Ndị Okpukpe “Polish Brethren”—N’ihi Gịnị Ka E Ji Kpagbuo Ha?
Na 1638, nzukọ ndị isi nke Poland mekpọrọ otu obere òtù okpukpe a maara dị ka Polish Brethren, ọnụ. E bibiri chọọchị na ígwè obibi akwụkwọ nke òtù ahụ. E mechiri Mahadum nke Raków, a chụgakwara ndị prọfesọ kụziri ihe n’ebe ahụ n’ala ọzọ.
Iri afọ abụọ mgbe e mesịrị, nzukọ ndị isi ahụ mekwuru ihe ọzọ. O nyere ndị nile so n’òtù ahụ, bụ́ ndị pụrụ iruwo 10,000 ma ọ bụ karịa, iwu ịhapụ mba ahụ. Olee otú ọnọdụ ahụ si dị nnọọ njọ ná mba e lere anya n’oge ahụ dị ka otu n’ime ndị kasị ekwe ibe nọrọ na Europe nile? Gịnị ka ndị okpukpe Polish Brethren meworo nke mere ha ji kwesị inweta mmeso dị otú ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ?
IHE nile malitere mgbe nsogbu siri ike dapụtara n’etiti Ndị Okpukpe Calvin. Ihe iseokwu bụ́ isi bụ ozizi Atọ n’Ime Otu. Ndị ndú nke òtù nwere echiche ọhụrụ n’ime chọọchị ahụ jụrụ ozizi ahụ n’ihi na ọ bụ nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Nke a were ndị ndú chọọchị ahụ iwe ma mee ka òtù ahụ nwere echiche ọhụrụ kewapụ onwe ya.
Ndị okpukpe Calvin kpọrọ ndị ahụ nwere echiche dị iche ndị òtù okpukpe Arius,a ma ndị ahụ nọ n’òtù ọhụrụ ahụ họọrọ ịkpọ onwe ha ndị Kraịst ma ọ bụ ndị okpukpe Polish Brethren. A makwaara ha dị ka ndị okpukpe Socinus, nke sitere n’aha Laelius Socinus, bụ́ onye Itali nke Servetus nwere mmetụta n’ahụ ya, onye nwa nwanne ya bụ́ Faustus Socinus gara Poland ma ghọọ onye a ma ama n’òtù ahụ.
N’oge ahụ, onye Poland a ma ama, bụ́ Jan Sienieński, nwara inye chọọchị ọhụrụ ahụ ihe ọ kpọrọ “ebe dara jụụ nke zoro ezo” bụ́ ebe ọ ga-anọ too. N’iji ihe ùgwù pụrụ iche nke eze Poland nyere ya mee ihe, Sienieński guzobere obodo Raków, nke mesịrị ghọọ ebe bụ́ isi maka okpukpe Socinus na Poland. Sienieński nyere ụmụ amaala Raków ọtụtụ ikike, gụnyere ikike nke ife ofufe n’enweghị ihe mgbochi.
A dọtara ndị ọkwa nkà, ndị dọkịta, ndị na-ere ọgwụ, ndị obodo, na ndị a ma ama n’obodo ọhụrụ ahụ. Tụkwasị na nke a, ndị ụkọchukwu si Poland, Lithuania, Transylvania, France, na ọbụna England bịa jupụtara n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nile a bịara ọhụrụ kwere ihe ndị okpukpe Socinus kwere; n’ihi ya ruo afọ atọ sochirinụ, site na 1569 ruo 1572, Raków ghọrọ ebe a nọ nwee nkwurịta okwu ndị na-enweghị ọgwụgwụ banyere nkà mmụta okpukpe. Gịnị ka ọ rụpụtara?
Ụlọ E Kewara Ekewa
Òtù okpukpe Socinus n’onwe ya bịara kewaa, ndị nwere echiche ndị gabigakwuru ókè nọ n’otu akụkụ ebe ndị echiche ha katụ kwesị ekwesị nọ n’akụkụ nke ọzọ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ndịrịta iche ha, nkwenkwe ha nwekọrọ ọnụ pụrụ iche. Ha jụrụ Atọ n’Ime Otu; ha jụrụ ime ụmụaka baptism; n’ozuzu ya ha adịghị alụ agha, mgbe mgbe kwa, ha adịghịkwa anọ n’ọkwá ọchịchị.b Ha ekweghịkwa n’ịdị adị nke hel dị ka ebe mmekpa ahụ. N’ihe ndị a nile, ha leghaara ọdịnala okpukpe ndị a ma ama, anya.
Ma ndị ụkọchukwu nke okpukpe Calvin ma nke ndị Katọlik malitere imegide òtù ahụ n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, ma ndị ụkọchukwu bụ́ ndị òtù okpukpe Socinus ji ọnọdụ okpukpe ikwe ibe nọrọ ahụ dịnụ, bụ́ nke ndị eze Poland ndị dị ka Sigismund nke Abụọ Augustus na Stephen Báthory kwalitere, mee ihe iji kụzie echiche ha.
Ọrụ Dị Ịrịba Àmà nke Budny
Nsụgharị Bible nke ndị okpukpe Calvin, bụ́ nke e ji mee ihe n’ụzọ sara mbara n’oge ahụ, egboghị mkpa nke ọtụtụ ndị na-agụ ya. E sighị n’asụsụ ndị mbụ sụgharịa ya, kama e sitere na Vulgate Latin na nsụgharị French dị n’oge ya sụgharịa ya. “A chụrụ ikwesị ntụkwasị obi na izi ezi n’àjà n’ihi ọchịchọ a na-achọ ka ọ dị ụtọ ọgụgụ,” ka otu akwụkwọ kwuru. E dehiere ọtụtu ihe. Ya mere, a kpọrọ otu ọkà mmụta a maara nke ọma nke aha ya bụ Szymon Budny òkù idezi nsụgharị ahụ. O kpebiri na ọ ga-aka mfe iwepụta nsụgharị ọhụrụ kpam kpam karịa idezi nke ochie ahụ. Budny malitere ọrụ ahụ n’ihe dị ka 1567.
Mgbe Budny na-eme nsụgharị ahụ, o ji nlezianya tụlee okwu nile na ihe dị iche iche ha nwere ike ịpụta n’ụzọ ọ na-adịbeghị onye merela ya na Poland. Ebe ọ bụla akụkụ ihe odide Hibru rara ahụ, o depụtara nsụgharị nkịtị ya n’etiti peji. Mgbe ọ dị mkpa, o chepụtara okwu ndị ọhụrụ ma gbalịa iji asụsụ Polish dị mfe bụ́ nke a na-asụ kwa ụbọchị n’oge ya mee ihe. Ihe mgbaru ọsọ ya bụ iwepụtara ndị ga-agụ ya nsụgharị Bible a pụrụ ịtụkwasị obi na nke ziri ezi.
E bipụtara nsụgharị Budny nke Bible dum na 1572. Otú ọ dị, ndị bipụtara nsụgharị ahụ gwagburu nsụgharị ya nke Akwụkwọ Nsọ Grik. N’ịbụ onye a na-akụdaghị mmụọ, Budny malitere idezigharị ya, bụ́ nke ọ rụzuru afọ abụọ mgbe e mesịrị. Nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Budny ji mkpachara anya mee ka nsụgharị Polish ndị bu ya ụzọ mma. Tụkwasị na nke a, o weghachiri aha Chineke, bụ́ Jehova, n’ọtụtụ ebe.
Ná ngwụsị nke narị afọ nke 16 na n’iri afọ atọ ndị mbụ nke narị afọ nke 17, Raków, bụ́ isi obodo nke òtù ahụ, ghọrọ ógbè okpukpe na nke mmụta. N’ebe ahụ ndị ndú na ndị edemede nke okpukpe Polish Brethren bipụtara traktị na akwụkwọ ha dị iche iche.
Ha Kwalitere Mmụta
Ọrụ mbipụta nke ndị okpukpe Polish Brethren malitere ibiri ọkụ n’ihe dị ka n’afọ 1600 mgbe ha guzobere ígwè obibi akwụkwọ na Raków. Ígwè obibi akwụkwọ ahụ nwere ikike nke ibipụta ma akwụkwọ nta ma akwụkwọ ukwu n’asụsụ dị iche iche. Dị ka ebe a na-ebipụta akwụkwọ, n’oge na-adịghị anya, Raków mara obodo ndị kasị mma na Europe aka. E kweere na e bipụtara ihe dị ka akwụkwọ 200 dị iche iche n’ígwè obibi akwụkwọ ahụ n’ime afọ 40 sochirinụ. Otu ụlọ ọrụ na-emepụta akwụkwọ, bụ́ nke ndị okpukpe Polish Brethren nwe, butere akwụkwọ ndị bụ́ ọkpọka maka ibipụta akwụkwọ ọgụgụ a.
N’oge na-adịghị anya, ndị okpukpe Polish Brethren hụrụ mkpa ọ dị izi ndị kwere ekwe ibe ha na ndị ọzọ ihe. Iji mezuo nke ahụ, e guzobere Mahadum nke Raków na 1602. Ụmụ ndị ikom nke ndị okpukpe Polish Brethren, tinyere ụmụ okoro bụ́ ndị Katọlik na ndị Protestant, gara akwụkwọ n’ebe ahụ. Ọ bụ ezie na mahadum ahụ bụ ụlọ akwụkwọ nkà mmụta okpukpe, ọ bụghị nanị ihe metụtara okpukpe ka a na-akụzi n’ebe ahụ. Asụsụ ala ọzọ, ụkpụrụ omume, nkà mmụta akụ̀ na ụba, akụkọ ihe mere eme, iwu, nkà iche echiche, nkà mmụta sayensị banyere ihe ndị e kere eke, nkà mgbakọ na mwepụ, ọgwụ, na egwuregwu bụchakwa akụkụ nke usoro ihe ọmụmụ ha. Mahadum ahụ nwere ọ́bá akwụkwọ buru ibu, bụ́ nke nọgidere na-eto site n’enyemaka nke ígwè obibi akwụkwọ ahụ dị n’ógbè ahụ.
Ka narị afọ nke 17 nọ na-aga, o yiri ka okpukpe Polish Brethren ọ̀ ga-anọgide na-enwe ọganihu. Ma, ọ gaghị adị otú ahụ.
Chọọchị na Ọchịchị Emegwara
Zbigniew Ogonowski nke nọ n’Ụlọ Akwụkwọ Na-ahụ Maka Nkà Mmụta Sayensị na Poland na-akọwa, sị: “Ná ngwụsị nke iri afọ atọ nke narị afọ nke 17, ọnọdụ ndị òtù okpukpe Arius nọ na Poland malitere ịdị njọ n’ike n’ike.” Nke a bụ n’ihi ihe omume nke ndị ụkọchukwu Katọlik ji anyaike na-eme n’ụzọ na-arị elu. Ndị ụkọchukwu ahụ ji ụzọ ọ bụla kwere omume, gụnyere nkwutọ na okwu nkatọ mee ihe, iji mee ka e ledaa okpukpe Polish Brethren anya. Mgbanwe a gbanwere ọnọdụ ọchịchị nke Poland mere ka mwakpo ahụ dị mfe karị. Eze ọhụrụ nke ndị Poland, bụ́ Sigismund nke Atọ Vasa, bụ onye iro nke ndị okpukpe Polish Brethren. Ndị nọchiri ya, karịsịa John nke Abụọ Casimir Vasa, kwadokwara mgbalị ndị Chọọchị Katọlik na-eme iji kwada okpukpe Polish Brethren.
Okwu bịara sie ike mgbe e boro ebubo na ụmụ akwụkwọ ole na ole si Raków ma ụma merụọ obe. Ihe omume ahụ ghọrọ ihe nkụnye aka iji mebie isi obodo nke okpukpe Polish Brethren. E boro onye nwe Raków ebubo n’ihu ụlọikpe ndị isi na ọ ‘na-agbasa ajọ omume’ site n’ịkwado Mahadum nke Raków na ígwè obibi akwụkwọ ya. E boro ndị okpukpe Polish Brethren ebubo ịgba mgba okpuru, nke ime ihe n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa, na nke ibi ndụ rụrụ arụ. Nzukọ ndị isi kpebiri na a ga-emechi Mahadum nke Raków nakwa na a ga-ebibi ígwè obibi akwụkwọ na chọọchị nke ndị okpukpe Polish Brethren. E nyere ndị na-ekpe ya iwu ịhapụ obodo ahụ. A chụpụrụ ndị prọfesọ nke mahadum ahụ ná mba ahụ, na-enwe ntaramahụhụ nke ọnwụ ma ọ bụrụ na ha alọghachi ná mba ahụ ọzọ. Ụfọdụ ndị okpukpe Polish Brethren kwagara n’ebe ndị dị nchebe karị, dị ka Silesia na Slovakia.
Na 1658, nzukọ ndị isi nyere iwu ka ndị okpukpe Polish Brethren ree ihe onwunwe ha ma kwaga n’ala ọzọ n’ime afọ atọ. Mgbe e mesịrị, e gbubilatara oge ahụ a kara aka ịbụ afọ abụọ. A ga-egbu onye ọ bụla nke na-ekwupụta nkwenkwe ha mgbe nke ahụ gasịrị.
Ụfọdụ ndị okpukpe Socinus biri na Netherlands, bụ́ ebe ha nọgidere na-arụ ọrụ obibi akwụkwọ ha. Otu ọgbakọ nọgidere na-arụ ọrụ na Transylvania ruo ná mmalite nke narị afọ nke 18. Ná nzukọ ha, bụ́ nke ha na-enwe ihe ruru ugbo atọ n’izu, ha na-abụ abụ ọma, na-ege ntị n’okwuchukwu, ma na-agụ katkizim nke a kwadebeworo iji kọwaa ozizi ha. Iji mee ka ọgbakọ ha nọgide na-adị ọcha, ndị kwere ekwe na-agbazi ibe ha, na-agba ibe ha ume, na-achụpụ ha n’etiti ha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.
Ndị okpukpe Polish Brethren bụ ndị mụrụ Okwu Chineke. Ha chọpụtara eziokwu ụfọdụ ndị dị oké ọnụ ahịa, ha alaghịkwa azụ n’isoro ndị ọzọ kerịta ha. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ha gbasara na Europe nile, ha hụkwara ya dị ka ihe sikwuru ike ịnọgide na-adị n’otu. Ka oge na-aga, okpukpe Polish Brethren miri ala.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Arius (250-336 O.A.) bụ onye ụkọchukwu si Aleksandria rụsiri ụka ike na Nna Jisọs ka Jisọs ukwuu. Kansụl nke Nicaea jụrụ echiche ya na 325 O.A.—Lee Teta! (Bekee) nke June 22, 1989, peji nke 27.
b Lee Teta! (Bekee), nke November 22, 1988, peji nke 19, “Ndị Okpukpe Socinus—N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Jụ Atọ n’Ime Otu?”
[Foto dị na peeji nke 23]
Ụlọ nke bụbu nke onye ụkọchukwu okpukpe Socinus
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
N’elu: Raków taa; n’aka nri ka ebe obibi ndị mọnk dị, bụ́ nke e guzobere na 1650 iji kpochapụ “okpukpe Arius” ; n’okpuru: N’ebe a ka ndị ụkọchukwu Katọlik guzobere otu obe iji kpalite esemokwu ha na ndị okpukpe Polish Brethren
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 21]
Kaadị bú aha Bible bụ́ Biblia nieświeska nke Szymon Budny sụgharịrị, 1572