Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom
9 Ebe m bụ onye na-eso ụzọ Kraịst, ana m ekwu eziokwu, ọ bụghị ụgha ka m na-agha n’ihi na akọnuche m, nke mmụọ nsọ na-edu, na-agba àmà 2 na m na-eru nnukwu uju, obi anaghịkwa ezu m ike. 3 N’ihi na ọ dị m ka ya bụrụ na e kewapụrụ m n’ebe Kraịst nọ, ka m bụrụ onye a bụrụ ọnụ kama ụmụnna m ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ, bụ́ ndị agbụrụ m, 4 ndị bụ́ ndị Izrel. Ọ bụ ha ka Chineke mere ka ha bụrụ ụmụ ya.+ E mere ka ha dị ebube, ha na ya gbakwara ndụ.+ Ọ bụ ha ka e nyere Iwu Mosis,+ nye ha ohere ije ozi dị nsọ,+ kwekwa ha nkwa dị iche iche.+ 5 Ha si n’agbụrụ nna nna anyị hà,+ bụ́ agbụrụ Kraịst sikwa na ya.+ Ka otuto dịrị Chineke, onye bụ́ isi ihe niile, ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
6 Ma, ọ pụtaghị na okwu Chineke emezughị. N’ihi na ọ bụghị ndị niile Izrel mụrụ bụ “ndị Izrel” n’eziokwu.+ 7 Ọ bụghịkwa maka na ha bụ ụmụ Ebreham mere ha niile ga-eji bụrụ ụmụ* ya;+ kama e dere, sị, “Ọ bụ Aịzik ga-amụta ndị a ga-akpọ ụmụ* gị.”+ 8 Ọ pụtara na ọ bụghị ndị niile Ebreham mụrụ bụ ụmụ Chineke n’eziokwu,+ kama ọ bụ ụmụ a mụrụ n’ihi nkwa ahụ+ bụ ụmụ* Ebreham. 9 N’ihi na Chineke kwere nkwa, sị: “M ga-abịa n’ụdị oge a n’afọ ọzọ, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”+ 10 Ọ bụghị naanị n’oge ahụ, kamakwa n’oge Aịzik nna nna anyị tụwara Ribeka ime, ya abụrụ ime ejima.+ 11 Mgbe a na-amụbeghị ha, mgbe ha na-emebeghịkwa ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ọ bụla, Chineke ekpebiela otú ọ ga-esi họrọ onye ọ chọrọ, ọ bụghị n’ihi ọrụ onye ahụ, kama ọ na-ahọrọ onye ọ chọrọ ịkpọ. 12 N’ihi ya, a gwara Ribeka, sị: “Nke okenye ga-agbara nke nwata ohu.”+ 13 Otú ahụ ka e dere ya, sị: “Ahụrụ m Jekọb n’anya, ma m kpọrọ Ịsọ asị.”+
14 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Mbanụ!+ 15 N’ihi na ọ gwara Mosis, sị: “Onye ọ bụla m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, onye ọ bụla m chọkwara inwere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko.”+ 16 N’ihi ya, ọ bụghị ihe mmadụ chọrọ ma ọ bụ mbọ ọ na-agba ga-eme ka a họrọ ya,* kama ọ bụ Chineke, onye na-eme ebere, ka ọ dị n’aka.+ 17 N’ihi na n’Akwụkwọ Nsọ, Chineke gwara Fero, sị: “Ọ bụ ihe a mere m ji hapụ gị ndụ: ka m wee jiri gị gosi ike m, ka m wee mee ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.”+ 18 N’ihi ya, ọ bụ onye ọ chọrọ ka ọ na-emere ebere, ma ọ na-ahapụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ gbaa isi akwara.+
19 N’ihi ya, ị ga-ajụ m, sị: “Gịnịzi mere o ji ata ndị mmadụ ụta? È nwere onye ga-emeli ka ọ ghara imezu uche ya?” 20 Ma, gị mmadụ, ònye ka ị bụ na ị ga na-asa Chineke okwu?+ Ihe a kpụrụ akpụ ọ̀ na-agwa onye kpụrụ ya, sị: “Gịnị mere i ji kpụọ m otú a?”+ 21 Ọ̀ bụ na ọkpụite enweghị ikike iji ụrọ+ ọ gwakọtara kpụọ otu arịa ka e jiri ya mee ihe bara ezigbo uru, kpụọkwa ọzọ ka e jiri ya mee ihe na-abaghị uru? 22 Otú ahụ ka ọ dịkwa Chineke. N’agbanyeghị na ọ chọrọ iwesa ndị ajọ omume iwe ma mee ka ha hụ ike ya, o nwere ezigbo ndidi ma hapụ ndị yiri arịa a ga-ewesa iwe, bụ́ ndị e kwesịrị ibibi ebibi. 23 O mere ihe a ka e wee mata ebube ya dị ukwuu nke ọ ga-eme ka ndị yiri arịa a ga-emere ebere nweta,+ bụ́ ndị o burula ụzọ kwadebe ka ha nweta ebube, 24 ya bụ, anyịnwa, ndị o si ma n’etiti ndị Juu ma n’etiti ndị mba ọzọ kpọọ.+ 25 Ọ bụ otú a ka o kwuru ya n’akwụkwọ Hosia, sị: “Ndị na-abụghị ndị m+ ka m ga-akpọ ‘ndị m.’ Nwaanyị ahụ a na-ahụghị n’anya ka m ga-akpọ ‘onye m hụrụ n’anya’;+ 26 n’ebe m gwara ha, sị, ‘Unu abụghị ndị m,’ n’ebe ahụ ka a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke dị ndụ.’”+
27 Aịzaya kwukwara banyere Izrel, sị: “Ọ bụ eziokwu na ndị Izrel nwere ike ịdị ọtụtụ ka ájá dị n’oké osimiri, ọ bụ naanị ndị fọdụrụ ka a ga-azọpụta.+ 28 N’ihi na Jehova* ga-ekpe ụwa ikpe, kpechaa ya n’egbughị oge.”*+ 29 Aịzaya kwukwara, sị: “A sị na Jehova* nke ụsụụ ndị agha emeghị ka ụmụ* anyị fọdụ, anyị gaara adị nnọọ ka Sọdọm, anyị gakwaara adị ka Gọmọra.”+
30 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-ekwu na n’agbanyeghị na ndị mba ọzọ anaghị agbalị ka ha bụrụ ndị ezi omume, a kpọrọ ha ndị ezi omume+ n’ihi okwukwe ha.+ 31 Ma n’agbanyeghị na Izrel gbara mbọ ka ha debe iwu ahụ ka ha wee bụrụ ndị ezi omume, ha edebelighị iwu ahụ. 32 Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ha chere na a ga-akpọ ha ndị ezi omume n’ihi ọrụ ha, kama ịbụ n’ihi okwukwe ha. Ha kpọrọ ụkwụ na “nkume mkpọbi ụkwụ”;+ 33 otú ahụ e dere, sị: “Lee, ana m adọnye otu nkume+ na-akpọbi ndị mmadụ ụkwụ nakwa otu oké nkume na-akpasu ndị mmadụ iwe* na Zayọn, ma e nweghị onye nwere okwukwe na ya a ga-emechu ihu.”+