Ndị Rom
9 Eziokwu+ ka m na-ekwu n’ime Kraịst; ọ bụghị ụgha ka m na-agha,+ ebe akọ na uche m so m na-agba àmà n’ime mmụọ nsọ, 2 na m nwere oké iru uju na ihe mgbu na-adịghị akwụsị akwụsị n’ime obi m.+ 3 N’ihi na ọ dị m ka ya bụrụ na e doro mụ onwe m iche dị ka onye a bụrụ ọnụ n’ebe Kraịst nọ maka ụmụnna m,+ bụ́ ndị ikwu m n’anụ ahụ́,+ 4 ndị bụ́ ụmụ Izrel+ n’ezie, ndị e doro dị ka ụmụ,+ ndị nwetara ebube+ ahụ na ọgbụgba ndụ+ ndị ahụ, ndị e nyekwara Iwu+ ahụ na ozi ahụ dị nsọ,+ ndị e kwekwara nkwa ndị ahụ;+ 5 ndị nwe nna nna+ anyị hà, ndị Kraịst sikwa n’etiti ha pụta dị ka anụ ahụ́ si dị:+ ka Chineke,+ onye bụ́ isi ihe niile, bụrụ onye a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
6 Otú ọ dị, ọ bụghị dị ka à ga-asị na okwu Chineke emezughị.+ N’ihi na ọ bụghị ndị niile si n’Izrel pụta bụ “Izrel” n’ezie.+ 7 Ọ bụghịkwa n’ihi na ha bụ mkpụrụ Ebreham mere ha niile ji bụrụ ụmụ,+ kama: “Ihe a ga-akpọ ‘mkpụrụ gị’ ga-esi n’Aịzik.”+ 8 Ya bụ, ndị bụ́ ụmụ n’anụ ahụ́+ abụghị ụmụ Chineke+ n’ezie, kama ndị a na-agụ dị ka mkpụrụ ahụ bụ ndị bụ́ ụmụ site ná nkwa+ ahụ. 9 N’ihi na Chineke kwere nkwa, sị: “M ga-abịa n’ụdị oge a, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”+ 10 Ma ọ bụghị naanị nke ahụ, kamakwa mgbe Ribeka tụụrụ ime ejima+ site n’aka otu nwoke, bụ́ nna nna anyị Aịzik: 11 n’ihi na mgbe a na-amụbeghị ha, mgbe ha na-emebeghịkwa ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ọ bụla,+ ka nzube Chineke n’ihe banyere ime nhọrọ ahụ wee dabere, ọ bụghị n’ọrụ, kama n’Onye ahụ nke kpọrọ òkù,+ 12 a gwara Ribeka, sị: “Nke okenye ga-abụ ohu nke nwata.”+ 13 Dị nnọọ ka e dere, sị: “Ahụrụ m Jekọb n’anya, ma akpọrọ m Isọ asị.”+
14 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu?+ Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Tụfịakwa! 15 N’ihi na ọ gwara Mozis, sị: “Onye ọ bụla m kpebiri imere ebere ka m ga-emere ebere, onye ọ bụla m kpebikwara igosi ọmịiko ka m ga-egosi ọmịiko.”+ 16 Ya mere, ọ dabeere, ọ bụghị n’onye na-achọ ma ọ bụ n’onye na-agba ọsọ, kama na Chineke,+ onye na-eme ebere.+ 17 N’ihi na Akwụkwọ Nsọ gwara Fero, sị: “N’ihi nke a ka m ji hapụ gị ndụ, ka m wee jiri gị gosi ike m, ka e wee kpọsaakwa aha m n’ụwa dum.”+ 18 Ya mere, onye ọ chọrọ ka ọ na-emere ebere,+ ma onye ọ chọrọ ka ọ na-ahapụ ka o kwesie olu ike.+
19 Ya mere, ị ga-agwa m, sị: “Ebe ọ dị otú a, gịnị mere o ji ahụta mmejọ? N’ihi na ònye guzogideworo uche ya o kwupụtara nke ọma?”+ 20 Gị mmadụ,+ ònye n’ezie, ka ị bụ na ị ga na-asa Chineke okwu?+ Ihe a kpụrụ akpụ ọ̀ ga-agwa onye kpụrụ ya, sị, “Gịnị mere i ji mee m otú a?”+ 21 Gịnị? Ọkpụite+ ó nweghị ikike n’ebe ụrọ dị, isi n’otu ụrọ ọ gwakọtara kpụọ otu arịa ka e jiri ya mee ihe kwesịrị nsọpụrụ, kpụọkwa nke ọzọ ka e jiri ya mee ihe na-ekwesịghị nsọpụrụ?+ 22 Ọ bụrụ na Chineke ji ogologo ntachi obi dị ukwuu hapụ arịa ndị dịịrị ọnụma, bụ́ ndị a ga-ebibi ebibi, ọ bụ ezie na o nwere ọchịchọ igosi ọnụma ya na ime ka a mara ike ya,+ 23 ka o wee mee ka a mara ebube ya dị ukwuu+ n’ebe arịa+ ndị dịịrị ebere dị, bụ́ ndị ọ kwadebere maka ebube tupu oge eruo,+ 24 ya bụ, anyị, bụ́ ndị ọ kpọrọ ọ bụghị naanị site n’etiti ndị Juu kamakwa site n’etiti ndị mba ọzọ,+ ọ̀ dị ihe o mere? 25 Ọ bụ dị ka o kwukwara n’akwụkwọ Hosia, sị: “Ndị na-abụghị ndị m+ ka m ga-akpọ ‘ndị m,’ nwaanyị ahụ a na-ahụghịkwa n’anya ka m ga-akpọ ‘onye m hụrụ n’anya’;+ 26 n’ebe ahụ a gwara ha, sị, ‘Unu abụghị ndị m,’ n’ebe ahụ ka a ga-akpọ ha ‘ụmụ nke Chineke dị ndụ.’”+
27 Aịzaya tikwara mkpu banyere Izrel, sị: “Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ụmụ Izrel pụrụ ịdị ka ájá nke oké osimiri,+ ọ bụ ndị fọdụrụ ka a ga-azọpụta.+ 28 N’ihi na Jehova ga-eme ka a zaa ajụjụ n’elu ụwa, ọ ga-emezu ya n’egbughị oge.”+ 29 Dịkwa nnọọ ka Aịzaya kwuru tupu oge eruo, sị: “E wezụga na Jehova nke ụsụụ ndị agha+ mere ka mkpụrụ fọdụrụ anyị, anyị gaara adị nnọọ ka Sọdọm, a gaara emekwa ka anyị dị nnọọ ka Gọmọra.”+
30 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Na ndị mba ọzọ ghọrọ ndị ezi omume,+ ya bụ, ezi omume nke sitere n’okwukwe,+ ọ bụ ezie na ha adịghị agbalị ka ha bụrụ ndị ezi omume; 31 ma Izrel edebelighị iwu ahụ, ọ bụ ezie na ha na-agbalị idebe iwu ezi omume.+ 32 N’ihi gịnị? N’ihi na ha gbalịrị idebe ya, ọ bụghị site n’okwukwe, kama site n’ọrụ.+ Ha sụrụ ngọngọ na “nkume ịsụ ngọngọ” ahụ;+ 33 dị ka e dere, sị: “Lee! Ana m edo na Zayọn otu nkume+ ịsụ ngọngọ na oké nkume mmejọ,+ ma a gaghị emechu onye nwere okwukwe na ya ihu.”+