Ịrụsi Ọrụ Ike Na-enye Obi Ụtọ
1. Gịnị nwere ike ime ka ịga ozi ọma na-agwụ anyị ike?
1 E kere mmadụ otú ọ ga na-enwe obi ụtọ ma ọ na-arụsi ọrụ ike. (Ekli. 2:24) Ma, ọ bụrụ na ọ na-adị anyị ka mbọ anyị na-agba n’ozi ọma enweghị isi, obi nwere ike ịna-ajọ anyị njọ ma ọ bụkwanụ ike ịga ozi ọma ana-agwụ anyị. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ n’ozi anyị?
2. Olee ihe mere na anyị ekwesịghị iche na mmadụ niile ga-ege ntị n’ozi anyị?
2 Echela na Mmadụ Niile Ga-ege Ntị: Cheta na ọ bụ mmadụ ole na ole gere Jizọs ntị mgbe ọ na-ezi ozi ọma, ma, nke a emeghị ka mbọ niile ọ gbara fuo ọhịa. (Jọn 17:4) N’ihe atụ Jizọs mere banyere ọgha mkpụrụ, o kwuru na ụfọdụ ndị anyị na-ezi ozi ọma Alaeze Chineke agaghị anabata ya. (Mat. 13:3-8, 18-22) Ma hà nabatara ya ma ha anabataghị ya, mbọ niile anyị na-agba bara ezigbo uru.
3. Olee otú anyị ga-esi “na-amị mkpụrụ” ma ndị mmadụ hà nabatara ozi anyị ma ha anabataghị ya?
3 Otú Anyị Si Amị Mkpụrụ: N’ihe atụ ahụ Jizọs mere, o kwuru na ndị nabatara ozi ọma e ziri ha ‘ga-amị mkpụrụ.’ (Mat. 13:23) A kụọ ọka wit, ọ na-epu ma na-eto. Ihe ọ ga-emecha mịa abụghị ókpòrò ndị ọhụrụ ọ ga-ewepụta kama ọ bụ mkpụrụ. N’ihi ya, mkpụrụ Ndị Kraịst na-amị abụchaghị ndị ọhụrụ batara n’ọgbakọ, kama ọ bụ mbọ anyị na-agba iji hụ na anyị na-agachi ozi ọma anya. Nke a na-eme ka obi dị anyị ụtọ ma ndị mmadụ hà nabatara ozi anyị ma ha anabataghị ya. Ozi anyị so na-edo aha Jehova nsọ. (Aịza. 43:10-12; Mat. 6:9) Anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ. (1 Kọr. 3:9) Jehova na-enwe obi ụtọ ma anyị na-akọrọ ndị ọzọ banyere ya.—Hib. 13:15, 16.
4. Olee ihe nwere ike isi n’ozi anyị pụta ma anyị agaghị ama?
4 Ihe ọzọ bụ na ozi ọma anyị ziri ndị mmadụ nwere ike ịdị ha n’obi, ma anyị amaghị. Ọ bụ mgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe ka ụfọdụ ndị o ziri ozi ọma ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya. Ndị anyị na-ezi ozi ọma nwekwara ike ime otú ahụ taa. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị anyị ziri ozi ọma agaghị abata n’ọgbakọ ozugbo, ma ha nwere ike mechaa bata ma anyị agaghị ama. Nke bụ́ eziokwu bụ na ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ bara ezigbo uru. N’ihi ya, ka anyị gbalịa “na-amị mkpụrụ dị ukwuu” ma gosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Jọn 15:8.