Jehova Hụrụ Ndị Ji “Ntachi Obi Na-amị Mkpụrụ” n’Anya
‘Ma ndị ahụ dara n’ala dị mma bụ ndị . . . ji ntachi obi na-amị mkpụrụ.’—LUK 8:15.
1, 2. (a) Olee otú ozi ọma ụmụnna na-ezi n’ebe ndị mmadụ na-anaghị egekarị ntị si agba anyị ume? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka Jizọs kwuru gbasara mmadụ ikwusa ozi ọma “n’obodo a mụrụ ya”? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)
SERGIO NA OLINDA bụ di na nwunye na-asụ ụzọ n’Amerịka. Ha abụọ akarịala afọ iri asatọ. N’oge na-adịbeghị anya, ịga ije na-esiri ha ike n’ihi ụkwụ na-egbu ha mgbu. Ma, e nwere ihe ha na-eme kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a. N’ụtụtụ, ha na-eji ụkwụ aga n’ebe na-ekwo ekwo n’obodo ha. Ha na-erute ebe ahụ n’elekere asaa ụtụtụ. Ha na-anọ ebe dị nso n’ebe ụgbọala na-akwụsị ndị mmadụ, na-enye ndị na-agafe agafe akwụkwọ anyị. Ọtụtụ ndị anaghị atụpụrụ ha ọnụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-anọ n’ebe ahụ na-amụmụrụ ndị lere ha anya ọnụ ọchị. Ọ kụọ elekere iri na abụọ, ha ejiri nwayọọ lawa. N’ụtụtụ echi ya, n’elekere asaa, ha anọrọla n’ebe ahụ. Di na nwunye a na-ekwusa ozi ọma ebe ahụ ụbọchị isii n’izu, si n’afọ ruo n’afọ.
2 Ọtụtụ ụmụnna n’ụwa niile na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anaghị egekarị ntị kemgbe ọtụtụ afọ otú ahụ Sergio na Olinda na-eme. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, anyị na-aja gị mma maka otú i si na-enwe ndidi.a Otú i si nọgidesie ike na-efe Jehova na-agba ọtụtụ ndị ume, ma ndị na-efeela ya ọtụtụ afọ. Lee ihe ndị nlekọta sekit kwuru. Otu onye kwuru, sị: “Mụ na ụmụnna ndị a rụọ n’ozi ọma, otú ha si eje ozi na-agba m ume.” Onye ọzọ ekwuo, sị: “Otú ha si nọgide na-eje ozi ọma na-agba m ume ịnọgide na-eje ozi m ma na-enwekwa obi ike.” Onye ọzọ ekwuokwa, sị: “Otú ha si eje ozi na-eme m obi ụtọ.”
3. Olee ajụjụ atọ ndị anyị ga-atụle, n’ihi gịnịkwa?
3 Ka anyị tụlee azịza ajụjụ atọ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwusa ozi ọma Jizọs gwara anyị kwusaa ruo mgbe anyị kwusachara ya. Ajụjụ ndị ahụ bụ: Olee ihe nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi mgbe ụfọdụ? Olee otú anyị ga-esi na-amị mkpụrụ? Gịnị ga-enyere anyị aka iji ntachi obi na-amị mkpụrụ?
OLEE IHE NWERE IKE IME KA ANYỊ DAA MBÀ?
4. (a) Olee otú obi dị Pọl n’ihi otú ọtụtụ ndị Juu si kpaso ya àgwà? (b) Gịnị mere obi ji dị ya otú ahụ?
4 Ọ bụrụ na ị datụla mbà n’obi n’ihi ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anaghị egekarị ntị, ị ga-aghọta otú obi dị Pọl onyeozi n’oge ya. O jere ozi ihe dị ka afọ iri atọ, nyekwara ọtụtụ ndị aka ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Ọrụ 14:21; 2 Kọr. 3:2, 3) Ma, o meghị ka ndị Juu niile fewe Chineke. Kama nke ahụ, ọtụtụ ndị egeghị ya ntị, ndị ọzọ mesidịrị ya ike. (Ọrụ 14:19; 17:1, 4, 5, 13) Olee otú obi dị ya n’ihi otú ndị Juu si meso ya ihe? Ọ sịrị: “Eziokwu ka m na-ekwu n’ime Kraịst . . . m nwere oké iru uju na ihe mgbu na-adịghị akwụsị akwụsị n’ime obi m.” (Rom 9:1-3) Gịnị mere obi ji dịrị Pọl otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na obi ya niile dị n’ikwusa ozi ọma. Ihe mere o ji kwusaara ndị Juu ozi ọma bụ n’ihi na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi. N’ihi ya, o wutere Pọl na ha jụrụ ebere Chineke meere ha.
5. (a) Gịnị mere anyị ji na-ekwusara ndị agbata obi anyị ozi ọma? (b) Gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya na anyị na-ada mbà n’obi mgbe ụfọdụ?
5 Ihe mere anyị ji ekwusara ndị mmadụ ozi ọma bụ n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya otú ahụ Pọl hụrụ ndị o ziri ozi ọma n’anya. (Mat. 22:39; 1 Kọr. 11:1) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị ma na e nwere ọtụtụ ihe ọma Jehova ga-emere ndị kpebiri ife ya. Anyị chee gbasara ndị nọ n’ókèala anyị, anyị na-agwa onwe anyị, sị, ‘A sịkwa na anyị ga-enyere ha aka ịmata ihe na-efunahụ ha.’ N’ihi ya, anyị na-agba ha ume ka ha na-amụ banyere Jehova na ihe ndị o kwere nkwa imere anyị. E nwere ike ikwu na ihe anyị na-agwa ndị anyị na-ezi ozi ọma bụ: ‘E nwere ọmarịcha onyinye anyị wetaara unu. Biko, naranụ ya.’ Ma, ọ bụrụ na ha ajụ ịnara anyị ya, o doro anya na anyị nwere ike inwe ‘ihe mgbu n’obi anyị.’ Ọ dị anyị otú ahụ, ọ pụtaghị na anyị enweghị okwukwe, kama ọ pụtara na obi anyị dị n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịda mbà n’obi mgbe ụfọdụ, anyị na-atachi obi. Elena, onye sụrụla ụzọ karịa afọ iri abụọ na ise, kwuru otú ọ na-adị ọtụtụ n’ime anyị. Ọ sịrị: “Ikwusa ozi ọma na-esiri m ike. N’agbanyeghị nke ahụ, o nweghị ọrụ ọzọ m ga-arụ ka ya mma.”
OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-AMỊ MKPỤRỤ?
6. Olee ajụjụ anyị ga-atụle? Olee otú anyị ga-esi atụle ya?
6 Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ozi anyị nwere ike ịga nke ọma n’agbanyeghị ebe anyị nọ na-ezi ya? Ka anyị nwee ike ịza ajụjụ a dị mkpa, anyị ga-atụle ihe atụ abụọ Jizọs mere. O ji ihe atụ ndị a kọwaa ihe mere anyị kwesịrị iji “na-amị mkpụrụ.” (Mat. 13:23) Nke mbụ bụ gbasara osisi vaịn.
7. (a) Ònye “kụrụ” osisi vaịn ahụ, ònye bụkwa “osisi vaịn” ahụ, oleekwa ndị bụ́ “alaka ya”? (b) Olee ajụjụ anyị ga-achọ ịmata azịza ya?
7 Gụọ Jọn 15:1-5, 8. Cheta na Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “A na-enye Nna m otuto na nke a, ka unu na-amị mkpụrụ dị ukwuu, unu ewee bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” Jizọs kwuru na ọ bụ Jehova “kụrụ” osisi vaịn ahụ, yanwa abụrụ “osisi vaịn” ahụ, ndị na-eso ụzọ ya abụrụkwanụ “alaka ya.”b Gịnị bụ mkpụrụ ahụ Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-amị? N’ihe atụ a, Jizọs ekwughị hoo haa ihe mkpụrụ ahụ bụ, ma o kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya.
8. (a) N’ihe atụ a, gịnị mere mkpụrụ ahụ anyị ga-amị abụghị ndị anyị nyeere aka ha abụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs? (b) Olee ihe Jehova na-agaghị asị anyị mee?
8 Mgbe Jizọs na-ekwu banyere Nna ya, ọ sịrị: “Ọ na-ewepụ alaka ọ bụla dị na m nke na-adịghị amị mkpụrụ.” Ihe ọ na-ekwu bụ na Jehova na-ewere anyị ka ndị na-efe ya naanị ma anyị na-amị mkpụrụ. (Mat. 13:23; 21:43) N’ihe atụ a, mkpụrụ Onye Kraịst ọ bụla ga-amịrịrị abụghị mmadụ ole o nyeere aka ha aghọọ ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19) Ọ bụrụ otú ahụ, Ndịàmà Jehova ndị na-enweghị onye ha nyeere aka ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ihi na ha na-eje ozi n’ebe ndị mmadụ na-anaghị egecha ntị, ga-adịzi ka alaka ndị ahụ na-anaghị amị mkpụrụ n’ihe atụ ahụ Jizọs mere. Ma, anyị ekwesịghị iche otú ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị anaghị amanye ndị mmadụ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ gaghị asị na anyị abaghị uru n’ihi na anyị emeghị ihe anyị na-agaghị emeli. Ihe ọ bụla Jehova sị anyị mee bụ ihe anyị ga-emeli.—Diut. 30:11-14.
9. (a) Olee ọrụ anyị na-arụ nke na-eme ka anyị na-amị mkpụrụ? (b) Olee ihe atụ anyị ga-atụle, n’ihi gịnịkwa?
9 Gịnịzi bụ mkpụrụ ahụ anyị ga-amị? O doro anya na mkpụrụ ahụ ga-abụ ọrụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-arụli. Olee ọrụ ga-eme ka anyị “na-amị mkpụrụ”? Ọ bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.c (Mat. 24:14) Ihe mere ka o doo anya bụ ihe atụ Jizọs mere gbasara onye na-agha mkpụrụ. Ka anyị tụlee ihe atụ nke abụọ.
10. (a) N’ihe atụ a, gịnị ka mkpụrụ na ala ahụ nọchiri anya ha? (b) Gịnị ka osisi wit ahụ mịrị?
10 Gụọ Luk 8:5-8, 11-15. N’ihe atụ Jizọs mere gbasara ọgha mkpụrụ, mkpụrụ ahụ bụ “okwu Chineke,” ma ọ bụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ala ahụ nọchiri anya obi mmadụ. Mkpụrụ ahụ nke dara n’ala dị mma bịara nwee mgbọrọgwụ, pulite ma ghọọ osisi. O mechara ‘mịa mkpụrụ okpukpu otu narị.’ Ọ bụrụ na osisi a bụ osisi wit, olee ụdị mkpụrụ ọ ga-amị? Ọ̀ ga-amị obere osisi wit? Mba, ọ ga-amị mkpụrụ ọhụrụ, bụ́ nke ga-emecha pulite ma ghọọ osisi wit. N’ihe atụ a, otu mkpụrụ mịtara otu narị mkpụrụ. Gịnị ka ihe atụ a na-akụziri anyị gbasara ozi anyị?
Olee otú anyị si eji “ntachi obi na-amị mkpụrụ”? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)
11. (a) Gịnị ka ihe atụ gbasara ọgha mkpụrụ ahụ na-akụziri anyị gbasara ozi anyị? (b) Olee otú anyị si amị mkpụrụ ọhụrụ?
11 Mgbe mbụ nne na nna anyị ma ọ bụ Ndịàmà Jehova kụziiri anyị gbasara Alaeze Chineke, o yiri ka hà kụrụ mkpụrụ n’ezi ala. Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ mgbe ha chọpụtara na anyị nabatara ihe ha kụziiri anyị. Mkpụrụ ahụ nọgidere na-eto ruo mgbe o toruru ịmị mkpụrụ. Otú ahụ osisi wit ahụ e kwuru banyere ya ná mmalite amịghị osisi ọhụrụ, kama mkpụrụ ọhụrụ, otú ahụkwa ka mkpụrụ anyịnwa na-amị abụghị ndị na-eso ụzọ ọhụrụ, kama mkpụrụ ọhụrụ.d Olee otú anyị si amị mkpụrụ ọhụrụ? Mgbe ọ bụla anyị gwara mmadụ gbasara Alaeze Chineke, o yiri ka ànyị na-aghasa mkpụrụ ahụ a kụrụ n’obi anyị. (Luk 6:45; 8:1) N’ihi ya, ihe atụ a na-akụziri anyị na ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, anyị ji “ntachi obi na-amị mkpụrụ.”
12. (a) Olee ihe anyị na-amụta n’ihe atụ Jizọs mere gbasara osisi vaịn na ọgha mkpụrụ? (b) Olee otú obi dị gị maka ya?
12 Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe atụ Jizọs mere gbasara osisi vaịn na ọgha mkpụrụ? Ha na-eme ka anyị ghọta na ihe na-eme ka anyị na-amị mkpụrụ abụghị otú ndị mmadụ si ege anyị ntị n’ozi ọma, kama, ọ bụ otú anyị si nọgide na-ekwusa ozi ọma. Pọl kwukwara ihe yiri ya mgbe ọ sịrị: “Onye ọ bụla ga-anata ụgwọ ọrụ nke ya dị ka ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ si dị.” (1 Kọr. 3:8) Ihe Jehova ga-eji akwụ anyị ụgwọ bụ maka ọrụ anyị, ọ bụghị mmadụ ole anyị nyeere aka ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Otu nwanna nwaanyị sụrụla ụzọ afọ iri abụọ aha ya bụ Matilda kwuru, sị: “Obi na-atọ m ụtọ na Jehova na-agọzi mgbalị anyị.”
OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI JIRI NTACHI OBI NA-AMỊ MKPỤRỤ?
13, 14. Olee ihe Ndị Rom 10:1, 2 kwuru mere Pọl ji nọgide na-ekwusara ndị na-achọghị iji ntị anụ gbasara ozi ọma Alaeze ahụ, ozi ọma?
13 Gịnị ga-enyere anyị aka iji ntachi obi na-amị mkpụrụ? Dị ka anyị tụlere, o wutere Pọl na ndị Juu jụrụ ozi ọma Alaeze o ziri ha. Ma nke ahụ emeghị ka ọ kwụsị izi ha ozi ọma. Lee ihe o mechara kwuo banyere otú obi dị ya gbasara ndị Juu ahụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Rom. Ọ sịrị: “Ezi ọchịchọ obi m na arịrịọ m na-arịọsi Chineke ike maka ha bụ, n’ezie, ka a zọpụta ha. N’ihi na ana m agbara ha akaebe na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” (Rom 10:1, 2) Olee ihe mere Pọl ji nọgide na-ekwusa ozi ọma?
14 Nke mbụ, Pọl kwuru na ihe mere o ji kwusaara ndị Juu ozi ọma bụ n’ihi ‘ezi ọchịchọ obi ya.’ Ọ chọrọ ka a zọpụta ụfọdụ n’ime ha. (Rom 11:13, 14) Nke abụọ, Pọl ‘rịọsiri Chineke arịrịọ ike maka ha.’ Ọ rịọrọ Chineke ka o nyere onye Juu ọ bụla aka ịnabata ozi ọma Alaeze ahụ. Nke atọ, Pọl kwuru, sị: “Ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi.” Pọl hụrụ ebe ha na-eme nke ọma, marakwa na ha nwere ike bịa fewe Jehova. Ọ ma na ndị Juu ahụ na-anụ ọkụ n’obi nwere ike mechaa ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na anụ ọkụ n’obi ka yanwa.
15. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Pọl? Nye ihe atụ.
15 Olee otú anyị ga-esi eme ka Pọl? Nke mbụ, anyị ga-agbalịsi ike na-achọ ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi.” Nke abụọ, anyị ga-arịọ Jehova ka o mee ka ndị chọrọ ịmata gbasara ya gee anyị ntị. (Ọrụ 13:48; 16:14) Nwanna nwaanyị aha ya bụ Silvana, onye sụrụla ụzọ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri atọ, kwuru, sị: “Tupu mụ erute n’ụlọ mmadụ izi ya ozi ọma, m na-ebu ụzọ rịọ Jehova ka o mee ka m lee ndị mmadụ anya otú kwesịrị ekwesị.” Anyị na-arịọkwa Jehova ka o jiri ndị mmụọ ozi ya duru anyị gaa na nke ndị nwere mmasị. (Mat. 10:11-13; Mkpu. 14:6) Otu nwanna aha ya bụ Robert, onye sụrụla ụzọ ihe karịrị afọ iri atọ, kwuru, sị: “Obi na-atọ m ụtọ na mụ na ndị mmụọ ozi, bụ́ ndị ma otú ihe si dịrị onye m na-aga na nke ya na-arụkọ ọrụ.” Nke atọ, anyị ga-agbalị ịhụ ebe ndị mmadụ na-eme nke ọma, buru n’obi na ha nwere ike imecha ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Otu okenye aha ya bụ Carl, onye e mere baptizim ihe karịrị afọ iri ise gara aga, kwuru, sị: “M na-agbalị ka m hụ obere ihe na-egosi na mmadụ nwere mmasị. O nwere ike bụrụ ọnụ ọchị ya, otú ihu ya dị, ma ọ bụkwanụ ajụjụ bara uru ọ jụrụ.” N’eziokwu, anyị nwere ike iji ntachi obi na-amị mkpụrụ otú ahụ Pọl mere.
“EKWEKWALA KA AKA GỊ ZUO IKE”
16, 17. (a) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’Ekliziastis 11:6? (b) Nye ihe atụ otú ozi ọma anyị na-ekwusa nwere ike isi gbanwee otú ndị mmadụ si ele anyị anya.
16 Ọ bụrụgodị na o yie ka ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa anaghị eru ndị mmadụ n’obi, anyị ekwesịghị ile ya anya ka ihe na-abaghị uru. (Gụọ Ekliziastis 11:6.) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị anaghị ege anyị ntị. Ma ha na-ahụ anyị. Ha ma na anyị na-adị ọcha, na-akpa àgwà ọma, ma na-amụmụrụ ha ọnụ ọchị. Ka oge na-aga, àgwà anyị nwere ike ime ka ụfọdụ ndị na-ele anyị anya ọjọọ, malite ile anyị anya ọma. Sergio na Olinda anyị kwuburu gbasara ha, chọpụtara na nke a bụ eziokwu.
17 Sergio kwuru, sị: “E nwere mgbe anyị na-agaghị ebe ahụ anyị na-anọ ekwusa ozi ọma n’ihi ọrịa. Mgbe anyị laghachiri, ndị na-agafe agafe nọ na-ajụ anyị, sị, ‘Ọ dịla anya anyị hụsọrọ unu, ọ̀ dịkwa mma?’” Olinda mụmụrụ ọnụ ọchị kwuo, sị: “Ndị na-anya ụgbọala na-efere anyị aka, ụfọdụ n’ime ha anọrọ n’ụgbọala ha gwa anyị sị, ‘Unu na-agbalị.’ Ha gwadịrị anyị ka anyị nye ha magazin anyị.” Otu ihe tụrụ di na nwunye a n’anya bụ na otu nwoke kwụsịrị n’ebe ahụ ha na-anọ, nye ha okooko osisi, keleekwa ha maka ọrụ ha na-arụ.
18. Olee ihe mere i ji kpebisie ike iji “ntachi obi na-amị mkpụrụ”?
18 N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ‘ekweghị ka aka anyị zuo ike’ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, anyị so na-agba “àmà nye mba niile.” (Mat. 24:14) Nke kachanụ bụ na obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ n’ihi na anyị ma na anyị na-eme ihe dị Jehova mma, ebe ọ bụ na ọ hụrụ ndị ji “ntachi obi na-amị mkpụrụ,” n’anya.
a Jizọs chọpụtadịrị na mmadụ ikwusa ozi ọma “n’obodo a mụrụ ya” anaghị adịcha mfe. Matiu, Mak, Luk, na Jọn dechara gbasara ihe a.—Mat. 13:57; Mak 6:4; Luk 4:24; Jọn 4:44.
b Ọ bụ eziokwu na alaka ndị ahụ e kwuru okwu ha n’ihe atụ a nọchiri anya ndị ga-aga eluigwe, ihe anyị ga-amụta n’ihe atụ a ga-abara ndị niile na-efe Chineke uru.
c ‘Ịmị mkpụrụ’ nwekwara ike ịpụta ịna-akpa àgwà ndị so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” Ma, n’isiokwu a nakwa nke na-eso ya, anyị ga-elekwasị anya n’ihe gbasara “mkpụrụ egbugbere ọnụ,” ma ọ bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.—Gal. 5:22, 23; Hib. 13:15.
d N’oge ndị ọzọ, Jizọs ji ihe atụ gbasara ịgha mkpụrụ na iwe ihe ubi kọwaa ọrụ ime ndị na-eso ụzọ.—Mat. 9:37; Jọn 4:35-38.