Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 7/1 p. 24-27
  • Iwulite Ọdịdị Ndị Kraịst n’Ime Ụmụ Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iwulite Ọdịdị Ndị Kraịst n’Ime Ụmụ Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ntọala ahụ
  • Ihe Owuwu ahụ
  • Ọrụ Iwu Ihe nke Gara nke Ọma
  • Ọkụ ahụ
  • Ụgwọ Ọrụ ahụ
  • Ọrụ Gị Ọ̀ Ga-alanarị Ọkụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Izi Ozi Nkasi Obi n’Itali
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịbịaru Jehova Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 7/1 p. 24-27

Iwulite Ọdịdị Ndị Kraịst n’Ime Ụmụ Anyị

NNE Wanda, onye di ya gbahapụworo, rụsiri ọrụ ike iwulite àgwà ndị Kraịst n’ime nwa ya nwanyị. Mgbe Wanda dị afọ 12, e tinyere ọzụzụ nke a n’ule. N’oge ahụ, ọnọdụ manyere Wanda, tinyere nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ na nwanne ya nwanyị, ịhapụ nne ya ma jee binyere nna ya ruo nwa oge. Nna ya abụghị onye kwere ekwe, ya mere olee otú Wanda ga-esi eme omume mgbe nne ya na-anọghị ya ịhụ ihe ọ na-eme?

Otu ihe ndabara nke na-abịara ndị Kraịst nile mụrụ ụmụ bụ oge mgbe ọ ga-adị mkpa ka ụmụ ha mee mkpebi n’onwe ha, na-etinye okwukwe nke onwe ha n’ule. Ọ pụrụ ịbụ na e kewapụrụ ụmụ ahụ n’ebe ndị mụrụ ha nọ, dị ka ọ dị n’ihe banyere Wanda. Ha pụrụ iche nrụgide ndị ọgbọ ihu n’ụlọ akwụkwọ ime ihe na-ezighị ezi. Ma ọ bụkwanụ na ha pụrụ iche ọnwụnwa ndị siri ike ihu. Ndị Kraịst mụrụ ụmụ na-enwe olileanya, na-ekpekwa ekpere na mgbe oge dị otú ahụ bịara, ka ụmụ ha bụrụ ndị nwere àgwà ndị Kraịst siri ike ruo n’ókè imeri ule ahụ.

Olee ụzọ ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi wulite àgwà ndị Kraịst siri ike n’ime ụmụ ha? Tupu anyị achọpụta ihe mere Wanda, ka anyị hụ ụzọ Bible na-esi enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ. Ihe ndabere nye azịza ya bụ nke a na-achọta n’okwu ndị a nke Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst nọ na Kọrint: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịtọ ntọala ọzọ ma ọ bụghị nke a tọworo, nke bụ Jisọs Kraịst. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ewukwasị ọlaedo, ọlaọcha, nkume dị oké ọnụ, osisi, ahịhịa, okporo ọka, n’elu ntọala ahụ; a ga-eme ka ọrụ nke mmadụ nile n’otu n’otu pụta ìhè: n’ihi na ụbọchị ahụ ga-egosi ya, n’ihi na a gaje ikpughe ya n’ọkụ; ọkụ onwe ya ga-anwakwa ọrụ mmadụ nile n’otu n’otu, aha ọrụ ọ bụ.”—1 Ndị Kọrint 3:11-13.

Ntọala ahụ

N’ihi gịnị ka Pọl ji dee okwu ndị a? Ọ malitewo usoro ihe omume nke iwulite ọdịdị ndị Kraịst na Kọrint, ma usoro ihe omume ahụ ezutewo nsogbu ụfọdụ. N’ezie, usoro ihe owuwu nke Pọl emetụtaghị ụmụ nke ọ mụrụ n’anụ ahụ. O metụtara ndị ghọrọ ndị Kraịst site ná nkwusa ya. Ma ọ na-ele ndị a anya dị ka ụmụ ime mmụọ ya, ihe o kwuru ga-abakwara ndị mụrụ ụmụ uru.—1 Ndị Kọrint 4:15.

Pọl bịara na Kọrint ogologo oge ụfọdụ tupu mgbe ahụ, o guzobewokwa otu ọgbakọ ndị Kraịst n’ebe ahụ. Ndị nakweere nkwusa ya emewo mgbanwe dị iche iche n’ọdịdị mmadụ ha. Ụfọdụ n’ime ha bụbu ndị na-ebi ndụ na-adịghị ọcha, ndị na-ezu ohi, ndị na-ekpere arụsị, na ndị na-aṅụbiga mmanya ókè. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Ma ha nwere ike ịgbanwe bịa n’iche echiche ndị Kraịst n’ihi na Pọl atọwo ezi ntọala, dị ka a pụrụ ikwu ya. Gịnị bụ ntọala ahụ? “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịtọ ntọala ọzọ ma ọ bụghị nke a tọworo, nke bụ Jisọs Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 3:11.

Olee ụzọ Pọl si tọọ ntọala nke a mgbe ọ na-akụziri ndị ọhụrụ ndị a kwere ekwe na Kọrint ihe? Ọ na-agwa anyị, sị: “Mụ onwe m, mgbe m bịakwutere unu, ụmụnna m, ejighị oké ikwu okwu ma ọ bụ oké amamihe bịa na-ekwusara unu ihe omimi dị nsọ nke Chineke. N’ihi na ekpebiri m ịghara ịma ihe ọ bụla n’etiti unu e wezụgakwa Jisọs Kraịst, na a kpọgburu ya.” (1 Ndị Kọrint 2:1, 2, NW; Ọrụ 18:5) Ọ dọrọghị uche gaa n’ebe onwe ya nọ ma ọ bụ hazigharịa eziokwu ahụ ka o yie ihe na-adọrọ adọrọ n’ụzọ nkà ọgụgụ isi. Kama nke ahụ, ọ dọọrọ uche gaa n’ebe Jisọs Kraịst nọ, na ụzọ Chineke siworo jiri onye nke a mee ihe.

N’eziokwu, Jisọs bụ ntọala siri oké ike maka ihe owuwu ndị Kraịst. O nyere ihe àjà mgbapụta ahụ. Ọ bụ Eze ugbu a n’eluigwe, n’ihi nke ahụkwa, n’oge na-adịghị anya, ọ gaje ibibi ndị iro nile nke Chineke n’Amagedọn. Mgbe ahụ, ọ ga-eji ezi omume Chineke mee ihe n’oge ọchịchị otu puku afọ, dịkwa ka Onye Isi Nchụaja nke Chineke, ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ bulie agbụrụ mmadụ gaa n’izu okè. Ntọala ọzọ dị aṅaa ka mmadụ pụrụ ịchọ inwe?

N’ihi ya, n’iwulite ọdịdị ndị Kraịst n’ime ụmụ anyị, anyị ga-eme nke ọma iṅomi Pọl, jidekwa n’aka na ha na-aghọta eziokwu ndị a dị oké mkpa. Site na mgbe ha dị na nwata, anyị kwesịrị ịkụziri ụmụ anyị ịhụ Jisọs n’anya maka ihe o mere na ihe ọ ka na-eme.—1 Pita 1:8.

Ihe Owuwu ahụ

Otú ọ dị, ọ bụ ezie na Pọl tọrọ ntọala ọma nke a, ọrụ ihe owuwu ahụ dalara azụ mgbe ọ hapụrụ ha. (1 Ndị Kọrint 3:10) Nsogbu ahụ yiri nke ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ na-enweta n’oge a. Ha na-azụlite ụmụ ha n’okwukwe ndị Kraịst, na-ejidekwa n’aka na ụmụntakịrị ahụ aghọtawo ihe eziokwu ahụ bụ. Ma mgbe ha na-eme okenye karị, ụmụntakịrị ahụ na-akpafu ma ọ bụ ju okwukwe ahụ. N’ihi gịnị ka nke ahụ ji na-eme? Ọtụtụ mgbe ọ bụ n’ihi ihe ndị e ji wuo ihe ahụ.

Pọl kwuru na a pụrụ iji ihe e ji ewu ụlọ ndị dị oké ọnụ ahịa mee ihe n’iwulite ọdịdị mmadụ: ọlaedo, ọlaọcha, na nkume dị oké ọnụ ahịa. A pụkwara iji ihe ndị na-adịghị oké ọnụ ahịa wuo ha: osisi, ahịhịa, na okporo ọka. (1 Ndị Kọrint 3:12) Ugbu a, ọ bụrụ na onye na-ewu ihe ejiri ọlaedo, ọlaọcha, na nkume dị oké ọnụ ahịa mee ihe, ihe ọ na-ewulite aghaghị isi ike, bụ́ nke abamuru ya pụrụ iche. Ma onye na-ewu ihe nke ji osisi, ahịhịa, na okporo ọka mee ihe na-ewulite nanị ihe na-esighị ike, ihe na-adị nwa oge, na ihe ọnụ ahịa ya dị ala.

O yiri ka è ji ihe ime mmụọ ndị na-esighị ike na-ewu ihe na Kọrint. Ụfọdụ ndị gaworo n’ihu n’iwukwasị ihe n’elu ntọala ahụ Pọl onyeozi tọrọ na-ewu ihe ọnụ ahịa ya dị ala, n’ewughị ihe ndị siri ike, ndị na-adịgide adịgide. Ndị Kọrint ahụ amalitewo ilekwasị ụmụ mmadụ anya, e nwekwara adịghị n’otu, ikwo ekworo, na esemokwu n’etiti ha. (1 Ndị Kọrint 1:10-12; 3:1-4) Oleekwa ụzọ a pụrụ isiworị gbochie nke a? Ọ bụ site na ha iji ihe ndị dị oké ọnụ ahịa karị, ndị na-adị ogologo oge.

Ndị a nọchiri anya àgwà ndị ahụ bara uru ndị bụ akụkụ dị mkpa nke ọdịdị onye Kraịst. Àgwà ndị dị aṅaa? Pita onyeozi hotara otu n’ime ha, sị: “Nnwapụta nke okwukwe unu, ebe ọ dịkarịrị ọlaedo oké ọnụ ahịa nke ukwuu.” (1 Pita 1:6, 7) Eze Solomọn hotara abụọ ọzọ: amamihe na nghọta, bụ́ nke inwe ha ‘dị mma karịa inwe ọlaọcha dị ka uru.’ (Ilu 3:13-15) Eze Devid chetakwaara anyị na ịtụ egwu Jehova na ịghọta ihe ndị o nyere n’iwu ‘bụ ihe a na-achọsi ike karịa ọlaedo.’—Abụ Ọma 19:9, 10.

A pụrụ iwunye ihe ndị a na ihe ndị ọzọ bara uru n’ọdịdị ndị Kraịst iji nyere ụmụ anyị aka imeri ule dị iche iche. Ma, olee ụzọ anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị ji ihe ndị dị otú ahụ na-ewu ihe? Ọ bụ site n’ilekwasị anya n’obi ma na nke ụmụ anyị ma na nke anyị onwe anyị.

Ọrụ Iwu Ihe nke Gara nke Ọma

A na-ahụta òkè obi onye mụrụ ụmụ na-ekere n’ọrụ owuwu ihe nke a n’otu ihe Jehova nyere ndị mụrụ ụmụ nọ ná mba Israel oge ochie n’iwu: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị.” Mgbe ahụ ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) N’ihi ya, tupu anyị enwee ike iwulite ndị ọzọ elu, anyị aghaghị iwulite onwe anyị. Ụmụ anyị kwesịrị ịhụta site n’ihe ndị anyị na-ekwu na ihe ndị anyị na-eme, na e ji ihe ndị kwesịrị ekwesị wuo ọdịdị mmadụ anyị.—Ndị Kọlọsi 3:9, 10.

Mgbe ahụ, ozizi anyị aghaghị irute n’obi ha. Jisọs, onye kasị nwee ihe ịga nke ọma n’iwulite ọdidị ndị Kraịst, ruru obi ndị mmadụ site n’iji ihe atụ na ajụjụ dị iche iche na-eme ihe. (Matiu 17:24-27; Mak 13:34) Ndị mụrụ ụmụ na-achọpụta na otu usoro izi ihe ndị a na-adị irè nke ukwuu. Ha na-eji ihe atụ dị iche iche na-eme ka eziokwu ndị Kraịst na-adọrọ obi ụmụntakịrị ha, ha na-ejikwa ajụjụ ndị e chepụtara nke ọma na-eme ihe ịchọpụta ihe ụmụ ha ndị meworo okenye karị na-eche n’ezie, otú ha si na-atụgharị uche n’ime obi ha.—Ilu 20:5.

Mgbe Mosis na-agbalị iwulite n’ime ụmụ Israel ọchịchọ nke ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi, ọ sịrị: ‘Debe ihe nile Jehova nyere n’iwu, na ụkpụrụ ya nile . . . ka o wee dịrị gị mma.’ (Deuterọnọmi 10:13) N’otu aka ahụ, ndị mụrụ ụmụ na-eme nke ọma ọ bụghị nanị ịkọwara ụmụ ha n’ụzọ doro anya ihe ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke bụ, kamakwa igosi ha n’ụzọ ha ga-eji kwere n’ihe mere ihe ndị dị ka ime ihe n’eziokwu, ịdị ọcha n’akparamagwa, na inwe mkpakọrịta dị mma ji bụrụ maka ọdịmma nke ha.

N’ikpeazụ, Jisọs sịrị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Mgbe ụmụntakịrị matara Jehova n’onwe ya mgbe ha ka dị na nwata, mụta ịgwa ya okwu banyere nsogbu ha dị iche iche, nweekwa ahụmahụ nke ọzịza ọ na-aza ekpere ha, a na-ewulite akụkụ kasị mkpa nke ọdịdị onye Kraịst: mmekọrịta onwe onye nke ha na Onye Okike ha.

Ọkụ ahụ

Pọl chọpụtara na mgbe a na-arụghị ọrụ owuwu ihe ahụ na Kọrint nke ọma, àgwà ndị ụwa, dị ka ịrọ òtù na ime nkewa, gbanyere mkpọrọgwụ. Nke a bụ ihe ize ndụ n’ihi na, dị ka ọ kọwara, “ọkụ onwe ya ga-anwakwa ọrụ mmadụ nile n’otu n’otu, aha ọrụ ọ bụ.”—1 Ndị Kọrint 3:13.

Gịnị bụ ọkụ ahụ? Ọ pụrụ ịbụ ule ọ bụla nke Setan wetaara onye Kraịst. Ọ pụrụ ịbụ nrụgide ndị ọgbọ, ọnwụnwa dị iche iche nke anụ ahụ, ịhụ ihe onwunwe n’anya, mkpagbu, ọbụna mmetụta na-emerụ ahụ nke ịrụ ụka. Ule ndị dị otú ahụ aghaghị ịbịa. “A ga-eme ka ọrụ nke mmadụ nile n’otu n’otu pụta ìhè: n’ihi na ụbọchị ahụ ga-egosi ya, n’ihi na a gaje ikpughe ya n’ọkụ.” Ndị nne na nna maara ihe na-ewulite ọdịdị ụmụ ha n’ịtụ anya na a ga-etinye ụmụ ha n’ule. Ma obi siri ha ike na site n’enyemaka Jehova, ụmụ ha ga-emeri ule ahụ. Ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ enwee àgwà nke a, ha ga-enwe ngọzi dị ukwuu.

Ụgwọ Ọrụ ahụ

Pọl sịrị: “Ọ bụrụ na ọrụ onye ọ bụla ga-adịgide nke o wukwasịrị ya, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ.” (1 Ndị Kọrint 3:14) Pọl onyeozi natara ụgwọ ọrụ. O degaara ndị Kraịst nọ n’obodo Tesalọnaịka, bụ́ ebe ọ rụwokwara ọrụ ihe owuwu akwụkwọ, sị: “N’ihi na gịnị bụ olileanya anyị, ma ọ bụ ọṅụ anyị, ma ọ bụ okpueze nke ịnya isi anyị? Ọ́ bụghịkwa unu onwe unu, n’ihu Onyenwe anyị Jisọs n’ọbịbịa [“ọnụnọ,” NW] ya? N’ihi na unu onwe unu bụ otuto anyị na ọṅụ anyị.”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:19, 20.

Nne Wanda nwetara ụgwọ ọrụ nke a. Mgbe Wanda nke gbaworo afọ 12 hụrụ na ya na nne ya anọghị, ná mmalite, ọ na-ebe ákwá ruo mgbe ọ rahụrụ ụra. Mgbe ahụ, o wee cheta ndụmọdụ nne ya nyeworo ya ka o soro Jehova na-akparịta ụka banyere nsogbu ya nile. O kpere ekpere, n’oge na-adịghị anya o chetakwara na ya kwesịrị ile anya n’akwụkwọ ebe e depụtara aha ndị nwere telifon iji chọta ma ọ̀ dị Onyeàmà Jehova ọ bụla bi nso. Ọ kpọtụụrụ ha wee nụ na e nwere otu ezinụlọ nke bi ná mgbada okporo ụzọ ahụ ebe ụlọ nna ya dị. “Obi tọrọ m nnọọ ụtọ,” ka Wanda kwuru.

Site n’agbamume nke ezinụlọ nke a, Wanda haziri nwanne ya nwoke na nwanne ya nwanyị ka ha maliteghachi ọrụ ndị Kraịst. “Ọ bụ ọrụ dịịrị m ịhụ na anyị nile kwadebere maka nzukọ nile,” ka ọ kọwara. “Ana m asa ákwà anyị, na-abọ isi anyị, na-ejide n’aka na anyị dị ọcha, dịkwa mma n’anya.” Ọ bụ ọrụ siri ike nye nwa agbọghọ nta, ma ọ rụrụ ya. N’otu oge, nna ya gbalịrị ịkwụsị ha ije nzukọ, ma ụmụntakịrị ahụ rịọrọ ya arịrịọ, o wee kwe ka ha jee.

Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ụmụntakịrị ahụ laghachikwuuru nne ha. Mgbe Wanda dị afọ 15, ọ ghọrọ onye Kraịst mere baptism, ma mesịa kwupụta ọchịchọ ya ịbụ onye ozi ala ọzọ. Ee, ọrụ nke nne Wanda gafere ule ahụ. O nwetara ụgwọ ọrụ nke ịhụ ka nwa ya nwanyị guzosiri ike n’onwe ya maka eziokwu ahụ. Anyị nwere olileanya na ndị Kraịst nile mụrụ ụmụ ga-enwe ihe ịga nke ọma yiri nke ahụ ka ha na-arụ ọrụ iwulite ọdịdị ndị Kraịst n’ime ụmụ ha.

[Igbe dị na peeji nke 27]

Ọ bụ ezie na dị ka isiokwu nke a gosiworo, ndị mụrụ ụmụ na-agbalịsi ike iwunye ọdịdị ndị Kraịst n’ime ụmụ ha, ụmụntakịrị ahụ n’onwe ha nwekwara ibu ọrụ. Ha, dị ka ndị Kraịst nile, aghaghị ịrụ ọrụ owuwu ihe n’onwe ha. (Ndị Efesọs 4:22-24) Ọ bụ ezie na ndị mụrụ ụmụ nwere ohere dị ebube inye aka na nke a, n’ikpeazụ, onye ọ bụla ga-eme mkpebi nke onwe ya ijere Jehova ozi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya