Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Poland
N’OGE mgbụsị akwụkwọ nke 1989, gọọmenti nile nke Kọmunist site n’Oké Osimiri Baltic ruo Oké Osimiri Ojii malitere ịdakpọ. Ka a na-adọrisị Ákwà Mgbochi Ígwè ahụ, mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe malitere ịchọ ụzọ nke ha gasị. N’etiti ha e nwere Poland, mba nke jupụtara n’ugwu ugwu, ala ndị dị larịị, na ugwu ndị bụ nkume nkume.a
Ndị Poland bụ ndị na-arụsi ọrụ ike, Poland ewepụtawokwa ụfọdụ n’ime ndị na-eme nkà na ndị ọkà mmụta sayensị a ma ama n’ụwa. Ma, karịa nke ahụ, e nwere ugbu a usuu ndị agha na-amụba amụba nke ndị nkwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke.
Anyaike n’Ikpughe Ụgha
Na Poland e nwere ọtụtụ ndị ga-achọ ịmụta eziokwu site na Bible. Ma ụfọdụ bụ ndị ndị ikwu ma ọ bụ ndị agbata obi na-egbochi. Dị ka ihe atụ, n’ógbè Wrocław, otu nwanyị nwere mmasị kwụsịrị iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible mgbe ezinụlọ na ndị enyi rụgidere ya. Ka o sina dị, nwa ya nwanyị nọ n’agbata afọ ndụ iri na atọ na iri na itoolu gụrụ usoro isiokwu Ụlọ Nche ndị na-ekpughe okpukpe ụgha. Ndị a kpaliri mmasị ya n’eziokwu ahụ.
Mgbe ọnwa isii nke ọmụmụ Bible gasịrị, onye a na-eto eto kpebiri igbubipụ ihe nile jikọrọ ya na okpukpe ụgha. O letara otu ụkọchukwu nke chọọchị ya ma gwa ya maka mkpebi ya. Onye ụkọchukwu ahụ gwara ya ka o detuo ihe na-esonụ: “Mụ, bụ́ K—— P——, na-ajụ okpukpe Katọlik.”
Na Sunday na-esonụ, a gụrụ okwu nke a na chọọchị. Nna nna nwa agbọghọ ahụ tụbọrọ, nne nne ya dapụkwara n’ákwá. Otú ọ dị, ọ masịrị ndị ọzọ nọ na chọọchị ahụ, ha kwuokwa, sị: “Ehee, mmadụ enwewo anyaike zuru ezu iji kwuo na e nwere ọtụtụ ihe ụgha n’ime chọọchị anyị.” Onye a nwere obi ike nke nọ n’agbata afọ ndụ iri na atọ na iri na itoolu bụ ugbu a nwanna nwanyị ime mmụọ nke e meworo baptism, ọ malitewokwa ọmụmụ Bible asaa n’obodo nta ya.
‘Site ná Mkpụrụ Ha’
Akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa izu bụ́ Kujawy i Pomorze bipụtara akụkọ bụ́ “Unu Ga-esite ná Mkpụrụ Ha Mazuo Ha.” N’akụkụ ya ụfọdụ, isiokwu ahụ kwuru na ndị na-ekpe okpukpe na Krisendọm “n’eziokwu adịghị eji ụkpụrụ dị iche iche nke okpukpe nke ha nakwewooro akpọrọ ihe nke ukwuu. Ha guzopụrụ nnọọ iche n’ebe Ndịàmà Jehova nọ bụ́ ndị na-eme dị ka ha kwuru, ha na-ekwukwa ihe Bible nyere n’iwu.”
Mgbe o gosisịrị ọdịiche n’ọdịdị nke Ndịàmà na nke ndị Kraịst egbugbere ọnụ, akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị nke ikpeazụ yikarịrị ka ha amaghị, ọtụtụ mgbekwa ha adịghị etinye n’ọrụ, eziokwu ndị dị mkpa na ụkpụrụ nile nke okwukwe ha. . . . Site n’àgwà ha, Ndịàmà Jehova na-egosipụta nkwekọrịta nke okwu na omume ha, si otú a na-anwapụta na ha abụghị ‘ndị amụma ụgha’ ahụ, kama nke ahụ, a pụrụ ịmata ha site ná mkpụrụ ha. ‘Mmadụ ọ̀ na-ekpokọpụta mkpụrụ vine n’ogwu, ma ọ bụ fig n’uke?’ (Matiu 7:15-20).”
Otu nwanyị degaara Przyjaciółka a na-ebipụta kwa izu akwụkwọ, na-akwa arịrị n’ihi na nwa ya nwoke hapụrụ Chọọchị Katọlik ma ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Gịnị bụ okwu ndụmọdụ onye editọ ya? “Ọ bụrụ na nwa gị nwoke malitere iso Ndịàmà Jehova na-akpakọ, mụta ma nakwere okwukwe ha, ọ bụ mkpebi nke ya kpọmkwem, bụ́ nke a ga-anabata ma kwanyere ùgwù. . . . E ji ọtụtụ àgwà ọma na ndị a na-achọsi ike n’etiti ọha na eze mara òtù okpukpe ahụ, dị ka nkwadorịta ibe a na-adịghị ahụkebe ihe yiri ya na nkekọ ìgwè siri nnọọ ike, oké ime ihe n’eziokwu na mgbasochi anya nke ụkpụrụ iwu ndị a nakweere ná ndụ ndị nọ n’otu ìgwè, na n’ikpeazụ, ikike ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu ha, na-emezu n’ụzọ a na-ahụ anya ụkpụrụ akparamàgwà ndị ha na-akpọsa. Ndị a bụ àgwà ndị dị oké ọnụ ahịa.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee 1994 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
[Igbe dị na peeji nke 9]
IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ
Afọ Ije Ozi 1993
ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NA-AGBA ÀMÀ: 113,551
NKEZI: 1 Onyeàmà maka 339
NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 235,642
NKEZI NDỊ NKWUSA BỤ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ: 7,961
NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 79,131
ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ E MERE BAPTISM: 8,164
ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 1,397
ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: Nadarzyn
[Foto dị na peeji nke 9]
Alaka ụlọ ọrụ Poland na Lodz na 1948
[Foto dị na peeji nke 9]
Ọrụ iji obodobo kaadị e dekwasịrị ihe, June 1948, n’Ọwụwa Anyanwụ Prussia na mbụ
[Foto dị na peeji nke 9]
Ndị ọrụ 72 na Betel nke Poland, January 1993
[Foto dị na peeji nke 9]
Alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ ahụ na Nadarzyn