Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 11/1 p. 14-19
  • Abamuru Ndị Na-esite n’Ịhụ Okwu Chineke n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Abamuru Ndị Na-esite n’Ịhụ Okwu Chineke n’Anya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị E Chebere Pụọ ná Mmerụ Ahụ Na-adịgide Adịgide
  • Nwapụta Onwe Gị Ịbụ ‘Ezi Ala’
  • ‘Ịmị Mkpụrụ n’Ezi Ọrụ Nile Ọ Bụla’
  • Abamuru Ndị Dị Ebube A Ga-enwe n’Ọdịnihu
  • Ọ Bụ “Chineke Na-eme Ka O Too”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • ‘Nọgidenụ n’Okwu m’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Jehova Hụrụ Ndị Ji “Ntachi Obi Na-amị Mkpụrụ” n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • “Nọgidenụ Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 11/1 p. 14-19

Abamuru Ndị Na-esite n’Ịhụ Okwu Chineke n’Anya

“Hụ [amamihe] n’anya, ọ ga-echebekwa gị. . . . Ọ ga-asọpụrụ gị, mgbe ị na-agbakụ ya obi.”—ILU 4:6, 8.

1. Gịnị ka ịhụ Okwu Chineke n’anya n’ezie gụnyere?

ỊGỤ Bible dị oké mkpa nye onye Kraịst. Otú ọ dị, nanị ịgụ ya adịghị n’onwe ya egosi ịhụ Okwu Chineke n’anya. Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ na-agụ Bible ma mgbe ahụ na-eme ihe ndị Bible katọrọ? N’ụzọ doro anya, ọ hụghị Okwu Chineke n’anya n’ụzọ ahụ onye dere Abụ Ọma nke 119 si hụ ya. Ịhụ Okwu Chineke n’anya dugara ya n’ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ndị ọ chọrọ n’aka ya.—Abụ Ọma 119:97, 101, 105.

2. Abamuru ndị dị aṅaa ka a na-enweta site n’amamihe dabeere n’Okwu Chineke?

2 Ibi ndụ kwekọrọ n’Okwu Chineke na-achọ mmadụ ime mgbanwe mgbe nile n’echiche na n’ụzọ ndụ ya. Omume dị otú ahụ na-egosipụta amamihe Chineke, nke pụtara itinye ihe ọmụma na nghọta e nwetara site n’ịmụ Bible n’ọrụ. “Hụ [amamihe] n’anya, ọ ga-echebekwa gị. Tụkọba ya elu, ọ ga-ebulikwa gị: ọ ga-asọpụrụ gị, mgbe ị na-agbakụ ya obi. Ọ ga-enye isi gị okpu amara: okpueze mara mma ka ọ ga-enye gị n’aka.” (Ilu 4:6, 8, 9) Lee ihe agbamume ịzụlite ịhụnanya n’ebe Okwu Chineke dị ma bụrụ onye ọ na-eduzi nke a bụ! Olee onye na-adịghị achọ ka e chebe ya, bulie ya, sọpụrụkwa ya?

Ndị E Chebere Pụọ ná Mmerụ Ahụ Na-adịgide Adịgide

3. Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, n’ihi gịnị ka o ji dị ndị Kraịst mkpa ịbụ ndị e chebere, ọ̀ bụkwa pụọ n’aka onye?

3 N’ụzọ dị aṅaa ka amamihe e nwetara site n’ịmụ na itinye Okwu Chineke n’ọrụ si echebe mmadụ? Otu ihe bụ na a na-echebe ya pụọ n’aka Setan Ekwensu. Jisọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere maka nnapụta pụọ n’aka ajọ onye ahụ, bụ́ Setan. (Matiu 6:13) Taa, e nwere mkpa dị ngwa n’ezie itinye arịrịọ a n’ekpere anyị. E si n’eluigwe chụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya mgbe 1914 gasịrị, n’ihi ya kwa, Setan na-enwe “oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:9, 10, 12) Ugbu a oge garala, iwe ya aghaghị ịkpụ ọkụ n’ọnụ ka ọ na-ebu agha n’enweghị ihe ịga nke ọma megide “ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs.”—Mkpughe 12:17.

4. Olee otú e si echebe ndị Kraịst pụọ ná nrụgide na ọnyà Setan?

4 N’ọnụma ya, Setan na-anọgide na-akpatara ndị Kraịst a bụ́ ndị ozi nsogbu, na-akpalikwa mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ma ọ bụ na-akpata ihe mgbochi ndị ọzọ nye ọrụ ha. Ọ na-achọkwa ịraba ndị nkwusa Alaeze n’ilekwasị anya n’ihe ndị dị ka ịbụ ndị a ma ama n’ụwa, ịhụ ntụrụndụ n’anya, ịkpakọba ihe onwunwe, na ịchụso ihe ụtọ, kama ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. Gịnị na-echebe ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi pụọ n’ịdaba ná nrụgide Setan ma ọ bụ n’ịbụ ndị ọnyà ya matara? N’ezie, ekpere, iso Jehova na-enwe mmekọrịta onwe onye chiri anya, na inwe okwukwe na nkwa ya ga-emezurịrị dị mkpa. Ma e jikọtara ihe a nile na inwe ihe ọmụma banyere Okwu Chineke na mkpebisi ike ịṅa ntị n’ihe ncheta ya. A na-enweta ihe ncheta ndị a site n’ịgụ Bible na akwụkwọ ndị na-enye aka ịmụ Bible, ịga nzukọ ndị Kraịst, ịṅa ntị na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ sitere n’aka onye kwere ekwe ibe anyị, ma ọ bụkwanụ site nanị n’iji ekpere na-atụgharị uche n’ụkpụrụ Bible ndị mmụọ Chineke na-eme ka a na-echeta.—Aịsaịa 30:21; Jọn 14:26; 1 Jọn 2:15-17.

5. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka amamihe dabeere n’Okwu Chineke si echebe anyị?

5 A na-echebe ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya n’ụzọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ha na-ezere ahụhụ mmetụta uche na ọrịa anụ ahụ ndị a na-enweta site n’ihe ndị dị ka ịṅụ ọgwụ ọjọọ, iji ụtaba eme ihe, na mmekọahụ rụrụ arụ. (1 Ndị Kọrint 5:11; 2 Ndị Kọrint 7:1) Ha adịghị atụnye ụtụ n’imebi mmekọrịta site n’ịgba asịrị ma ọ bụ ikwu okwu obi ọjọọ. (Ndị Efesọs 4:31) Ha adịghịkwa adaba n’inwe obi abụọ site n’imikpu onwe ha na nkà ihe ọmụma nke amamihe ụwa bụ́ nke na-eduhie eduhie. (1 Ndị Kọrint 3:19) Site n’ịhụ Okwu Chineke n’anya, a na-echebe ha pụọ n’ihe ndị pụrụ ịnapụ ha mmekọrịta ha na Chineke na olileanya nke ndụ ebighị ebi. Ha na-arụsi ọrụ ike n’inyere ndị agbata obi ha aka inwe okwukwe ná nkwa ndị dị ebube bụ́ ndị dị na Bible, na-amara na ha ga-esi otú ahụ ‘zọpụta onwe ha zọpụtakwa ndị na-anụ olu ha.’—1 Timoti 4:16.

6. Olee otú amamihe dabeere n’Okwu Chineke pụrụ isi chebe anyị ọbụna n’ọnọdụ ndị tara akpụ?

6 N’ezie, “mgbe na ihe ndapụta” na-adabara onye ọ bụla—ọbụna ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya. (Eklisiastis 9:11) Ọ bụ ihe a na-apụghị izere ezere na ọdachi ndị na-emere onwe ha, oké ọrịa, ihe mberede, ma ọ bụ ọnwụ nnwụchu ga-adakwasị ụfọdụ n’ime anyị. Ma, a na-echebe anyị. Ọ dịghị ọdachi pụrụ iwetara onye hụrụ Okwu Chineke n’anya n’ezie mmerụ ahụ na-adịgide adịgide. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịdị na-echegbubiga onwe anyị ókè banyere ihe pụrụ ime n’ọdịnihu. Mgbe anyị mesịrị ihe nile ezi uche dị na ya ime, ọ ka mma ịhapụrụ Jehova okwu ma ghara ikwe ka ndụ anọghị ná nchebe nke oge a napụ anyị udo. (Matiu 6:33, 34; Ndị Filipaị 4:6, 7) Buru n’uche ịbụ eziokwu nke olileanya mbilite n’ọnwụ nakwa nke ndụ ka mma mgbe Chineke ‘ga-eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.’—Mkpughe 21:5; Jọn 11:25.

Nwapụta Onwe Gị Ịbụ ‘Ezi Ala’

7. Ilu dị aṅaa ka Jisọs tụụrụ ìgwè mmadụ bịara ige ya ntị?

7 E mere ka ịdị mkpa nke inwe echiche ziri ezi banyere Okwu Chineke pụta ìhè n’otu n’ime ilu Jisọs. Ka Jisọs nọ na-akpọsa ozi ọma ahụ na Palestine nile, ìgwè mmadụ gbakọtara ige ya ntị. (Luk 8:1, 4) Otú ọ dị, ọ bụghị ha nile hụrụ Okwu Chineke n’anya n’ezie. Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ bịara ige ya ntị n’ihi na ha chọrọ ịhụ ọrụ ebube ma ọ bụ n’ihi na ha nwere mmasị n’ụzọ dị ebube o si ezi ihe. N’ihi ya, Jisọs tụụrụ ìgwè mmadụ ahụ ilu, sị: “Ọgha mkpụrụ pụrụ ka ọ ghaa mkpụrụ ya: mgbe ọ na-agha, ụfọdụ wee daa n’akụkụ ụzọ; e wee zọkwasị ha ụkwụ, anụ ufe nke eluigwe wee tụtụrie ha. Mkpụrụ ọzọ wee daa n’elu oké nkume; mgbe ha puru ome, ha wee kpọnwụọ, n’ihi na ha enweghị ala mmiri. Mkpụrụ ọzọ wee daa n’etiti ogwu; ogwu ahụ wee so ha puo, kpagbuo ha. Mkpụrụ ọzọ wee daa n’ezi ala, ha wee puo, wee mịa mkpụrụ [otu narị otu narị].”—Luk 8:5-8.

8. N’ilu Jisọs, gịnị bụ mkpụrụ ahụ?

8 Ilu Jisọs gosiri na a ga-enwe mmeghachi omume dịgasị iche n’ebe nkwusa ozi ọma ahụ dị, na-adabere n’ọnọdụ obi nke onye nụrụ ya. Mkpụrụ ahụ a na-agha bụ “okwu Chineke.” (Luk 8:11) Ma ọ bụ, dị ka ihe ndekọ ọzọ nke ilu ahụ si kwuo, mkpụrụ ahụ bụ “okwu alaeze eluigwe.” (Matiu 13:19) Jisọs pụrụ iji okwu abụọ ahụ mee ihe, ebe ọ bụ na isiokwu nke Okwu Chineke bụ Alaeze eluigwe nke Jisọs Kraịst bụ Eze ya bụ́ nke Jehova ga-eji wepụ ọbụbụeze ya n’ụta ma doo aha ya nsọ. (Matiu 6:9, 10) Mgbe ahụ, n’ezie, mkpụrụ ahụ bụ ozi nke ozi ọma dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ndịàmà Jehova na-eme ka ozi Alaeze a pụta ìhè ka ha na-agha mkpụrụ n’iṅomi Ọgha Mkpụrụ mbụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Mmeghachi omume dị aṅaa ka ha na-ahụ?

9. Gịnị ka mkpụrụ ndị ahụ na-ada n’ebe ndị a na-ese onyinyo ha, (a) n’akụkụ ụzọ? (b) n’elu oké nkume? (ch) n’etiti ogwu?

9 Jisọs sịrị na ụfọdụ mkpụrụ na-ada n’akụkụ ụzọ e wee zọkwasị ha ụkwụ. Nke a na-ezo aka n’ebe ndị tinyere uche ha n’ihe ọzọ nọ nke na mkpụrụ Alaeze ahụ apụghị ịgba mkpọrọgwụ n’obi ha. Tupu ha enwee ike ịzụlite ịhụnanya maka Okwu Chineke, “ekwensu [abịa], wee napụ okwu ahụ n’obi ha, ka ha ghara ikwere, e wee zọpụta ha.” (Luk 8:12) Ụfọdụ mkpụrụ na-ada n’elu oké nkume. Nke a na-ezo aka n’ebe ndị a dọtara uche ha n’ozi Bible nọ ma ha ekweghị ka o metụta obi ha. Mgbe mkpagbu bịara ma ọ bụ mgbe o siiri ha ike itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ, “ha [ewezụga] onwe ha” n’ihi na ha enweghị mkpọrọgwụ. (Luk 8:13) Mgbe ahụ e nwere ndị na-anụ okwu ahụ ma “nchegbu na akụ̀ na ihe ụtọ nke ndụ a” erikpuo ha. N’ikpeazụ, a “na-akpagbu ha” dị ka ihe ọkụkụ ndị ogwu kpagidere.—Luk 8:14.

10, 11. (a) Olee ndị ezi ala ahụ na-ese onyinyo ha? (b) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji ‘jisie Okwu Chineke ike’ n’obi anyị?

10 N’ikpeazụ, e nwere mkpụrụ ndị na-ada n’ezi ala. Nke a na-ezo aka n’ebe ndị na-eji “ezi obi dị mma” anabata ozi ahụ nọ. N’ụzọ kwekọrọ n’ọchịchọ anyị, onye ọ bụla n’ime anyị ga-enwe mmasị ikweta na o so ná ndị a. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ọ bụ echiche Chineke bụ ihe dị mkpa. (Ilu 17:3; 1 Ndị Kọrint 4:4, 5) Okwu ya na-ekwu na anyị inwe “ezi obi dị mma” bụ ihe anyị na-anwapụta site n’omume ndị anyị na-eme site ugbu a ruo mgbe anyị ga-anwụ ma ọ bụ ruo mgbe Chineke ga-eweta ajọ usoro ihe a ná njedebe. Ọ bụrụ na mmeghachi omume mbụ anyị nye ozi Alaeze ahụ dị mma, nke ahụ amaka. Otú ọ dị, ndị nwere ezi obi dị mma na-anabata Okwu Chineke ma ‘na-ejisi ya ike, werekwa ntachi obi na-amị mkpụrụ.’—Luk 8:15.

11 Nanị ụzọ a pụrụ ịdabere na ya isi jisie Okwu Chineke ike n’obi anyị bụ ịgụ na ịmụ ya nanị anyị nakwa iso ndị kwere ekwe ibe anyị na-amụ ya. Nke a na-agụnye irite uru zuru ezu site ná nri ime mmụọ nke ndị a họpụtara ilekọta ọdịmma ime mmụọ nke ezi ụmụazụ Jisọs na-enye. (Matiu 24:45-47) Site n’ụzọ dị otú ahụ, ịhụnanya na-akwali ndị jisiri Okwu Chineke ike n’obi ha ‘iwere ntachi obi mịa mkpụrụ.’

12. Gịnị bụ mkpụrụ ahụ anyị na-aghaghị iji ntachi obi mịa?

12 Olee mkpụrụ ezi ala ahụ na-amị? N’ala nkịtị, mkpụrụ na-eto ghọọ ihe ọkụkụ ndị na-amị mkpụrụ ndị ha na ya bụ otu, bụ́ ndị a pụziri ịgha ka ha mịkwuo mkpụrụ. N’otu aka ahụ, nye ndị nwere ezi obi dị mma, mkpụrụ nke okwu ahụ na-eto n’ime ha, na-eme ka ha na-enwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ ruo mgbe ha, n’onwe ha, pụrụ ịgha mkpụrụ ahụ n’obi ndị ọzọ. (Matiu 28:19, 20) E jikwa ntachi obi mara ọrụ ịgha mkpụrụ ha. Jisọs gosiri ịdị mkpa nke ntachi obi n’ịgha mkpụrụ mgbe ọ sịrị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta. A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:13, 14.

‘Ịmị Mkpụrụ n’Ezi Ọrụ Nile Ọ Bụla’

13. Olee ekpere Pọl kpere nke jikọtara ịmị mkpụrụ na Okwu Chineke?

13 Pọl onyeozi kwukwara banyere mkpa ọ dị ịmị mkpụrụ, o jikọtakwara ịmị mkpụrụ na Okwu Chineke. O kpere ekpere ka ndị kwere ekwe ibe ya “jupụta ná mmazu nke ihe [Chineke] na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ, ka unu jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile, na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla.”—Ndị Kọlọsi 1:9, 10; Ndị Filipaị 1:9-11.

14-16. N’ikwekọ n’ekpere Pọl, olee mkpụrụ ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya na-amị?

14 Pọl si otú a na-egosi na inweta ihe ọmụma Bible abụghị ebe o biri. Kama nke ahụ, ịhụnanya maka Okwu Chineke na-akwali anyị ‘ijegharị n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị’ site n’ịnọgide “na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla.” Olee ezi ọrụ ọ bụ? Ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ bụ ọrụ dị ịrịba ama e nyere ndị Kraịst na mgbe ikpeazụ a. (Mak 13:10) Tụkwasị na nke ahụ, ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya na-eme ike ha nile iji ego na-akwado ọrụ a mgbe nile. Ha na-enwe obi ụtọ n’ihe ùgwù a, na-amara na “Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) A na-eji onyinye ha akwụ ụgwọ mmefu ndị a na-eme n’ilekọta ihe karịrị otu narị ihe owuwu Betel bụ́ ebe a nọ eduzi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, na-ebipụtakwa Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ụfọdụ n’ime ha. Onyinye ha na-enyekwa aka n’ịkwụ ụgwọ mmefu ndị a na-eme ná mgbakọ ndị buru ibu nke ndị Kraịst na nke izipụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ozi ala ọzọ, na ndị ọzọ na-ezisa ozi ọma oge nile.

15 Ezi ọrụ ndị ọzọ na-agụnye iwu na ilekọta ebe ndị a na-anọ efe ezi ofufe. Ịhụnanya maka Okwu Chineke na-akwali ndị na-efe ya ijide n’aka na e legharaghị Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze anya. (Tụlee Nehemaịa 10:39.) Ebe ọ bụ na aha Chineke na-agba n’ihu ụlọ ndị dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka e debe ime ha na mpụga ha ọcha ka ha na-adọrọkwa adọrọ, nakwa ka àgwà nke ndị na-efe ofufe n’ime ụlọ nzukọ ndị dị otú ahụ bụrụ nke na-adịghị eweta nkọcha. (2 Ndị Kọrint 6:3) Ụfọdụ ndị Kraịst na-enwe ike ime ihe ka ukwuu. Ịhụnanya maka Okwu Chineke na-akpali ha ime njem dị anya iji kere òkè n’iwu ụlọ ofufe ndị ọhụrụ n’akụkụ ụwa ebe e nwere mkpa n’ihi ịda ogbenye ma ọ bụ enweghị nkà.—2 Ndị Kọrint 8:14.

16 ‘Ịmị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla’ na-agụnyekwa ilekọta ibu ọrụ ezinụlọ na inwe mmetụta n’ebe ndị Kraịst ibe anyị nọ. Ịhụnanya maka Okwu Chineke na-akwali anyị inwe mmetụta banyere mkpa nke ndị “ezinụlọ nke okwukwe anyị” na “ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka [anyị].” (Ndị Galetia 6:10; 1 Timoti 5:4, 8) N’ihe banyere nke a, ọ bụ ezi ọrụ ileta ndị ọrịa na ịkasị ndị na-eru újú obi. Leekwa ezi ọrụ ndị okenye ọgbakọ na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ na-arụ n’inyere ndị chere ọnọdụ ahụ ike ndị na-ama aka ihu, aka! (Ọrụ 15:29) Mgbe ahụ, e nwere ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ọdachi—ndị ụfọdụ n’ime ha na-emere onwe ha, ndị ọzọ abụrụ ndị enweghị ezi uche nke mmadụ na-akpata. Site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, Ndịàmà Jehova enweela ihe ndekọ dị mma n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa nke iwetara ndị kwere ekwe ibe ha na ndị ọzọ ọdachi na ihe mberede dakwasịrị, ihe enyemaka ozugbo. Ihe a nile bụ ezi mkpụrụ nke ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya na-egosipụta.

Abamuru Ndị Dị Ebube A Ga-enwe n’Ọdịnihu

17, 18. (a) Gịnị ka a na-arụzu site n’ịgha mkpụrụ Alaeze? (b) Olee ihe omume ndị ga-eme ka ụwa mee mkpatụ nke ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya ga-ahụ n’isi nso?

17 Ọghịgha mkpụrụ Alaeze na-anọgide na-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ abamuru dị ukwuu. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ihe karịrị mmadụ 300,000 kwa afọ ekwewo ka ozi Bible gbanye mkpọrọgwụ n’obi ha ruo n’ókè nke na ha ararawo ndụ ha nye Jehova ma gosipụta nke a site na baptism ime mmiri. Lee ọdịnihu dị ebube na-echere ha!

18 N’isi nso, ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya maara na Jehova Chineke ga-ebili ọtọ iji bulie aha ya elu. A ga-ebibi “Babilọn ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:2, 8) Mgbe ahụ, Eze, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-egbu ndị jụrụ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Chineke. (Abụ Ọma 2:9-11; Daniel 2:44) Mgbe nke ahụ gasịrị, Alaeze Chineke ga-eweta ahụ efe na-adịgide adịgide pụọ na mpụ, agha, na ọdachi ndị ọzọ. A gaghịzi enwe mkpa nke ịkasị ndị mmadụ obi n’ihi ihe mgbu, ọrịa, na ọnwụ.—Mkpughe 21:3, 4.

19, 20. Olee ọdịnihu dị ebube nke na-echere ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya n’ezie?

19 Lee ezi ọrụ dị ebube nke ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya ga-arụzu mgbe ahụ! Ndị lanarịrị Amagedọn ga-eji ọrụ na-enye ọṅụ nke ime ka ụwa a ghọọ paradaịs malite. Ha ga-enwe ihe ùgwù na-akpali akpali nke ịkwadebe maka mkpa nke ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị na-ezu ike ugbu a n’ili ma nọrọ ná ncheta Chineke, na-enwe atụmanya nke ikere òkè ná mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:28, 29) N’oge ahụ, ndị bi n’ụwa ga-enweta nduzi zuru ezu n’aka Eze Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, site n’aka Ọkpara ya e buliri elu, bụ́ Jisọs Kraịst. ‘A ga-asaghe akwụkwọ dị iche iche,’ na-ekpughe ntụziaka Jehova maka ibi ndụ n’ime ụwa ọhụrụ.—Mkpughe 20:12.

20 N’oge Jehova kara aka, a ga-eweli ndị nile so n’òtù ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi gaa n’ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe dị ka “ndị ha na Kraịst na-ekekọ.” (Ndị Rom 8:17) N’ime Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, a ga-ebuli mmadụ nile nọ n’ụwa bụ́ ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya gaa n’izu okè nke uche na anụ ahụ. Mgbe ha kwesịsịrị ntụkwasị obi n’ule ikpeazụ, a ga-eji ndụ ebighị ebi kwụghachị ha ụgwọ, ha ga-anụkwa ụtọ ‘inwe onwe nke ebube nke ụmụ Chineke.’ (Ndị Rom 8:21; Mkpughe 20:1-3, 7-10) Lee oge dị ebube nke ahụ ga-abụ! N’ezie, ma Jehova ò nyere anyị olileanya nke ndụ eluigwe ma ọ bụ nke elu ala, inwe ịhụnanya na-adịgide adịgide n’ebe Okwu ya dị na mkpebisi ike ibi ndụ kwekọrọ n’amamihe Chineke ga-echebe anyị. N’ọdịnihu kwa, ọ ‘ga-asọpụrụ anyị, mgbe anyị na-agbakụ ya obi.’—Ilu 4:6, 8.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Olee otú ịhụ Okwu Chineke n’anya ga-esi chebe anyị?

◻ Gịnị bụ mkpụrụ nke ilu Jisọs, è sikwa aṅaa agha ya?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị bụ ‘ezi ala’?

◻ Abamuru ndị dị aṅaa ka ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya pụrụ ịtụ anya ha?

[Foto dị na peeji nke 16]

Mkpụrụ nke ilu Jisọs na-ese onyinyo ozi nke ozi ọma dị n’Okwu Chineke

[Ebe E Si Nweta Foto]

Garo Nalbandian

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndịàmà Jehova na-eṅomi Ọgha Mkpụrụ Ukwu ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ndị lanarịrị Amagedọn ga-anụ ụtọ mkpụrụ dị iche iche nke ụwa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya