Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 11/15 p. 4-7
  • Bible Na-aza Ajụjụ Ndị Dị Mkpa Banyere Oge Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bible Na-aza Ajụjụ Ndị Dị Mkpa Banyere Oge Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?
  • Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?
  • Ihe Chineke Na-atụ Anya n’Aka Anyị
  • Ìhè A Pụrụ Ịdabere na Ya nke Dịịrị Okporo Ụzọ Anyị
  • Ndụ Nwere Nzube Dị Ebube
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Jehova Chineke nke Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Tụkwasị Jehova Obi na Ọ Ga-emezu Nzube Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 11/15 p. 4-7

Bible Na-aza Ajụjụ Ndị Dị Mkpa Banyere Oge Anyị

BIBLE ọ̀ bara uru taa? Ka azịza ya wee bụrụ ee, n’ezie akwụkwọ ochie a aghaghị inye ndị na-agụ ya nduzi n’isiokwu ndị na-akpali mmasị ma baa uru n’oge a. Bible ọ̀ na-enye ndụmọdụ bara uru n’isiokwu ndị dị ezigbo mkpa n’ụwa taa?

Ka anyị leba anya n’isiokwu abụọ a kpụ n’ọnụ. N’ime otú ahụ, anyị ga-enyocha ihe Bible na-ekwu banyere okwu ndị a.

N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?

N’ihi ọnọdụ ndị e nwere n’ụwa taa, otu n’ime ajụjụ ndị a kasị ajụ bụ: N’ihi gịnị ka Chineke ji ekwe ka ndị aka ha dị ọcha na-ahụju anya? Ajụjụ a kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na mpụ ime ihe ike, nrụrụ aka, mgbukpọ nke agbụrụ, ọdachi onwe onye, na ihe ndị ọzọ, na-emetụta ọtụtụ mmadụ.

Dị ka ihe atụ, na June 1998, otu ụgbọ okporo ígwè awara awara kpọkanyere n’otu àkwà mmiri n’ebe ugwu Germany, na-egbu ihe karịrị otu narị ndị o bu. Oké mgbupịa ahụ wutere ọbụna ndị ọrụ ahụ ike na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ nwere ahụmahụ bụ́ ndị lekọtara ndị ahụ merụrụ ahụ na ndị nwụrụ anwụ. Otu bishọp nke Chọọchị Evangelical jụrụ, sị: “Ezigbo Chineke, N’ihi gịnị ka nke a ji mee?” Bishọp ahụ n’onwe ya enyeghị azịza ọ bụla.

Ahụmahụ na-egosi na mgbe ihe ọjọọ dakwasịrị ndị aka ha dị ọcha, ha enwetaghịkwa nkọwa banyere ihe kpatara ya, ha na-enwe obi ilu mgbe ụfọdụ. Ebe a ka Bible pụrụ inye aka, n’ihi na ọ na-akọwa ihe mere ihe ọjọọ na nhụjuanya ji adakwasị ndị aka ha dị ọcha.

Mgbe Jehova Chineke kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya, o zubeghị ka ihe ọjọọ na nhụjuanya na-enye ihe a kpọrọ mmadụ nsogbu. Anyị pụrụ isi aṅaa jide nke a n’aka? N’ihi na mgbe o kesịrị ihe, “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Jụọ onwe gị, ‘Ọ bụrụ na m ahụ ihe dị njọ, m̀ ga-akpọ ya ihe “dị mma nke ukwuu”?’ Ọ dịghị ma ọlị! N’otu ụzọ ahụ, mgbe Chineke kwuru na ihe nile “dị mma nke ukwuu,” e nweghị ihe ọjọọ ọ bụla dị n’ụwa. Ya mere, ole mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ihe ọjọọ si malite?

N’oge na-adịghị anya mgbe e kesịrị nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, otu mmụọ e kere eke dị ike bịakwutere nwanyị ahụ ma maa ikwu eziokwu Jehova na izi ezi nke ọbụbụeze ya aka. (Jenesis 3:1-5) Onye a e kere eke, bụ́ Setan Ekwensu, mesịrị boo ebubo na ụmụ mmadụ agaghị eguzosi ike n’ihe nye Chineke mgbe ha na-ata ahụhụ. (Job 2:1-5) Olee otú Jehova si meghachi omume n’ọnọdụ a? O kwere ka oge gabiga ka o wee doo anya na ụmụ mmadụ apụghị iduzi nzọụkwụ ha n’ụzọ na-aga nke ọma n’adabereghị n’ebe ọ nọ. (Jeremaịa 10:23) Mgbe ihe ndị e kere eke mere omume n’ụzọ megidere iwu na ụkpụrụ Chineke, ihe ọ na-arụpụta bụ mmehie, bụ́ nke na-eweta ọnọdụ ndị dị mwute. (Eklisiastis 8:9; 1 Jọn 3:4) Otú ọ dị, n’agbanyeghị ọnọdụ ndị a dị njọ, Jehova maara na ụfọdụ mmadụ ga-anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye ya.

Kemgbe nnupụisi ahụ dị mwute weresịịrị ọnọdụ n’Iden, ihe dị ka afọ 6,000 agafeela. Nke ahụ ọ̀ dịbigara anya ókè? Jehova pụrụ ibibiwo Setan na ndị na-akwado ya ọtụtụ narị afọ gara aga. Ma ọ̀ bụ na ọ kabeghị mma ichere ruo mgbe a ga-ewepụ obi abụọ nile a pụrụ ichetụ n’echiche banyere izi ezi nke ọbụbụeze Jehova na iguzosi ike n’ezi ihe nke ụmụ mmadụ nye ya? Ọ́ bụghị eziokwu na n’usoro ikpe nke oge a, iji nwapụta onye meziri emezi na onye na-emezighị, okwu ikpe pụrụ iwe ọtụtụ afọ?

N’ihi ịdị mkpa nke ihe iseokwu ndị ahụ na-eche Jehova na ihe a kpọrọ mmadụ ihu—ọbụbụeze eluigwe na ala na iguzosi ike n’ezi ihe nke ụmụ mmadụ—lee ka Chineke si bụrụ onye amamihe ikwe ka oge gafee! Ugbu a anyị na-ahụ nke ọma ihe na-eme mgbe ụmụ mmadụ leghaara iwu Chineke anya ma na-achịkwa ihe omume ha n’onwe ha. Ihe ọ na-arụpụta bụ ịba ụba nke ihe ọjọọ. Ọ bụkwa ya mere ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha ji ahụju anya taa.

Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, Okwu Chineke na-egosi na ihe ọjọọ agaghị adịru mgbe ebighị ebi. N’ezie, n’isi nso, Jehova ga-eweta ihe ọjọọ na ndị na-akpata ya ná njedebe. “Ma ndị na-emebi iwu,” ka Ilu 2:22 na-ekwu, “ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.” N’aka nke ọzọ, ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke pụrụ ilepụ anya n’ihu n’oge, bụ́ nke dị nso ugbu a, mgbe “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:4.

Ya mere, Bible na-akọwa n’ụzọ doro anya ihe mere ndị aka ha dị ọcha ji ahụju anya. Ọ na-emesikwa anyị obi ike na ihe ọjọọ na nhụjuanya ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. Otú ọ dị, ka anyị na-enwe ihe isi ike nke ndụ a na-adị ugbu a, ọ dị anyị mkpa inweta azịza nye ajụjụ ọzọ dị mkpa.

Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?

Ikekwe ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ, ndị mmadụ na-agbalị ịchọpụta ihe bụ́ nzube nke ndụ. Ọtụtụ ndị na-ajụ onwe ha, ‘N’ihi gịnị ka m ji dịrị ndụ? M̀ pụrụ isi aṅaa mee ka ndụ m nwee nzube?’ Ọnọdụ dị iche iche na-akpali ha ịjụ ajụjụ ndị a.

Mmadụ pụrụ ịbụ onye ọdachi onwe onye tisasịrị ndụ ya. Dị ka ihe atụ, ná mmalite 1998 a tọọrọ ma gbuo otu nwata nwanyị dị afọ 12 nke bi na Bavaria, Germany. Otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, nne ya kwetara na kwa ụbọchị ya na-achọ ihe bụ́ nzube nke ndụ—n’enweghị ihe ịga nke ọma. A na-akpali ụfọdụ ndị na-eto eto iche echiche banyere ihe bụ́ nzube nke ndụ. Ha na-achọ nchebe, afọ ojuju, na inwe echiche nke ịbụ ndị so biri, ma nanị ihe ha na-enweta bụ obi nkoropụ n’ihi ịba ụba nke ihu abụọ na nrụrụ aka. Ndị ọzọ na-emikpu onwe ha n’ọrụ, ma ha na-achọpụta na ike, ùgwù, na ihe onwunwe adịghị emeju ọchịchọ ha na-achọ ihe mere ha ji dịrị ndụ.

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya na-akpali mmadụ ịjụ banyere nzube nke ndụ, ajụjụ a chọrọ azịza rijuru afọ ma na-enye afọ ojuju. Ọzọkwa, Bible pụrụ ịba uru dị ukwuu na nke a. Ọ na-akọwa Jehova dị ka Chineke nke nzube, onye nwere ezi ihe mere o ji eme ihe nile ọ na-eme. Anyị na-ajụ, sị, Ị̀ ga-ewu ụlọ n’enweghị ihe kpatara ya? O yighị ka ị ga-eme otú ahụ, ebe ọ bụ na iwu ụlọ na-eri ego buru ibu, ọ pụkwara iwe ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ afọ. Ị na-ewu ụlọ ka gị onwe gị ma ọ bụ onye ọzọ nwee ike ibi n’ime ya. A pụrụ iji otu ụzọ iche echiche ahụ mee ihe n’ebe Jehova nọ. O tinyeghị mgbalị nile o tinyere n’ike ụwa na ihe ndị dị ndụ nọ na ya n’enweghị ihe kpatara ya, nzube. (Tụlee Ndị Hibru 3:4.) Gịnị bụ nzube ya banyere ụwa?

Amụma Aịsaịa na-akọwa Jehova dị ka “Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya.” N’ezie, ọ bụ “ya mere ka [ụwa] guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” (Aịsaịa 45:18) Ee, kemgbe e kere ụwa, ọ bụwo nzube Jehova ka e biri n’ime ya. Abụ Ọma 115:16 na-asị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere; ma ụwa ka O nyeworo ụmụ mmadụ.” N’ihi ya, Bible na-egosi na Jehova kere ụwa ka ụmụ mmadụ na-erube isi, bụ́ ndị ga-elekọta ya, biri n’ime ya.—Jenesis 1:27, 28.

Nnupụisi Adam na Iv ò mere ka Jehova gbanwee nzube ya? Ee e. Anyị pụrụ isi aṅaa jide nke a n’aka? Tụlee isi ihe a: E dere Bible ọtụtụ puku afọ mgbe nnupụisi ahụ n’Iden gasịrị. Ọ bụrụ na Chineke agbahapụla nzube mbụ ya, gịnị mere e kwughị ya n’ime Bible? Nkwubi okwu doro anya bụ na nzube ya maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ agbanwebeghị.

Ọzọkwa, nzube Jehova adịghị ada ada ma ọlị. Site n’ọnụ Aịsaịa, Chineke kwere nkwa a: “Dị ka oké mmiri ozuzo na snow si esi n’eluigwe ezo, ma ọ bụghị n’ebe ahụ ka ọ na-alaghachi, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ desịa ala, wee mee ka o mee ihe omume, ka o puokwa ihe opupu; o wee were mkpụrụ nye ọgha mkpụrụ, werekwa nri nye onye na-eri ihe; otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:10, 11.

Ihe Chineke Na-atụ Anya n’Aka Anyị

N’ụzọ doro anya, anyị pụziri inwe obi ike ná mmezu nke nzube Chineke bụ́ ime ka ụmụ mmadụ na-erube isi biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị ga-eso ná ndị ga-enwe ihe ùgwù nke ibi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, anyị aghaghị ime ihe Eze Solomọn nwere amamihe kwuru: “Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13; Jọn 17:3.

Ibi ndụ kwekọrọ ná nzube Jehova maka ihe a kpọrọ mmadụ pụtara ịmara ezi Chineke ahụ na ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị ọ na-achọ dị ka e depụtara ha n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na anyị emee nke a ugbu a, anyị pụrụ inwe olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs, bụ́ ebe anyị na-agaghị akwụsị mgbe ọ bụla ịmụta ihe ọhụrụ banyere Chineke na ihe okike ya dị ebube. (Luk 23:43) Lee atụmanya na-akpali akpali ọ bụ!

Ọtụtụ ndị na-achọ nzube ná ndụ na-echigharịkwuru Bible ma na-achọta obi ụtọ dị ukwuu kpọmkwem ugbu a. Dị ka ihe atụ, otu nwa okorobịa aha ya bụ́ Alfred apụghị ịchọta nzube ná ndụ. Aka okpukpe na-etinye n’agha bụ ihe arụ n’anya ya, ihu abụọ na nrụrụ aka dị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kpasukwara ya iwe. Alfred letara ndị India nke Ebe Ugwu America n’olileanya nke inweta ihe ọmụma banyere nzube nke ndụ, ma o ji nanị ndakpọ olileanya lọghachite Europe. N’obi nkoropụ, o chigharịkwuuru ọgwụ ọjọọ na ịkpọbiga egwú ókè. Otú ọ dị, iji nlezianya na-enyocha Bible mgbe nile mesịrị nyere Alfred aka ịmata ezi nzube nke ndụ na inweta afọ ojuju.

Ìhè A Pụrụ Ịdabere na Ya nke Dịịrị Okporo Ụzọ Anyị

Gịnịzi ka anyị pụrụ ikwubi banyere Bible? Ọ̀ bara uru taa? N’ezie, ọ bara, n’ihi na ọ na-enye nduzi n’isiokwu ndị a kpụ n’ọnụ. Bible na-akọwa na ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ, na-enyekwara anyị aka ịchọta nzube na-eju afọ ná ndụ. Ọzọkwa, Bible nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere ihe ndị ọzọ na-akpali mmasị nke ukwuu taa. A tụlere isiokwu ndị dị ka alụmdi na nwunye, ịzụ ụmụ, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ n’Okwu Chineke.

Ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ, biko leba anya nke ọma n’ihe ndị dị n’ime Bible. Ozugbo ị chọpụtara ezi uru ụkpụrụ nduzi ya bara ná ndụ, ị pụrụ inwe mmetụta yiri nke ọbụ abụ ahụ bụ́ onye legaara Jehova Chineke anya maka nduzi ma bụọ, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.”—Abụ Ọma 119:105.

[Foto dị na peeji nke 6]

Ị̀ maara ihe mere Chineke ji ekwe ka ndị aka ha dị ọcha na-ahụju anya?

[Foto dị na peeji nke 7]

Ị pụrụ ibi ndụ nwere nzube

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya