụ iwu ụlọ e ji ngwá ọrụ na-adịghị mma rụọ. Ọ gaghị alanarị “ọkụ” ahụ. Olee ọkụ Pọl na-ekwu banyere ya?

13. Gịnị ka ọkụ ahụ dị n’ihe atụ Pọl na-anọchite anya ya, banyere gịnị ka ndị Kraịst nile kwesịkwara ịmara?

13 Ọ dị otu ọkụ anyị nile na-eche ihu ná ndụ—ule nke okwukwe anyị. (Jọn 15:20; Jemes 1:2, 3) Ọ dị ndị Kraịst nọ na Kọrint mkpa ịmara, dịkwa ka ọ dị anyị mkpa ịmara taa, na a ga-anwale onye ọ bụla anyị na-akụziri eziokwu. Ọ bụrụ na anyị akụzie ihe n’ụzọ na-erijughị afọ, ọ pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị mwute. Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ọrụ onye ọ bụla ga-adịgide nke o wukwasịrị ya, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụ na a ga-erechapụ ọrụ onye ọ bụla n’ọkụ, ọ ga-eyi iyi: ma a ga-azọpụta ya onwe ya; ma ọ bụ dị ka onye a zọpụtara n’ọkụ.”c—1 Ndị Kọrint 3:14, 15.

14. (a) Olee otú ndị Kraịst na-eme ndị na-eso ụzọ pụrụ isi ‘nwee mfu,’ ma olee otú ha pụrụ isi nweta nzọpụta dị ka onye a zọpụtara n’ọkụ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi belata ihe ize ndụ nke inwe mfu?

14 Okwu ndị na-akpali iche echiche n’ezie! Ọ pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-egbu mgbu ịrụsi ọrụ ike iji nyere mmadụ aka ịghọ onye na-eso ụzọ, nanị ịhụ onye ahụ ka ọ dara n’ọnwụnwa ma ọ bụ mkpagbu, n’ikpeazụkwa hapụ ụzọ nke eziokwu. Pọl na-ekweta nke ahụ mgbe ọ sịrị na anyị na-enwe mfu n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Ahụmahụ ahụ pụrụ ịbụ nke na-egbu oké mgbu nke na a na-akọwa nzọpụta anyị dị ka nke “onye a zọpụtara n’ọkụ”—dị ka nwoke ihe nile o nwere funahụrụ n’ọkụ ma ya onwe ya abụrụ onye ọ fọrọ nke nta ka ọ ghara ịlanarị. N’akụkụ anyị, olee otú anyị pụrụ isi belata ihe ize ndụ nke mfu? Jiri ngwá ọrụ ndị na-adịte anya na-ewu! Ọ bụrụ na anyị na-akụziri ndị anyị na-amụrụ ihe ihe iji ruo ha n’obi, na-akwali ha iji àgwà ndị Kraịst dị oké ọnụ ahịa dị ka amamihe, nghọta, egwu Jehova, na ezi okwukwe kpọrọ ihe, mgbe ahụ anyị na-eji ngwá ọrụ ndị na-adịte anya, bụ́ ndị ọkụ na-apụghị ịgba na-ewu ụlọ. (Abụ Ọma 19:9, 10; Ilu 3:13-15; 1 Pita 1:6, 7) Ndị nwetara àgwà ndị a ga-anọgide na-eme uche Chineke; olileanya e ji n’aka nke ịdịgide ndụ ruo mgbe ebighị ebi bụ nke ha. (1 Jọn 2:17) Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe atụ Pọl mee ihe n’ụzọ dị irè? Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

15. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị zeere ịrụ ọrụ iwu ụlọ na-erijughị afọ n’ebe ndị anyị na-amụrụ Bible nọ?

15 Mgbe anyị na-akụziri ndị anyị na-amụrụ Bible ihe, anyị ekwesịghị ibuli ndị mmadụ elu karịa Jehova Chineke ma ọlị. Nzube anyị abụghị ịkụziri ha ile anyị anya dị ka ebe bụ́ isi ha si enweta amamihe. Anyị chọrọ ka ha na-elegara Jehova, Okwu ya, na nzukọ ya anya maka nduzi. Iji mezuo nke ahụ, anyị adịghị ekwu nnọọ echiche nke onwe anyị n’ịza ajụjụ ha. Kama nke ahụ, anyị na-akụziri ha ịchọta azịza, na-eji Bible na mbipụta dị iche iche nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” wepụtaworo eme ihe. (Matiu 24:45-47) N’ihi ihe yiri nke ahụ, anyị na-akpachara anya ịghara ime ka ọ̀ bụ anyị nwe ndị anyị na-amụrụ Bible. Kama iwe iwe mgbe ndị ọzọ na-egosi mmasị n’ebe ha nọ, anyị kwesịrị ịgba ndị anyị na-amụrụ ihe ume ka ha “dị obodobo” ná mmetụta ịhụnanya ha, na-amara ma na-enwe mmasị n’ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ dị ka o kwere mee.—2 Ndị Kọrint 6:12, 13.

16. Olee otú ndị okenye pụrụ isi jiri ngwá ọrụ ndị ọkụ na-apụghị ịgba na-ewu ụlọ?

16 Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-arụkwa ọrụ dị mkpa n’iwulite ndị na-eso ụzọ. Mgbe ha na-akụziri ọgbakọ ihe, ha na-agbalị iji ngwá ọrụ ndị ọkụ na-apụghị ịgba na-ewu. Ikike izi ihe, ahụmahụ, na àgwà ha pụrụ ịdịgasị iche nke ukwuu, ma ha adịghị eji ndịrịta iche ndị a eme ihe iji dọtara onwe ha ụmụazụ. (Tụlee Ọrụ 20:29, 30.) Anyị amaghị kpọmkwem ihe mere ụfọdụ ndị nọ na Kọrint ji na-asị, “Mụ onwe m bụ nke Pọl” ma ọ bụ, “mụ onwe m bụkwa nke Apọlọs.” Ma anyị pụrụ ijide nnọọ n’aka na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị okenye a kwesịrị ntụkwasị obi kwalitere echiche dị otú ahụ na-akpata nkewa. Echiche dị otú ahụ ebughị Pọl isi; ọ gbaghara ha n’ụzọ siri ike. (1 Ndị Kọrint 3:5-7) N’otu aka ahụ taa, ndị okenye na-eburu n’uche na ha na-azụ “ìgwè atụrụ nta Chineke.” (1 Pita 5:2, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Ọ bụghị nke mmadụ ọ bụla. Ya mere ndị okenye na-eguzosi ike megide ọchịchọ ọ bụla nke otu onye ịchị ìgwè atụrụ ahụ ma ọ bụ òtù ndị okenye. Ọ bụrụhaala na ọ bụ ọchịchọ obi umeala ijere ọgbakọ ozi, iru n’obi, na inyere atụrụ ahụ aka iji obi dum na-ejere Jehova ozi na-akwali ndị okenye ha na-eji ngwá ọrụ ndị ọkụ na-apụghị ịgba na-ewu.

17. Olee otú ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst si agbalị iji ngwá ọrụ ndị ọkụ na-apụghị ịgba na-ewu ụlọ?

17 Ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-enwekwa nchegbu dị ukwuu n’okwu a. Lee nnọọ otú ha si achọsi ike ịhụ ka ụmụ ha dị ndụ ebighị ebi! Ọ bụ n’ihi nke a ka ha ji arụsi nnọọ ọrụ ike “izi” ụmụ ha ụkpụrụ nke Okwu Chineke ka o ruo ha n’obi. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ha chọrọ ka ụmụ ha mara eziokwu, ọ bụghị nanị dị ka usoro iwu ma ọ bụ ọtụtụ ihe ndị bụ́ ezie, kama dị ka ụzọ ndụ na-eju afọ, nke na-enye ụgwọ ọrụ, na-enyekwa obi ụtọ. (1 Timoti 1:11) Iji wulite ụmụ ha ịbụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-eso ụzọ Kraịst, ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-agbalị iji ngwá ọrụ ọkụ na-apụghị ịgba eme ihe. Ha na-eji ndidi soro ụmụ ha na-arụ ọrụ, na-enyere ha aka iwepụ àgwà ndị Jehova kpọrọ asị ma zụlite àgwà ndị ọ hụrụ n’anya.—Ndị Galetia 5:22, 23.

Ònye Ka Ụta Dịrị?

18. Mgbe onye na-eso ụzọ jụrụ ozizi nke na-enye ezi ndụ, n’ihi gịnị ka ọ na-agaghị eji sicha n’aka onye ahụ na-agbalị ịkụziri ya ihe na inye ya ọzụzụ?

18 Ntụle a na-ewelite ajụjụ dị mkpa. Ọ bụrụ na onye anyị na-agbalị inyere aka esi n’eziokwu ahụ dapụ, nke ahụ ọ̀ pụtara na anyị dara ada dị ka ndị nkụzi—na ọ ghaghị ịbụ na anyị ji ngwá ọrụ ndị na-adịghị mma wuo ihe? Ọ bụchaghị otú ahụ. Okwu Pọl na-echetara anyị n’ezie na ọ bụ ibu ọrụ dị ukwuu ikere òkè n’iwulite ndị na-eso ụzọ. Anyị kwesịrị ime ike anyị nile iji na-ewu n’ụzọ dị mma. Ma Okwu Chineke adịghị agwa anyị ka anyị buru ibu ọrụ nile ahụ ma ghọọ ndị obi amamikpe na-anyịgbu mgbe ndị ahụ anyị na-achọ inyere aka si n’eziokwu ahụ pụọ. E nwere ihe ndị ọzọ ọ gụnyere ma e wezụga ọrụ anyị onwe anyị dị ka ndị na-ewu ụlọ. Dị ka ihe atụ, rịba ama ihe Pọl na-ekwu banyere ọbụna onye ozizi bụ́ onye rụrụ ọrụ na-erijughị afọ n’ọrụ iwu ụlọ a: “Ọ ga-eyi iyi: ma a ga-azọpụta ya onwe ya.” (1 Ndị Kọrint 3:15) Ọ bụrụ na onye a pụrụ imesị nweta nzọpụta—ọ bụ ezie na àgwà ndị Kraịst ọ gbalịrị iwulite n’ime onye ọ na-amụrụ ihe bụ nke e sere onyinyo ya dị ka nke ‘e rechapụrụ n’ọkụ’ n’ule dị ọkụ—gịnị ka anyị na-aghaghị ikwubi? N’ezie, na Jehova ga-ajụ onye ahụ a na-amụrụ ihe ajụjụ maka mkpebi ndị o mere banyere ma ọ̀ ga-agbaso ụzọ ikwesị ntụkwasị obi ma ọ bụ na ọ gaghị agbaso.

19. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ibu ọrụ onwe onye bụ okwu dị mkpa nke ukwuu. Ọ na-emetụta onye ọ bụla n’ime anyị. Gịnị kpọmkwem ka Bible na-akụzi banyere okwu a? Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle nke a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a “Ntọala ụwa” pụrụ izo aka n’ike ndị sitere n’okike ndị jigidesiri ya ike—jigidekwa ihe ndị dị n’eluigwe. Tụkwasị ná nke ahụ, a rụrụ ụwa n’onwe ya otú a na-agaghị ‘ewezụga ya n’ọnọdụ ya’ mgbe ọ bụla, ma ọ bụ bibie ya.—Abụ Ọma 104:5.

b “Nkume dị oké ọnụ” ndị ahụ Pọl zoro aka na ha abụchaghị ndị dị oké ọnụ ahịa dị ka diamọnd na ruby. Ha pụrụ ịbụworị nkume ndị dị oké ọnụ dị ka marble, alabaster, ma ọ bụ granite.

c Pọl na-eme ka e nwee obi abụọ banyere nzọpụta nke, ọ bụghị onye na-ewu ụlọ, kama “ọrụ” nke onye na-ewu ya. The New English Bible na-asụgharị amaokwu a ịbụ: “Ọ bụrụ na ụlọ mmadụ eguzo, a ga-enye ya ụgwọ ọrụ; ọ bụrụ na o ree ọkụ, ọ ghaghị iburu mfu ahụ; ma ọ ga-agbapụ ná ndụ, dị ka mmadụ pụrụ ịgbapụ n’ọkụ.”

Olee Otú Ị̀ Ga-esi Zaa?

◻ Gịnị bụ “ntọala” dị n’ime ezi onye Kraịst, oleekwa otú e si atọ ya?

◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụdị ngwá ọrụ dị iche iche e ji ewu ụlọ?

◻ Gịnị ka “ọkụ” ahụ na-anọchite anya ya, oleekwa otú ọ pụrụ isi mee ka ụfọdụ ‘nwee mfu’?

◻ Olee otú ndị ozizi Bible, ndị okenye, na ndị nne na nna pụrụ isi jiri ngwá ọrụ ndị ọkụ na-apụghị ịgba na-ewu ụlọ?

[Foto dị na peeji nke 9]

N’ọtụtụ obodo oge ochie, ụlọ nkume ndị ọkụ na-apụghị ịgba na ụlọ ndị na-esighị ike karị dịrị n’otu ebe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya