Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Galeshia
5 Ọ bụ ka anyị nwere onwe anyị otú a mere Kraịst ji tọhapụ anyị. N’ihi ya, nọgidenụ na-abụ ndị nweere onwe ha.+ Unu ekwekwala ka e mee ka unu bụrụ ndị ohu ọzọ.+
2 Mụnwa bụ́ Pọl na-agwa unu na ọ bụrụ na e bie unu úgwù, e nweghị uru Kraịst ga-abara unu.+ 3 Ana m echetakwara onye ọ bụla e biri úgwù na o kwesịrị ịna-edebe Iwu ahụ* niile.+ 4 Unu na Kraịst adịghịzi n’otu, unu ndị na-agbalị ka a kpọọ unu ndị ezi omume maka na unu na-edebe iwu.+ Unu emeela ka amara ya gharazie ịna-eru unu aka. 5 Ma, ebe mmụọ Chineke na-edu anyị, anyị na-echeresi ike ma na-atụ anya na a ga-ewere anyị ka ndị ezi omume n’ihi okwukwe anyị nwere. 6 N’ihi na e nweghị uru ibi úgwù ma ọ bụ ebighị úgwù baara ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu,+ kama ihe ka mkpa bụ okwukwe ha nwere nke ha na-egosi n’ịhụ ndị ọzọ n’anya.
7 Unu na-agbabu ọsọ nke ọma.+ Ole ndị mere ka unu kwụsị irubere eziokwu isi? 8 Ụdị ihe a ha na-akụziri unu esighị n’aka Onye ahụ na-akpọ unu. 9 Obere ihe iko achịcha na-eme ka ntụ ọka niile a gwakọtara agwakọta koo.+ 10 Obi siri m ike na unu ndị ha na Onyenwe anyị dị n’otu+ agaghị eche ihe dị iche n’ihe m chere. Ma a ga-ata onye ọ bụla na-akpatara unu nsogbu+ ahụhụ kwesịịrị ya, onye ọ sọkwara ya bụrụ. 11 Ụmụnna m, ọ bụrụ na m ka na-akụzi na e kwesịrị ibi mmadụ úgwù, gịnị mere a ka ji na-akpagbu m? Ọ pụtara na ihe m na-akụzi banyere ọnwụ Jizọs nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ*+ agaghịzi abụ ihe mkpọbi ụkwụ. 12 Ọ dị m ka ya bụrụ na ndị na-agba mbọ ime ka unu daa ga-ebepụ onwe ha ihe ha ji bụrụ nwoke.*
13 Ụmụnna m, a kpọrọ unu ka unu nwere onwe unu. Ma unu ejila maka na unu nweere onwe unu na-eme ihe na-agụ ahụ́ unu agụụ,+ kama ka ịhụnanya mee ka unu na-agbara ibe unu ohu.+ 14 N’ihi na e mezuola* Iwu ahụ* niile n’otu iwu, ya bụ: “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.”+ 15 Ma, ọ bụrụ na unu ana-emerụ ibe unu ahụ́ ma na-emegbu ibe unu,+ kpacharanụ anya ka unu ghara ibibi ibe unu.+
16 Ma m na-agwa unu, sị, Na-ekwenụ ka mmụọ nsọ na-edu unu,+ unu agaghịkwa eme ihe ọ bụla na-agụ ahụ́ unu agụụ.+ 17 N’ihi na ihe na-agụ ahụ́ agụụ na-eme ka ahụ́ na-emegide mmụọ nsọ, mmụọ nsọ ana-emegidekwa ahụ́. Ha na-emegide ibe ha. Ọ bụ ya mere na unu anaghị eme ihe ndị unu chọrọ ime.+ 18 Ọ bụrụkwa na mmụọ nsọ na-edu unu, iwu agaghị na-achị unu.
19 Ọrụ ndị e ji mara anụ ahụ́ doro anya. Ha bụ ịkwa iko,*+ adịghị ọcha, ime ihe ọjọọ n’asọghị anya,*+ 20 ikpere arụsị, ime mgbaasị,*+ ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndị kwe na ndị ekweghị, nkewa, inwe òtù, 21 anyaụfụ, ịṅụ oké mmanya,+ oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị yiri ha.+ Ana m adọ unu aka ná ntị banyere ihe ndị a otú m dọburu unu aka ná ntị, na ndị na-eme ụdị ihe ndị a agaghị eketa Alaeze Chineke.+
22 Ma mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ndidi,* obiọma, ịdị mma,+ okwukwe, 23 ịdị nwayọọ, mmadụ ijide onwe ya.+ E nweghị iwu na-emegide ụdị ihe ndị a. 24 Ndị bụ́ ndị nke Kraịst Jizọs akpọgidekwala ahụ́ ha na ihe ọjọọ niile na-agụsi ahụ́ ha agụụ ike n’osisi.+
25 Ọ bụrụ na mmụọ nsọ na-edu anyị, ka anyị na-ebi ndụ otú na-egosi na mmụọ nsọ na-edu anyị.+ 26 Ka anyị ghara ikwe ka onwe anyị na-ebu anyị isi,+ ghara ịna-amarịta aka,+ gharakwa ịna-enwere ibe anyị anyaụfụ.