Nkà Ihe Ọmụma Ndị Gris—Ò Mere Ka Iso Ụzọ Kraịst Ka Mma?
“Ọ bụ ezie na Iso Ụzọ Kraịst na-emegide ọdịbendị ndị Gris na nke ndị Rom na-ekpere arụsị, ọ nakweere nkà ihe ọmụma oge ochie ha n’ụzọ dị ukwuu n’ezie.”—The Encyclopedia Americana.
N’IME ndị nwere mmetụta dị ike n’echiche “ndị Kraịst,” “Senti” Augustine nọ n’ọkwá a na-adịghị agbagha agbagha. Dị ka The New Encyclopædia Britannica si kwuo, “uche [Augustine] bụ ebe a gwakọtara okpukpe nke Agba Ọhụrụ na ọdịnala Plato nke nkà ihe ọmụma ndị Gris n’ụzọ kasị zuo ezu; ọ bụkwa ebe e si bufee ihe si ná ngwakọta a pụta na Krisendọm nke Okpukpe Roman Katọlik nke oge ụwa na-emepechabeghị anya nakwa na nke Okpukpe Protestant nke Oge Ntụte.”
Ihe nketa nke Augustine hapụrụ na-adịgide adịgide n’ezie. N’ikwu banyere ókè nkà ihe ọmụma ndị Gris metụtaruworo Krisendọm, Douglas T. Holden kwuru, sị: “A gwakọtawo nkà mmụta okpukpe ndị Kraịst na nkà ihe ọmụma ndị Gris n’ụzọ dị ukwuu nke na ọ zụpụtawo ndị nwere akụkụ itoolu nke echiche ndị Gris na otu akụkụ nke echiche ndị Kraịst.”
Ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwenyesiri ike na mmetụta nkà ihe ọmụma dị otú ahụ meziwanyere Iso Ụzọ Kraịst ná mmalite ya, mee ka ozizi ya ka mma, meekwa ka ọ bụrụ ihe a pụrụ ikwenye ekwenye karị. Nke a ọ̀ bụ eziokwu? Olee otú mmetụta nkà ihe ọmụma ndị Gris si were ọnọdụ, ọ̀ bụkwa ole mgbe? Ò mere ka Iso Ụzọ Kraịst ka mma n’ezie, ka ò merụrụ ya emerụ?
Ọ bụ ihe na-enye ihe ọmụma ịchọpụta ọtụtụ ihe ndị merenụ site na narị afọ nke atọ T.O.A. ruo na narị afọ nke ise O.A. site n’inyocha okwu anọ dị ịtụnanya: (1) “Okpukpe ndị Juu kwekọrọ n’ọdịbendị ndị Gris,” (2) “ọdịbendị ndị Gris e mere ka o yie Iso Ụzọ Kraịst,” (3) “Iso Ụzọ Kraịst nke kwekọrọ n’ọdịbendị ndị Gris,” na (4) “nkà ihe ọmụma ndị Kraịst.”
“Okpukpe Ndị Juu Kwekọrọ n’Ọdịbendị Ndị Gris”
Nke mbụ ahụ, bụ́ “okpukpe ndị Juu kwekọrọ n’ọdịbendị ndị Gris,” bụ n’ezie ihe na-emegide onwe ya. A gaghị eji echiche okpukpe ụgha merụọ okpukpe mbụ nke ndị Hibru, bụ́ nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, guzobere. (Deuterọnọmi 12:32; Ilu 30:5, 6) Otú ọ dị, siterị ná mmalite, ihe omume na echiche okpukpe ụgha ndị gbara ya gburugburu yiri ịdị ọcha nke ofufe egwu ịbụ nke e merụrụ—dị ka mmetụta ndị sitere n’Ijipt, Kenean, na Babilọn. Ọ dị mwute ikwu na Israel kwere ka ezi ofufe ya ghọọ nke e merụrụ n’ụzọ dị ukwuu.—Ndị Ikpe 2:11-13.
Ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị, mgbe Palestine oge ochie ghọrọ akụkụ nke Alaeze Ukwu Gris n’okpuru ọchịchị Alexander Onye Ukwu na narị afọ nke anọ T.O.A., mmerụ a ruru ọ̀tụ̀tụ̀ dị njọ karị ma hapụ ihe nketa na-adịgide adịgide ma na-ebibi ihe. Alexander webatara ndị Juu n’usuu ndị agha ya. Mmekọrịta ahụ dị n’etiti ndị Juu na onye a ka meriri ha emeri nwere mmetụta dị ukwuu n’echiche okpukpe ndị Juu. E webatara echiche ọdịbendị ndị Gris ná mmụta ndị Juu. A maara Onyeisi Nchụàjà bụ́ Jason dị ka onye guzobere ụlọ akwụkwọ ndị Gris n’ime Jerusalem na 175 T.O.A. iji kwalite ihe ọmụmụ nke Homer.
N’ụzọ na-akpali mmasị, otu onye Sameria, ka ọ na-ede akwụkwọ n’ọkara nke abụọ nke narị afọ nke abụọ T.O.A., nwara igosi akụkọ ihe mere eme nke Bible dị ka ihe odide dabeere n’akụkọ ọdịbendị ndị Gris. Akwụkwọ apọkrịfa nke ndị Juu, dị ka Judith na Tobit, na-ezo aka n’ezie n’akụkọ mgbe ochie ndị na-akpali agụụ mmekọahụ nke ndị Gris. E nwere ọtụtụ ndị ọkà ihe ọmụma bụ́ ndị Juu, ndị nwara ime ka echiche ndị Gris na okpukpe ndị Juu nakwa Bible nwee nkwekọrịta.
Onye a kasị kwuo na ọ bụ ya mere nke a bụ Philo, bụ́ onye Juu nke narị afọ mbụ O.A. O ji ozizi Plato (narị afọ nke anọ T.O.A.), nke ndị òtù Pythagoras, na nke ndị Stoik mee ihe n’anataghị ikike. Echiche Philo nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ ndị Juu. N’ịchịkọta ojiji a e ji akọ webata echiche ndị Gris n’ime ọdịbendị ndị Juu, onye Juu na-ede akwụkwọ bụ́ Max Dimont na-ekwu, sị: “N’ịbụ ndị e ji echiche Plato, arụmụka Aristotle, na sayensị Euclid kwalite, ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Juu kọwara Torah n’ụzọ ndị dị ọhụrụ. . . . Ha malitere itinye echiche ndị Gris n’ihe e kpugheere ndị Juu.”
Ka oge na-aga, ndị Rom weghaara Alaeze Ukwu Gris, na-eweghara Jerusalem. Nke a nyere ohere maka ọbụna mgbanwe ndị dị ịrịba ama karị. Ka ọ na-erule na narị afọ nke atọ O.A., ozizi nkà ihe ọmụma na nke okpukpe nke ndị ọkà n’echiche bụ́ ndị gbalịsiri ike iwulite na ịgwakọta echiche Plato, pụtara n’ụdị zuru ezu, bụ́ ndị a maara n’ozuzu ha taa dị ka ozizi Plato nke ọgbara ọhụrụ. Echiche a ndị a nwere aghaghị inwe mmetụta dị ukwuu n’Iso Ụzọ Kraịst nke si n’ezi ofufe dapụ.
“Ọdịbendị Ndị Gris E Mere Ka O Yie Iso Ụzọ Kraịst”
N’ime narị afọ ise mbụ nke oge anyị, ụfọdụ ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ nwara igosipụta njikọ e nwere n’etiti nkà ihe ọmụma ndị Gris na eziokwu e kpughere ekpughe nke Bible. Akwụkwọ bụ́ A History of Christianity na-ekwu, sị: “Ndị Kraịst bụ́ ndị ọkà ihe ọmụma n’ihe banyere ịdị adị nke ihe, gaje igosipụta ndị Gris nke iri afọ ndị bu ọbịbịa Kraịst ụzọ dị ka ndị na-agbasi mbọ ike n’ụzọ na-enweghị isi inweta ihe ọmụma nke Chineke, na-agbalị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, iji nkà ihe ọmụma nkịtị nke ndị Gris chepụta Jisọs, iji isi ha tọgbọ chakoo chepụta Iso Ụzọ Kraịst.”
Plotinus (205-270 O.A.), bụ́ onye butere ụzọ n’echiche dị otú ahụ, kwalitere usoro nke dabeere n’ụzọ bụ́ isi ná nchepụta echiche nke Plato. Plotinus webatara echiche nke mkpụrụ obi nke dị iche n’ebe ahụ dị. Prọfesọ E. W. Hopkins kwuru banyere Plotinus, sị: “Nkà mmụta okpukpe ya . . . nwere mmetụta dị ukwuu n’echiche ndị Kraịst na-edu ndú.”
“Iso Ụzọ Kraịst nke Kwekọrọ n’Ọdịbendị Ndị Gris” na “Nkà Ihe Ọmụma Ndị Kraịst”
Malite na narị afọ nke abụọ O.A., “ndị Kraịst” bụ́ ndị ọkà n’echiche mere mgbalị siri ike iji dọta mmasị ndị na-ekpere arụsị ụbụrụ na-aghọ nkọ. N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị doro anya Pọl onyeozi nyere megide “okwu efu nile nke e merụrụ emerụ” na “ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha, ha na nguzogide ya nile,” ndị nkụzi dị otú ahụ gwakọtara nkà ihe ọmụma sitere n’ọdịbendị ndị Gris gbara ha gburugburu n’ime ozizi ha. (1 Timoti 6:20) Ihe atụ Philo yiri ka ọ na-enye echiche na ọ pụrụ ikwe omume ijikọta Bible na echiche Plato.—Tụlee 2 Pita 1:16.
N’ezie, ọ bụ eziokwu Bible ka nke a kasị kpaa aka ọjọọ. Ndị ozizi bụ́ “ndị Kraịst” gbalịrị igosi na Iso Ụzọ Kraịst kwekọrọ n’ụzọ ndụ ndị Gris na Rom. Clement onye Alexandria na Origen (narị afọ nke abụọ na nke atọ O.A.) mere ka ozizi Plato nke ọgbara ọhụrụ bụrụ ntọala nke ihe mesịrị bụrụ “nkà ihe ọmụma ndị Kraịst.” Ambrose (339-397 O.A.), bụ́ bishọp nke Milan, ‘anakwerewo ihe ọmụmụ ndị Gris nke ọgbara ọhụrụ, ma nke ndị Kraịst ma nke ndị na-ekpere arụsị—karịsịa akwụkwọ ndị . . . Plotinus, bụ́ onye na-ekpere arụsị nke na-akwado ozizi Plato nke ọgbara ọhụrụ dere.” Ọ gbalịrị iwetara ndị Latin gụrụ akwụkwọ ụdị Iso Ụzọ Kraịst nke dị n’oge ahụ. Augustine gbasoro ihe nlereanya ya.
Otu narị afọ mgbe e mesịrị, Daịọnisiọs bụ́ onye Areọpagọs (onye a na-etukwa oyiri Daịọnisiọs), ikekwe onye mọnk Siria, gbalịrị ijikọta nkà ihe ọmụma Plato nke ọgbara ọhụrụ na nkà mmụta okpukpe “ndị Kraịst.” Dị ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma si kwuo, “edemede [ya] guzobere usoro doro anya nke ozizi Plato nke ọgbara ọhụrụ n’akụkụ dị ukwuu nke ozizi na ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Kraịst nọ n’oge ụwa na-emepechabeghị anya . . . bụ́ nke meworo ka e nwee akụkụ ya dị iche iche n’ụzọ okpukpe nakwa n’ụzọ nraranye ya ruo n’oge a.” Lee ajọ nleda anya nke a bụ nye ịdọ aka ná ntị Pọl onyeozi nyere megide “ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu . . . nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe”!—Ndị Kọlọsi 2:8.
Ihe Mmerụ Dị Iche Iche
E kwuwo na “ndị Kraịst bụ́ ndị nakwere ozizi Plato butere mkpughe Chineke ụzọ ma were nkà ihe ọmụma Plato dị ka ngwá ọrụ kasị mma e nwere maka ịghọta na ịgbachitere ozizi nke Akwụkwọ Nsọ na ọdịnala nke chọọchị.”
Plato n’onwe ya kwenyesiri ike na e nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. N’ụzọ dị ịrịba ama, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi bụ otu n’ime ozizi ụgha ndị a kasị mara amara nke gbebatara n’ime nkà mmụta okpukpe “ndị Kraịst.” A pụghị ime ka ịnakwere ozizi a zie ezie ná ndabere nke na ime otú ahụ mere ka Iso Ụzọ Kraịst masịkwuo ndị mmadụ. Mgbe Pọl onyeozi na-eme nkwusa n’Atens, bụ́ ebe bụ́ isi nke ọdịbendị ndị Gris, ọ kụzighị ozizi Plato nke mkpụrụ obi. Kama nke ahụ, ọ kụziri ozizi ndị Kraịst nke mbilite n’ọnwụ, ọ bụ ezie na o siiri ọtụtụ ndị Gris na-ege ya ntị ike ịnakwere ihe o kwuru.—Ọrụ 17:22-32.
N’ụzọ megidere nkà ihe ọmụma ndị Gris, Akwụkwọ Nsọ na-egosi n’ụzọ doro anya na mkpụrụ obi abụghị ihe mmadụ nwere kama ihe ọ bụ. (Jenesis 2:7) N’ọnwụ, mkpụrụ obi na-akwụsị ịdị adị. (Ezikiel 18:4) Eklisiastis 9:5 na-agwa anyị, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ; n’ihi na e chezọwo ncheta ha.” Bible adịghị akụzi ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi.
Ozizi ọzọ na-eduhie eduhie bụ nke metụtara ọkwá Jisọs ahụ dịbu adị tupu ọ ghọọ mmadụ, echiche nke bụ́ na ya na Nna ya ha nhata. Akwụkwọ bụ́ The Church of the First Three Centuries na-akọwa, sị: “Mmalite nke ozizi Atọ n’Ime Otu . . . sitere kpam kpam n’ebe dị iche n’Akwụkwọ Nsọ ndị Juu na nke ndị Kraịst.” Olee ebe o sitere? Ozizi ahụ “tolitere, e wee jikọta ya n’Iso Ụzọ Kraịst, site n’aka ndị Nna na-agbaso ozizi Plato.”
N’ezie, ka oge na-aga, ndị Nna Chọọchị aghọọkwa ndị ozizi Plato nke ọgbara ọhụrụ metụtara n’ụzọ dị ukwuu, ndị kweere n’ozizi Atọ n’Ime Otu nwetakwuru ndị nkwado. Nkà ihe ọmụma Plato nke ọgbara ọhụrụ nke narị afọ nke atọ yiri ka o mere ka ha nwee ike ijikọta ihe a na-apụghị ijikọtali—ime ka Chineke atọ yie otu Chineke. Site n’echiche nkà ihe ọmụma, ha zọọrọ na ndị atọ pụrụ ịbụ otu Chineke ọ bụ ezie na nke ọ bụla nọọrọ onwe ya!
Otú ọ dị, eziokwu Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ bụ nanị Jehova bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Ya katụ ala nke o kere eke, na mmụọ nsọ bụkwa ike Ya nọ n’ọrụ. (Deuterọnọmi 6:4; Aịsaịa 45:5; Ọrụ 2:4; Ndị Kọlọsi 1:15; Mkpughe 3:14) Ozizi Atọ n’Ime Otu na-akparị onye ahụ nanị ya bụ ezi Chineke, ọ na-etigharịkwa ndị mmadụ anya, na-echigharị ha pụọ n’ebe Chineke nke ha na-apụghị ịghọta aghọta nọ.
Otu ihe ọzọ mmetụta ozizi Plato nke ọgbara ọhụrụ kpara aka ọjọọ n’echiche ndị Kraịst bụ olileanya nke otu puku afọ ahụ bụ́ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. (Mkpughe 20:4-6) A ma Origen ama maka nkatọ ọ katọrọ ndị kweere n’ọchịchị puku afọ. N’ihi gịnị ka o ji megide nnọọ ozizi a gbadosiri mkpọrọgwụ ike na Bible nke bụ́ na Kraịst ga-achị otu puku afọ? Akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia na-aza, sị: “N’ihi ozizi Plato nke ọgbara ọhụrụ bụ́ ebe ozizi ya dabeere . . . [Origen] apụghị ịdụnyere ndị ahụ na-akwado ọchịchị puku afọ ukwu.”
Eziokwu Ahụ
Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị e kwuru n’elu nke ya na eziokwu nwere njikọ. Eziokwu a bụ ozizi nile nke ndị Kraịst dị ka ha dị na Bible. (2 Ndị Kọrint 4:2; Taịtọs 1:1, 14; 2 Jọn 1-4) Bible bụ nanị otu isi iyi nke eziokwu e nwere.—Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16.
Otú ọ dị, onye iro Jehova, nke eziokwu, nke ihe a kpọrọ mmadụ, na nke ndụ ebighị ebi—Setan bụ́ Ekwensu, “ogbu mmadụ” na ‘nna ụgha’—ejiriwo ụzọ aghụghọ dị iche iche mee ihe iji gwagbuo eziokwu ahụ. (Jọn 8:44; tụlee 2 Ndị Kọrint 11:3.) Otu n’ime ngwá ọrụ ndị kasị ike o jiworo mee ihe bụ ozizi nke ndị ọkà ihe ọmụma na-ekpere arụsị bụ́ ndị Gris—n’ezie ngosipụta nke echiche ya—ná mgbalị ya iji gbanwee ihe ndị mejupụtara na ọdịdị nke ozizi ndị Kraịst.
Ngwakọta a na-adịghị otú o kwesịrị nke a gwakọtara ozizi ndị Kraịst na nkà ihe ọmụma ndị Gris bụ mgbalị iji gwagbuo eziokwu Bible, na-ebelata ikike ya ma na-eme ka ndị na-achọ eziokwu bụ́ ndị dị nwayọọ, nwere ezi obi, ma dị njikere ịmụta ihe, ghara inwechakwa mmasị na ya. (1 Ndị Kọrint 3:1, 2, 19, 20) Ọ na-achọkwa imerụ ịdị ọcha nke ozizi doro nnọọ anya nke Bible, na-eme ka a ghara ịhụtacha ọdịiche dị n’etiti eziokwu na okwu ụgha.
Taa, n’okpuru nduzi nke Onyeisi nke ọgbakọ, bụ́ Jisọs Kraịst, e weghachila ezi ozizi ndị Kraịst. Ọzọkwa, ndị ji ezi obi na-achọ eziokwu ahụ pụrụ ịmata ọgbakọ ndị Kraịst nke bụ́ ezigbo ya n’ụzọ dị mfe site ná mkpụrụ ya. (Matiu 7:16, 20) Ndịàmà Jehova dị njikere ma nwee mmasị inyere ndị dị otú ahụ aka ịchọta mmiri a na-agwagbughị agwagbu nke eziokwu ahụ na inyere ha aka ijidesi ihe nketa nke ndụ ebighị ebi nke Nna anyị, bụ́ Jehova na-enye, ike.—Jọn 4:14; 1 Timoti 6:19.
[Foto dị na peeji nke 11]
Augustine
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 10]
Ihe odide Grik: Site n’akwụkwọ bụ́ Ancient Greek Writers: Plato’s Phaedo, 1957, Ioannis N. Zacharopoulos, Atens; Plato: Musei Capitolini, Roma