Okpukpe n’Ime Poland nke Taa
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA POLAND
A MAARA ndị Poland n’ụwa nile dị ka ndị ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ezie, ihe dị ka pasent 95 nke ndị obodo ahụ na-ekwu na ha bụ ndị Roman Katọlik.
A na-eji ememe okpukpe dị iche iche akpọrọ ihe nke ukwuu n’ala a, ha bụkwa akụkụ bụ́ isi nke ọdịnala mba ahụ. Karịsịa n’ime ime obodo, ememe okpukpe pụrụ ịdị na-akpali oké mmasị ma na-enye ọṅụ, ka ndị na-eme ya yi uwe ọdịnala, ndị mmadụ ana-esonyekwa n’egwuregwu dị iche iche.
Ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-ebukarị akụkọ banyere ụdị ihe omume ndị ahụ tinyere ime njem gaa n’ebe ofufe ndị a ma ama na ngagharị okpukpe. Baptism, alụmdi na nwunye e mere na chọọchị, ụbọchị aha, na Oriri Nsọ mbụ bụ n’otu aka ahụ oge ndị e ji kpọrọ oké ihe.
Na 1978, Karol Wojtyła, bụ́ onye Poland, ghọrọ Popu John Paul nke Abụọ. Nke a kwalitekwuru okpukpe Katọlik na Poland. Oké ìgwè obi dị ụtọ nke ukwuu na-anabata onye obodo ha mgbe ọ bụla ọ bịara ileta ala a mụrụ ya.
Ihe omume a nile nke okpukpe na-eme ka ndị na-anọghị na Poland na-eche na ndị Poland nwere okwukwe siri ike, nke a na-egosipụtakwa n’ihu ọha. Otú ọ dị, na Poland, ndị ndú Katọlik na ndị ọzọ na-ahụ ihe na-emenụ na-ekwupụta nchegbu ha banyere omume na àgwà na-agbanwe agbanwe nke ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị òtù chọọchị.
Echiche Ndị Poland
Ndị nnọchiteanya a ma ama nke ndị isi Katọlik nke Poland tinyere ndị odeakụkọ na ndị na-eme nnyocha banyere ọha na eze nwere echiche dị iche banyere ọnọdụ okpukpe Katọlik na Poland nke taa. Ọtụtụ ugboro karị, ndị a ma ama na-ekwu okwu ndị siri ike banyere mpụ na-akawanye njọ, ụkpụrụ omume ọma na-eretọ eretọ, na mmasị na-ebelata ebelata e nwere n’ozizi na n’ihe omume chọọchị. Ihe dị ukwuu ná mkparịta ụka ahụ hiwere isi n’ajụjụ bụ́, Mmetụta dị aṅaa ka ụdị ofufe ahụ a ma ama nke Roman Katọlik na-enwe ná ndụ ndị ahụ na-adị kwa ụbọchị?
Dị ka ihe atụ, Bishọp Józef Glemp, bụ́ onye Poland, chọpụtara ejighị okpukpe kpọrọ ihe nke rịworo elu n’etiti ndị mmadụ wee kwuo okwu banyere mkpa ọ dị ịgbaso ntiwapụ nke ụdị ọhụrụ nke ịgọ mmụọ ná mba ahụ mgba. Na magazin ndị Katọlik bụ́ Ład, onye edemede bụ́ Wojciech Chudy nyere nkọwa ka saa mbara banyere ọnọdụ ahụ. O kwuru, sị: ‘Anyị aghaghị ịtụle okwu ahụ nọworo na-enye ndị ụkọchukwu, ndị ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze, na ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ banyere okpukpe nsogbu ruo ọtụtụ afọ—enweghị nkwekọrịta pụtara ìhè n’agbata ndụ okpukpe na nke a na-adị kwa ụbọchị. Ị na-aṅa ntị n’okwuchukwu, ma ozugbo i si na chọọchị pụta, i chefuo nnọọ banyere ụwa Chineke. Ị na-abanye n’ụwa ọzọ, ụwa ebe anyị na-adọlị kwa ụbọchị, ebe ị na-ebi ndụ gị dị ka a ga-asị na Chineke adịghị ma ọlị.’
Achịbishọp Henryk Muszyński, bụ́ osote onyeisi oche ná Nnọkọ Ndị Bishọp ahụ, gara n’ihu na-ekwu, sị: “Oziọma ahụ emebeghi ka anyị gbanwee n’ime. Ndị Poland bụ ndị Kraịst nanị n’ihe ndekọ. O siri ike ịgọpụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-ele Iso Ụzọ Kraịst anya dị ka àgwà karịa dị ka okpukpe.”
Ihe Ndị E Ji Kpọrọ Ihe Gbanwere Agbanwe—Àgwà Gbanwere Agbanwe
Ụdị okwu ndị ahụ na-egosi na ndị nnọchiteanya bụ́ isi nke chọọchị na-echegbu onwe ha banyere oké mgbanwe ndị e nweworo n’ihe ọha na eze ji kpọrọ ihe na n’àgwà ha. Otu ihe bụ n’ihi na, omume mbụ a na-ahụkarị nke iji okpukpe kpọrọ ihe yiri ka nchegbu ndị ọzọ hà na-anọchi ya.
Iji maa atụ, n’otu ihe ọmụmụ banyere mmekọrịta ọha na eze, ndị Poland weere ezinụlọ n’ihe kasị mkpa ná ndụ, ihe ndị na-esote ya bụ ịkwụwa aka ọtọ, ikpe ziri ezi, obiọma, na ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi. Ihe ndị metụtara Chineke na okpukpe batara nanị dị ka nke 16. Ihe si na nke a pụta bụ ndalata nke ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị, ọbụna n’etiti ndị na-ekwu na ha bụ ndị kwere ekwe.
Ndị bishọp nọ na Poland na-echegbukwa onwe ha banyere ihe ndekọ ndị na-egosi ejighị ozizi chọọchị kpọrọ ihe bụ́ nke zuru ebe nile. Dị ka ihe atụ, n’otu nnyocha nke Irena Borowik si Mahadum Jagielloński mere n’okwu banyere okpukpe, nanị pasent 50 n’ime ndị zara ajụjụ kwuru na ha kwere ná ndụ mgbe a nwụsịrị, pasent 47 chere na e kwesịrị ịhapụ ndị ụkọchukwu ka ha lụọ nwanyị, pasent 64 kwadokwara ịgba alụkwaghịm.
Nchọpụta ọzọ, nke e bipụtara na magazin bụ́ Wprost, gosiri na “pasent 69 nke ndị Poland na-akatọ mmachibido chọọchị machibidoro iji ihe mgbochi afọ ime eme ihe, pasent 56 na-emegide mmachibido a machibidoro nsikwopụ afọ ime, pasent 54 kwadokwara inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye.” Ọnụ ọgụgụ ndị a na-egosi enweghị nkwekọrịta dị n’echiche ndị e nwere ugbu a n’ime chọọchị.
Chọọchị ahụ nwetara nkwanye ùgwù dị ukwuu n’iri afọ abụọ gara aga n’ihi òkè o keere n’imegide Ọchịchị Kọmunist. Otú ọ dị, ugbu a, ntinye aka chọọchị nọgidere na-etinye n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchichị na nke ọha na eze yiri ka ọ na-akpata obi ilu, na-akpata ọbụna enweghị nkwekọrịta ka njọ n’etiti ndị òtù chọọchị na ndị isi chọọchị.
Gịni Bụ Ngwọta Ya n’Ezie?
Tupu e nwee oké mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ nke 1989, gọọmenti tiri iwu ụfọdụ kpọmkwem banyere omume. Ọtụtụ n’ime ha adịkwaghị. Usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọhụrụ ewetawo ọchịchị onye kwuo uche ya na nnwere onwe onye, kama o wetawokwa mgbalị inweta ihe ndị e ji ebi ndụ n’ime usoro akụ̀ na ụba nke nwere ahịa ghere oghe nye onye ọ bụla. Ọtụtụ ndị nọ n’ebe a na-eche na ndị Poland adịghị nnọọ njikere maka oké mgbanwe dị otú ahụ. Gịnị kọrọ ha?
Ịnọgide na-enwe omume ọma na ịkwụsi ike n’ụzọ ime mmụọ n’ime ụwa nke taa chọrọ okwukwe nke dabeere n’ihe karịrị àgwà ma ọ bụ ememe okpukpe. Onye ọ bụla aghaghị ịzụlite okwukwe gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ihe ọmụma na nghọta o nwere banyere Okwu Chineke, bụ́ Bible.
Popu John Paul nke Abụọ n’onwe ya kwetara na nso nso a mkpa ọ dị ka ndị Kraịst bụrụ ndị na-agụchi Akwụkwọ Nsọ anya. Ọ kpọrọ ndị mmadụ òkù “ịzụlite àgwà nke ịgụsi Okwu Chineke ike na n’ụzọ chiri anya karị.” O kwukwasịrị: “Ịmụta ịgụ Akwụkwọ Nsọ dị oké mkpa nye onye kwere ekwe: ọ bụ nzọụkwụ mbụ n’usoro ime ihe, bụ́ nke na-aga n’ihu ná ntụgharị uche, na-ejikwa ekpere sitere n’obi eme otú ahụ.” Popu gbara ‘onye ọ bụla na-achọ eziokwu ume ịgagharị jiri nri nke Okwu nke Ndụ na-azụ onwe ya kwa ụbọchị.’
Narị afọ iri na itoolu gara aga, ogologo oge tupu ndụ aghọọ nke ọkụ ọkụ na nke a na-ejighị n’aka dị ka ọ dị ugbu a, Jisọs Kraịst rịọrọ Chineke ka o chebe ndị na-eso ụzọ ya pụọ n’ihe ndị na-akpata ike ọgwụgwụ n’ụzọ ime mmụọ bụ́ ndị gbara ha gburugburu. O kpere ekpere, sị: “Were eziokwu doo ha nsọ: okwu Gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Ihe mekwaranụ Bible ji ‘bụrụ eziokwu’ bụ na ọ bụ Okwu Chineke, ọ bụghị nke mmadụ. Pọl onyeozi degaara otu ọgbakọ akwụkwọ, sị: “Mgbe unu natara okwu nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, bụ́ okwu nke Chineke, ọ bụghị okwu mmadụ ka unu naara nke ọma, kama, otú ọ dị n’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.
N’ihi na Bible bụ “okwu Chineke,” ‘bụrụkwa eziokwu,’ ọ pụrụ inye anyị ihe dị anyị mkpa iji wusie onwe anyị ike n’ime ụwa a na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe. Bible na-ekwu, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.
Ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu na ndị nwere ọgụgụ isi nọ na Poland na gburugburu ụwa na-achọpụta na ọmụmụ Bible onwe onye na-enye ihe ndabere siri ike maka inwe okwukwe na Chineke na ná nzube ya. Ọ bụ ụdị okwukwe a na-enye ha ume iji bie ezi ndụ ndị Kraịst n’ụwa taa nke na-aghọwanye nke na-ejighị okpukpe kpọrọ ihe.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]
“Ndị Poland bụ ndị Kraịst nanị n’ihe ndekọ.”—Achịbishọp bụ́ onye Poland
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]
E nwere ejighị ozizi chọọchị kpọrọ ihe bụ́ nke zuru ebe nile
[Map dị na peeji 15]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
POLAND